Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 5/8 p. 26-27
  • Anyị Bụ Ndị Enyi A Na-apụghị Ikewa Ekewa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Bụ Ndị Enyi A Na-apụghị Ikewa Ekewa
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekpuru M Ìsì, ma Na-ahụ Ụzọ
  • A Họtara Ya Maka Ọzụzụ Pụrụ Iche
  • Ihe Tracy Na-arụrụ M
  • Mkpa Maka Nghọta
  • Gịnị Mere M Ga-eji Na-eme Ihe Baịbụl Kwuru?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Otú M Si Anagide Ịsụ Nsụ
    Teta!—1998
  • Gịnị Mere M Kwesịrị Iji Na-ebi Ndụ Otú Baịbụl Kwuru Ka A Na-ebi?
    Teta!—2008
  • Enwetara M ‘Ihe Obi M Na-arịọ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 5/8 p. 26-27

Anyị Bụ Ndị Enyi A Na-apụghị Ikewa Ekewa

TRACY bụ nkịta nduzi m, Labrador retriever ojii dị afọ iri. N’ihi ya apụrụ m ịgagharị nnọọ otú kwesịrị ekwesị. Ọ na-anọnyekwara m, na-enyekwa m nkasi obi. Ya mere ihe ijuanya adịghị ya na abịawo m hụ ya n’anya nke ukwuu, na anyị bụkwa ndị enyi a na-apụghị ikewa ekewa.

Mgbe ụfọdụ, n’amaghị ụma, ndị mmadụ na-ada ada n’ụzọ Tracy na-adịghị ada ma ọlị. Otu ụbọchị, dị ka ihe atụ, ahapụrụ m Tracy n’ụlọ ma soro otu enyi m na-aga ije. Anyị ji obi ụtọ na-ekwurịta okwu ruo mgbe m dara n’ala na mberede. Enyi m echefuwo na m kpuru ìsì, ọ dọghịkwa m aka ná ntị banyere ọnụ gota ahụ. Ihe a agaraghị eme ma Tracy nọrọ m n’akụkụ.

Otu oge, Tracy zọpụtara ndụ m n’ezie. Anọ m na-agbada n’otu okporo ámá mgbe otu gwongworo na mberede malitere iche ihu n’enweghị nchịkwa n’ebe m nọ. Anụrụ m ụda injin ya ma, n’ezie, apụghị m ịhụ ebe o chere ihu. Tracy hụrụ ma ghọta ihe ize ndụ ahụ wee dọpụta m ozugbo.

Ekpuru M Ìsì, ma Na-ahụ Ụzọ

A mụrụ m na 1944 ná ndịda Sweden, abụwokwa m onye ìsì eri mgbe a mụrụ m. E zijere m n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi maka ụmụaka kpuru ìsì, ebe m mụtara ịgụ na ide mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì. Egwú ghọrọ akụkụ dị mkpa nke ndụ m, karịsịa ịpị ngwa egwú piano. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu, agara m n’ihu na-amụ asụsụ dị iche iche na egwú na Mahadum Göteborg.

Otú ọ dị, ndụ m nwere mgbanwe ga-adị ebighị ebi mgbe Ndịàmà Jehova abụọ kpọtụrụ n’ọnụ ụzọ m n’ogige mahadum. N’oge na-adịghị anya amalitere m ije nzukọ Ndịàmà ahụ, ọbụnakwa malite isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe m na-amụta. Na 1977, egosipụtara m nrara m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri. Ọ bụ ezie na m kpuru ìsì n’ụzọ nkịtị, site n’ọmụmụ ihe nke Okwu Chineke, anatawo m ihe ka baa uru—ọhụhụ ụzọ ime mmụọ.

Taa ana m agụ onwe m n’onye ka nnọọ ndị pụrụ ịhụ ụzọ n’ụzọ nkịtị ma kpuo ìsì n’ụzọ ime mmụọ mma. (Tụlee Jọn 9:39-41.) Enwere m oké obi ụtọ inwe ọhụhụ ụzọ dị mma nke uche nke ụwa ọhụrụ Chineke ebe, dị ka nkwa ya si dị, anya ndị kpuru ìsì ga-ahụ ụzọ—ee, ebe a ga-agwọ nrịanrịa anụ ahụ nile na ọbụna ebe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ!—Abụ Ọma 146:8; Aịsaịa 35:5, 6; Ọrụ 24:15.

Ọ bụ ezie na alụghị m di ma kpuo ìsì n’ụzọ nkịtị, n’inwe Tracy dị ka onye ibe m na-eguzosi ike n’ihe, ana m ebi ndụ otú dị nnọọ mma. Ka m kọwaa otú o si na-enyere m aka ịrụ ọrụ ego m na ije ozi m dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova. (Matiu 24:14; Ọrụ 20:20; Ndị Hibru 10:25) Ma ka m buru ụzọ kwutụkwuo okwu banyere Tracy n’onwe ya.

A Họtara Ya Maka Ọzụzụ Pụrụ Iche

Mgbe Tracy dị nanị ọnwa asatọ, e lere ya ule ịmara ma ọ ga-eru eru dị ka nkịta nduzi. O gosiri na ya dị nwayọọ, dị mfe ịkụziri ihe, ọ dịghịkwa adị mfe mkpọtụ mberede ndị dara ụda imenye ya ụjọ. Ya mere, ebe ọzọ e dotara ya bụ n’otu ezinụlọ ruo oge ụfọdụ ịmụta ihe ndụ nkịtị n’ezinụlọ dị ka ya. Ka nke a gasịrị, mgbe o toruru, e zijere ya n’ụlọ akwụkwọ ọzụzụ maka nkịta nduzi.

N’ụlọ akwụkwọ a Tracy mụtara ime ihe a chọrọ n’aka nkịta nduzi, bụ́ inyere onye ga-abụ onye nwe ya n’ọdịnihu aka ịchọta ọnụ ụzọ, stepụ, ọnụ ụzọ ámá, na okporo ụzọ. Ọ mụtakwara otú e si aga ije n’ebe ndị ụkwụ na-aga na-ekwo ekwo na otú e si agafe okporo ámá. A kụzikwaara ya ịkwụsị n’ọnụ gota, irubere ihe mgbaàmà okporo ụzọ isi, na isi n’ihe mgbochi ndị dị ize ndụ pụọ. Mgbe ihe dị ka ọnwa ise nke inye ọzụzụ gasịrị, ọ dịrị njikere maka ọrụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka e mere ka Tracy mata m.

Ihe Tracy Na-arụrụ M

Kwa ụtụtụ Tracy na-akpọte m n’ụra ka m nwee ike inye ya nri. E mesịa anyị ejikere maka ọrụ. Ụlọ ọrụ m dị ihe dị ka iji ụkwụ jee minit 20 site n’ụlọ anyị. N’ezie, amaara m ụzọ, ma ọrụ Tracy bụ inyere m aka ijeru ebe ahụ n’akpọghị ụkwụ n’ụgbọala, ndị mmadụ, poolu ọkụ, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla. Mgbe anyị rutere, ọ na-edinara n’okpuru table m. Mgbe ahụ, n’oge nri ehihie m, anyị na-ejekarị ime mkpagharị.

Na mgbede, mgbe anyị si ọrụ lọrutesịa n’ụlọ, akụkụ kasị mma nke ụbọchị anyị na-amalite. Ọ bụ n’oge a ka Tracy na-edu m apụ n’ọrụ ime nkwusa ụlọ n’ụlọ na n’ebe obibi ebe ndị m na-eduzi ọmụmụ Bible. Ọtụtụ ndị na-emeso ya omume enyi, na-adịda ya aka ma na-amakụ ya na mgbe ụfọdụ na-enye m iberibe nri dị mma maka ya. Anyị na-ejekwa nzukọ ndị Kraịst kwa izu. Mgbe a gbasara ọ na-adị ụmụaka mma ikele na ịmakụ Tracy, bụ́ nke na-atọ ya ụtọ nke ukwuu.

Amatara m na Tracy bụ nanị nkịta nakwa na ọ ga-anwụ otu ụbọchị. Nke ahụ na-apụta na m aghaghị imesị nweta nkịta nduzi ọzọ. Ma, ka ọ dị ugbu a, anyị bụ ndị e jikọrọ ọnụ, anyị dịrịtakwa ibe anyị mkpa. Mgbe Tracy na-anọghị nso, anaghị m akpa onwe n’aka, ụjọ na-atụkwa ya, ahụ adịghịkwa eru ya ala mgbe ọ na-apụghị iduzi m.

Mkpa Maka Nghọta

N’ụzọ na-eju anya, mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-agbalị ikewa anyị. Ha na-ele Tracy anya dị ka nkịta ma ọ bụ anụ e ji mere enyi nkịtị, ha adịghị aghọta mmekọrịta anyị miri emi. Ọ dị ndị a mkpa ịghọta na Tracy bụụrụ m ihe oche nkwagharị bụụrụ onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ikewapụ anyị dị ka iwepụ anya m abụọ.

Ka ndị ọzọ na-aghọta mmekọrịta dị n’etiti mụ na Tracy nke ọma karị, otú ahụ ka nsogbu ga-esi dịkwuo ole na ole. Dị ka ihe atụ, a na-anakwere oche nkwagharị ngwa ngwa ma, ọ dị mwute na ọ naghị adị otú ahụ mgbe nile ná nkịta nduzi. Ndị ụfọdụ na-atụ nkịta egwu, ma ọ bụ ha enwetụdịghị mmasị na ha.

Ihe a hụrụ n’ime otu broshụọ banyere nkịta nduzi, nke Òtù Na-ahụ Maka Ndị Nwere Nkwarụ Anya na Sweden bipụtara, na-enye ezigbo aka. Ọ na-asị: “Nkịta nduzi bụ ihe enyemaka na-eme njegharị maka onye nwere nkwarụ anya. Ee, karịa nke ahụ. Ọ bụ ihe enyemaka dị ndụ. . . . Ọ bụ enyi na-agaghị eweda gị ala ma ọlị.”

N’ezie, Tracy na-arụ ọrụ dị ka anya m n’ọchịchịrị, ọ na-enyekwara m aka ibi ndụ kwesịrị ekwesị pụrụ ikwe omume ugbu a. Ma, ekwenyesiri m ike na n’oge na-adịghị anya, n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, aga m enwe ike ịhụ ihe ijuanya nile dị ebube nke ihe e kere eke. N’ihi ya, ekpebisiri m ike ugbu a ịnọgide n’ọhụhụ ụzọ ime mmụọ m.

Ya mere, ka Tracy tụkwasịrị isi n’apata m, anyị adịwo njikere ugbu a igere tepu nke mbipụta kasị ọhụrụ nke magazin Ụlọ Nche.—Dị ka Anne-Marie Evaldsson si kọọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya