Paradaịs nke Nsogbu Na-adịghị na Ya Ga-eme Eme n’Isi Nso
“MỤ NA gị ga-anọ na Paradaịs.” Lee ka okwu ndị ahụ si mesighachi nwoke ahụ na-emebu mpụ obi ike! Ee e, ọ bụghị na o chere na ọ ga-ezere ịga hel na-ere ọkụ ma gaa eluigwe mgbe ọ nwụrụ. Kama nke ahụ, onye ohi ahụ nọ n’akụkụ Jisọs nwetara nkasi obi site n’olileanya ahụ bụ na a ga-akpọliteghachi ya ná ndụ mgbe e weghachiri Paradaịs na mbara ụwa. Biko, rịba ama onye kwuru okwu ahụ dị ịrịba ama banyere Paradaịs—Ọkpara Chineke n’onwe ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Luk 23:43.
Gịnị kpaliri nkwa Kraịst nke Paradaịs? Onye ohi ahụ arịọwo, sị: “Jisọs, cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-abịa n’alaeze Gị.” (Luk 23:42) Gịnị bụ Alaeze a, gịnịkwa bụ njikọ dị n’etiti ya na paradaịs elu ala? Olee otú nke a si ekwe nkwa na Paradaịs ahụ ga-abụ nke nsogbu na-adịghị na ya?
Ike nke Ga-eweta Paradaịs Ahụ
Ị ga-ekweta na ezi paradaịs pụrụ ịbịa n’elu ala nanị mgbe nsogbu nile nke oge a pụworo. Ka ọ dị ugbu a mgbalị ụmụ mmadụ iwepụ ha akụwo afọ n’ala, dị ka akụkọ ihe mere eme na-egosipụta n’ụzọ zuru ezu. Jeremaịa onye amụma bụ́ onye Hibru kwetara, sị: “Jehova, amawo m na . . . ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ònyezi ga-ewepụ nsogbu nile nke oge a?
Ihu Igwe Ịdị Oké Njọ na Mmetọ. Mgbe ajọ ifufe fere n’Osimiri Galili kpaliri ebili mmiri nke zuru ikpu ụgbọ, ndị ọrụ ụgbọ mmiri kpọtere onye so ha na-eme njem n’ụra ya. N’aka nke ya, nanị ihe o mere bụ ịsị oké osimiri ahụ: “Dị jụụ, kpuchie ọnụ gị.” Ihe ndekọ Oziọma Mak na-akọ ihe merenụ: “Ifufe wee febie, oké ndajụ wee dị.” (Mak 4:39) Onye ahụ so na-eme njem bụ Jisọs. O nwere ike ịchịkwa ihu igwe.
Ọ bụ otu Jisọs a buru amụma site n’ọnụ Jọn onyeozi na oge ga-abịa mgbe Chineke ‘ga-emebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (Mkpughe 1:1; 11:18) Nke a abụghị ihe omume na-agaghị ekwe omume nye Onye ahụ nke wepụrụ ụwa dum nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’Iju Mmiri nke ụbọchị Noa.—2 Pita 3:5, 6.
Mpụ na Ime Ihe Ike. Bible na-ekwe nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:9, 11) Ọzọ, ọ bụ Chineke, bụ́ Jehova, bụ onye kwere nkwa iwepụ mpụ na ime ihe ike nile, na-edebere ndị dị umeala n’obi Paradaịs.
Ịda Ogbenye na Agụụ. Ikpe na-ezighị ezi nke oge a na-enye ndị ọchịchị nọ n’otu ógbè ụwa ohere ịkwakọba ihe oriri “buru ibu” n’ụzọ gafere ókè ọ bụ ezie na n’otu oge ahụ mba ndị dara ogbenye na-adọgbu onwe ha n’ịda ogbenye. Ụlọ ọrụ enyemaka, nke ndị mmadụ nwere nchegbu gburugburu ụwa na-akwado, na-agbalị inye ihe ndị bụ isi ma ha na-akụkarị afọ n’ala mgbe atụmatụ nkesa ihe mebiri n’ihi enweghị iwu na ime ihe n’usoro. Jiri nke a tụnyere ihe Aịsaịa onye amụma dekọrọ: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.” (Aịsaịa 25:6) Ọ̀ bụ na nke ahụ adaghị ka ụnwụ nri na ịkwụ agụụ agaghị adịkwa? Otú ahụ ka ọ dị.
Agha. Mgbalị ịchị ụwa a site n’ike ọchịchị mba ndị ọzọ enwebeghị ihe ịga nke ọma. Njikọ Mba Nile, e guzobere na 1920, kụrụ afọ n’ala n’igbochi ntiwapụ nke Agha Ụwa nke Abụọ ma daa. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu, nke a na-eto mgbe nile dị ka olileanya kasị mma maka udo, na-agbalị igbosa òtù ndị na-emegide onwe ha n’ógbè ndị e nwere esemokwu. N’agbanyeghị mgbalị udo ya a kpọsara akpọsa, agha jupụtara, ma nke obodo, nke agbụrụ, ma ọ bụ nke ógbè. Ọchịchị Alaeze Chineke na-ekwe nkwa iwepụ akụkụ ndị na-alụ agha nke oge a ma kụziere ndị ọ na-achị ihe n’ụzọ nke udo.—Aịsaịa 2:2-4; Daniel 2:44.
Ezinụlọ na Ndakpọ Omume Ọma. Nkewasị nke ezinụlọ juru ebe nile. Isi ike ndị na-eto eto jupụtakwara. Omume rụrụ arụ na-agbasaru akụkụ nile nke ọha mmadụ. Ma, ụkpụrụ Chineke anọgidewo n’agbanweghị agbanwe site ná mmalite. Jisọs gbara àmà na “nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya; ha abụọ ewee ghọọ otu anụ ahụ . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.” (Matiu 19:5, 6) Jehova Chineke gakwara n’ihu inye iwu, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ụkpụrụ ndị dị otú ahụ ga-adịgide n’elu ala n’okpuru Alaeze Chineke.
Ọrịa na Ọnwụ. “Jehova . . . ga-azọpụta anyị,” ka Aịsaịa onye amụma kwere ná nkwa, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:22, 24) “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ,” ka onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kwetara, “ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Rom 6:23.
Jehova Chineke ga-ewepụ nsogbu ndị a nile site n’ọchịchị eluigwe ya dị n’aka Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs. Otú ọ dị, ị pụrụ ikwu, sị, ‘Nke a yiri nrọ Ihe Izu Okè. N’ezie, ọ ga-abụ ihe obi ụtọ ma o mezuo, ma ọ̀ ga-emezu?’
Ihe Na-eme Eme Ugbu A
Nye ọtụtụ ndị, ikwe omume nke ibi na paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya kpọmkwem n’elu ala ebe a na-ada ka nchekwube ezi uche na-adịghị na ya. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, nyochaa ihe àmà na nke a ga-eme n’ezie.
Ndịàmà Jehova bụ ìgwè zuru ụwa nile nke oge a nke ihe karịrị nde mmadụ ise bụ́ ndị nwetatụwororị gburugburu ebe nsogbu na-adịghị na ya n’ọgbakọ 82,000 ha nke gbasapụrụ n’ala 233. Ị pụrụ ileta nnọkọ ha ọ bụla, nke ukwu ma ọ bụ nke nta, gịnịkwa ka ị ga-ahụ?
(1) Gburugburu Ebe Dị Mma, Dị Ọcha. N’ikwu banyere otu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova e nwere na Norwich, England, onye nlekọta ámá egwuregwu ịgba bọl ahụ kwuru, sị: “Ọnọdụ udo e nwere n’ime ụbọchị anọ ndị a . . . na-adọrọ mmasị. Ị na-enwe ahụ ịda jụụ nke dịwaga nnọọ iche n’ụbọchị anọ ọ bụla ọzọ n’ụwa azụmahịa ahụ erughị ala na ndụ a na-adị kwa ụbọchị gbara anyị gburugburu. Ndịàmà nwere n’ezie ihe dị iche banyere ha, nke sikwara ike ịkọwa.”
Onye ndụmọdụ ọzụzụ nke ụlọ ọrụ na-ewu ihe bụ́ onye letara ọfịs Ndịàmà Jehova ndị dị na London kwuru, sị: “Ma ihe m hụrụ ma ihe m nụrụ metụrụ m n’ahụ nke ukwuu, ọnọdụ nke udo na ịdị jụụ zuru ezu nke dị ọ bụghị nanị n’ime ụlọ unu kamakwa n’etiti [ndị ikom na ndị inyom] riri m ọnụ. Echere m na ụzọ ndụ na obi ụtọ unu nwere ọtụtụ ihe ịkụziri ihe fọdụrụ n’ụwa a nọ ná nsogbu.”
(2) Ịnọ ná Ntụkwasị Obi na Udo. Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ Journal de Montréal na Canada dere, sị: “Abụghị m Onyeàmà. Kama abụ m onye àmà nye eziokwu ahụ bụ na Ndịàmà na-agba àmà ezi ọrụ na ịkpa ezi àgwà. . . . A sị na ọ bụ nanị ha bi n’ụwa, anyị agaghị agbachi ụzọ anyị n’abalị wee na-etinye mgbịrịgba e ji ama mgbe ndị ohi bịara.”
(3) Iguzosi Ike n’Ihe Nye Ọchịchị Alaeze Chineke bụ njimara Ndịàmà. Ọnọdụ nnọpụiche ha na-akpasu ụfọdụ iwe, ọ bụ ezie na o kwesịghị. Etinyeghị aka ha n’atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị na-enweghị isi nke oge a esiteghị n’enweghị mmasị ime ka ọha na eze ka mma. Kama nke ahụ, ha na-agbalị ime omume n’ụzọ na-atọ onye ahụ nke na-achị site n’ọchịchị eluigwe ụtọ, ya bụ, Onye Okike ụwa, bụ́ Jehova Chineke.
Nkwenkwe Ndịàmà, nke dabeere kpam kpam n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-egbochi ha ịdaba n’ọnyà nke ịghọ ịrọ òtù ma ọ bụ òtù nzuzo. Ha na-enwe mmasị obiọma n’ebe ndị ọzọ nile nọ, ndị sitere n’usoro okpukpe ọ bụla. Ee e, ha adịghị agbalị ịmanye mmadụ ndị a ịgbanwe echiche ha. Ha na-agbalị iṅomi Onye Ndú ha, bụ́ Kraịst Jisọs, site n’igosipụta ihe àmà Akwụkwọ Nsọ banyere Paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya nke a ga-eguzobe n’elu ala n’oge na-adịghị anya.—Matiu 28:19, 20; 1 Pita 2:21.
(4) Ahụ Ike Ime Mmụọ na Obi Ụtọ. N’ikwu eziokwu, Ndịàmà Jehova adịghị azọrọ ịbụ ndị na-enweghị nsogbu ma ọlị n’oge a. Nke a bụ ihe na-agaghị ekwe omume n’etiti ndị nwere akara nke mmehie e ketara eketa site n’aka Adam. Ma site n’enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, ha na-arụ ọrụ ịzụlite àgwà onwe onye ndị dị ka “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Ọ bụ ofufe ha na-efe Jehova site na Kraịst Jisọs na-ejikọta ha ma na-edebe olileanya ha ndụ.
Anyị ji n’aka na nleta gị n’ebe Ndịàmà na-ezukọ n’ógbè unu ga-eme ka o doo gị anya na Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs nkịtị.
Nsogbu nke oge a ga-apụ n’anya. Ọbụna ezughị okè nke dịnụ ga-eji nwayọọ pụọ n’anya ka a na-eji uru nke àjà mgbapụta Kraịst na-eme ihe n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nọ. Ee, ahụ ike na obi ụtọ zuru okè pụrụ ịbụ nke gị.
Nkwadebe ndị dị mfe ga-enyere gị aka inwe olileanya dị otú ahụ. Nata Ndịàmà otu akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebia nke gị. Ná mkpirikpi oge, ị pụrụ iji nke a mụta ihe Chineke na-achọ n’aka gị ka i wee nwee ike ịnụ ụtọ ndụ na paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 10]
Nkwenkwe Ndịàmà, nke dabeere kpam kpam na Bible, na-egbochi ha ịghọ ịrọ òtù ma ọ bụ òtù nzuzo
[Foto ndị dị na peeji nke 8, 9]
A na-atọ ntọala ugbu a maka paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya
N’isi nso paradaịs nkịtị ga-adị n’ụwa nile