Ọdịnihu Mara Mma Maka Ụmụ Anyị
KEMGBE ngwụsị nke Agha Ụwa nke Abụọ, ndị ọchịchị ụwa edewo ma bịanye aka n’ọtụtụ akwụkwọ nkwekọrịta iji chebe ndị nkịtị n’agha. N’ime ha e nwere nkwekọrịta ndị na-enye ohere ka uwe nakwa ọgwụ na ihe oriri ruo ụmụaka aka. Nkwekọrịta mba na mba na-ekwe nkwa ichebe ụmụaka pụọ ná nrigbu n’ụzọ mmekọahụ, mmekpọ ọnụ, na ime ihe ike. Nkwekọrịta na-amachibidokwa idebanye aha onye ọ bụla na-erubeghị afọ 15 n’òtù agha.
Akwụkwọ The State of the World’s Children 1996, akụkọ nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu, na-aja iwu ndị a mma dị ka “ezigbo mgbanwe” ma na-agbakwụnye, sị: “Ndị ọchịchị maara na e nwere ụkpụrụ ndị a pụrụ iji mesịa kpee ha ikpe yikarịrị ka hà ga-atụle ụkpụrụ ndị ahụ n’atụmatụ ha.”
Otú ọ dị, ndị ọchịchị na-aghọtakwa na ọtụtụ mgbe mba ụwa nile enweghị ma ikike ma ọchịchọ itinye iwu n’ọrụ. Akụkọ ahụ si otú a kweta na “n’ihi ókè e mebiruworo ụkpụrụ ndị a, ọ dị mfe ịghara iji ìgwè iwu mba nile kpọrọ ihe.”
Okwu ego bụkwa ihe ọzọ. Na 1993, a lụrụ ọgụ ná mba 79. Mba 65 n’ime ha dara ogbenye. Olee ebe mba ndị a dara ogbenye si nweta ngwá agha ha jiri lụọ ọgụ? Karịsịa site ná mba ndị bara ọgaranya. Oleekwa mba ise kasị ebuga ngwá agha ná mba ndị na-emepe emepe? Ndị òtù ise ahụ na-anọ ya mgbe nile na Kansụl Nchebe nke Mba Ndị Dị n’Otu!
Ndị Ọ Na-echegbu
Otú ọ dị, e nwere ndị na-echegbu onwe ha banyere nsogbu nke ụmụaka n’oge agha. Ma ndị mmadụ ma òtù dị iche iche na-eji ịhụnanya enyere ụmụaka agha metụtara aka. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova, ndị na-adịghị ekere òkè n’agha, emewo otú ahụ. Ma ikpochapụ ajọ ihe na-adakwasị ụmụaka n’agha pụtara n’ezie ikpochapụ agha n’onwe ya, olileanya nke pụrụ iyi ihe na-agaghị eme eme. N’ihi ihe ndekọ toro ogologo nke ọgụ na esemokwu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọtụtụ na-ekwubi na ụmụ mmadụ agaghị enwe ike iweta udo zuru ụwa ọnụ. A bịa n’echiche a, ha ziri ezi.
Ndị mmadụ na-ekwubikwa na Chineke agaghị emekata tinye aka n’ihe omume nke mba dị iche iche ma ọ bụ weta udo na-adịgide adịgide na mbara ụwa. A bịa n’echiche a, ha ezighị ezi.
Onye Okike anyị, bụ́ Jehova Chineke, na-eche nnọọ banyere ihe ndị na-ewere ọnọdụ n’ụwa. N’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova jụrụ, sị: “Ọ̀ na-atọ m ụtọ ma ọlị, bụ́ ọnwụ nke onye na-emebi iwu? . . . ọ́ dịghị atọ m ụtọ mgbe o si n’ụzọ ya chigharịa, wee dị ndụ?” Chineke zasiri ike, sị: “Ọnwụ nke onye na-anwụ anwụ adịghị atọ m ụtọ.”—Ezikiel 18:23, 32.
Chee banyere ya: Ọ bụrụ na Onye Okike anyị nwere ọmịiko chọrọ ka ọbụna ndị ajọ omume toruworo ogo mmadụ chegharịa ma nụ ụtọ ndụ, n’ezie ọ chọrọ ka ụmụaka dịrị ndụ ma nụkwa ụtọ ndụ! Ma, Chineke anyị na-ahụ n’anya agaghị anagide ndị ajọ omume ruo ebighị ebi. “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ,” ka Okwu Chineke na-ekwe ná nkwa. “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa.”—Abụ Ọma 37:9, 10.
Jisọs Kraịst, onye gosipụtara n’ụzọ zuru okè ọdịdị nke Nna ya nke eluigwe, hụrụ ụmụaka n’anya ma kwuo na “alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otú a.” (Matiu 19:14) Àjà e ji ụmụaka achụrụ chi nke agha bụ ihe arụ nye ma Jehova Chineke ma Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst.—Tụlee Deuterọnọmi 18:10, 12.
Nkwa Chineke Maka Ọdịnihu Mara Mma
Chineke ekwewo ka agha na nhụjuanya dịgide ruo ọtụtụ narị afọ ka e wee nwapụta eziokwu ahụ Jeremaịa onye amụma kwupụtara ruo mgbe nile ebighị ebi na-abịanụ: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) N’isi nso, ka Bible na-ekwe ná nkwa, Jehova ga-ewepụ ọbụbụeze eluigwe na ala ya n’ụta site ‘n’ime ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.’ (Abụ Ọma 46:9) Ihe ọzọ e buru amụma ya na Bible bụ oge mgbe “[ndị mmadụ] ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma oge, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.
Gịnị ga-eme ndị agha napụworo ndụ ha n’ike? È nwere olileanya dịịrị ha? Jisọs kwere nkwa mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ bịa n’elu ala agha na-adịghị, na-asị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili . . . ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi ji obi ike kwuo, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.
Nkwa nile nke Chineke ga-emezurịrị. O nwere ma ike ma mkpebisi ike imezu ihe nile o kweworo ná nkwa. (Aịsaịa 55:11) Mgbe Jehova sịrị na ya ga-ewepụ agha, o jighị ya n’egwú. Mgbe o kwere nkwa ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ bịa ná ndụ, ọ ga-eme ya. Dị ka mmụọ ozi Gebriel kwuru, “ọ dịghị okwu ọ bụla si Chineke n’ọnụ pụta nke na-agaghị adị irè.”—Luk 1:37.
[Foto dị na peeji nke 20]
Mgbe agha na-adịkwaghị, ụmụaka nile ga-anụ ụtọ ndụ mara mma