Ihe Ịma Aka nke Inye Nlekọta
“MGBE ụfọdụ ọ na-adị m ka ya bụrụ na m pụrụ isi n’ọnọdụ ahụ gbapụ. Ma adị m ya mkpa karị mgbe ọ bụla ọzọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka m nọ nanị m.”—Jeanny, onye lekọtara di ya dị afọ 29 ruo ọnwa 18 tupu ọ nwụọ n’ihi akpụ ụbụrụ.a
“E nwere mgbe ụfọdụ iwe na-ewe m n’ebe mama m nọ, mgbe ahụ m na-akpọ onwe m asị. Ọ na-adị m ka m bụ onye dara ada mgbe m na-enweghị ike ịnagide nke ọma.”—Rose, 59, onye lekọtara nne ya na-adịghị ike nke dị afọ 90, bụ́ onye na-adịkwaghị esi n’àkwà ebili.
Akụkọ banyere ọrịa na-egbu mmadụ ma ọ bụ nke na-adịghị ala ala pụrụ ịbụrụ ezinụlọ na ndị enyi ihe na-eri ọnụ. “N’oge a chọpụtara ya, ezinụlọ ọ bụla na-enwe mmetụta nke ịnọ nanị ha. Ha nwere ike ha agaghị ama onye ọzọ nweworo nsogbu a,” ka Jeanne Munn Bracken na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ Children With Cancer. Ha na-abụkarịkwa ndị “na-enweghị mmetụta ọ bụla na ndị na-ekwetaghị ihe merenụ,” dị ka ọ dị Elsa mgbe ọ chọpụtara na ezigbo enyi ya dị afọ 36 bụ́ Betty nwere ọrịa cancer. Sue, onye ahụ na-adịghị nna ya, nwere “oké mmetụta, nke ịtọgbọrọ chakoo” n’ime onwe ya mgbe ọ chọpụtara n’ikpeazụ na nna ya na-anwụ n’ihi ọrịa cancer.
Ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi pụrụ ịchọta onwe ha na mberede ka a manyere ha ịrụ ọrụ onye na-enye nlekọta—na-egbo mkpa anụ ahụ na nke mmetụta uche nke onye ahụ na-arịa ọrịa. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ha sie nri ndị na-edozi ahụ, lekọta ọgwụgwọ, mee ndokwa maka ịga na nke dọkịta, lekọta ndị ọbịa nke onye ọrịa ahụ, deere onye ọrịa ahụ akwụkwọ ozi ya, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe a na-afọju ihe omume ndị ahụ n’usoro ihe omume jurula eju.
Otú ọ dị, ka ọnọdụ onye ọrịa ahụ na-aka njọ, ọrụ inye nlekọta na-aghọ ọbụna nke siri ike karị. Gịnị ka nke a pụrụ ịgụnye? “Ihe nile!” ka Elsa tiri ná mkpu banyere enyi ya na-adịghị esi n’àkwà ebili bụ́ Betty. “Ịsa ya ahụ na inye ya nri, inyere ya aka mgbe ọ na-agbọ agbọ, ịwụfu mamịrị dị n’akpa mamịrị ya.” Kathy, n’agbanyeghị inwe ọrụ oge nile, aghaghị ilekọta nne ya ahụ na-adịghị. Sue, onye a kpọtụrụ aha na mbụ, na-ekwu banyere “ilele na idetu ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ahụ [nna ya] n’ọkara hour ọ bụla, ịhịa ya mmiri n’ahụ mgbe ahụ ya malitere ire ọkụ, na ịgbanwe uwe ya na ákwà ihe ndina ya n’ime hour ole na ole ọ bụla.”
Ọdịdị nke nlekọta a na-enye onye ọrịa ga-adabere ruo n’ókè dị ukwuu n’otú ahụ dịruru ndị na-enye nlekọta ahụ. Ma, a na-elegharakarị mmetụta na mkpa nke ndị na-elekọta onye ọrịa anya. Ọ bụrụ na inye nlekọta aghọọ nnọọ ihe mgbu, ọ ga-esi nnọọ ike. Ma, dị ka ihe ka ukwuu ná ndị na-enye nlekọta ga-ekweta, a na-enye nlekọta ahụ n’oké mfu nke mmetụta uche.
“Ọ Bụ Nnọọ Ihe Mmechuihu”
“Ugboro ugboro ihe ọmụmụ na-akọwa obi erughị ala nke na-esi ná mmegheri, àgwà mmechuihu, na okwu iwe [nke onye ọrịa] ahụ apụta,” ka The Journals of Gerontology na-akọ. Dị ka ihe atụ, Gillian na-akọwa ihe mere mgbe otu enyi ya kwuru n’otu nzukọ ndị Kraịst na ya chọrọ ịhụ nne ya meworo agadi. “Mama m moropụrụ nnọọ anya, ọ zaghịkwa ihe ọ bụla,” ka Gillian ji iwe na-echeta. “Ọ bụ nnọọ ihe mmechuihu ma mee ka anya mmiri ju m anya.”
“Ọ bụ otu n’ime ihe ndị kasị sie ike ịnagide,” ka Joan na-ekwu, bụ́ onye di ya nwere isi mmebi. “Ọ na-emetụ ka ọ ghara iche echiche banyere àgwà ọma,” ka ọ na-akọwa. “Mgbe anyị na ndị ọzọ kpapụrụ ije rie nri, mgbe ụfọdụ ọ na-aga na table ndị ọzọ dị n’ebe iri nri ahụ, rachatụ jam ma tinyeghachi ngajị ahụ n’ime efere jam ahụ. Mgbe anyị jere ileta ndị agbata obi, ọ pụrụ ịgbụsa ọnụ mmiri n’ụzọ dị n’ubi ahụ. O siiri m ike iwepụ n’ime obi m echiche bụ na ndị ọzọ na-ekwu okwu banyere àgwà ndị a ma eleghị anya na ikekwe na-ele ya anya dị ka onye na-enweghị ezi àgwà ma ọlị. Ana m anọkarị nanị m.”
“Atụrụ M Ụjọ na Ọ Bụrụ na Anyị Elezighị Anya . . .”
Ilekọta onye a hụrụ n’anya nke na-arịasi ọrịa ike pụrụ ịbụ ahụmahụ na-atụ ụjọ. Onye ahụ na-enye nlekọta pụrụ ịdị na-atụ ụjọ ihe ga-emenụ ka ọrịa ahụ na-aka njọ—ikekwe ọbụna na-atụ ụjọ ọnwụ nke onye ọ hụrụ n’anya. Ọ pụkwara ịtụ ụjọ na ya agaghị enwe ume ma ọ bụ ikike igbo mkpa onye ọrịa ahụ.
Elsa na-akọwa ihe kpatara ụjọ ya n’ụzọ dị otú a: “Ana m atụ ụjọ na m nwere ike imerụ Betty ahụ n’ụzọ anụ ahụ, si otú a na-atụkwasị ihe n’ahụhụ ya, ma ọ bụ na m ga-eme ihe nwere ike igbubilata ndụ ya.”
Mgbe ụfọdụ egwu ndị na-atụ onye ọrịa na-aghọ egwu nke onye ahụ na-enye nlekọta. “Nna m nwere oké egwu nke ịbụ onye ihe gbadoro, mgbe ụfọdụkwa ọ na-amalite ịma jijiji,” ka Sue kwuru ná ntụkwasị obi. “Atụrụ m ụjọ na ọ bụrụ na anyị elezighị anya, ihe ga-agbado ya, o wee si otú a nwee egwu ya kasị ukwuu.”
“Ị Pụrụ Inwe Mwute n’Ihi Otú Ha Dịbu”
“Mwute bụ ahụmahụ nke ndị na-elekọta onye a hụrụ n’anya nke na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala na-enwekarị,” ka akwụkwọ bụ́ Caring for the Person With Dementia na-ekwu. “Ka ọrịa onye ọrịa ahụ na-aka njọ, onye ibe na mmekọrịta nke dị gị mkpa pụrụ ifunahụ gị. Ị pụrụ inwe mwute n’ihi otú ha dịbu.”
Jennifer na-akọwa otú ahụ ike nne ya nọgidere na-adalata si metụta ezinụlọ ya: “O wutere anyị. Mkparịta ụka ya na-ekpo ọkụ funahụrụ anyị. O wutere anyị nke ukwuu.” Gillian na-akọwa, sị: “Achọghị m ka nne m nwụọ, achọghịkwa m ka ọ taa ahụhụ. Ebere m ákwá ọtụtụ ugboro.”
“Enwere M Mmetụta nke Ịbụ Onye A Jụrụ Ajụ, Iwe”
Onye na-enye nlekọta pụrụ iche, sị: ‘N’ihi gịnị ka ihe a ga-eji mee m? Gịnị mere na ndị ọzọ agaghị enye aka? Ọ̀ bụ na ha apụghị ịhụ na ọ na-esiri m ike? Ọ̀ bụ na onye ọrịa apụghị ime ka ihe dịrị m mfe karị?’ Mgbe ụfọdụ, onye ahụ na-enye nlekọta pụrụ iwe nnọọ iwe banyere ihe ndị yiri ọchịchọ na-arị elu na nke na-ezighị ezi nke onye ọrịa ahụ na ndị òtù ezinụlọ ndị ọzọ na-achọ n’aka ya. Rose, onye a kpọtụrụ aha n’okwu mmeghe, na-asị: “M na-eweso onwe m iwe ọtụtụ mgbe karị—n’obi m. Ma mama m na-asị na ọ na-apụta ìhè n’ihu.”
Onye na-enye nlekọta ahụ pụrụ ịnagide akụkụ ka ukwuu nke obi nkoropụ na iwe nke onye ọrịa ahụ. N’akwụkwọ bụ́ Living With Cancer, Dr. Ernest Rosenbaum na-akọwa na ụfọdụ ndị ọrịa “pụrụ mgbe ụfọdụ inwe obi iwe na ịda mbà n’obi nke ga-achọ onye kasị nọrọ nso dị ka onye ha ga-awụkwasị ya . . . A na-egosipụtakarị iwe a dị ka ahụ ntakasị n’ụmụ irighiri ihe ndị na-agadịghị enye onye ọrịa ahụ nsogbu n’ọnọdụ nkịtị.” N’ụzọ kwere nghọta, nke a pụrụ ịtụkwasịkwu nrụgide n’obi iwe nke ndị a hụrụ n’anya na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji lekọta onye ọrịa ahụ.
Dị ka ihe atụ, Maria rụrụ ọrụ kwesịrị ịja mma n’ilekọta enyi ya na-anwụ anwụ. Otú ọ dị, n’otu oge, enyi ya yiri ka ọ na-abụ onye a kpasuru iwe ngwa ngwa ma nwee nkwubi okwu ndị na-ezighị ezi. “Ọ ga-ekwu okwu na-afụ ụfụ n’ahụ nakwa àgwà ọjọọ, na-emechu ndị a hụrụ n’anya ihu,” ka Maria na-akọwa. Olee otú nke a si metụta Maria? “N’oge ahụ, ọ na-adị mmadụ ka ọ ‘na-aghọta’ onye ọrịa ahụ. Ma mgbe m chebaara ya echiche ka e mesịrị, enwere m mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ, iwe, ejighị ihe n’aka—n’enweghịkwa ọchịchọ igosi ịhụnanya dị mkpa.”
Otu ihe ọmụmụ e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ The Journals of Gerontology kwubiri, sị: “Iwe nwere ike iru ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu n’ọnọdụ inye nlekọta, na-arụpụta[kwa] mgbe ụfọdụ ime ihe ike n’ezie ma ọ bụ nke e chere n’echiche.” Ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 1 n’ime mmadụ 5 ọ bụla na-enye nlekọta tụrụ egwu na ọ pụrụ ịghọ onye na-eme ihe ike. Ihe karịrị 1 n’ime 20 mesokwara onye ọrịa ya ihe ike n’ezie.”
“Ana M Enwe Obi Amamikpe”
Mmetụta nke obi amamikpe na-eti ọtụtụ ndị na-enye nlekọta ihe otiti. Mgbe ụfọdụ obi amamikpe ahụ na-esochi iwe—ya bụ, ha na-enwe obi amamikpe n’ihi na ha na-ewe iwe mgbe ụfọdụ. Ụdị mmetụta uche ndị ahụ pụrụ ime ka ike gwụ ha ruo n’ókè nke na ha na-eche na ha apụghị ịga n’ihu.
N’ọnọdụ ụfọdụ, e nweghị ihe ọzọ a pụrụ ime ma ọ bụghị ilekọta onye ọrịa ahụ n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa ma ọ bụ n’ụlọ ọgwụ. Nke a pụrụ ịbụ mkpebi na-enye nsogbu n’uche nke pụrụ ibibi mmetụta uche nke onye na-enye nlekọta. “Mgbe e mesịrị manye m ịkpọga mama m n’ebe obibi ndị meworo agadi, ọ dị m ka m na-agbahapụ ya, na-atụfu ya,” ka Jeanne na-ekwu.
Ma e nyere onye ọrịa ahụ àkwà n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ na e nyeghị ya, ndị ọ hụrụ n’anya pụrụ inwe obi amamikpe na ha adịghị emere ya ihe zuru ezu. Elsa kwuru, sị: “O wutere m ọtụtụ mgbe na oge m dị ntakịrị. Mgbe ụfọdụ enyi m agaghị nnọọ ekwe ka m laa.” A pụkwara inwe nchegbu banyere ileghara ibu ọrụ ndị ọzọ nke ezinụlọ anya, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ na-enye nlekọta na-anọte aka n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ na ọ ghaghị ịrụ ọrụ ruo ogologo oge karị iji nye aka kwụọ ụgwọ ndị na-arị elu. “Aghaghị m ịrụ ọrụ iji nye aka ná mmefu ego,” ka otu nne kwara n’arịrị, “ma ana m enwe obi amamikpe n’ihi na apụghị m ịnọ n’ụlọ na-elekọta ụmụ m.”
N’ụzọ doro anya, nkwado dị ndị na-enye nlekọta oké mkpa, karịsịa mgbe onye ahụ e lekọtara nwụsịrị. “Ọrụ m kasị mkpa [mgbe onye ọrịa nwụsịrị] . . . bụ ibelata mmetụta nke obi amamikpe n’ime onye na-enye nlekọta, bụ́ nke a na-adịghị ekwupụtakarị,” ka Dr. Fredrick Sherman, nke Huntington, New York na-ekwu.
Ọ bụrụ na mmetụta ndị a anọgide bụrụ nke a na-ekwupụtaghị, ha pụrụ ịbụ nke na-ebibi ihe nye ma onye ahụ na-enye nlekọta ma onye ọrịa ahụ. Gịnịzi ka ndị na-enye nlekọta pụrụ ime iji nagide mmetụta ndị a? Gịnịkwa ka ndị ọzọ—ndị òtù ezinụlọ na ndị enyi—pụrụ ime iji nyere ha aka?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.
[Igbe dị na peeji nke 4]
Ejila Ha Gwurie Egwu!
“ANYỊ maara na 80% nke nlekọta a na-enye ndị agadi n’ebe obibi bụ ụmụ nwanyị na-enye ya,” ka Myrna I. Lewis na-ekwu, bụ́ osote prọfesọ ná ngalaba ahụ ike ógbè na Mount Sinai Medical School, New York.
Otu nnyocha e mere ụmụ nwanyị na-enye nlekọta, nke e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ The Journals of Gerontology,b gosiri na 61 pasent n’ime ụmụ nwanyị ahụ kọrọ na ha enwetaghị enyemaka ọ bụla site n’aka ezinụlọ ma ọ bụ ndị enyi. Ihe gafekwara ọkara (57.6 pasent) kwuru na ha enwetaghị nkwado mmetụta uche zuru ezu site n’aka ndị di ha. N’akwụkwọ bụ́ Children With Cancer, Jeanne Munn Bracken na-akọwapụta na ọ bụ ezie na nne pụrụ ịdị na-ebu ibu arọ dị ukwuu nke inye nlekọta ahụ, “nna pụrụ nnọọ ịdị na-emikpu n’ọrụ ya.”
Otú ọ dị, e nwere ókè dị ukwuu nke inye nlekọta nke ụmụ nwoke na-eme, ka Dr. Lewis na-ekwu. Dị ka ihe atụ, ndị bụ́ di nwunye ha na-arịa Alzheimer’s disease bụ ìgwè butụrụ nnọọ ibu. A gụpụghịkwa ha n’ezie ná nrụgide nile nke ilekọta onye a hụrụ n’anya na-arịa ọrịa. “Ikekwe ụmụ nwoke a bụ ndị ọ na-emetụtakarịsị,” ka Lewis gara n’ihu ikwu, “n’ihi na ha na-atọkarị ndị nwunye ha, nweekwa ike ịbụ ndị ahụ na-adịghị n’onwe ha. . . . E nyeghị ihe ka ọtụtụ n’ime ha ọzụzụ banyere akụkụ dị iche iche bara uru nke inye nlekọta.”
Ọ dị ezinụlọ dị iche iche mkpa ịnọ na nche megide omume nke ibo otu onye òtù nke o yiri ka ọ na-anagide ihe ịma aka ahụ nke ọma ibu arọ. “Ọtụtụ mgbe ọ na-abụ otu onye òtù ezinụlọ kpọmkwem na-aghọ onye nlekọta, mgbe ụfọdụ ọtụtụ ugboro,” ka akwụkwọ bụ́ Care for the Carer na-ekwu. “Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ime ndị a bụ ụmụ nwanyị ndị malitewororị ime okenye karị n’onwe ha. . . . A na-elekarịkwa ụmụ nwanyị anya dị ka ndị nlekọta ‘site n’ọmụmụ’ . . . , ma ezinụlọ dị iche iche na ndị enyi ekwesịghị iji nke a gwurie egwu mgbe ọ bụla.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
b A kọwara nkà mmụta ime agadi dị ka “ngalaba ihe ọmụmụ metụtara ịka nká na nsogbu nke ndị agadi.”
[Foto dị na peeji nke 6]
Nkwado dị ndị na-enye nlekọta mkpa n’ịnagide mmetụta obi amamikpe na iwe