Ichebe Ahụ Ike Ụmụntakịrị
OTU akụkọ na-adịbeghị anya nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNICEF) dere, bụ́ The Progress of Nations, na-egosi ọganihu dị ịrịba ama n’ọnọdụ ahụ ike ụmụntakịrị n’ọtụtụ ala. Site ná mgbalị nke gọọmenti na òtù mba dị iche iche jikọrọ aka na-eme, ọ̀tụ̀tụ̀ ọnwụ nke ụmụntakịrị ndị na-erubeghị afọ ise adalatawo n’ọtụtụ mba. Ka o sina dị, akwụkwọ ahụ bụ́ The Progress of Nations na-egosikwa na kwa afọ, a pụrụ ichebe ndụ ọtụtụ nde ndị na-eto eto ọzọ site n’ụzọ dị mfe na nke na-adịghị oké ọnụ, karịsịa n’obodo ndị na-emepe emepe. Ndị nne na nna nọ ná mba ndị a na n’ebe ọzọ nwere ike hụ aro ndị na-esonụ dị n’akụkọ ahụ dị ka nke na-enye aka.
Inye ara. “Inye nwa ara bụ mmalite kasị kwe omume maka ahụ ike na iri ihe,” ka akụkọ ahụ na-adụ ọdụ. Dị ka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, “a pụrụ ịzọpụta ihe karịrị otu nde ndụ ụmụ ọhụrụ kwa afọ ma ọ bụrụ na e nye ụmụ ọhụrụ nanị ara ruo ihe dị ka ọnwa isii mbụ.” Ebe ọ bụ na ụlọ ọgwụ na ebe ndị a na-amụ nwa na-esetịpụ ihe nlereanya dị irè, òtù UNICEF na WHO na-akwalite “imeso nwa ọhụrụ n’obiọma nke ụlọ ọgwụ.” Ebumnobi ha bụ ịkpali ụlọ ọgwụ dị iche iche inye ndị mụrụ ụmụ ọhụrụ nkwado na ndụmọdụ kwesịrị ekwesị banyere inye nwa ara.
Ịdị ọcha na mmiri dị ọcha. “A pụrụ ibelata nke ukwuu ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọrịa site n’iji mmiri dị ọcha, site n’iji ụlọ mposi eme ihe, site n’ịkwọ aka tupu e bitụ ihe oriri aka, na site n’ịkwado na ichekwa ihe oriri n’ụzọ na-adịghị ize ndụ,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ógbè, a chọrọ mgbalị dị ukwuu iji nweta nke zuru ezu, mmiri dị ọcha dị oké mkpa maka ahụ ike nwatakịrị na ezinụlọ.
Nri. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, ịgbakwụnye vitamin A pụrụ igbochi ihe dị ka nde ụmụntakịrị atọ ịnwụ kwa afọ. Ihe ngwọta nke nsogbu ahụ dị adị ma bụrụ nke a pụrụ inweta, ka ọ na-ekwu, e nwekwara ike inweta ya site n’imeziwanye ihe oriri, itinye ihe na-edozi ahụ n’ihe oriri, ma ọ bụ ikesa mkpụrụ ọgwụ vitamin A. Ikesara ụmụntakịrị mkpụrụ ọgwụ vitamin A ọnụ ego ya bụ́ cent abụọ site n’oge ruo n’oge adịwalarị irè n’ọtụtụ ala ebe ụkọ vitamin A bụ ihe a na-ahụkarị. Ihe ndị ọzọ a tụkwara n’aro bụ nri ndị dị ka ọkwụrụ oyibo, mango, karọt, akwụkwọ nri, na àkwá.
Usoro Ọgwụgwọ E Ji Etinyeghachi Mmiri n’Ahụ Site n’Ọnụ. Òtù UNICEF na-ekwu na a pụrụ igbochi ọkara nke ọnwụ ụmụntakịrị kwa afọ nke otoro na-akpata site n’enyemaka nke ngwakọta dị ọnụ ala dịkwa mfe ịkwado nke mmiri dị ọcha, nnu, na shuga ma ọ bụ ntụ osikapa.a Ndị nne na nna kwesịkwara ịnọgide na-enye nwa ahụ nri. A zọpụtawalarị ngụkọta nke otu nde ndụ kwa afọ n’ụzọ ndị dị otú a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ichebe ahụ ike ụmụ gị, biko lee Teta! nke April 8, 1995, peji nke 3-14.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 27]
WHO