Bịa Nụrụ Okwu Ihu Ọha Ahụ—“Okwukwe na Ọdịnihu Gị”
À pụrụ ịmata ọdịnihu gị n’ezie? È nwere ihe ị pụrụ ime iji mata ihe ọ ga-abụ?
Okwu ihu ọha ahụ, akụkụ dị mkpa nke Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova, ga-egosi ihe mere e ji nwee ezi olileanya maka ọdịnihu na-egbuke egbuke. Ị pụrụ igere okwu ahụ n’ebe a ga-enwe mgbakọ nke dị nso n’ebe obibi gị, ebe ọ bụ na malite n’ọnwa a a ga-ekwu ya ná mgbakọ dị iche iche na Nigeria dum.
Kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ma ọ bụ detara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ maka ebe a ga-enwe mgbakọ ahụ nke kasị dị gị nso. Mbipụta Teta! nke June 8 depụtara ebe nile a ga-enwe mgbakọ na Nigeria.