Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 12-15
  • Gịnị Meworo Ntụrụndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Meworo Ntụrụndụ?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa Maka Nlezianya
  • Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’
    Teta!—2006
  • Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Echiche Dị Mma
    Teta!—1999
  • Olee Fim Ị Ga-ekiri?
    Teta!—2005
  • Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 6/8 p. 12-15

Gịnị Meworo Ntụrụndụ?

OLEE otú ndị Rom oge ochie, bụ́ ndị e chere na ha nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ọdịbendị ha, pụrụ isi lee oké ihe mgbu nke mmadụ ibe ha anya dị ka ntụrụndụ? “A pụrụ ịkọwa ya nanị site n’oké ọchịchọ maka ihe mkpali ndị ọhụrụ na ndị siri ike karị,” ka Gerhard Uhlhorn na-ede n’akwụkwọ bụ́ The Conflict of Christianity With Heathenism. “N’ịbụ ndị mkpori ndụ nile a pụrụ inweta juru afọ, ndị mmadụ chọrọ . . . ihe ụtọ ha na-adịkwaghị achọta n’ebe ọ bụla ọzọ.”

Ọtụtụ ndị mmadụ taa na-egosipụta “oké ọchịchọ maka ihe mkpali ndị ọhụrụ na ndị siri ike karị” yiri nke ahụ. N’ezie, o nwere ike ha agaghị ezukọ iji kirie oké mgbupịa ma ọ bụ enweghị nchịkwa n’omume nke na-ewere ọnọdụ n’ezie. Ma ụdị ntụrụndụ na-amasị ha na-egosi ihe iri isi yiri nke ahụ n’ebe ime ihe ike na mmekọahụ dị. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ihe Nkiri Sịnịma. N’afọ ndị na-adịbeghị anya ndị na-eme ihe nkiri egosipụtawo “mmasị ka ukwuu maka ihe rụrụ arụ,” ka onye na-akatọ ihe nkiri sịnịma bụ́ Michael Medved kwuru. “Ozi dị n’azụmahịa ihe nkiri sịnịma,” ka o kwukwasịrị, “yiri ka ọ bụ na ngosipụta nke obi ọjọọ na ara ọgbụgba kwesịrị ichebara echiche, ịkwanyere ùgwù ozugbo, karịa mgbalị ọ bụla igosipụta ihe kwesịrị otuto ma ọ bụ ịdị mma.”

Iji telivishọn asọ mpi amanyewo ndị na-eme ihe nkiri ịgaru n’ihe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọ bụla iji rata ndị mmadụ n’ụlọ sịnịma. “Anyị chọrọ ihe nkiri ndị na-enwe mmetụta n’ahụ, ndị na-awụ akpata oyi, ndị dị iche pụọ n’ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-ekiri na TV,” ka onye isi oche nke otu ebe a na-eme ihe nkiri sịnịma kwuru. “Ọ bụghị dị ka a ga-asị na ihe anyị dị mma ya bụ igosi nkwafu ọbara na asụsụ [rere ure], ma nke ahụ bụ ihe dị gị mkpa taa iji wepụta otu ihe nkiri.” N’ezie, ọbụna ime ihe ike sịnịma nke kasị pụta ìhè adịkwaghị awụ ọtụtụ ndị ibobo n’ahụ. “Ndị mmadụ na-aghọ ndị ọ na-adịghị emetụta,” ka onye nduzi ihe nkiri bụ́ Alan J. Pakula na-ekwu. “Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ amụbawo okpukpu anọ, ike mgbawapụ na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu, ọ dịghị emetụtakwa ha ma ọlị. Ha azụlitewo enweghị afọ ojuju maka ihe mkpali obi ọjọọ.”

Telivishọn. Ngosi nke mmekọahụ na TV n’ezoghị ihe ọ bụla bụ ihe a na-ahụkarị ugbu a n’ọtụtụ akụkụ ụwa, gụnyere Brazil, Europe, na Japan. Onye nkịtị na-ekiri TV n’America na-ezute ihe dị ka izo aka 14,000 nke mmekọahụ n’otu afọ. “Ịrị elu n’isiokwu na ngosi pụtara ìhè nke mmekọahụ adịghị egosi ihe ịrịba ama nke nkwụsị,” ka otu òtù na-eme nnyocha na-akọ. “Isiokwu ndị a na-asọbu nsọ dị ka idina onye ikwu, inweta ihe ụtọ ná mmerụ ahụ, na ndina anụmanụ aghọwo ihe na-amịtara TV oge uhuruchi ego.”

Dị ka akwụkwọ bụ́ Watching America si kwuo, e nwere ihe kpatara ara ime ihe masịrị onye nke telivishọn. Ọ na-ekwu, sị: “Mmekọahụ na-aga ahịa. . . . Ka usoro mgbasa ozi na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ha chọpụtara na ha na-akpali mmasị ọtụtụ ndị na-ekiri ha karịa ka ha na-akpasu ha iwe, ha ejiriwo nwayọọ nwayọọ mụbaa nrepụ nke ngwá ahịa ha site n’ikwe ka e mebikwuo ọtụtụ nsọ ala n’ụdị pụtara ìhè karịa mgbe ọ bụla.”

Egwuregwu Vidio. Ọgbọ Pac-Man na Donkey Kong ndị yitụrụ ka aka ha ọ dị ọcha enyewo ohere maka ọgbọ ọhụrụ nke egwuregwu obi ọjọọ ndị na-atụ ụjọ. Prọfesọ Marsha Kinder na-akọwa egwuregwu ndị a dị ka “nke ka TV ma ọ bụ ihe nkiri sịnịma njọ.” Ha na-ezi “ozi bụ na nanị ụzọ isi nweta ikike bụ site n’ime ihe ike.”

N’ihi nchegbu ọha na eze, otu ụlọ ọrụ kasị emepụta ihe na United States na-ejizi usoro nkọwa eme ihe n’egwuregwu vidio ya. Ihe mmapanye bụ́ “MA-17”—na-egosi na egwuregwu ahụ “tozuru okè” ekwesịghị ekwesị maka ndị na-erubeghị afọ 17—pụrụ ịgụnye ime ihe ike ndị siri ike, isiokwu mmekọahụ, na okwu rere ure. Otú ọ dị, ụfọdụ na-atụ egwu na nke a kọwara dị ka nke “tozuru okè” ga-etinye nnọọ ihe ná ndọrọ nke egwuregwu ahụ. “Ọ bụrụ na m dị afọ 15 ma hụ ihe mmapanye e dere MA-17,” ka otu onye na-eto eto na-enwe mmasị n’egwuregwu na-ekwu, “m ga-enweta egwuregwu ahụ n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ ga-ewe.”

Egwú. Otu magazin nke na-enyocha ihe dị n’ime egwú ndị na-ewu ewu na-ekwu na ná ngwụsị nke 1995, nanị 10 n’ime rekọd 40 welitere isi bụ ndị na-enweghị okwu rere ure ma ọ bụ izo aka n’ọgwụ ọjọọ, ime ihe ike, ma ọ bụ mmekọahụ. “Egwú nke ndị na-erubeghị oge uto pụrụ inweta na-awụ ibobo n’ahụ, ọtụtụ n’ime ha bụ nnọọ nnupụisi megide ụkpụrụ,” ka akwụkwọ bụ́ St. Louis Post-Dispatch na-akọ. “[Egwú] nke na-adọrọ mmasị nke ụfọdụ ndị nọ n’oge uto bụ nke jupụtara n’iwe na enweghị olileanya, na-akụnyekwa mmetụta bụ́ na ụwa na onye ahụ na-egere ya na-echere mbibi.”

Egwú death metal, egwú “grunge” rock, na egwú “gangsta” rap yiri ka ha na-ejupụta n’ime ihe ike. Dịkwa ka akwụkwọ akụkọ bụ́ San Francisco Chronicle si kọọ, “ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ mmepụta ntụrụndụ na-ekwu na ìgwè ndị kasị atụ ụjọ ka ga-apụta ìhè.” Ukwe iwe na ọnwụ abụrụwo ihe na-ewu ewu ugbu a n’Australia, Europe, na Japan. N’eziokwu, ụfọdụ ndị òtù egwú agbalịwo ịhọrọ ozi katụ nro. Ka o sina dị, ka Chronicle ahụ na-ekwu, sị: “Ihe àmà na-egosi na egwú dị ọcha adịghị agakebe ahịa.”

Kọmputa. Ndị a bụ ngwá ọrụ ndị bara uru nke nwere ọtụtụ ihe dị mma e ji ya eme. Otú ọ dị, ụfọdụ ejiriwokwa ya mee ihe ikesa ihe ndị jọrọ njọ. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Maclean’s na-akọ na nke a na-agụnye “ihe osise na ihe odide banyere ihe ọ bụla site n’ihe oyiyi na-atụkarị ụjọ gaa n’ịgba akwụna gaa n’idina ụmụaka—ihe nke ga-eme ka ọtụtụ ndị toworo ogo mmadụ kụja, ma ya fọdụzie ụmụ ha.”

Akwụkwọ Ọgụgụ. Ọtụtụ akwụkwọ na-ewu ewu jupụtara ná mmekọahụ na ime ihe ike. Otu omume ọgbara ọhụrụ dị na United States na Canada bụ ihe a kpọworo “akụkọ e chepụtara echepụta na-awụ ibobo n’ahụ”—akụkọ ọjọọ na-eyi egwu nke na-elekwasị anya ná ndị ntorobịa dị ihe dị ka afọ asatọ. Diana West, ka ọ na-ede ihe na magazin bụ́ New York Teacher, na-azọrọ na akwụkwọ ndị a “na-ewepụ ikike inwe mmetụta nke ndị na-eto eto, na-akwụsị uto ndụ nke uche tupu ọ maliterị.”

Ọtụtụ akwụkwọ na-atọ ọchị e bipụtara na Hong Kong, Japan, na United States nwere “isiokwu agha ndị kpụ ọkụ n’ọnụ na obi ọjọọ, iri anụ mmadụ, ibepụ mmadụ isi, ofufe Setan, ndina n’ike, na okwu rere ure,” ka otu ihe ọmụmụ nke Njikọ Mba Na-ahụ Maka Ime Ihe Ike Telivishọn (NCTV) na-akọ. “Ịdị ike nke ime ihe ike na ihe metụtara mmekọahụ na-emerụ emerụ na magazin ndị a na-awụ ibobo n’ahụ,” ka Dr. Thomas Radecki, bụ́ onye nduzi ime nnyocha nke NCTV kwuru. “Ọ na-egosi ókè anyị kweworo ka anyị ghọọ ndị na-enweghị ike inwe mmetụta.”

Mkpa Maka Nlezianya

N’ụzọ doro anya, n’ụwa taa, e nwere ihe na-akpali akpali n’ebe mmekọahụ na ime ihe ike dị, ọ na-apụtakwa ìhè n’ụlọ ọrụ ntụrụndụ. Ọnọdụ ahụ yiri nke ahụ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kọwara: “Ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.” (Ndị Efesọs 4:19) Ọtụtụ ndị taa nwere ezi ihe mere ha ga-eji chọọ ihe ka mma. Ị̀ na-achọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-amasị gị ịmara na ị pụrụ ịchọta ntụrụndụ dị mma, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]

Telivishọn Pụrụ Ịbụ Ihe Ize Ndụ

TELIVISHỌN pụtara nke mbụ ya n’ihu ọha na United States ná mkpọsa ngwá ahịa ụwa nke 1939 na New York. Otu onye odeakụkọ nọ ebe ahụ kwupụtara obi abụọ ya banyere ọdịnihu nke ngwá ọrụ ọhụrụ a. “Nsogbu dị na telivishọn,” ka o dere, “bụ na ndị mmadụ aghaghị ịnọdụ ala ma gwunye anya ha n’ihu ya; ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ ndị America enweghị oge maka ya.”

Lee ka o si hie ụzọ! N’ezie, e kwuwo na mgbe ihe ka ọtụtụ ná ndị America na-agụchaala akwụkwọ, ha ga-etinyeworị 50 pasent nke oge karị n’ihu TV karịa n’ihu onye nkụzi. “Ụmụaka ndị na-ekiri telivishọn nke ukwuu na-ewe iwe karị, na-abụ ndị na-enweghị nchekwube karị, na-ebu ibu karị, na-enwe ikike nchepụta ihe dị ala karị, ọmịiko dị ala karị, na-abụ ụmụ akwụkwọ na-adịghị eme nke ọma karịa ndị ibe ha na-adịghị ekiri nke ukwuu,” ka Dr. Madeline Levine kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Viewing Violence.

Gịnị bụ ndụmọdụ ya? “Ọ dị mkpa ịkụziri ụmụaka na telivishọn, dịkwa ka ngwá ndị ọzọ dị n’ụlọ, nwere kpọmkwem ihe ọ na-arụ. Anyị adịghị ahapụ ịgbanyụ ígwè e ji edozi isi mgbe agịrị isi anyị kọsịworo, ma ọ bụ hapụ ọkụ ka ọ na-enwufu mgbe nri ghesịrị. Anyị na-aghọta ihe pụtara ìhè e ji ngwá ndị a eme, marakwa mgbe a ga-agbanyụ ha. Ọ dị mkpa izi ụmụ anyị otu ihe ahụ banyere telivishọn.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 13]

Ntụrụndụ Gbaa Ụwa Gburugburu

Teta! gwara ndị nta akụkọ ya sitere n’akụkụ dị iche iche nke ụwa ka ha kọwaa omume ndị e nwere banyere ntụrụndụ n’ógbè ha. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha kwuru.

Brazil: “Usoro ihe omume TV aghọwo ihe na-emerụ emerụ karị. Ma, ebe ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-arụ ọrụ n’èzí, a na-ahapụkarị ụmụaka iji TV tụrụ ndụ. CD-ROM ndị nwere isiokwu metụtara anwansi na egwuregwu vidio nke na-egosi ime ihe ike n’ụzọ pụtara ìhè bụ ihe na-ewu ewu.”

Czech Republic: “Eri ọdịda nke ọchịchị Kọmunist, ntụrụndụ a na-ahụtụbeghị n’ebe a mbụ ejupụtawo ná mba a, gụnyere usoro ihe omume TV sitere n’ebe Ọdịda Anyanwụ na ụlọ ahịa na-ere ihe ndị na-akpali mmekọahụ. Ndị na-eto eto na-ejekarị disko, ebe a na-eme egwuregwu billiard, na ụlọ mmanya. Oké mkpọsa na nrụgide ndị ọgbọ na-enwekarị mmetụta siri ike n’ahụ ha.”

Germany: “N’ụzọ dị mwute, ike na-agwụbiga nnọọ ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ ókè ịhaziri ụmụ ha ntụrụndụ, n’ihi ya ndị ntorobịa ahụ na-elegakarị anya n’ebe ibe ha nọ iji kporie ndụ. Ụfọdụ na-eji egwuregwu kọmputa kewapụ onwe ha iche. Ndị ọzọ na-aga nnọkọ ịgba egwú abalị nile a na-akpọ rave, ebe ọgwụ ọjọọ na-ejupụta.”

Japan: “Akwụkwọ na-atọ ọchị bụ ihe na-amasị ndị ntorobịa na ndị meworo okenye iji gbuo oge, ma ndị a na-ejupụtakarị n’ime ihe ike, omume rụrụ arụ, na asụsụ ọjọọ. Ịgba chaa chaa dịkwa ebe nile. Omume ọzọ na-enye nsogbu bụ na ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-eto eto na-akpọ òtù telifon ndị e mere mkpọsa ha nke ọma bụ́ ndị na-emeju agụụ nke ndị ikom nwere nzube nke omume rụrụ arụ. Ụfọdụ na-akpọ òkù ahụ nanị maka mkpori ndụ, ebe ndị ọzọ na-aga ruo n’ókè nke iyi oge a na-akwụ ụgwọ ya, nke na-eduga mgbe ụfọdụ n’ịgba akwụna.”

Nigeria: “Ebe a na-ekiri vidio a na-achịkwaghị achịkwa na-agbasa n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Mkpọmkpọ ụlọ ndị a na-eghe oghe nye ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla, gụnyere ụmụaka. Vidio na-akpali mmekọahụ na ndị na-eyi egwu bụ ihe a na-egosi mgbe nile. Ọzọkwa, ihe nkiri ndị e mere n’obodo ahụ ndị a na-enweta na TV na-egosikarị mgbaasị.”

South Africa: “Rave na-enwe ihe ịga nke ọma n’ebe a, a na-enwetakarịkwa ọgwụ ọjọọ n’ụzọ dị mfe n’ebe ndị a.”

Sweden: “Ụlọ mmanya na ụlọ nkwari abalị na-eme nke ọma na Sweden, ọtụtụ mgbekwa ndị omekome na ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-enubaju n’ebe ndị dị otú ahụ. Ntụrụndụ telivishọn na vidio jupụtara n’ime ihe ike, mgbaasị, na omume rụrụ arụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya