Paradaịs nke Nsogbu Na-adịghị na Ya—Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?
“Ọ DỊ nnọọ n’udo!” Nlepụ anya sitere n’oké ọhịa nke osisi pine gabiga Ọdọ Mmiri Redfish dị na steeti Idaho, U.S.A., dị nnọọ jụụ n’ezie. “Ọ bụ nnọọ otú m chere na paradaịs ga-adị,” ka onye njem ahụ kwuru.
Anyanwụ na-achasi ike n’ụsọ oké osimiri dị n’akụkụ ndịda nke àgwàetiti Mediterranean bụ́ Saịprọs. Mmali mmiri na-eji nwayọọ apịasa n’ụsọ osimiri ahụ. Ka ọ nọdụrụ n’ụlọ nri dị n’elu ebe dị mkputamkpu na-eleda anya n’ebe a anya pụrụ iru, onye ọbịa ahụ tiri mkpu, sị: “Nke a bụ paradaịs!”
Ọtụtụ n’ime anyị na-ewere ihe ncheta nke ọnọdụ ndị yiri ndị a dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ma ndị bi ebi na-aghọta na gburugburu ebe yiri paradaịs na-enyekarị echiche ụgha banyere ihe ndị siri ike na-eme eme ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị: ọkụ ọgbụgba n’ọhịa dị n’ugwu nta Usoro Ugwu Rocky, mmetọ oké osimiri nke na-emetụta azụ̀ ma mesịa metụta mmadụ—tinyere agha mba na mba na ógbè na ógbè ndị na-eyi ndụ egwu.
Paradaịs—Gịnị Ka Ọ Bụ?
Olee otú i chere paradaịs dị? The New Shorter Oxford English Dictionary na-enye dị ka nkọwa mbụ ya: “Ogige Iden a kọwara na Jen[esis] 2, 3.” Nke a na-ezo aka ná nkọwa dị n’akwụkwọ mbụ nke Bible banyere ógbè ebe Chineke tinyere nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. Na Paradaịs mbụ ahụ, osisi “a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri” tojupụtara.—Jenesis 2:9.
Nkọwa nke abụọ nke akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ na-ejikọta “paradaịs” na “Eluigwe, ná nkà mmụta okpukpe ndị Kraịst na nke ndị Alakụba” ma tụkwasịzie: “Ugbu a ọ bụ n’ụzọ bụ isi ihe a na-agụ n’abụ uri.” Otú ọ dị, nye onye njem na onye ọbịa anyị, paradaịs bụ “ógbè nke ịma mma ma ọ bụ ihe obi ụtọ dị ukwuu,” nke atọ ná nkọwa nke akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ.
Onye Britain nke narị afọ nke 16 ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị bụ́ Sir Thomas More dere akwụkwọ a kpọrọ Utopia bụ ebe ọ kọwara obodo na-adịghị adị ebe iwu, ọchịchị, na ọnọdụ ọha na eze zuru okè. O yiri nnọọ nke na-emeghị eme nke na taa Webster’s New Collegiate Dictionary na-enye otu nkọwa nke “Utopia” (Ihe Izu Okè) dị ka “atụmatụ na-agaghị ekwe omume maka ime ka ọha na eze ka mma.”
Nye ụmụazụ nke onye ndú òtù Ụlọ Nsọ Ndị Mmadụ bụ́ Jim Jones, Ihe Izu Okè bụ ebe a sụchara asụcha n’oké ọhịa nke Guyana. N’ụzọ dị mwute, na 1978 paradaịs a a tụrụ anya ya ghọrọ ọnọdụ nke ọnwụ nye ihe karịrị mmadụ 900 n’etiti ha—nrọ ọjọọ n’ezie! N’ihi ya, mgbe ụfọdụ ndị mmadụ na-ejikọ echiche nke paradaịs na òtù pụrụ iche ndị omume ha na-awụ ibobo n’ahụ ma na-akpata nchegbu.
N’ụwa ebe mpụ na ime ihe ike na-eyi egwu, ebe ọrịa na-eyi ma ndị toruworo ogo mmadụ ma ụmụaka egwu, na ebe ịkpọasị na ndịrịta iche okpukpe na-ekewa ógbè, gburugburu ebe mara mma na-abụkarị ọka mma n’anya. Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji eche na paradaịs bụ nanị nrọ! Ma nke a akwụsịbeghị ụfọdụ ndị n’ịgbalị ịchọta ma ọ bụ ọbụna imere onwe ha paradaịs. Ruo ókè hà aṅaa ka ha nweworo ihe ịga nke ọma?