Onye E Wusiri Ike Ịnagide Ule Ndị Dị n’Ihu
DỊ KA EDWARD MICHALEC SI KỌỌ YA
Oké iwe ji onye isi ndị uwe ojii nke Wharton, Texas, U.S.A. N’ịkpọga m n’ụlọ nga na nke ugboro anọ ya, o tiri ná mkpu, sị: “Gịnị mere ị dịghị erube isi n’iwu?” “Enwere m ikike zuru ezu ime nke a,” ka m zaghachiri ozugbo. Nke a kpasuru onye isi ndị uwe ojii ahụ iwe ọbụna karị, ọ malitekwara ịpịa m ụtarị ígwè. Ndị uwe ojii ndị ọzọ sonyeere ya, na-akụ m ikè égbè ha.
NKE ahụ mere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 gara aga. N’ileghachi anya azụ, apụrụ m ịhụ na Jehova Chineke ji ọnọdụ ndị ahụ nye m ọzụzụ iche ihe ịma aka nke ịbụ otu n’ime nanị Ndịàmà Jehova abụọ nọ na Bolivia ihu, mba Ndịda America hà ka France. Ahụmahụ m pụrụ inyere gị aka ịhụ otú Jehova pụrụ isi mee ka ị dị ike mgbe ị na-eche ule dị iche iche ihu.
Laa azụ na 1936, ka m na-arụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ nta a na-edozi redio na Boling, Texas, anụrụ m mgbasa nke okwu Joseph F. Rutherford, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society mgbe ahụ, kwuru. Okwu ya kọrọ banyere ngọzi ndị Alaeze Chineke ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. Ọ masịrị m n’ezie. (Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:3, 4) Emesịrị m chọta akwụkwọ ụfọdụ Rutherford dere n’ọ́bá akwụkwọ nke aka anyị wee malite ịgụ ha.
Nwunye nna m tụrụ egwu n’ihi mmasị m nwere n’ihe ọ na-akpọ “akwụkwọ okpukpe ochie nile ndị ahụ.” O zoro ha, yiekwa egwu ịgba ha ọkụ. Mgbe m degaara Watch Tower Society akwụkwọ maka ụtụ Ụlọ Nche na The Golden Age, bụ́ aha Teta! na mbụ, Society gwara William Harper, nke Ọgbakọ Wharton ahụ e guzobere ọhụrụ ka o leta m. N’oge na-adịghị anya, nwunye nna m, nwanne m nwoke, nwa nwunye nna m nke obere, na mụ onwe m socha Nwanna Harper na-amụ Bible. N’oge na-adịghị anya, anyị nile gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site na baptism ime mmiri.
Na 1938, Shield Toutjian, bụ́ onye nnọchiteanya na-ejegharị ejegharị nke Society, bịara n’ebe obibi anyị na Boling wee kwuo okwu Bible. Ọnụ ụlọ obibi anyị jupụtara n’ọnụ—ndị mmadụ guzo ọtọ ọbụna n’ọnụ ụzọ banyere ọnụ ụlọ ndị dị n’akụkụ. Nwanna Toutjian kwuru okwu banyere ntachi obi nke onye amụma bụ Jeremaịa n’imere ndị oge ya nkwusa n’agbanyeghị mmegide ha. (Jeremaịa 1:19; 6:10; 15:15, 20; 20:8) Site n’okwu ndị dị otú ahụ, Jehova nọ na-ewusi anyị ike maka ule ndị anyị ga-eche ihu.
Otu Mkpebi na Ihe Ndị Si n’Ime Ya Pụta
Amatara m n’oge na-adịghị anya na ọ dị m mkpa ime otu mkpebi. N’oge gara aga, amụwo m ihe banyere achụmnta ego, achọwokwa m ịghọ onye a ma ama n’ụwa achụmnta ego. Enwere m ọrụ ire na idozi redio, arụkwaara m ụlọ ọrụ telifon na-etinye telifon ọrụ. Ma ugbu a amalitere m ịghọta na ezi ihe ịga nke ọma ná ndụ na-agụnye ime ihe na-atọ Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke ụtọ. N’ihi ya emechiri m ọrụ m, doziekwa otu ụgbọala e ji mere ebe obibi. Ka ọ na-erula January 1, 1939, esonyeworo m otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi oge nile, na nso nso Three Rivers, dị n’Ógbè Karnes, Texas.
Na September 1939, Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na Europe. Ndị mmegide ji ọnọdụ ahụ mee ihe ikwutọ Ndịàmà Jehova. Ha kwuru na anyị bụ ndị nkwado ndị iro, ma ọ bụ ndị nledo nye Ikike Njikọ Germany na Mba Ndị Òtù Ya. Ọtụtụ kweere ebubo ụgha ndị dị otú ahụ wee malite ịkpatara anyị nsogbu. Ná mmalite afọ ndị 1940, a tụnyere m n’ụlọ nga ugboro itoolu ma ọ bụ iri, gụnyere oge ahụ e kwuru ná mmalite mgbe onye isi ndị uwe ojii ahụ na ndị osote ya kụrụ m ihe nke ukwuu. Nlekọta ahụ ike dịrị m mkpa mgbe nke ahụ gasịrị.
Ọ dabara na otu onye isi ndị uwe ojii ahụ mesịrị ghara ịkpụpụ otu nwoke ikpe ịgba chaa chaa iwu na-akwadoghị mara n’ụlọikpe iji nweta ihu ọma—nwoke ahụ, onye gbara dimkpa na-arụ ọrụ n’ọhịa mmanụ, ga-eti m ihe. N’ihi ya, otu ụbọchị mgbe m na-enyefe magazin n’okporo ámá, nwoke ahụ ji chen wakpoo m! Ụfọdụ ndị osote onye isi ndị uwe ojii pụtara, ma kama ịkpara ya aka, ha kpọchiri m! Ka oge na-aga, onye ahụ na-awakpo m gwara m ihe kpatara o ji wakpo m n’enweghị ihe m mere ya ma rịọ mgbaghara.
Ihe Ndị M Mụtara Site n’Ule
Imeri ule ndị dị otú ahụ wusiwanyere okwukwe m ike n’ezie n’ebe Chineke nọ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, echetaghị m inwe ihe mgbu ka a na-eti m ihe, ma ana m echeta ịdị jụụ na udo m nwere mgbe e mesịrị. (Ọrụ 5:40-42) N’ihi ya, amụtara m ime dị ka Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ: “Na-anyakwa isi n’ime mkpagbu anyị nile: ebe anyị matara na mkpagbu na-arụta ntachi obi.” (Ndị Rom 5:3) Mgbe e mesịrị, mgbe m chetara ihe ahụ e tiri m, o mere ka m kpebisie ike site n’enyemaka Jehova ịghara ikwe ma ọlị ka onye ozi ọ bụla nke Setan mee ka m mechie ọnụ.
Ọzọkwa, amụtara m ihe ọzọ bara uru. Okwu m na-ejighị akọ kwuo, “enwere m ikike zuru ezu ime nke a,” akpasuwo onye isi ndị uwe ojii ahụ iwe. Ka oge na-aga, ọ bịakwutere m ọzọ, na-ewe oké iwe n’oge a n’ihi na Ndịàmà adịghị etinye aka n’agha. (Aịsaịa 2:4) N’ịnwa ịkpasu m iwe, ọ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na a kpọrọ gị òkù ijere mba gị ozi, ị̀ ga-eje?”
N’ịbụ onye mụtaworo iji akọ ekwu okwu ugbu a, azaghachiri m, sị: “Ọ bụrụ na m ji n’aka na ọ bụ uche Jehova, aga m agarịrị.” Azịza ahụ mere ka iwe ya dajụọ, ọ dịghịkwa ihe ọzọ merenụ.
Ọzụzụ Maka Ọrụ M Ga-arụ ná Ndụ
Ihe gbara ọkpụrụkpụ ná ndụ m bụ ịgụ akwụkwọ na klas nke atọ nke Watchtower Bible School of Gilead, na 1944. Ụlọ akwụkwọ a na-enye ọzụzụ ọnwa ise maka ọrụ ozi ala ọzọ. Tupu m gaa ụlọ akwụkwọ a, enwere m ụjọ nke ikwu okwu n’ihu ndị na-ege ntị. Ma ịdị na-ekwu okwu mgbe mgbe n’ihu ihe dị ka otu narị ụmụ akwụkwọ, ọtụtụ mgbe n’ebe ghere oghe a na-eme ihe nkiri, nyeere m aka n’ezie. Onye nkụzi ikwu okwu ihu ọha anyị, bụ́ Maxwell Friend, na-akwụsị m ma tie mkpu, sị: “Nwanna Michalec, adịghị m anụ ihe ị na-ekwu!” Esi m otú ahụ ghọta na m nwere olu dị nnọọ ike n’ezie.
Mgbe Nathan H. Knorr, bụ́ onye isi oche ụlọ akwụkwọ ahụ mgbe ahụ, masịrị ọkwa na ebe e kenyere m ọrụ ozi ala ọzọ bụ Bolivia, echetara m na ọ dụrụ m ọdụ, sị: “Ị ga-ahụ ọtụtụ ndị dị umeala n’obi n’ebe ahụ. Na-ahụ n’anya, nwee ndidi, na-echebakwara ha echiche.” N’ihi na Agha Ụwa nke Abụọ ka na-aga n’ihu, anyị aghaghị ichere ruo nwa oge tupu anyị agawa ebe e kenyere anyị ọrụ. N’ikpeazụ, n’October 25, 1945, mụ na Harold Morris—bụ́ nwa klas m—rutere n’Ọdụ Ụgbọelu El Alto, kpọmkwem ná mpụga La Paz, bụ́ isi obodo Bolivia. Anyị si otú a bụrụ nanị Ndịàmà abụọ e nwere ná mba nke atọ kasị ukwuu na Ndịda America.
Otu bọs si n’ọdụ ụgbọelu ahụ kwọga anyị, mita 4,100 site n’ọ̀tụ̀tụ̀ elu osimiri, gaa n’isi obodo ahụ, bụ́ La Paz, nke gbasapụrụ ma banye n’ala na akụkụ nke otu nnukwu ndagwurugwu. Ọ bụ ihe ịma aka ime mgbanwe gaa n’ibi n’ịdị elu nke kilomita atọ site n’ọ̀tụ̀tụ̀ elu osimiri.
Obere Mmalite Na-agba Aghara
Anyị malitere ozugbo ileta ndị mmadụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ha nwere obiọma na ndidi n’ebe anyị nọ ka anyị na-agbalị ịsụ obere Spanish anyị maara. N’oge na-adịghị anya onye ọ bụla n’ime anyị na-eduzi malite na 18 ruo 20 ọmụmụ Bible ebe obibi kwa izu. Ọnwa isii mgbe nke ahụ gasịrị, n’April 16, 1946, otu ìgwè dị nta nwere obi ụtọ sooro anyị zukọọ maka ememe kwa afọ nke ọnwụ Kraịst. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mmadụ anọ ọzọ gụsịrị akwụkwọ na Gilead rutere, gụnyere Elizabeth Hollins, onye mesịrị ghọọ nwunye m.
N’oge na-adịghị anya mụ na Nwanna Morris malitere ileta obodo ukwu ndị ọzọ, gụnyere Cochabamba na Oruro, bụ́ obodo nke abụọ na nke atọ kasị ukwuu mgbe ahụ na Bolivia. Mgbe m kọọrọ Nwanna Knorr banyere otú ndị mmadụ si gosi mmasị na akwụkwọ e ji amụ Bible ndị anyị nyefeworo, ọ tụrụ aro ka anyị na-eleta obodo ndị a n’ime ihe dị ka ọnwa atọ ọ bụla iji nyere ndị gosiri mmasị aka. Ọtụtụ n’ime ndị a nwere omume enyi, na-ele ọbịa nke ọma mesịrị ghọọ Ndịàmà Jehova.
Ebe ọ bụ na Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịrị nanị otu afọ bu ụzọ, Bolivia na-enwe ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ịma aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị na egwu nke mpụtaghachi Nazi na Ndịda America dugara ná ntiwapụ nke njegharị iwe okporo ámá na igbu mmadụ. N’oge okpomọkụ nke 1946, e gburu president mba ahụ, a kwụbakwara ozu ya n’elu otu osisi eletrik chere ihu n’obí president. Mgbe ụfọdụ, ime ihe ike ahụ mere ka ọ ghara ikwe ndị mmadụ omume ọbụna ịhapụ ụlọ ha.
Ka Elizabeth ji bọs na-aga n’ámá bụ́ isi nke obodo ahụ n’otu ụbọchị, ọ hụrụ ụmụ okorobịa atọ a kwụbara n’elu osisi. N’egwu, o bere obere ákwá. Otu onye so nọrọ na bọs ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na i nweghị mmasị n’ihe ị na-ahụ, wepụ anya gị.” Ihe omume ndị dị otú ahụ kụnyere n’ime anyị ịdị mkpa nke ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ.
Otú ọ dị, n’etiti ọgba aghara ahụ, eziokwu Bible na-agbanye mkpọrọgwụ n’obi ndị dị umeala n’obi. Na September 1946, e guzobere alaka ụlọ ọrụ na La Paz, a họpụtakwara m dị ka onye nlekọta alaka. Otu ụlọ obibi a na-akwụ ụgwọ na ya nke ulọ ọrụ ahụ dị n’ime ya jekwara ozi dị ka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. Ọnwa ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, mgbe e hiwere ọgbakọ mbụ na Bolivia, otu ụlọ obibi a jere ozi dị ka ebe anyị na-enwe nzukọ.
Na 1946 anyị malitekwara inwe okwu ihu ọha. E nwetara ụlọ nzukọ dị n’Ọ́bá Akwụkwọ Ógbè dị na La Paz maka nke mbụ. Otu nwoke nwere omume enyi si Yugoslavia, bụ́ onye anyị na-amụrụ ihe, kwụrụ ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ ógbè ahụ ụgwọ ka ha kpọsaa okwu ahụ. Ụlọ nzukọ ahụ juru nnọọ n’ọnụ. Ebe ọ bụ na m ka na-agbalị ịsụ asụsụ Spanish m, ụjọ tụrụ m banyere ikwu okwu ahụ. Ma site n’enyemaka Jehova nzukọ ahụ gara nke ọma. Ọ dabara na nke ahụ bụ nke mbụ n’usoro okwu anọ anyị kwuru n’ụlọ nzukọ ahụ.
Na 1947 anyị nwetara ndị ozi ala ọzọ Gilead isii ọzọ, na anọ ndị ọzọ na 1948. Ebe obibi ndị anyị nwere ike ịkwụ ụgwọ ha nwere ihe ntụsara ahụ ma ọ bụ nke ahụ efe ọgbara ọhụrụ ole na ole. E wezụga ịdị na-agbasochi usoro ihe omume ozi ala ọzọ anyị nke na-adịghị enye ohere, anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi ala ọzọ mbụ mesịrị nweta ọrụ nwa oge iji kpata ego iji zụchie uwe anyị ndị kaworo nká. Isite n’otu obodo gaa n’ọzọ bụkwa ihe ịma aka. Mgbe mgbe, emere m njem gafee usoro ugwu ndị na-atụ oyi n’azụ gwongworo ghere oghe. Ma Jehova nọgidere na-eji nzukọ ya na-enye anyị agbamume ndị na-ewusi ike.
Na March 1949, Nwanna Knorr na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton Henschel, si New York bịa wee leta ebe obibi atọ nke ndị ozi ala ọzọ anyị, dị na La Paz, Cochabamba, na Oruro. Lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịnụ banyere mmụba dị ukwuu n’ọtụtụ ala na nke Ebe Obibi Betel ọhụrụ na ebe obibi akwụkwọ ndị a na-ewu n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na Brooklyn! Nwanna Knorr tụrụ aro ka anyị nwee ebe obibi anyị na Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị n’ebe ka dịrị n’etiti na La Paz. Ọ gwakwara anyị na a ka ga-ezitekwu ndị ozi ala ọzọ.
Ka oge na-aga na 1949, anyị nwere mgbakọ sekit mbụ anyị, n’obodo ukwuu bụ́ Oruro. Ọ bụ ihe na-agba ume nye ọtụtụ ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị ndị Kraịst ọhụrụ izute ibe ha na nke mbụ ya. Ka ọ dị mgbe ahụ, Bolivia eruwo ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 48 ndị nkwusa Alaeze, nweekwa ọgbakọ atọ.
Onye Ibe M Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
N’ihi ijekọ ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ afọ, mụ na Elizabeth matara wee hụkwa onwe anyị n’anya. N’ikpeazụ, na 1953, anyị lụrụ. Ọ malitewo ozi ọsụ ụzọ na January 1939, dịkwa ka m malitere. Afọ ndị mbụ ahụ nke ịsụ ụzọ siiri ya ike n’otu aka ahụ. N’ihi ọrụ nkwusa ya o ji obi ike na-eme, a tụwokwa ya nga, kpọrọ ya gagharịa n’okporo ámá dị ka onye omempụ.
Elizabeth na-ekweta na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ na-ekere òkè ná ngagharị ihe ọmụma ma buru kaadị ịma ọkwa nke na-agụ, sị: “Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ.” Ma o mere ihe nzukọ Jehova nyere anyị ntụziaka ime n’oge ahụ. Dị ka o kwuru, o meere ya Jehova. Ahụmahụ ndị ahụ wusiri ya ike maka ule ndị ọ tachiiri obi n’afọ ndị mbụ ahụ na Bolivia.
Ọrụ Dịgasị Iche Iche
N’ime afọ ole na ole mgbe anyị lụsịrị, anyị tinyere ihe dị ukwuu n’oge anyị n’ọrụ njegharị. Anyị letara ọ bụghị nanị ọgbakọ anọ ndị ahụ dị na Bolivia kama ìgwè nile dịpụrụ adịpụ nke ndị nwere mmasị, tinyekwara obodo nile nwere ụba mmadụ karịrị 4,000. Nzube anyị bụ ịchọta na ịzụlite mmasị ọ bụla n’eziokwu Bible n’etiti ndị bi n’ebe ndị ahụ. Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịhụ na ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1960, e nwewo ọgbakọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ obodo nta nile anyị letaworo ihe dị ka afọ iri gara aga.
Ka ọ dị n’oge ahụ, enwere m nsogbu ahụ ike ndị ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke La Paz mere ka ọ ka njọ. Ya mere na 1957 nwanna nwoke ọzọ weghaara ibu ọrụ nke nlekọta alaka, e kenyekwara mụ na Elizabeth ibi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Cochabamba, bụ́ obodo dị na ndagwurugwu n’ebe na-adịchaghị elu. Ná nzukọ mbụ anyị, ndị ozi ala ọzọ ole na ole bịara ma ọ dịghị nwa afọ Bolivia ọ bụla bịaranụ. N’oge anyị hapụrụ Cochabamba n’afọ 15 n’ihu, na 1972, e nwere ọgbakọ abụọ. Ugbu a e nwere ọgbakọ 35 na ndagwurugwu Cochabamba, na-enwe ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze dị 2,600!
Na 1972 e zigara anyị na Santa Cruz, n’ala na-adịghị elu nke ebe okpomọkụ. Anyị ka bi n’ebe a n’ọnụ ụlọ ole na ole dị n’elu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe anyị rutere, Santa Cruz nwekwara ọgbakọ abụọ, ma ugbu a e nwere ihe karịrị ọgbakọ 45, na-enwe ihe karịrị ndị nkwusa dị 3,600 na-ekere òkè n’ozi ndị Kraịst.
Lee ka anyị si nwee obi ụtọ na anyị nọgidere n’ozi ala ọzọ anyị n’ihe karịrị afọ 50 ndị a ịhụ nchịkọta nke ihe dị ka ndị Jehova dị 12,300 n’ala a! Anyị enwewo obi ụtọ n’ezie inyere ndị a anyị hụrụ n’anya aka.
Ndụ Obi Ụtọ nke Ijere Ndị Ọzọ Ozi
Tupu mụ agawa ozi ala ọzọ m, onye ndụmọdụ okwu iwu nke Watch Tower Society, bụ́ Hayden C. Covington, onye Texas ibe m, kwuru, sị: “Ed, na Texas anyị nwere ọtụtụ ohere ịkpagharị n’ime ya. Ma n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, ị ga-abụ onye a kpagidere ya na ndị ọzọ. Ọ ga-apụta ime mgbanwe.” Ihe o kwuru bụ eziokwu. Gị na ndị ọzọ ibi oké nso bụ ihe ịma aka, ma ọ bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ịma aka onye ozi ala ọzọ bụ onye Kraịst na-eche ihu.
Ya mere ọ bụrụ na ị ga-atụle ịkwapụ n’ụlọ iji jeere Jehova ozi n’ebe ọzọ, cheta na ndụ nke ezi onye na-eso ụzọ Kraịst bụ nke ijere ndị ọzọ ozi. (Matiu 20:28) Ya mere, onye ozi ala ọzọ kwesịrị ịkwadebe uche ya ịnakwere ndụ nke mmadụ igbochi onwe ya ihe. Ụfọdụ pụrụ iche na ha ga-abụ ndị a ma ama. Ikekwe ha ga-abụ—mgbe ha sịrị ndị enyi na ndị ikwu nọ n’ụlọ ka e mesịa. Ma nke ahụ na-apụ n’anya mgbe mmadụ rutere n’obodo nta ma ọ bụ obodo dara ogbenye nke dị n’agbata obi nke ga-abụ ebe e kenyere ya ọrụ. Gịnị bụ ndụmọdụ m?
Mgbe i zutere ihe isi ike, ndị dị ka nsogbu ahụ ike, mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe ndị ezinụlọ gị nọ, ma ọ bụ ikekwe nwee ihe isi ike gị na ụmụnna gị ndị Kraịst ịdị ná mma n’ebe e kenyere gị ọrụ, nakwere ihe ndị a nile dị ka akụkụ nke ọzụzụ gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, a ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ka oge na-aga, dị ka Pita onyeozi dere, sị: “Chineke nke amara nile, . . . mgbe unu hụworo ahụhụ nwa oge, Ya onwe ya ga-eme ka unu zuo okè, meekwa ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike, tọọkwa unu ntọala.”—1 Pita 5:10.
Edward Michalec nwụrụ na July 7, 1996, ka a na-akwadebezu isiokwu a maka mbipụta.
[Foto dị na peeji nke 23]
Na Bolivia na 1947
[Foto dị na peeji nke 24, 25]
A na-enwekarị klas okwu ihu ọha n’èzí, dị ka e gosiri n’ihe osise ikpeazụ a nke ebe a na-ekiri ihe ghere oghe na Gilead
[Foto dị na peeji nke 27]
Mụ na nwunye m