Site n’Okwu Na-emerụ Ahụ Gaa n’Okwu Na-agwọ Agwọ
“Ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.”—ILU 18:21.
NKWUTỌ—ịma ụma na-eji okwu mkparị, nke nkwulu, na-eme ihe—bụ nke a kagburu hoo haa n’ime Bible. N’okpuru Iwu Mosis, onye kwutọrọ nne na nna ya pụrụ inweta ikpe ọnwụ. (Ọpụpụ 21:17) N’ihi ya, Jehova Chineke adịghị ewere okwu ahụ n’ihe nta. Okwu ya, bụ́ Bible, adịghị akwado echiche nke bụ na ihe ọ bụla mere ‘na nzuzo’ adịkebeghị mkpa ọ bụrụhaala na mmadụ na-azọrọ na ya na-ejere Chineke ozi. Bible na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye na-ekpere Chineke, mgbe ọ dịghị akwa ire nke ya ngá, kama ọ na-aghọ obi ya aghụghọ, okpukpe Chineke nke onye a bụ ihe efu.” (Jemes 1:26; Abụ Ọma 15:1, 3) Ya mere ọ bụrụ na nwoke ejiri okwu na-eti nwunye ya ihe, ọrụ ya ọzọ nile nke ndị Kraịst pụrụ ịghọ ihe efu n’anya Chineke.a—1 Ndị Kọrint 13:1-3.
Ọzọkwa, onye Kraịst bụ́ onye nkwutọ pụrụ iche nchụpụ site n’ọgbakọ ihu. Ọ pụrụ ọbụna ịghara inweta ngọzi nile nke Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11; 6:9, 10) N’ụzọ doro anya, ọ dị onye okwu ya na-emerụ ahụ mkpa ime oké mgbanwe. Ma olee otú a pụrụ isi mezuo nke a?
Ime Ka Nsogbu ahụ Pụta Ìhè
O doro anya na onye mmejọ agaghị agbanwe ọ gwụla ma ọ ghọtara nke ọma na ya nwere nsogbu siri ike. N’ụzọ dị mwute, dị ka otu onye ndụmọdụ chọpụtara, ọtụtụ ndị ikom ji nkwulu eme ihe “adịghị ele akparamàgwà ha anya dị ka mmetọ ma ọlị. Nye ndị ikom a, omume ndị dị otú ahụ dị nnọọ otú o kwesịrị, bụrụkwa ụzọ ‘kwekọrọ n’okike’ otú ndị bụ di na ndị bụ nwunye si emekọ ihe.” N’ihi ya, ọtụtụ agaghị ahụ mkpa ime mgbanwe ruo mgbe e chere ha ọnọdụ ahụ n’ihu n’ezoghị ọnụ.
Ọtụtụ mgbe, mgbe o jisịrị ekpere tụlee ọnọdụ ya, ọ ga-adị nwunye ka ọ bụ iwu na ya ga-ekwu okwu—maka ọdịmma nke ya na nke ụmụ ya na n’ihi nchegbu maka nguzo di ya n’ihu Chineke. N’eziokwu, e nwere mgbe nile ohere nke na ikwupụta okwu pụrụ ime ka ihe ka njọ nakwa na okwu ya pụrụ izute mwụpụ nke agụgọ. Ma eleghị anya nwunye pụrụ igbochi nke a site n’iji nlezianya chee echiche ụzọ ọ ga-esi welite isiokwu ahụ. “Mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha ka okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya bụ,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 25:11) Okwu dị nro ma bụrụ nke ezoghị ọnụ n’oge dị jụụ pụrụ iru n’obi ya.—Ilu 15:1.
Kama ibo ebubo, nwunye kwesịrị ịgbalị ikwupụta echiche ya site n’ụzọ nke otú okwu ahụ na-emerụ ahụ si emetụta ya. Okwu nke “mụ” na-adịkarị irè. Dị ka ihe atụ, ‘O wutere m n’ihi na . . .’ ma ọ bụ ‘Ọ na-egbu m mmụọ ma ị gwa m . . .’ O yikarịrị ka okwu ndị dị otú ahụ hà ga-erukarị n’obi, n’ihi na ha na-alụso nsogbu ahụ ọgụ kama ịlụso onye ahụ.—Tụlee Jenesis 27:46–28:1.
Ntinye ọnụ siri ike ma dị akọ nke nwunye pụrụ ịrụpụta ihe dị mma. (Tụlee Abụ Ọma 141:5.) Otu nwoke anyị ga-akpọ Steven hụrụ na nke a bụ eziokwu. “Nwunye m chọpụtara na m bụ onye mmetọ, bụ́ nke m na-amataghị, o nwekwara obi ike ime ka ọ pụta ìhè,” ka ọ na-ekwu.
Inweta Enyemaka
Ma gịnị ka nwunye pụrụ ime ma di ya jụ ikweta nsogbu ahụ? N’ọnọdụ a ụfọdụ ndị nwunye na-achọ enyemaka si n’èzí. N’oge ahụhụ dị otú ahụ, Ndịàmà Jehova pụrụ ijekwu ndị okenye ọgbakọ ha. Bible na-agba ndị ikom a ume igosi ịhụnanya na obiọma mgbe ha na-azụ ìgwè atụrụ ime mmụọ nke Chineke na, n’otu oge ahụ, ‘ịtụ ndị na-ekwugide okwu na-enye ezi ndụ nke Okwu Chineke mmehie ha n’anya.’ (Taịtọs 1:9; 1 Pita 5:1-3) Ọ bụ ezie na ọ dịghịịrị ha itinye ọnụ n’okwu onwe onye nke ndị di na nwunye, n’izi ezi ndị okenye na-enwe nchegbu mgbe di ma ọ bụ nwunye na-enwe ihe otiti site n’okwu obi ọjọọ nke onye nke ọzọ. (Ilu 21:13) Site n’ịgbasochi ụkpụrụ Bible anya, ndị ikom a adịghị eleghara ma ọ bụ na-eleda nkwulu anya.b
Ndị okenye pụrụ inwe ike ime ka e nwee nkwurịta okwu ngwa ngwa n’etiti di na nwunye ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanyị jekwuuru otu okenye wee kọọrọ ya banyere ọtụtụ afọ nke di ya, bụ́ onye kwere ekwe ibe ya, jiworo okwu ọnụ tie ya ihe. Onye okenye ahụ mere ndokwa ka ya na ha abụọ zukọọ. Ka nke ọ bụla na-ekwu okwu, ọ gwara nke ọzọ ka o gee ntị n’etinyeghị ọnụ. Mgbe o ruru oge nke nwunye ahụ, o kwuru na ya enwekwaghị ike idili oké iwe nke di ya. Ruo ọtụtụ afọ, ka ọ kọwara, obi na-eko ya n’elu ná ngwụsị ụbọchị ọ bụla, n’amaghị ma ọlị ma ọ ga-anọ n’iwe mgbe ọ batara n’ụlọ. Mgbe o tiwapụrụ, ọ ga-ekwu ihe nlelị dị iche iche banyere ezinụlọ ya, ndị enyi ya, na ya onwe ya.
Onye okenye ahụ gwara nwunye ahụ ka ọ kọwaa ụzọ okwu di ya si metụta ya. “Ọ dị m ka m bụ nnọọ ajọ mmadụ nke ọ na-adịghị onye pụrụ ịhụ ya n’anya,” ka ọ zara. “Mgbe ụfọdụ m na-ajụ nne m, ‘Mama, àbụ m onye o siri ike iso biri? Àbụ m onye a na-apụghị ịhụ n’anya?’” Ka ọ na-akọwa ụzọ okwu ya si metụta ya, di ya malitere ibe ákwá. Na nke mbụ ya, ọ pụrụ ịhụ ụzọ o siworo jiri okwu ya na-emerụ nwunye ya ahụ n’ụzọ dị omimi.
Ị Pụrụ Ịgbanwe
Ụfọdụ ndị Kraịst na narị afọ mbụ nwere nsogbu nkwulu. Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dụrụ ha ọdụ ịtụpụ “iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere.” (Ndị Kọlọsi 3:8) Otú ọ dị, okwu obi ọjọọ bụ nsogbu bụkarịrị nke obi kama nke ire. (Luk 6:45) Ọ bụ ya mere Pọl ji gbakwụnye: “[Yipụchasịanụ] mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:9, 10) Ya mere mgbanwe gụnyere ọ bụghị nanị ikwu okwu otú dị iche kamakwa inwe mmetụta otú dị iche.
Ọ pụrụ ịdị di nke na-ekwu okwu na-emerụ ahụ mkpa ịchọpụta nnọọ ihe na-akpali akparamàgwà ya.c Ọ ga-achọ inwe àgwà ọbụ abụ ahụ: “Gwupụta ala obi m, Chineke, wee mara obi m: na-anwa m, wee mara iche uche m nile: hụkwa ma ọ̀ dị ụzọ ọ bụla na-eweta ihe mgbu dị n’ime m.” (Abụ Ọma 139:23, 24) Dị ka ihe atụ: N’ihi gịnị ka o ji adị ya ka o nwere mkpa ịchịkwa, ma ọ bụ ijikpa, nwunye ya? Gịnị na-akpalite mwakpo okwu ọnụ? Mwakpo ya hà bụ mgbaàmà iwe bamiri abami? (Ilu 15:18) Ọ̀ na-enwe mmetụta nke abaghị uru, ma eleghị anya na-esite ná nzụlite nke jupụtara n’okwu nkatọ? Ajụjụ ndị dị otú ahụ pụrụ inyere nwoke aka ikpughe mkpọrọgwụ nke akparamàgwà ya.
Ma, nkwulu siri ike ifopụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ nke a kụnyere site n’aka nne na nna nwere ọnụ ọjọọ n’onwe ha ma ọ bụ ọdịbendị na-akwado akparamàgwà ịchị ọchịchị nchịgbu. Ma a pụrụ—mgbe oge na-aga na site ná mgbalị—ịhapụ ihe ọ bụla a mụtara amụta. Bible bụ ihe enyemaka kasịnụ n’okwu a. Ọ pụrụ inyere mmadụ aka ịkwada ọbụna akparamàgwà ndị gbamiri mkpọrọgwụ. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 10:4, 5.) N’ụzọ dị aṅaa?
Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Isi Lee Ọkwá Chineke Kenyegasịrị Anya
Ọtụtụ mgbe, ndị ikom ji okwu ọnụ emerụ mmadụ ahụ nwere echiche gbagọrọ agbagọ banyere ọkwá Chineke kenyegasịrị di na nwunye. Dị ka ihe atụ, Pọl so dee Bible kwuru na ndị bụ nwunye ga ‘na-edo onwe ha n’okpuru di ha’ nakwa na “di bụ isi nke nwunye.” (Ndị Efesọs 5:22, 23) Di pụrụ iche na ịbụisi na-enye ya ikike nchịkwa a na-akparaghị ókè. Ma ọ dịghị otú ahụ. Nwunye ya, ọ bụ ezie na ọ nọ n’okpuru, abụghị ohu ya. Ọ bụ “onye inyeaka” na nke “kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) N’ihi ya, Pọl gbakwụnyere: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.”—Ndị Efesọs 5:28, 29.
Dị ka isi nke nzukọ Kraịst, Jisọs adịghị mgbe ọ na-agwakasị ndị na-eso ụzọ ya ahụ, na-eme ka ha nwee nchekasị ahụ erughị ala mgbe ntiwapụ ọzọ nke nkatọ ga-abụ. Kama nke ahụ, ọ dị nro, si otú ahụ na-echekwa ịdị ùgwù ha. “Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike,” ka o kwere ha ná nkwa. “Abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi.” (Matiu 11:28, 29) Ntụgharị uche site n’ekpere banyere ụzọ Jisọs si gosi ịbụisi ya pụrụ inyere di aka ile ịbụisi ya anya n’ụzọ ka zie ezi.
Mgbe Esemokwu Bilitere
Ịma ụkpụrụ Bible bụ otu ihe; itinye ha n’ọrụ n’okpuru nrụgide bụ nnọọ ihe ọzọ. Mgbe esemokwu bilitere, olee otú di pụrụ isi zere ịlaghachi n’usoro nke okwu obi ọjọọ?
Ọ bụghị ihe àmà nke ịbụ nwoke ka di jiri okwu na-alụ ọgụ mgbe iwe were ya. Bible na-asị: “Ọ dị mma, bụ́ onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, karịa dike: ọ dịkwa mma, bụ́ onye na-achị mmụọ ya, karịa onye na-ewere obodo n’agha.” (Ilu 16:32) Onye bụ nwoke n’ezie na-achị mmụọ ya. Ọ na-egosi ọmịiko site n’ịtụle: ‘Olee otú okwu m si emetụta nwunye m? Olee otú ọ ga-adị m ma a sị na m nọ n’ọnọdụ ya?’—Tụlee Matiu 7:12.
Otú ọ dị, Bible na-ekweta na ọnọdụ ụfọdụ pụrụ ịkpasu iwe. Banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọbụ abụ ahụ dere: “Maanụ jijiji, emehiekwala: sịnụ otú a n’obi unu n’elu ihe ndina unu, wee dere duu.” (Abụ Ọma 4:4) E kwuwokwa ya otú a: “Ọ dịghị ihe dị njọ n’iwe iwe, ma ọ dị njọ iji okwu ọnụ wakpo mmadụ site n’ikwurụ ọnụ, iweda n’ala, ma ọ bụ ilelị.”
Ọ bụrụ na o yie di ka ọ dịkwaghị achịkwa okwu ya, ọ pụrụ ịmụta ịdị na-akwụsị. Ma eleghị anya ọ ga-abụ ihe amamihe ịhapụ ọnụ ụlọ ahụ, ije gagharịa, ma ọ bụ ịchọta ebe ịnọrọ nanị onwe onye iji mee ka obi jụrụ. Ilu 17:14 na-asị: “Tupu [esemokwu, NW] esie ike hapụ ya.” Maliteghachi nkwurịta okwu ahụ mgbe iwe dajụsịrị.
Otú ọ dị, ọ dịghị onye zuru okè. Di nke nwere nsogbu okwu obi ọjọọ pụrụ ịdabaghachi na ya. Mgbe nke a mere, o kwesịrị ịrịọ mgbaghara. Iyikwasị “mmadụ ọhụrụ” bụ ihe na-aga n’ihu, ma ọ bụ nke na-enye ụgwọ ọrụ buru ibu.—Ndị Kọlọsi 3:10.
Okwu Ndị Na-agwọ Agwọ
Ee, “ọnwụ na ndụ dị ire n’aka.” (Ilu 18:21) A ghaghị iji okwu ndị na-ewuli elu ma na-eme ka alụmdi na nwunye siwanye ike dochie okwu na-emerụ ahụ. Otu ilu Bible na-asị: “Ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ka okwu ọnụ ụtọ nile bụ. Nke na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ n’ọrịa.”—Ilu 16:24.
Afọ ole na ole gara aga, e mere nnyocha iji chọpụta ihe ndị mere ezinụlọ ndị siri ike ji na-aga nke ọma. “Nnyocha ahụ chọpụtara na ndị òtù ezinụlọ ndị a nwere mmasị n’ibe ha, nọgidekwa na-agwa ibe ha na ha nwere mmasị n’ibe ha,” ka ọkà alụmdi na nwunye bụ́ David R. Mace na-akọ. “Ha na-akwadorịta ibe ha, na-enye ibe ha mmetụta nke uru onwe onye, na-ejikwa ohere ọ bụla ezi uche dị na ya na-ekwu okwu ma na-eme ihe n’ụzọ ịhụnanya. Ihe si na ya pụta, dị nnọọ ka a tụrụ anya, bụ na ọ na-amasị ha ịnọkọ ọnụ ma wusiwanye ibe ha ike n’ụzọ ndị na-eme ka mmekọrịta ha na-eju nnọọ afọ.”
Ọ dịghị di na-atụ egwu Chineke nke pụrụ ikwu n’eziokwu na ya hụrụ nwunye ya n’anya ma ọ bụrụ na ọ ma ụma jiri okwu ya na-emerụ ya ahụ. (Ndị Kọlọsi 3:19) Ee, otu ihe ahụ ga-abụkwa eziokwu n’ebe nwunye nke ji okwu ọnụ na-eti di ya ihe nọ. N’ezie, ọ bụ ibu ọrụ dịịrị mmadụ abụọ ahụ ịgbaso okwu ntụziaka Pọl nye ndị Efesọs: “Ka okwu ọ bụla nke na-ere ure ghara isi n’ọnụ unu pụta, kama ihe bụ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dị ka ụlọ, dị ka mkpa si dị, ka o wee nye ndị na-anụ ya amara.”—Ndị Efesọs 4:29.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na anyị na-ezo aka n’onye mejọrọnụ dị ka nwoke, ụkpụrụ ndị dị n’ebe a dịkwaara ndị inyom.
b Iji ruo eru ije ozi ma ọ bụ ịnọgide na-eje ozi dị ka okenye, nwoke agaghị abụ onye na-eti mmadụ aka. Ọ pụghị ịbụ onye na-akụ ndị mmadụ ihe n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ jiri okwu na-egbu mmụọ na-emenye ha ihere. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi gaje ịdị na-achị ezinụlọ nke aka ha nke ọma. N’agbanyeghị otú ọ pụrụ isi kpaa àgwà obiọma n’ebe ọ bụla ọzọ, nwoke adịghị eru eru ma ọ bụrụ na ọ bụ onye ọchịchị nchịgbu n’ụlọ.—1 Timoti 3:2-4, 12.
c Ma onye Kraịst ọ̀ ga-achọ inweta ọgwụgwọ bụ okwu dịịrị onwe onye. Ma, o kwesịrị ijide n’aka na ọgwụgwọ ọ bụla ọ ga-anata emegideghị ụkpụrụ Bible.
[Foto dị na peeji nke 19]
Okenye ndị Kraịst pụrụ inwe ike inyere di na nwunye aka ikwurịta okwu
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị di na nwunye kwesịrị itinye ezi mgbalị iji ghọta ibe ha