Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 7/8 p. 27-30
  • Ná Ntị Nwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ná Ntị Nwa Ọhụrụ
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agụụ Okpukpe
  • Alụmdi na Nwunye na Ezinụlọ
  • Ịhapụ Chọọchị Ahụ
  • Ịmụta Eziokwu Bible
  • Mmegide Ezinụlọ
  • Nzute A Ga-echeta
  • Gbaa Mbọ Ka Gị na Onye Na-anụ Ekpere Bụrụ Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Jehova, Ị Chọta M!”
    Teta!—2004
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ugbu A Amatala M Chineke M Na-efe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 7/8 p. 27-30

Ná Ntị Nwa Ọhụrụ

OTU ụbọchị, mgbe m bụ nwatakịrị nwanyị, otu nwa amadị bịara n’ụlọ anyị na Coeburn, Virginia, U.S.A., ka ọ nọkwa na-agwa nna m okwu, onye ya na ya so gwara mụ okwu iji dọrọ mmasị m. Okwu ya sere onyinyo nke ụwa paradaịs, ebe m ga-enwe ike isoro anụ ọhịa nke na-agaghị emerụ m ahụ gwurie egwu. (Aịsaịa 11:6-9) Ọ kọwara na mụ agaghịdị anwụ anwụ kama na m pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi kpọmkwem n’elu ala ebe a. Ọdịnihu ahụ dara m ka ihe magburu onwe ya! Ihe nwoke ahụ kwuru banyere ibi n’elu ala nwere oké mmetụta n’ahụ m.—Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:3, 4.

Agụụ Okpukpe

Ndị mụrụ m, bụ́ ndị nwere ọtụtụ nsogbu alụmdi na nwunye, gbaa alụkwaghịm n’afọ ole na ole n’ihu, mụ na mama m bikwara. O nweghị mmasị ọ bụla n’okpukpe. Ya mere m na-aga Sunday school nanị m na chọọchị ọ bụla nke dị nso n’ụlọ anyị ebe a pụrụ iji ụkwụ gaa. N’oge na-adịghị anya mama m lụgharịrị di, anyị na nna nkuchi m kwagakwara Indiana. Otú ọ dị, n’oge okpomọkụ ọ bụla, m na-alaghachi Virginia ileta nna m.

Papa m ghọrọ onye Mormon n’oge na-adịghị anya ka ịgba alụkwaghịm ahụ gasịrị, ọ nwakwara ịkụnye okpukpe ọhụrụ ya n’obi m. N’oge okpomọkụ nke 1960, mgbe m dị afọ asatọ, o mere m baptism. Ma, mgbe m nọ n’Indiana, agara m chọọchị ọ bụla nke dị nso n’ụlọ anyị. Ha nile na-ezi na ọ bụrụ na anyị bụ ndị ọma, anyị ga-aga eluigwe, ọ bụrụkwa na anyị bụ ndị ọjọọ, anyị ga-aga hel ebe a ga-emekpa anyị ahụ. Ebe m na-echeghị na ọ dị onye ga-aghọta mmetụta m banyere ịchọ ibi n’elu ala kama ibi n’eluigwe, ọ dịghị onye m gwatụrụ banyere ya.

Mgbe m dị afọ 11, papa m kwagara Oregon. O wutere m, oké iwe wekwara m. Nna nkuchi m bụ onye na-ekweghị na Chineke na onye aṅụrụma, o mesiri m ike n’ihi okwukwe m. Ọ kpọrọ m obere Nwaada Nsọ Nsọ, mgbe m malitekwara ibe ákwá, ọ ga-asị: “Gịnị mere ị kpọkughị Chineke gị ka o nyere gị aka?” O yiri ka ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ụlọ nke na-eche banyere Chineke. Ndị ahụ bụ afọ ndị gbara ọchịchịrị, ndị sikwara ike. E metọrọ m n’ụzọ anụ ahụ, n’okwu, na n’ụzọ mmekọahụ. Enwetara m nkasi obi n’ịgwa Chineke okwu n’ihi na ọtụtụ mgbe m na-enwe mmetụta na ọ bụ nanị ya bụ onye na-eche banyere m.

Mama m hapụrụ nna nkuchi m, mmetọ ahụ kwụsịkwara. Ma, anyị dara ogbenye nke ukwuu, o sikwaara mama m ike inweta ihe anyị ga-eri. Mgbe m dị afọ 13, anyị laghachiri Virginia ileta nwanne nne m nke nwanyị. Ọ bụ nwanyị Baptist nwere obiọma, nke nwere obi eziokwu. Ahụrụ m ya n’anya nke ukwuu. Mgbe ọ gwara m ka m soro ya gaa chọọchị ya, m kwetara. Ọbụna mama m soro gaa, m na-echetakwa oké ọṅụ m nwere mụ na ndị ezinụlọ m ịnọ n’ebe ahụ. Ka nleta anyị na-eru ná ngwụsị, ụjọ tụrụ m ịlaghachi ụlọ. Egwu tụrụ m na ọ bụrụ na m laa, m ga-etinye aka n’omume rụrụ arụ. Ya mere arịọrọ m nwanne nne m ka mụ na ya biri, mama m kwetakwara ka m nọrọ.

Nwanne nne m zụtaara m nsụgharị King James nke Bible. Eji m ya eme ọnụ, na-agụtụkwa ya n’abalị ọ bụla. Agụrụ m n’isi ikpeazụ nke Bible na “ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-atụkwasị ihe n’ihe ndị a, Chineke ga-atụkwasịrị ya ihe otiti ndị e dere n’akwụkwọ a.” (Mkpughe 22:18, 19, King James Version) Ya mere echere m, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi kwere na Akwụkwọ Mormon bụ akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ?’ N’ihi ya, ekpebiri m ịghọ onye Baptist.

Ọ bụ ezie na m ji n’aka na o wutere papa m mgbe m degaara ya akwụkwọ ma gwa ya banyere mkpebi m, nanị ihe o kwuru bụ na obi dị ya ụtọ na m na-aga chọọchị. M na-esokarị onye ozi Baptist anyị aga n’ụlọ ndị mmadụ ịkpọ ha òkù ịbịa ná nzukọ ntụte anyị. Echere m na m na-eme uche Chineke site n’ileta ndị mmadụ n’ebe obibi ha na ịgwa ha okwu otú Jisọs mere.

Ma, ọchịchọ m ibi na paradaịs elu ụwa kama ibi n’eluigwe ka dịgidere n’uche m. Ma mgbe ahụ agụrụ m akụkụ Bible na-esonụ, o nyekwara m olileanya: “Rịọnụ, a ga-enyekwa unu; chọọnụ, unu ga-achọtakwa; kụọnụ aka, a ga-emeghekwara unu: n’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta; onye na-achọkwa na-achọta; onye na-akụkwa aka ka a ga-emeghere.”—Matiu 7:7, 8, KJ.

Alụmdi na Nwunye na Ezinụlọ

N’afọ na-esonụ alaghachiri m isoro mama m biri n’Indiana. Mgbe m dị nanị afọ 15, alụrụ m di, dị ime, anọkwa m na bọs na-aga ndịda California. Amaghị m ndị ezinụlọ di m nke ọma, ma achọrọ m ka ha nabata m. Ha bụ ndị Pentikọstal, nwanne di m nke nwanyị gwakwara m banyere onyinye nke ịsụ asụsụ dị iche iche. Ya mere mgbe m soro ha gaa ekpere n’otu abalị, ekpere m ekpere ka e kwe ka m sụọ asụsụ dị iche iche.

Ná mberede, n’ụka ahụ mmetụta m na-amaghị dakwasịrị m. Ahụ malitere ịma m jijiji, amalitekwara m ịtagheri ọnụ n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Onye okwuchukwu ahụ tiri mkpu na mmụọ ahụ na-apụta site n’ime m, ọ malitekwara ịkụtụ m aka n’azụ. Ka e mesịrị, onye ọ bụla makụrụ m ma gwa m otú o si bụrụ ihe magburu onwe ya na Chineke jiri m mee ihe n’ụzọ a. Ma o juru m anya, ụjọ tụkwara m. Amaghị m ihe m kwuworo.

Nwa oge ka e mesịrị, e nwere nsogbu n’oge ime nwa nke mbụ anyị na-eme m. Pastọ chọọchị ahụ gwara di m na Chineke na-amụba ihe mgbu ịmụ nwa m n’ihi na ọ bụghị onye Kraịst. Di m jiri anya mmiri bịakwute m ma kwuo na ọ bụrụ na m chere na ọ ga-enye aka, a ga-eme ya baptism. Agwara m ya na m ji nnọọ n’aka na Chineke adịghị emenye ndị mmadụ ụjọ iji jeere ya ozi.

Ịhapụ Chọọchị Ahụ

Otu Sunday, mgbe okwuchukwu ya gasịrị, pastọ ahụ rịọrọ ọgbakọ ahụ ụtụ. Ọ dị mkpa imezi chọọchị ahụ n’ihi mmebi sitere n’ala ọma jijiji mere n’oge na-adịghị anya. Mgbe e bugharịrị efere ụtụ, atụnyere m ego nile m nwere. Mgbe ọ gụsịrị ego ahụ, pastọ ahụ, kama ikele ọgbakọ ahụ, dụrụ ha ọdụ imepe akpa ha na obi ha n’ihi nzube a kwesịrị ekwesị. Mgbe ahụ o bugharịrị efere ahụ ọzọ. Enwekwaghị m ego ọzọ, ya mere n’oké mmechuihu ebufeere m onye ọzọ efere ahụ ọsọ ọsọ. Pastọ gụrụ ego ahụ ngwa ngwa ọzọ, ọzọkwa n’ekeleghị ha, o kwuru na ozutụghị ezu. “N’eziokwu ọ dịghị onye ga-ala ruo mgbe anyị nwetara ego dị mkpa iji rụọ ọrụ Chineke,” ka o kwuru.

Di m nọ n’èzí na-eche, amakwaara m na ike agwụwala ya. Ọ bụghị nanị ya. Ike gwụrụ m n’ihi enweghị ekele nke pastọ. Ya mere n’ikuru nwa m n’aka, anya mmiri na-erudakwa m n’ihu, esiri m na chọọchị pụọ n’ihu onye ọ bụla. Ekpebiri m mgbe ahụ na ọ dịghị ihe ga-ejikọ mụ na chọọchị ọzọ. Ọ bụ ezie na m kwụsịrị ịga chọọchị, akwụsịghị m ikwere na Chineke. M ka na-agụ Bible m, na-agbalịkwa ịbụ ezigbo nwunye.

Ịmụta Eziokwu Bible

Mgbe a mụsịrị nwa nke abụọ anyị, ndị enyi anyị na-akwaga Texas gwara onye nwe ụlọ ha ikwere inyefe anyị ụlọ ebe ha bi. Ka enyi m bụ́ Pat na-ahapụ, o kwuru na otu nwanyị ji ya ụgwọ na ọ ga-eji ya bịa. Pat gwara m ka m zitere ya ego ahụ na Texas. Ụbọchị ole na ole n’ihu, ụmụ nwanyị abụọ kụrụ aka n’ụzọ. N’iche na ha ji ego ahụ bịa, akpọbatara m ha ngwa ngwa. Akọwaara m ha na Pat akwapụwo ma ọ gwawo m na ha ga-abịa. “Pat mere nke ọma,” ka Charlene Perrin, otu n’ime ụmụ nwanyị ahụ kwuru. “N’ezie anyị nwetara ọṅụ n’ịmụrụ ya ihe.”

“Gịnị?” ka m jụrụ. “Ịmụ ihe? Ọ ghaghị ịbụ na unu hiere ụzọ.” Charlene kọwara na ha na Pat amalitewo ọmụmụ Bible. Mgbe ọ matasịrị na Pat akwapụwo, Charlene jụrụ m ma ọ̀ ga-amasị m ịmụ Bible. “Eenụ,” ka m ji obi ike zaghachi. “M ga-akụziri unu ihe ọ bụla unu chọrọ ịma.” Ọgụgụ Bible m meworo masịrị m, e chekwara m na m pụrụ ịgba ha ume.

Charlene gosiri m akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, anyị gụkwara Abụ Ọma 37:9: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” Akụjara m. Kpọmkwem n’ime Bible m, o kwuru na ndị mmadụ ga-enweta ala. Mgbe nke ahụ gasịrị, ajụrụ m ọtụtụ ajụjụ, ha nile n’otu oge. Charlene mụmụrụ ọnụ ọchị ma sị: “Chere, jiri nwayọọ! Anyị ga-ewere ha otu otu.” Ọ kọwara mkpa nke ọmụmụ Bible chiri anya, nke na-aga n’usoro. Ozugbo, ọ kpọrọ m òkù ịbịa Ụlọ Nzukọ Alaeze, aha ebe Ndịàmà Jehova na-ezukọ.

Akọọrọ m Charlene banyere ahụmahụ mụ na efere ụtụ nakwa na achọghị m ịlaghachi na chọọchị. O sooro m tụlee Matiu 10:8, nke na-asị: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.” Ọ kọwara na a dịghị ebugharị efere ụtụ ná nzukọ Ndịàmà Jehova nakwa na onyinye nile bụ n’afọ ofufo. O kwukwara na e nwere igbe onyinye n’ụlọ nzukọ ahụ nakwa na ndị mmadụ chọrọnụ pụrụ ịtụnye ụtụ n’ime ya. Ekpebiri m ịnwale okpukpe otu ugboro ọzọ.

Ka m na-amụ ihe, amụtara m ihe mere ahụ jiworo na-agbakasị m mgbe m na-asụ asụsụ dị iche iche na chọọchị Pentikọstal. E nyere ndị Kraịst oge mbụ onyinye Chineke nke ịsụ asụsụ dị iche iche iji nye ihe àmà na ha nwere mmụọ nsọ ya. Onyinye ọrụ ebube a mezukwara nzube bara uru nke ime ka ndị sitere n’ala dị iche iche gbakọta na Pentikọst 33 O.A. nweta eziokwu Bible. (Ọrụ 2:5-11) Otú ọ dị, Bible na-ekwu na onyinye Chineke nke ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsị, nke ihe àmà gosiri na ọ kwụsịrị mgbe ndị ozi nwụsịrị. (1 Ndị Kọrint 13:8) Ma iji kpuo uche ndị mmadụ ìsì, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya emewo ka ụfọdụ ndị na-atagheri ọnụ n’ụzọ na-enweghị nkwekọ, n’ụzọ nke meworo ka ọtụtụ ndị kwere na ndị a nwere mmụọ nsọ Chineke.—2 Ndị Kọrint 4:4.

Mmegide Ezinụlọ

N’oge na-adịghị anya, abịara m ghọta nzube Chineke maka ụwa nakwa na agaghị m abụ akụkụ nke ụwa ọjọọ. (Jọn 17:16; 18:36) Amụtakwara m na mụ aghaghị igbubi nkekọ nile nke mụ na Babilọn Ukwu ahụ, nke bụ ihe nnọchianya e ji mee ihe na Bible maka alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 18:2, 4) Mgbe m gwara papa m na a ga-eme m baptism, ugbu a dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, o wutere ya nke ukwuu. Ọ rịọrọ m ka m ghara ịbụ Onyeàmà. Ọ bụ mbụ m hụtụrụ ya ka ọ na-ebe ákwá. Esoro m ya bee ákwá, n’ihi na n’eziokwu achọghị m ime ka iwe wee ya. Ma amaara m na mụ achọtawo eziokwu nakwa na apụghị m ịgbakụta Jehova azụ.

Ezinụlọ m dum megidere mụ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ruo nwa oge akwụsịrị m ịga nzukọ. Nke a belatara mmegide sitere n’aka ndị òtù ezinụlọ, ma ahụsiri m anya. Amaara m na mụ agaghị enwetụ udo ruo mgbe m mewere uche Jehova. Otu ụbọchị n’oge nri ehihie m, agara m n’ụlọ Charlene ma gwa ya na ọ dị m mkpa ka e mee m baptism. “Ì cheghị na ọ dị gị mkpa ibu ụzọ maliteghachi ịbịa nzukọ?” ka ọ jụrụ. Agwara m ya na ekpebisiri m ike ugbu a na ọ dịghị ihe ga-ekewa mụ na Jehova. E mere m baptism na September 19, 1973.

Nke ahụ bụ ihe karịrị afọ 23 ugbu a. Ọ bụ ihe obi ekele na ezinụlọ m amalitewo ịkwanyere mkpebi m ùgwù eri oge ahụ, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha na-arụgide mụ ịhapụ eziokwu ahụ, nke na-amasị m nke ukwuu. Ma, ada m, bụ́ Kim, bụ nanị onye ghọworo Onyeàmà ka ọ dị ugbu a. Ozi iguzosi ike n’ihe ya nye Jehova abụrụwo oké ihe agbamume nye m n’afọ ndị gafeworonụ.

Nzute A Ga-echeta

Na 1990, mgbe m laghachiri Coeburn, Virginia, maka nleta, agwara m mama m ka ọ kwụsị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka m wee hụ oge nzukọ ga-amalite na Sunday. Ka anyị banyere n’ụzọ ahụ e si aba, o kwuru na anyị bibu n’ụlọ dị n’azụ ụlọ nzukọ ahụ, agafee ụzọ ụgbọ okporo ìgwè. Ụlọ ahụ agbaalarị ọkụ, nanị ihe fọdụrụ bụ ebe anwụrụ si akwụpụ nke e ji brik rụọ. “Ị bụ nanị nwatakịrị nwanyị mgbe ahụ,” ka o kwuru, “ị gafeghị afọ atọ ma ọ bụ anọ.”

Na Sunday, e ji ikpo ọkụ nabata m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe mụ na Stafford Jordan kwuru okwu, ekwutatụrụ m na mgbe m bụ nwata, ebiri m n’ụlọ ahụ nke dịbu n’azụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O legidere m anya. “Echetala m gị!” ka o tiri. “Ị bụ nwatakịrị nwanyị ntutu isi ya guzoro otu otu nke há otú a [o jiri aka ya tụọ ya]. Anyị na-arụ ọrụ n’ókèala a mgbe onye mụ na ya so na nna gị na-akparịta ụka. Agbalịrị m ime ka a dọrọ mmasị gị site n’ịgwa gị okwu banyere Paradaịs.”

Amakwaghị m ihe m ga-ekwu. Olu m na-ama jijiji ka m kọọrọ ya banyere ọchịchọ m chọrọ eziokwu Bible. “Mgbe m ka bụ nwa ọhụrụ, ị kụnyere mkpụrụ nke eziokwu n’obere obi m!” Ka m kwuru. Mgbe ahụ ọ gwara m na e nwere nwanne nna m ochie, bụ́ Stephen Dingus, nke bụworo Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi. Ezinụlọ anyị ekwutụbeghị okwu banyere ya, n’ihi na ha enweghị mmasị ma ọlị. “Ọ gaara enwe oké obi ụtọ banyere gị!” ka Nwanna Jordan kwuru.

Ka m na-eleghachi anya azụ n’afọ ndị m nọworo ná nzukọ Jehova, enwere m obi ekele n’ezie maka ịhụnanya na obiọma e gosiworo m. Ee, a ka nwere oge mgbe m nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe ịhụ ezinụlọ dị iche iche ka ha na-ejekọrọ Jehova ozi ọnụ na-eme ka obi dịtụ m ilu, n’ihi na ana m anọkarị nanị m n’ebe ahụ. Ma ngwa ngwa ana m echeta na Jehova nọnyeere m. Ọ na-ekiri m mgbe nile, mgbe obi m nwekwara ike ịnabata eziokwu ahụ e kwunyere ná ntị nke obere nwa ọtụtụ afọ gara aga, o kwere ka o too ma maa ifuru.

“I meela, Nwanna Jordan,” ka m kwuru, “n’ihi iwepụta oge gwa nwatakịrị nwanyị na-eme aghara okwu banyere Paradaịs!”—Dị ka Louise Lawson si kọọ.

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na Stafford Jordan mgbe m zutere ya ọzọ na 1990

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya