Ndị Akakpọ—Ndị Ime Oké Ọhịa
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA CENTRAL AFRICAN REPUBLIC
BỊA zute ndị BaBinga, ndị Akakpọ nke Central African Republic, bụ́ ebe obibi anyị. Ikekwe ị nụwo ma gụọ ihe banyere ndị Akakpọ, ma eleghị anya i zutetụbeghị nke ọ bụla n’ime ha. Ọ bụrụ na ị gaa Bangui, bụ́ isi obodo, njem na-erughị hour abụọ ga-eduga gị kpọmkwem n’ókèala ha.
Ndịàmà Jehova nwere ozi dị mkpa maka mba, ebo, agbụrụ, na ìgwè agbụrụ nile. N’ọrụ ndị Kraịst anyị, anyị na-ezi ụdị mmadụ nile ozi ọma. Nke a na-agụnye ndị Akakpọ.—Mkpughe 14:6.
Ya mere biko soro anyị ma hụ otú ha si ebi na otú ha si na-azaghachi n’ozi ọma nke Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-eweta Paradaịs n’elu ala. Ọ ga-abụrụ gị ụbọchị na-enye obi ụtọ ma na-akpali akpali.
Ihe A Ga-emere Nchọpụta
Tupu anyị agawa, o kwesịrị ka anyị mee nchọpụta ụfọdụ banyere ndị anyị ga-aga ileta. E nwere ọtụtụ akwụkwọ nke ndị ikom biworo n’etiti ndị Akakpọ, ruo ọtụtụ ọnwa, na-amụ ọdịbendị, okpukpe, na àgwà ha deworo.
Ịgụ banyere ndị a dị n’udo ma nwee omume enyi nakwa iletazi ha ga-aza ọtụtụ ajụjụ ndị dị ka: Olee ebe ndị Akakpọ si bịa? Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’aka ha? Olee ebe ha bi? Olee ihe ndị mere ka ha dị iche n’ebe ìgwè ndị Africa ndị ọzọ nọ? Olee otú ha na ụba mmadụ ndị ọzọ si emekọchi ihe anya?
Webster’s Third New International Dictionary na-asị na ndị Akakpọ bụ “ndị dị ntakịrị nke ebe ụwa kewara abụọ n’Africa, ndị na-adịghị etofe mita 1.5 n’ogologo, . . . na-asụ asụsụ ndị agbata obi bikarịsịrị ha nso.” A na-eche na ndị Akakpọ nke Africa na ndị Negrito (nke pụtara “Obere Ndị Negro”) nke Oceania nakwa akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ Esia esighị n’otu ebe.
Okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “akakpọ” sitere n’okwu Grik pụtara “ogologo nke agbata ikpere aka ruo ná nkwoji mkpịsị aka.” A maara ndị Akakpọ dị ka ndị na-achụ nta na ndị na-atụtụkọta ihe. A na-eme atụmatụ ọnụ ọgụgụ ndị Akakpọ nọ n’ụwa ịbụ ihe ji nke nta gafee 200,000.
Serge Bahuchet na Guy Philippart de Foy na-enye anyị nkọwa ndị na-adọrọ mmasị karị n’akwụkwọ ha bụ́ Pygmées—peuple de la forêt (Ndị Akakpọ—Ndị Ime Oké Ọhịa). Ndị Akakpọ, ka ha na-ekwu, bi n’oké ọhịa nke Republic of Congo, Democratic Republic of Congo, Gabon, Cameroon, na Central African Republic, a pụkwara ịchọta ha ọbụnadị n’ime ime ọwụwa anyanwụ na Rwanda na Burundi.
Ọ dịghị onye ma kpọmkwem ebe ndị Akakpọ si bịa ma ọ bụ mgbe ha bịara. Ha akpọtụbeghịdị onwe ha “akakpọ.” Na Central African Republic, a na-akpọkarị ha BaBinga, ma ná mba ndị ọzọ, a maara ha dị ka BaKola, BaBongo, BaAka, BaMbènzèlè, BaTwa, na BaMbuti.
Nleta Mbụ
Anyị hapụrụ Bangui n’ụgbọala Land Cruiser n’isi ụtụtụ, n’ihe dị ka n’elekere asaa, iji gaa ndịda ruo M’Baiki/Mongoumba. Nanị kilomita 100 mbụ nke ụzọ ahụ ka e doziri edozi. Ọ dị mma inwe obere ụgbọala injin na-arụ ọrụ na wheel ya anọ, ebe ọ bụ na ụzọ ahụ na-amị amị ka mmiri zosịrị n’abalị gara aga.
Anyị gbafere ime obodo jupụtara n’ihe ọkụkụ ndị na-eto nke ọma, nke nwere oké ọhịa nakwa n’ime obodo nta ebe ndị mmadụ na-ere unere, ogede, akwụoro, akpụ, ọka, squash, na ahụekere n’akụkụ ụzọ n’elu obere table. A maghị ihe bụ ụnwụ nri n’ebe a. Ala dị mma na ihu igwe dị udè na-emepụta nri dịgasị iche iche n’ụba. Mgbe ahụ, na mberede, anyị rutere “obodo nta” mbụ, ma ọ bụkwanụ ógbè ndị BaBinga.
N’ụzọ na-eju anya, ha bi na mkpuke ndị dị nnọọ nta, ndị dị okirikiri ma nwee otu oghere nke a pụrụ isi na ya rịbanye. Ndị inyom na-eji osisi na ahịhịa ndị sitere n’oké ọhịa dị nso ewu mkpuke ndị ahụ. A haziri ihe dị ka mkpuke 10 ruo 15 gburugburu. Ndị a bụ nanị maka ihi ụra ma ọ bụ maka nchebe pụọ n’oké mmiri ozuzo. Ndụ a na-adị kwa ụbọchị bụ n’èzí.
Anyị sị n’ụgbọala pụta iji kelee ụfọdụ ndị inyom, nke ọ bụla kwọ nwa n’azụ ya. N’ịnụ ụda ụgbọala anyị, ụfọdụ ndị ikom gbaara ọsọ rute ịhụ ndị anyị bụ na ihe anyị chọrọ. Ọtụtụ nkịta so ha, nke ọ bụla nya obere mgbịrịgba n’olu ya.
Anyị na-echeta na site ná nnyocha anyị na nanị anụ ụlọ ndị Akakpọ na-akpa bụ nkịta. Ha na-eso ha achụ nta. Ọzọkwa, site n’ala ruo n’elu osisi, e nwere ọtụtụ ihe a ga-enweta. Dị ka akwụkwọ bụ́ Pygmées—peuple de la forêt na-akọwa, nke a na-agụnye nnụnụ, enwe, enyí, atụ, òké, ele, ezì ọhịa, ọsá, na ọtụtụ ndị ọzọ. Dinta ọ bụla aghaghị inwe nkịta na-ekwesị ntụkwasị obi.
N’ịgwa ndị a okwu, anyị ji Akwukwọm nke Akukọ Bible na broshuọ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!a mee ihe. Ndị a na-egosi na n’isi nso ụwa ga-abụ paradaịs nwere oké ọhịa ndị mara mma, ebe ọrịa ma ọ bụ ọnwụ na-agaghị adị. (Mkpughe 21:4, 5) E bipụtara akwụkwọ abụọ ndị ahụ na Sango, bụ́ asụsụ nke ihe karịrị 90 pasent nke ndị ahụ na-asụ, gụnyere ndị Akakpọ. Ndị a na-adị n’udo, n’ebe ọ bụla ha bi, na-amụta asụsụ ndị Africa bụ ndị agbata obi ha. Nke a dị mkpa n’ihi na ha na-azụkọrịta ahịa.
N’oge na-adịghị anya, ndị ikom na ndị inyom na-eguzo anyị gburugburu, jiri oké mmasị na-ele ihe osise ahụ otu otu ka ha na-ege ntị ná nkọwa a na-enye. Site ná nleta ndị anyị meburu n’ime ọtụtụ afọ gafeworonụ, ha maara anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Ha nwere obi ụtọ inweta mbipụta ndị ahụ. Otú ọ dị, nsogbu bụ na ha apụghị ịgụ ihe. N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ gọọmenti na ọtụtụ ụlọ ọrụ ndị ọzọ emewo mgbalị iji kụziere ha ịgụ na ide ihe, ma o nweghị isi. E meere ụmụ ha ndokwa ịga akwụkwọ. Ụlọ akwụkwọ ndị ahụ dịruru nwa oge, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka ahụ kwụsịrị ka oge na-aga. Onye nkụzi sowooro ndị Akakpọ rụọ ọrụ sịrị na mgbe ha nọ na klas, ha na-egosipụta ikike ịmụta ihe dị ịtụnanya, ma mgbe ha gasịrị akwụkwọ ruo ọnwa ụfọdụ, ha na-eji nnọọ nwayọọ kwụsị. Otú ọ dị, ọchịchị ime ime obodo na ndị ọzọ nọgidere na-eme mgbalị inye nkụzi kwesịrị ekwesị.
A maara Ndịàmà Jehova maka iletaghachi ndị gosiri mmasị n’Okwu Chineke. Ma anyị adịghị atụ anya izute otu ndị BaBinga ahụ n’oge ọzọ anyị ga-abịa, ebe ọ bụ na ha na-akwagharị mgbe nile n’afọ. Ha na-akwaba n’ụlọ ha dị n’ime oké ọhịa ruo ọtụtụ ọnwa n’otu mgbe. Mgbalị ime ka ha biri n’otu ebe enwechabeghị ihe ịga nke ọma. N’ezie, ha bụ ndị ime oké ọhịa. Ime nkwagharị na ịchụ nta bụ ụzọ ndụ ha, ọ dịghịkwa ihe na-egbochi ha.
Ndụ Kwa Ụbọchị, Alụmdi na Nwunye, na Ezinụlọ
N’ụzọ bụ isi, ndị ikom na-achụ nta, ndị inyom na-atụtụkọtakwa ihe, na-achịkọta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile oké ọhịa na-emepụta: ero, mkpọrọgwụ, berry, mkpá akwụkwọ, mkpụrụ osisi, ụkpana, mkpu, mmanụ aṅụ ọhịa, a gaghịkwa echefu egú na-amasị ha nke ukwuu. Ihe ndị a nile dị mkpa maka ihe oriri na maka azụmahịa. Ndị Africa bụ ndị agbata obi ndị Akakpọ, ndị a na-akpọkarị les grands noirs (ndị ojii toro ogologo), na-adabere nke ukwuu na ha maka ihe ndị a. Ná mgbanwerịta, ha na-eweta ite, efere, mma ogè, ngwá ọrụ ndị dị ka anyụike na obere mma, nnu, mmanụ nkwụ, akpụ, ogede, nakwa, n’ụzọ dị mwute, ụtaba, mmanya na-aba n’anya e mere n’ógbè ahụ, na wii wii. Ihe atọ ndị ikpeazụ a bụ oké nsogbu nye ndị a dị umeala n’obi. Ọtụtụ mgbe ha na-aba n’ụgwọ iji nweta ha, a na-ejikwa nke nta nke nta ebibi ndụ ha.
Ndị ikom na-alụkarị otu nwanyị. Otú ọ dị, ọ na-adịrị ha mfe ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ kewaa ka ha na onye ọzọ wee biri. Nna ma ọ bụ onye kasị mee okenye n’ógbè ahụ bụ onye a kasị akwanyere ùgwù. Ọ dịghị eti iwu, ma a na-agbasokarị ndụmọdụ ya. Ị ga-ahụ na ndị Akakpọ hụrụ ụmụ ha n’anya. Ọtụtụ ugboro nne na nna na-eku nwa ha. Ụmụaka a na nne na nna ha na-enwe mmekọrịta chiri anya ebe ọ bụla ha na-aga nakwa ihe ọ bụla ha na-eme, ma ọ bụ ịrụ ọrụ, ịchụ nta, ma ọ bụ ịgba egwú.
N’abalị nwatakịrị ahụ na-edina n’agbata nne na nna ya. N’ehihie, ndị nne na nna, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ụmụnne nne na nna, na ndị nne na nna ochie na-elekọta ụmụaka, e wezụgakwa nke ahụ, ìgwè ahụ dum na-elekọta ha. Ndị mụrụ ụmụ na ndị ikwu na-eleta onwe ha mgbe nile. Ihe ndị a na-eme ka nkekọ ezinụlọ sie ike. Ná mba nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, mgbe mgbe nkekọ ezinụlọ adịghị esi ike ma ọ bụ bụrụ ndị e gbubiri, ma ọ dị nnọọ iche n’ebe a.
Ọ bụ ezie na ndị Akakpọ na-ebipụ iche n’ebe ndị Africa bụ ndị agbata obi ha nọ, ha na ha na-enwe mmekọrịta azụmahịa. E wezụga inwe mmekọrịta mgbe nile site n’azụmahịa, a na-arịọkarị ha ịrụ ọrụ dị ka ndị ọrụ e goro ọrụ n’ubi kọfị na koko. Ha nwere ike rụọ ọrụ izu ole na ole, nara ụgwọ, ma banyezie n’ime ime oké ọhịa ruo ogologo oge. Ònye manụ? Kọfị ị ṅụrụ n’ụtụtụ a pụrụ isite n’aka ndị Akakpọ nke Central Africa.
Okpukpe
Ndị BaBinga bụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe, ma nkwenkwe ụgha na ọdịnala na-achịkwa ndụ okpukpe ha. Ha na-ejikọta iti egwú, ịgụ egwú, (n’olu na-agbanwe agbanwe), na ịgba egwú na ememe okpukpe ha. Akwụkwọ bụ́ Ethnies—droits de l’homme et peuples autochtones (Ìgwè Agbụrụ—Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Ụmụ Afọ) na-enye nkọwa na-esonụ: “Nye ndị bi n’ime ime oké ọhịa, Chineke kere ụwa, nke pụtara oké ọhịa. Mgbe o kesịrị di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ . . . , ọ laghachiri n’eluigwe ma kwụsị inwe mmasị n’ihe omume ụmụ mmadụ. Ugbu a otu mmụọ kasịnụ, chi nke oké ọhịa, na-arụchitere ya ọrụ.” Otú ọ dị, nke a ekwekọghị ma ọlị ná nkọwa nke Chineke na nzube ya nke a na-achọta na Bible—Jenesis, isi 1, 2; Abụ Ọma 37:10, 11, 29.
Ndị Nwere Ọgụgụ Isi
Ọ bụ ihe a na-ahụkarị ụfọdụ ndị ịkparị ma ọ bụ ọbụna ileda ndị Akakpọ anya, na-ele ha anya dị ka ndị dị ala na ndị na-enwechaghị ọgụgụ isi. Ma Patrick Meredith, prọfesọ na-ahụ maka uche na ụbụrụ na Mahadum Leeds, England, sịrị: “Ọ bụrụ na ị hụ ndị akakpọ na gburugburu ebe maara ha ahụ ka ha ji ụdọ na-ewu àkwà mmiri ma na-ebi ndụ na-aga nke ọma, ị pụrụ ịjụ onwe gị ihe ị na-akpọ ọgụgụ isi.”
Anyị maara na ihe nile a kpọrọ mmadụ sitere na di na nwunye mbụ, bụ́ Adam na Iv. Ọrụ 17:26 na-asị “[Chineke] wee site n’otu onye [Adam] kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile.” Ọzọkwa Ọrụ 10:34, 35 na-asị na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” Ya mere, anyị kwesịrị iwegara ndị a eziokwu Bible ka ha wee nweekwa ike inwe olileanya ịdị ndụ n’oge ahụ dị nso mgbe a ga-agbanwe ala nile ịghọ paradaịs mara mma, na-enwe ọtụtụ ime oké ọhịa.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
1. Iso ndị Akakpọ na-ekerịta ozi Bible; 2. onye Akakpọ na-atụ osisi; 3. ebe obibi ndị Akakpọ