Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 28-29
  • Ụwa Ọ̀ Ga-agwụsị n’Ọkụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ọ̀ Ga-agwụsị n’Ọkụ?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ò Nwere Nchegbu?
  • “Ụwa Mbụ Ahụ”
  • “Ụwa Ọhụrụ”
  • À Ga-ebibi Ụwa?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Ka Mbara Ala Bụ Ụwa Ga-aghọ?
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Ụwa
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 1/8 p. 28-29

Echiche nke Bible

Ụwa Ọ̀ Ga-agwụsị n’Ọkụ?

ỊBỤ ihe a ghara ọkụ n’oké mgbukpọ nke nuklia, ịbụ ihe anyanwụ na-aza aza suru ọkụ, ma ọ bụ ịbụ ihe chi iwe ji mụnyere ọkụ—ụzọ isi mee ya pụrụ ịdịgasị iche iche, ma ọtụtụ ndị mmadụ kwenyesiri ike na mbara bụ́ Ụwa, ebe obibi nke ihe a kpọrọ mmadụ, ga-abịaru ọgwụgwụ ya n’oké ọkụ na-erechapụ ihe nile, apọkalips oké ọdachi.

Ụfọdụ na-ezo aka n’akụkụ Bible ndị na-egosi ọkụ sitere n’aka Chineke dị ka ụgwọ ọrụ maka ngahie mmadụ megide ụwa. Ndị ọzọ na-ekwughachi echiche nke Paul Davies, onye prọfesọ na Mahadum nke Adelaide, Australia, onye na-ede banyere ihe ọ na-ele anya dị ka mmikpu n’ime mbibi nke ọkụ nke ụwa na-aghaghị imikpu. N’akwụkwọ ya bụ́ The Last Three Minutes, ọ na-echepụta, sị: “Ka anyanwụ na-azawanye aza, ọ ga-erikpugide . . . Ụwa n’ime ihe mkpuchi ya dị ọkụ. Mbara ụwa anyị ga-aghọ ntụ́.” Gịnị bụ eziokwu banyere ihe na-aghaghị ime ụwa? Olee otú anyị ga-esi ghọta akụkụ Bible ndị na-eyi ka ọ na-ebu amụma mkpochapụ site n’ọkụ?

Chineke Ò Nwere Nchegbu?

Na Jeremaịa 10:10-12, a na-agwa anyị, sị: “Jehova bụ Chineke n’eziokwu; . . . Onye jiworo ike Ya mee ụwa, Onye jiworo amamihe Ya mee ka elu ụwa dum mmadụ bi guzosie ike, Onye jiworo nghọta Ya setịpụ eluigwe.” Chineke mere ụwa, meekwa ka o guzosie ike. Ya mere, site n’amamihe, ịhụnanya, na nghọta, o ji nlezianya kwadebe ụwa ịdịru mgbe ebighị ebi dị ka ebe obibi mara mma maka ihe a kpọrọ mmadụ.

Banyere okike Chineke kere ihe a kpọrọ mmadụ, Bible na-akọ: “Nwoke na nwanyị ka O kere ha. Chineke wee gọzie ha: Chineke wee sị ha, Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:27, 28) Mgbe ọ rụsịrị ọrụ okike ya, ọ pụrụ ikwupụta n’enweghị obi abụọ na “ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Ọ chọrọ ka ọ dịgide otú ahụ. Dị nnọọ ka ụfọdụ ndị na-atụ anya ịghọ nne na nna si edozi ọnụ ụlọ ihi ụra nwatakịrị ma na-akwadebe maka nwa ọhụrụ ha na-atụ anya ya, Chineke kụrụ ogige mara mma ma debe mmadụ ahụ bụ́ Adam n’ebe ahụ ịgbasa ya na ilekọta ya.—Jenesis 2:15.

Adam gbahapụrụ izu okè na ọrụ ya nke ilekọta ụwa. Ma Onye Okike ọ̀ gbahapụrụ nzube Ya? Aịsaịa 45:18 adịghị egosi nke ahụ: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; . . . Onye kpụworo ụwa . . . , Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Leekwa Aịsaịa 55:10, 11.) Ọ bụ ezie na mmadụ ledara ọrụ nlekọta ya anya, Chineke nọgidere na-emezu nzube ya maka ụwa na ndụ dị n’elu ya. Iwu ahụ e nyere mba Israel oge ochie mere ndokwa maka “ụbọchị izu ike ga-adịrị ala ahụ” kwa afọ asaa. Ọ gụnyere iwu obi ebere ndị nyere ụmụ anụmanụ nchebe ụfọdụ. (Levitikọs 25:4; Ọpụpụ 23:4, 5; Deuterọnọmi 22:1, 2, 6, 7, 10; 25:4; Luk 14:5) Ndị a bụ nanị ihe atụ ole na ole dị n’ime Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na Chineke na-enwe nchegbu buru ibu banyere ihe a kpọrọ mmadụ na ihe nile o nyefere mmadụ ilekọta.

“Ụwa Mbụ Ahụ”

Olee otú anyị ga-esi mee ka akụkụ Bible ndị yiri ka ha enweghị otu olu kwekọọ? Otu n’ime ha bụ 2 Pita 3:7, ebe, dị ka King James Version si dị, na-asị: “Eluigwe na ụwa, ndị dị ugbu a, a na-echebe ha n’otu okwu ahụ, ndị a kpadoworo nye ọkụ maka ụbọchị nke ikpe na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ọzọ bụ Mkpughe 21:1, nke na-ekwu, sị: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị.”

A sị na a ga-ewere okwu Pita n’ụzọ nkịtị, na ọkụ efu ga-eripịa mbara bụ́ Ụwa, mgbe ahụ eluigwe nkịtị—kpakpando na ihe ndị ọzọ dị n’eluigwe—ka a ga-ejikwa ọkụ bibie. Otú ọ dị, echiche a na-emegide mmesi obi ike a na-ahụ n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Matiu 6:10: “Ka alaeze Gị bịa, ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa,” na Abụ Ọma 37:29: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Ọzọkwa, gịnị bụ mmetụta ọkụ ga-enwe n’anyanwụ na kpakpando ndị dị mbụ dị oké ọkụ, ndị na-anọgide na-akpata ntiwapụ nuklia?

N’aka nke ọzọ, Bible mgbe mgbe na-eji okwu ahụ bụ́ “ụwa” eme ihe n’ụzọ ihe atụ. Dị ka ihe atụ, Jenesis 11:1 na-asị: “Ụwa nile wee nwee otu asụsụ.” N’ebe a, okwu ahụ bụ “ụwa” na-ezo aka n’ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya, ma ọ bụ ọha ụmụ mmadụ. (Leekwa 1 Ndị Eze 2:1, 2; 1 Ihe Emere 16:31.) Ihe ndị gbara 2 Pita 3:5, 6 gburugburu na-egosi otu ụzọ ahụ nke iji “ụwa” mee ihe n’ụzọ ihe atụ. Ọ na-ezo aka n’ụbọchị Noa mgbe e bibiri ọha ụmụ mmadụ ndị ajọ omume n’Iju Mmiri ma e chebere Noa na ezinụlọ ya tinyere ụwa n’onwe ya. (Jenesis 9:11) N’otu aka ahụ, na 2 Pita 3:7, ọ na-asị na ndị a ga-ebibi bụ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Nkọwa a na-ekwekọ n’ebe nile ọzọ nke Bible. Ọha mmadụ ajọ omume a kara akara maka mkpochapụ bụkwa “ụwa mbụ ahụ” e zoro aka ya ná Mkpughe 21:1, nke e hotara na mbụ.

N’ezie, dị nnọọ ka nna elu ala na-enwe nchegbu ga-eme ihe ọ bụla kwere omume iji hụ na e metọghị ebe obibi ya, Jehova Chineke na-enwe oké nchegbu banyere ihe okike ya. N’otu oge, ọ chụpụwo ndị mmadụ rụrụ arụ bụkwa ndị ajọ omume ná Ndagwurugwu Jọdan na-eme nri nke ọma, ma kwe ndị nlekọta ọhụrụ nke ala ahụ nkwa, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ọgbụgba ndụ, na ọ bụrụ na ha edebe ụkpụrụ ya, ‘ala ahụ ewee ghara ịgbọpụta ha mgbe ha na-emerụ ya, dị ka ọ ga-agbọpụta mba ahụ nke dị n’ihu ha.’—Levitikọs 18:24-28.

“Ụwa Ọhụrụ”

Taa, ọha mmadụ rụrụ arụ n’ụzọ mmekọahụ, ndị obi fere azụ n’ime ihe ike, na ndị rụrụ arụ n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị emetọwo ụwa. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ịnapụta ya. Ọ ga-eme nnọọ nke ahụ. Ná Mkpughe 11:18, ọ na-ekwe nkwa “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” Ndị na-atụ egwu Chineke nwekwara ezi ịhụnanya maka mmadụ ibe ha ga-ebijupụta ụwa e weghachiri eweghachi ma mee ka ọ dịghachi ọhụrụ. (Ndị Hibru 2:5; tụlee Luk 10:25-28.) Mgbanwe ndị ga-ewere ọnọdụ n’okpuru Alaeze eluigwe Chineke ga-ezu ezu nke na Bible na-ekwu banyere “ụwa ọhụrụ”—ọha mmadụ ọhụrụ.

Mgbe anyị gụrụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Abụ Ọma 37:29, anyị ewee ghọta okwu Kraịst ahụ dị na Matiu 6:10, anyị na-ekwenyesi ike na ike okike ndị na-enweghị nduzi ma ọ bụ mmadụ na ikike mbibi ya agaghị eweta ọgwụgwụ nke mbara ụwa anyị. Ha agaghị ebibi nzube Chineke. (Abụ Ọma 119:90; Aịsaịa 40:15, 26) Ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ebi n’ụwa n’etiti ọnọdụ nke ịma mma a na-akparaghị ókè na ọṅụ na-enweghị ọgwụgwụ. Nke ahụ bụ eziokwu banyere ihe na-aghaghị ime ụwa, n’ihi na nke a bụ, ọ nọrọwokwa na-abụ nzube nke Onye Okike na-ahụ n’anya nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Jenesis 2:7-9, 15; Mkpughe 21:1-5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya