Ònye Kwesịrị Ikpebi Otú Ezinụlọ Ga-aharu?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRAZIL
Ọ DỊ nanị ụbọchị atọ, a gbahapụrụ nwa okoro ahụ n’ime akpa plastik n’ebe nkwụsịtụ nke ụzọ okpuru ala. Ma otu akwụkwọ akụkọ ndị Brazil kwuru na ọtụtụ ezinụlọ kwuru ka ha kuchie nwa ọhụrụ ahụ.
Ọ bụ ezie na a dịghị ahụkebe ụdị ihe ahụ, ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-achọghị na ndị a gbahapụrụ n’ụwa nile na-arị elu. Nne ma ọ bụ nna ji ibu ọrụ ha kpọrọ ihe na-adịkarị ụkọ. Mgbochi ịmụ nwa ọ̀ bụ ihe ngwọta ya? Ọ̀ ga-adị njọ mmadụ ịhazi otú ezinụlọ ya ga-aharu?
Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa si kwuo, ihe dị ka 50 pasent nke afọ ime n’ụwa nile bụ ndị a na-emeghị atụmatụ ha. Ọtụtụ mgbe, ọ bụghị nanị na e meghị atụmatụ afọ ime, kama ọ bụkwa nke a na-achọghị.
Ọtụtụ na-achọ izere afọ ime, eleghị anya n’ihi nsogbu ahụ ike, ụlọ obibi, ma ọ bụ nke ọrụ. N’ihi ya, usoro ọgwụ mgbochi ime, dị ka ọgwụ nchịkwa ọmụmụ ma ọ bụ condom, dị n’ebe nile. E jikwa nsikwopụ afọ ime na igbochi ikike ịmụ nwa eme ihe dị ka usoro nchịkwa ọmụmụ. Banyere nsikwopụ afọ ime na Brazil, akwụkwọ akụkọ bụ́ O Estado de S. Paulo na-akọ, sị: “Òtù Ahụ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na kwa afọ ndị inyom nde 5 n’ime nde 13 ndị na-atụrụ ime na Brazil na-akwụsị afọ ime n’ụzọ nzuzo.” Ọzọ, magazin bụ́ Time kọrọ na 71 pasent nke ndị inyom Brazil nọ n’afọ ndụ ịmụ nwa bụ́ ndị lụrụ di na-achịkwa ọmụmụ. Ná ndị a, 41 pasent ji mkpụrụ ọgwụ eme ihe, 44 pasent egbochiwokwa ikike ịmụ nwa ha.
Otu nnyocha na-egosi na 75 pasent nke ndị Brazil chere na ọ dị mkpa ime atụmatụ ụmụ ole a ga-amụ. Ndị ọzọ na-ajụ atụmatụ otú ezinụlọ ga-aharu n’ihi ikwere n’akara aka ma ọ bụ n’ihi iche na ọ bụ nzube Chineke ka ezinụlọ nwee ‘ụmụ ole Chineke zitere.’ Ònye kwesịrị ikpebi otú ezinụlọ ga-aharu—di na nwunye ahụ ka ọ̀ bụ ọdịmma mba ma ọ bụ okpukpe?
Nchịkwa Ọmụmụ—Gịnị Mere O Ji Bụrụ Okwu Arụmụka?
Ọ bụ ezie na ọ na-enye ohere maka usoro ịgụ oge, Chọọchị Roman Katọlik, bụ́ okpukpe kasị ibu na Brazil, na-emegide iji usoro mgbochi ịmụ nwa eme ihe, ma hà bụ ndị na-esikwopụ afọ ime ma ọ bụ na ha abụghị. Popu Paul nke Isii kwuru, sị: “Mmekọahụ ọ bụla n’etiti nwoke na nwanyị [kwesịrị] ịbụ nke ghere oghe nye mbufe nke ndụ.” Popu John Paul nke Abụọ sịrị: “Mgbochi ịmụ nwa, ma e lee ya anya n’ụzọ ziri ezi, bụ ihe rụrụ oké arụ nke na, n’agbanyeghị ihe kpatara ya, ọ pụghị izi ezi.” N’ihi ya, ọtụtụ ndị Katọlik na-ala azụ n’ibelata otú ezinụlọ ha ga-aharu, na-ele mgbochi ịmụ nwa anya dị ka mmehie.
N’aka nke ọzọ, akwụkwọ akụkọ ahụ ike bụ́ Lancet na-ekwu, sị: “Ọtụtụ nde ga-ebi ndụ ha dị ka ndị na-agụghị akwụkwọ, ndị na-enweghị ọrụ, ndị na-ebighị n’ụlọ dị mma, ndị na-apụghịkwa inweta enyemaka ahụ ike, nlekọta na ịdị ọcha kasị dị ala, ọ bụkwa ịrị elu nke ụba mmadụ a na-achịkwaghị achịkwa bụ isi ihe na-akpata ya.” N’ihi ya, n’ịtụ egwu ụba mmadụ gabigara ókè na ịda ogbenye, gọọmenti ụfọdụ na-agba ume ime atụmatụ otú ezinụlọ ga-aharu, n’agbanyeghị mmegide chọọchị. Dị ka ihe atụ, “Costa Rica belatara nkezi ọnụ ọgụgụ ụmụ [maka otu ezinụlọ] site na 7 gaa na 3,” ka onye ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ bụ́ Paul Ehrlich na-ekwu.
Akwụkwọ òtù UN bụ́ Okwu Dị Mkpa Maka Ahụike—Ọrụ Cheere Ndi Mgbasaozi Aka Mgba, na-ekwu, sị: “Nwaanyị mụta ụmụ anọ, ịtụkwa ime ọzọ na-eweta oke nsogbu na ndụ na ahụike nke nne na nwa. Nke a na-akacha njọ ma ọ bụrụ na a kpọgaghị oge ndi a mụrụla amụ karịa afọ abụọ abụọ. Ọ dị mfe ike ịgwụ ahụ nwaanyị n’ihi ịtụ ime enyeghị ohere, ịmụ nwa mgbe na mgbe, inye ara mgbe na mgbe na ilekọta ụmụaka.”
Ezinụlọ bụrụ ibu ka juru ebe nile, ebe ọ̀tụ̀tụ̀ ọnwụ ụmụ ọhụrụ dị elu, karịsịa n’ime ime obodo Africa, Esia, na Latin America. N’ihi gịnị? Ọtụtụ amaghị banyere usoro mgbochi ịmụ nwa. Otu ihe na-akpata ya n’ebe ụfọdụ pụrụ ịbụ na, dị ka otu onye ome iwu kwuru, “nwoke na-ewere onwe ya dị ka dimkpa ma ọ bụrụ na nwunye ya na-atụrụ ime kwa afọ.” Akwụkwọ akụkọ bụ́ Jornal da Tarde na-ekwu ihe ọzọ pụrụ iso na-akpata ya, karịsịa site n’ụzọ nwanyị si ele ihe anya: “Ụmụ bụ otu n’ime isi iyi obi ụtọ nke dị ụkọ, nke na-eweta echiche nke nrụzu ihe onwe onye.” Ọzọ, Paulo Nogueira Neto, onye bụbu odeakwụkwọ nke gburugburu ebe obibi na Brazil, kwuru, sị: “Nwa bụ ịnọ ná ntụkwasị obi ọha na eze nke ndị dara ogbenye.”
Ihe Bible Na-ekwu
Ị̀ maara na Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ahapụrụ ya di na nwunye ikpebi otú ezinụlọ ga-aharu? Ọ na-egosikwa na alụmdi na nwunye kwesịrị ekwesị, ma ọ̀ bụ maka ọmụmụ ma ọ̀ bụ maka igosi ịhụnanya site ná mmekọahụ chiri anya nke nwere nsọpụrụ.—1 Ndị Kọrint 7:3-5; Ndị Hibru 13:4.
Ma ọ̀ bụ na Chineke agwaghị Adam na Iv na Paradaịs ka ha ‘mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụtakwa ụwa’? (Jenesis 1:28) Ee, ma ọ dịghị ihe dị na Bible nke na-egosi na anyị nọ n’okpuru otu iwu ahụ taa. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Ricardo Lezcano rụtụrụ aka, sị: “O yiri ihe na-emegiderịtatụ onwe ha iji otu usoro ime ihe ahụ bụ maka mmadụ abụọ nanị biri na mbara ụwa mee ihe maka [ọtụtụ ijeri] ụmụ mmadụ.” Ọ bụrụgodị na mkpebi bụ ịghara inwe ụmụ ma ọlị, nke a bụ nhọrọ onwe onye nke a ga-akwanyere ùgwù.
N’ụzọ na-akpali mmasị, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwu na ụzọ ile ihe anya nke Ndịàmà Jehova dabeere na Bible. Ọ na-ekwu, sị: “E wezụga nchịkwa ọmụmụ, bụ́ nke ha hapụrụ ka di na nwunye ahụ kpebie, ụkpụrụ àgwà mmekọahụ ha siri nnọọ ike.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ha na-ewere Bible dị ka nanị ebe ndabere ha nke nkwenkwe na ụkpụrụ nduzi omume.”
Ụzọ nile nke ibelata otú ezinụlọ ga-aha hà ziri ezi? Ee e. Ebe ọ bụ na ndụ dị nsọ, Iwu Chineke nyere Israel kwuru ka e mesoo onye kpatara nsikwopụ afọ ime dị ka ogbu mmadụ. (Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23) N’ihe banyere igbochi ikike ịmụ nwa, dị ka site n’ibepụ usoro akwara ọbara ọcha, mkpebi ahụ bụ nke akọ na uche onwe onye, ebe ọ bụ na a kpọghị nke a aha kpọmkwem n’ime Bible. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5)a Ebe ọ bụkwa na e nwere ụzọ dị iche iche nke nchịkwa ọmụmụ, ntụziaka ahụ ike pụrụ inyere di na nwunye aka ikpebi ma hà chọrọ iji otu ụdị kpọmkwem mee ihe ma ọ bụ na ha achọghị.
Mee Mkpebi Ndị Ị Pụrụ Ịnagide
Ọ bụghị ihe nile dị ná ndụ ka a pụrụ ime atụmatụ ya. Ma ị̀ ga-azụ ụgbọala ma ọ bụ ụlọ n’ebughị ụzọ chebara ihe ọ gụnyere uche nke ọma? A pụrụ ireghachi ụgbọala ma ọ bụ ụlọ, ma a pụghị iweghachi ụmụ. Mgbe a na-eme atụmatụ afọ ime, ọ̀ bụ na e kwesịghị ịtụle mgbe ahụ ikike di na nwunye nwere ịkpata ihe ndị dị mkpa ná ndụ?
N’ezie, anyị agaghị achọ ka ezinụlọ anyị ghara iri ihe na-edozi ahụ, anyị agaghịkwa achọ ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ. (1 Timoti 5:8) N’otu aka ahụ, e wezụga nri na ụlọ obibi, ụmụaka nwere mkpa agụmakwụkwọ, ụkpụrụ omume ọma, na ịhụnanya.
Tụkwasị n’ịgbakọ ihe ọ gụnyere n’ụzọ ọrụ, ego, na ndidi, a ghaghị ịtụle ahụ ike nke nwunye. Ịtụrụ ime mgbe e dokwara edokwa n’ụzọ amamihe na-azọpụta ndụ ma na-akwalite ahụ ike ka mma. Okwu Dị Mkpa Maka Ahụike na-ekwu, sị: “Otu ụzọ kachasị mkpa e ji ebelata ọghọm nke afọ ime na ịmụ nwa na-ewetara nne na nwa bụ ịkpọga oge otu ịtụ ime na nke ọzọ na-eso ya. Ọghọm ịmụ nwa na-adịkarịsị ukwuu ma ọ bụrụ na nne erughị afọ iri na asatọ, ma ọ bụ na ọ gafeela afọ iri atọ na ise, ma ọ bụkwanụ na nne atụọla ime anọ, ma ọ bụ karịa. Nke ọzọ bụ ma ọ bụrụ na nne atụọ ime na-enyeghị ohere ruru afọ abụọ site n’ime nke nwa ọ mụrụ ikpeazụ.”
Ndị di na nwunye na-eche banyere inwe ụmụ kwesịrị ịtụle na, dị ka Bible buru n’amụma, ụwa nke jupụtara na mpụ, ụnwụ, agha, na ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka gbara anyị gburugburu. (Matiu 24:3-12; 2 Timoti 3:1-5, 13; Mkpughe 6:5, 6) Ezi ịhụnanya maka ụmụaka ga-enyere di na nwunye aka inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere ụwa anyị bi n’ime ya, na-aghọta na ịzụlite ụmụ bụ oké ihe ịma aka n’oge anyị. Ya mere kama ịhapụ nnọọ ihe ka ha na-emere onwe ha ma na-enwe ọtụtụ ụmụ dị ka o kwere omume n’olileanya na ihe nile ga-adịcha mma, ọ na-amasị ọtụtụ ndị ịhọrọ otú ezinụlọ ha ga-aharu ka ụmụ ha wee nwee ike ịnụ ụtọ ọ̀tụ̀tụ̀ obi ụtọ na ịnọ ná ntụkwasị obi ka ukwuu.
E wezụga inyere anyị aka ime mkpebi amamihe n’ihe ndị metụtara ezinụlọ, Okwu Chineke na-enye anyị olileanya siri ike maka ọdịnihu. Bible na-egosi na ọ bụ nzube Onye Okike ka ụmụ mmadụ dị ndụ ebighị ebi n’udo na obi ụtọ n’elu ụwa paradaịs. Iji mezuo nke a, Chineke ga-eweta usoro ihe ọjọọ nke a ná njedebe n’isi nso. Mgbe ahụ, n’ime ụwa ezi omume nke ịda ogbenye na ụba mmadụ gabigara ókè na-adịghị, a gaghị atụfu ụmụaka ọzọ ma ọlị n’ihi na a chọghị ha.—Aịsaịa 45:18; 65:17, 20-25; Matiu 6:9, 10.
N’ụzọ doro anya, ichebara onwe ha na ụmụ ha echiche, tinyere echiche kwesịrị ekwesị banyere ọmụmụ, ga-enyere di na nwunye aka ikpebi otú ezinụlọ ha ga-aharu. Kama ịhapụ nnọọ ihe ka ha na-emere onwe ha, ha kwesịrị iji ekpere chọọ nduzi Chineke. “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, Ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—Ilu 10:22.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche, November 1, 1985, peji nke 31.
[Foto dị na peeji nke 12]
A na-agbahapụ ọtụtụ nde ụmụaka
[Foto dị na peeji nke 13]
Nlekọta ịhụnanya dị ụmụaka mkpa