Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 12/8 p. 28-29
  • Ụzọ Isii Isi Chebe Ahụ Ike Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isii Isi Chebe Ahụ Ike Gị
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ 6 Isi Chekwaa Ahụ́ Ike Gị
    Teta!—2003
  • Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma
    Teta!—2015
  • 2. Na-adị Ọcha
    Teta!—2012
  • Mmiri Ọ̀ Na-agwụnahụ Ụwa?
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 12/8 p. 28-29

Ụzọ Isii Isi Chebe Ahụ Ike Gị

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA

DỊ KA Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) si kwuo, ihe dị ka 25 pasent nke ndị mmadụ bi ná mba ndị na-emepe emepe enweghị mmiri dị mma. Ihe karịrị 66 pasent—ọ dịkarịa ala ijeri mmadụ 2.5—enweghị usoro zuru ezu maka idebe ihe ọcha. Ihe ndị ọ kpataara ọtụtụ ndị bụ ọrịa na ọnwụ.

N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ịnọgide na-adị ọcha bụ ihe ịma aka. Ma, ọ bụrụ na i mee ịdị ọcha onwe onye ụzọ isi na-adị ndụ, ị ga-echebe onwe gị pụọ n’ọtụtụ ọrịa. N’ebe a e nwere ihe isii ị pụrụ ime iji chebe onwe gị na ezinụlọ gị pụọ na nje ndị pụrụ ịba gị n’ahụ ma kpata ahụ esighị ike.

1. Jiri ncha na mmiri kwọọ aka gị mgbe i metụsịrị nsị aka na tupu i metụ ihe oriri aka.

Otu ụzọ dị mkpa isi gbochie nrịanrịa bụ ijide n’aka na e nwere ncha na mmiri mgbe nile nke na onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ gị pụrụ ịkwọ aka ha. Ncha na mmiri na-ewepụ nje n’aka—nje ndị pụrụ isi n’ụzọ ụfọdụ banye n’ihe oriri ma ọ bụ n’ọnụ. Ebe ụmụaka na-etinye mkpịsị aka ha mgbe mgbe n’ime ọnụ ha, ọ dị mkpa ịkwọ ha aka mgbe mgbe, karịsịa tupu e nye ha ihe oriri.

Ọ dị mkpa karịsịa iji ncha kwọọ aka gị mgbe i jesịrị mposi, tupu i metụ ihe oriri aka, na mgbe i hichasịrị ike nwa ọhụrụ ma ọ bụ nwata nke ka nyụsịrị nsị.

2. Jee n’ụlọ mposi.

Iji gbochie mgbasa nke nje, ọ dị mkpa ikpofu nsị n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọtụtụ nrịanrịa, karịsịa afọ ọsịsa, na-esite na nje dị na nsị mmadụ. Nje ndị a pụrụ ịbanye ná mmiri ọṅụṅụ ma ọ bụ n’ihe oriri, n’aka, ma ọ bụ n’arịa na n’elu ebe a na-akwadebe ma ọ bụ na-eke ihe oriri. Mgbe nke ahụ mere, ndị mmadụ pụrụ ilo nje ndị ahụ ma daa ọrịa.

Iji nye aka gbochie nke a, jee n’ụlọ mposi. E kwesịghị iweta nsị anụmanụ nso n’ebe obibi na n’ebe ndị e si enweta mmiri. Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na nsị ụmụ ọhụrụ na obere ụmụaka dị ize ndụ karịa nke ndị toruworo ogo mmadụ. Ya mere e kwesịrị ọbụna ịkụziri ndị na-eto eto ije n’ụlọ mposi. Mgbe ụmụaka nyụrụ nsị n’ebe ọzọ, e kwesịrị ikpopụ nsị ha ozugbo ma tụnye ha n’ụlọ mposi ma ọ bụ lie ha.

E kwesịrị idebe ụlọ mposi ọcha ma kpuchie ha ekpuchi.

3. Jiri mmiri dị ọcha na-eme ihe.

Ezinụlọ ndị nwere mmiri pọmpụ dị ọcha n’ụzọ bara ụba adịghị arịakebe ọrịa ka ndị na-enweghị. Ndị na-enweghị mmiri pọmpụ pụrụ ichebe ahụ ike ha site n’ikpuchi olulu mmiri na site n’idebe mmiri unyi iche pụọ ná mmiri a na-aṅụ aṅụ, nke e ji asa ahụ, ma ọ bụ nke e ji asacha ihe. Ọ dịkwa mkpa ịchụpụ ụmụ anụmanụ n’ụlọ nakwa pụọ ná mmiri ọṅụṅụ.

Ụzọ ọzọ isi chebe onwe gị pụọ n’ọrịa bụ idebe bọket, eriri, na ite ndị e ji ekute ma na-adọba mmiri ọcha ruo n’ókè o kwere omume. Dị ka ihe atụ, ọ ka mma ikobe bọket ekobe kama ịhapụ ya n’ala.

E kwesịrị ịgbanye mmiri ọṅụṅụ a na-edebe n’ụlọ n’arịa e kpuchiri ekpuchi, dị ọcha. E kwesịrị iji iko dị ọcha na-ekupụta mmiri site n’arịa ahụ. Ekwela ka ndị mmadụ tinye aka ha n’ime mmiri ọṅụṅụ ahụ ma ọ bụ manye ọnụ n’ime arịa ichekwa mmiri ahụ.

4. Sie mmiri ọṅụṅụ n’ọkụ ọ gwụla ma o sitere ná mmiri pọmpụ dị ọcha.

A na-enwetakarị mmiri kasị dị mma site ná mmiri pọmpụ. Mmiri sitere n’ebe ndị ọzọ yikarịrị ka ọ ga-enwe nje, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị ọcha n’anya.

Isi mmiri n’ọkụ na-egbu nje. Ya mere mgbe i kutere mmiri n’iyiala, iyi, ma ọ bụ na tankị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya isi ya n’ọkụ ma hapụzie ya ka ọ jụọ oyi tupu a ṅụọ ya. Mmiri ọṅụṅụ na-enweghị nje dị mkpa karịsịa nye ụmụ ọhụrụ na ụmụaka na-eto eto, ebe ha nwere ihe mgbochi dị nta nye nje karịa ka ndị toruworo ogo mmadụ nwere.

Ọ bụrụ na o kweghị omume isi mmiri ọṅụṅụ n’ọkụ, debe ya n’arịa e kpuchiri ekpuchi, nke e ji plastik ma ọ bụ glas na-ahụ ụzọ mee. Mgbe ahụ gbaa arịa ahụ n’anwụ ruo ụbọchị abụọ tupu i jiri mmiri ahụ mee ihe.

5. Debe ihe oriri gị ọcha.

Ihe oriri ndị a na-eri n’esighị ha esi kwesịrị ka a saa ha nke ọma. E kwesịrị isi ihe oriri ndị ọzọ nke ọma, karịsịa anụ ehi na anụ ọkụkọ.

Ọ kasị mma iri ihe oriri ozugbo e sisịrị ya; n’ụzọ dị otú ahụ ọ gaghị enwe oge imebi. Ọ bụrụ na ị ghaghị idebe ihe oriri e siri esi ruo ihe karịrị hour ise, i kwesịrị idebe ya ka ọ dị ọkụ ma ọ bụ tinye ya na friji. Tupu i rie ya, i kwesịrị isighachi ya n’ọkụ nke ọma.

Anụ ndụ na-enwekarị nje, ya mere i kwesịghị ikwe ka o metụ ihe oriri i siworo esi. Mgbe i kwadebesịrị anụ ndụ, sachaa arịa na elu ebe ọ bụla o metụworo na kichin.

Elu ebe a na-akwadebe ihe oriri kwesịrị ka e debe ha ọcha mgbe nile. E kwesịrị ikpuchi ihe oriri ma debe ya ebe ijiji, òké, nkapị, na anụ ndị ọzọ na-agaghị erute.

6. Kpọọ ihe mkpofu sitere n’ụlọ ọkụ ma ọ bụ lie ha n’ala.

Ijiji, nke na-ekesa nje, na-enwe mmasị ịmụba n’ihe mkpofu ihe oriri. Ya mere e kwesịghị ịwụsa ihe mkpofu n’elu ala. Kwa ụbọchị, e kwesịrị ili, kpọọ ọkụ, ma ọ bụ kpofuo ya n’ụzọ ụfọdụ.

Site n’itinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ, ị pụrụ inye aka ichebe onwe gị na ezinụlọ gị pụọ n’afọ ọsịsa, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, ịba ahụ ọkụ, okpo, nsí ihe oriri, na ọtụtụ nrịanrịa ndị ọzọ.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Facts for Life, nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu, Òtù Na-ahụ Maka Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, na òtù WHO jikọrọ aka bipụta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya