“Meghee Nnọọ Anya Gị Hụrụ”
GỊNỊ ka ụmụ gị na-ahụ? Agha? Mpụ? Mmetọ? Ịda ogbenye? Ọrịa? N’eziokwu, ndị a bụ ihe ndị na-eme mgbe nile. Ma ị̀ kụziworo ha ile anya gabiga ihe ndị a gaa n’ọdịnihu dị ebube e kwere nkwa ya na Bible? Nne na nna Joel Pierson dị afọ itoolu emewo nke a. Gịnị si na ya pụta?
Tụlee ihe Joel dere n’isiokwu bụ́ “Meghee Nnọọ Anya Gị Hụrụ.” E nyere isiokwu a dị ka ihe omume ide ihe maka ndị ntorobịa nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’otu ógbè na Virginia, U.S.A. Rịba ama otú edemede Joel, nke e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Central Virginian, August 22, 1996, si kpughee na olileanya ya dabeere n’ihe ọ mụtaworo site n’Okwu Chineke. O dere, sị:
“Meghee nnọọ anya gị hụrụ, ịma mma nile e zubere ka ọ dịrị.
“Ọ́ gaghị abụ ihe dị ebube iteta ụra n’otu ụtụtụ ma nụ na mmetọ adịkwaghị? Kama igbu ọchụ na mpụ ịdị n’akụkọ, udo na obi ụtọ bụ ihe ndị dị ná ndụ ndị mmadụ.
“Ndị agbata obi na-arụkọ ọrụ iji nyere enyi ha aka ịrụ ebe obibi ya. Na gburugburu ya, anyị na-ahụ ndị ọzọ ka ha na-akụ ubi. Ọ bụghị nanị nke a, kamakwa ebumnobi ha ziri ezi. Onye ọ bụla na-etinyekọ aka ọnụ iji nyerịtara onwe ha aka. A gaghị enwe ndị ogbenye ọzọ, a ga-enwekwa nri n’ụba izu onye ọ bụla. A ga-enwe ịdị n’otu na udo gburugburu ụwa. Ọ dịghị onye ga-anọkwa na agụụ ma ọ bụ rịa ọrịa ọzọ. E nwere gburugburu ebe obibi bụ sọ mma maka onye ọ bụla ikiri ma lee, nwatakịrị na-anọkwasị n’elu agụ! Ọ bụghị nanị agụ kamakwa ụmụ anụmanụ nile na ụmụ mmadụ nọ n’udo.
“Aga m achọ ibi n’ebe dị otú a. Ị̀ ga-achọ isoro m biri n’ebe ahụ?”
Chineke ọ̀ na-ekwe nkwa n’ezie maka ngọzi ndị dị ka ndị Joel na-eto eto na-akọwa n’ebe a? N’ezie, ọ na-ekwe! Biko saghee Bible gị ma gụọ banyere nkwa ndị dị otú ahụ dị ka ndị a na-ahụ n’Abụ Ọma 46:8, 9; 67:6; 72:16; Aịsaịa 2:3, 4; 11:6-9; 33:24; 65:17-25; Matiu 6:9, 10; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.