Ihe Otiti ahụ Na-agbasa
Obere Robert dị nanị afọ 11, ma a hụrụ ya ka o kpudoro ihu n’ala n’okpuru àkwà mmiri a gbahapụrụ agbahapụ. E nwere oghere abụọ ebe a gbara ya égbè n’azụ isi ya. E kwetara na ọ bụ ndị nọ n’ajọ òtù ndị ntorobịa ọ nọ na ya gburu ya.
Alex dị afọ 15 na-aga ịbanye n’ajọ òtù nakwa ma eleghị anya ịnwụchu ọnwụ. Ma ọ hụrụ ka otu enyi ya nwụrụ, ọ tụgharịkwara uche, sị: ‘Achọghị m isi otú ahụ nwụọ.’
AJỌ òtù okporo ámá ndị na-eme ihe ike, bụ́ ndị e jikọtaburu ha na ajọ òtù Los Angeles ndị ahụ a ma ama a kpọrọ Ọbara na Ngwụrọ, agbasawo gburugburu ụwa. Ma n’ebe ọ bụla ha nọ, ajọ òtù yiri onwe ha n’ụzọ na-eju anya.
“Ụmụ Okoro Teddy” nke England menyere ụwa egwu n’afọ ndị 1950. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London sịrị na ha jiri anyụike, mma, chen ịnyịnya ígwè, na ngwá ọgụ ndị ọzọ ‘na-emerụsị ndị aka ha dị ọcha ahụ n’ụzọ dị egwu.’ ‘Ọgụ e ji mma lụọ tiwapụrụ, e bibisịrị ụlọ iri ihe, laakwa ụlọ kọfị dị iche iche n’iyi.’ A wakporo ndị mmadụ, pụnara ha ihe, tie ha ihe, mgbe ụfọdụkwa gbuo ha.
Die Welt nke Hamburg, Germany, kọrọ na na nso nso a karị ndị na-eto eto “na-aga disko ma ọ bụ na-ala ụlọ” abụrụwo ndị ajọ òtù ndị bu “osisi baseball, mma, na égbè” wakporo. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Süddeutsche Zeitung nke Munich kwuru na ndị isi agbọ ncha na Berlin na-awakpo onye ọ bụla “o doro anya na ha ka ike—ndị na-enweghị ebe obibi, ndị nwere nkwarụ, ndị inyom laworo ezumike nká.”
Otu onye nta akụkọ Teta! na Spain kọrọ na nsogbu ajọ òtù nke ndị nọ n’afọ iri na ụma malitere ọhụrụ n’ebe ahụ ma ọ na-arịwanye elu. ABC, bụ́ otu akwụkwọ akụkọ na Madrid, bu isiakụkọ bụ́ “Ndị Isi Agbọ Ncha—Nrọ Ọjọọ Ọhụrụ nke Okporo Ámá.” Onye bụbu isi agbọ ncha na Spain sịrị na ha na-achọpụtacha “ézì ndị si ala ọzọ, ndị akwụna, na ndị na-edina ụdị onwe ha.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Abalị a na-emeghị ihe ike abaghị uru.”
Na South Africa akwụkwọ akụkọ bụ́ Cape Times sịrị na ọtụtụ n’ime mpụ ime ihe ike dị n’ebe ahụ bụ “ihe na-esi n’inwe òtù ọjọọ apụta.” Otu akwụkwọ e bipụtara na Cape Town na-ekwu na ajọ òtù ndị dị na South Africa ghọrọ “nje” n’obodo ukwuu ndị dara ogbenye karị, nakwa na ha “na-apụnara ndị bi n’ógbè ha ihe ma na-edina ha n’ike, na-alụrịtakwa ọgụ n’etiti ajọ òtù banyere ókèala, ahịa, na ndị inyom.”
O Estado de S. Paulo, bụ́ otu akwụkwọ akụkọ Brazil, sịrị na ajọ òtù ndị dị n’ebe ahụ “na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-eyi egwu.” O kwuru na ha na-awakpo ajọ òtù na-ama ha aka, ndị ntorobịa ji ego, ndị si agbụrụ ọzọ, na ndị ọrụ na-eme nkwagharị bụ́ ndị dara ogbenye. O kwukwara na otu ụbọchị ọtụtụ ajọ òtù jikọrọ aka “zuo ndị mmadụ ohi n’ụsọ mmiri . . . , lụọ ọgụ n’etiti onwe ha,” meekwa ka otu okporo ámá na-ekwo ekwo na Rio de Janeiro ghọọ “ọgbọ agha.” Akụkọ ọzọ sitere Brazil sịrị na ọnụ ọgụgụ ajọ òtù na-amụba ma ná nnukwu obodo ndị dị ka São Paulo na Rio de Janeiro ma n’obodo ndị ka nta.
Magazin Canada bụ́ Maclean’s kwuru na 1995 na dị ka atụmatụ ndị uwe ojii mere si dị, e nwere ma ọ dịkarịa ala ajọ òtù okporo ámá asatọ na-akpa ike na Winnipeg, Canada. Akwụkwọ akụkọ ndị dị na United States ewepụtawokwa foto ndị nọ n’ajọ òtù bụ́ ndị wegara ákwà ndị ajọ òtù na ihe nsekasị n’ókèala ndị India dịpụrụ adịpụ nke Ndịda Ọdịda Anyanwụ America.
Na New York City, ọtụtụ ime ihe ike e jikọtara ha na ajọ òtù tiwapụrụ n’afọ gara aga. Ndị òtù nke Ọbara na Ngwụrọ, bụ́ ajọ òtù a ma ama malitere na Los Angeles, ka a sịrị na aka ha dị na ya. Dị ka onye isi obodo New York si kwuo, n’agbata July na September, ndị uwe ojii nwụchiri mmadụ 702 n’ihe omume ndị metụtara kpọmkwem ndị ajọ òtù okporo ámá.
Ọ bụghịzi nanị n’obodo ukwu ka e nwere nsogbu ahụ. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Quad-City Times, a na-ebipụta n’akụkụ etiti nke United States, kọrọ banyere “ime ihe ike na-arị elu n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe nke juru ebe nile na echiche enweghị olileanya nke na-amụba amụba.”
Ihe Otiti Na-agbawa Obi
E kwuru na otu ajọ òtù malitere dị ka ìgwè ndị enyi. Ma ka aha onye ndú ya na-edewanye ude, otú ahụ ka ọ dịkwa ime ihe ike ya. Onye ndú ajọ òtù ahụ bi n’ụlọ nne nne ya, bụ́ nke a na-agba égbè ugboro ugboro, ọbụna mgbe nwanyị ahụ nọ n’ime ya. Otu akwụkwọ akụkọ kọrọ na e nwere ihe karịrị oghere mgbọ égbè 50 n’ụlọ ahụ. O yikarịrị ka a gbawo égbè ndị ahụ iji megwara ihe ndị a na-ekwu na ajọ òtù nwa nwa ya nọ na ya mere. Ọzọkwa, nwanne nwoke onye ndú ahụ nọ n’ụlọ nga n’ihi ime ihe ndị e jikọtara ya na ajọ òtù, nwa nwanne nne ya kwa, bụ́ onye kwapụworo iji zere ime ihe ike ahụ ma lọrutekwa ileta ndị ụlọ, abụrụwo onye onye nọ n’ụgbọala na-agbafe agbafe gbagburu.
Na Los Angeles, ndị nọ n’ajọ òtù gbara otu ụgbọala égbè ma gbuo nwatakịrị gbara afọ atọ aka ya dị ọcha bụ́ onye nne ya na enyi ya nwoke gbabaworo n’otu okporo ámá n’amaghị ụma. Otu mgbọ égbè tibara n’otu ụlọ akwụkwọ ma tụọ otu onye nkụzi nọ na-agbalị inyere ụmụ akwụkwọ aka ịmụta ime ka ndụ ha ka mma. E gbuwokwa ọtụtụ ndị ọzọ bụ́ ndị na-enweghị ihe jikọrọ ha na ajọ òtù ndị ahụ kama bụrụ ndị ha metụtara. Otu nne na Brooklyn, New York, ghọrọ onye a maara n’agbata obi ya n’ihi ọnọdụ kasị dị mwute—ịbụ onye ụmụ okoro atọ ya nwụrụ n’ihi ime ihe ike ndị ajọ òtù.
Gịnị kpataworo ihe otiti a zuru ụwa ọnụ nke ime ihe ike ndị ntorobịa, oleekwa otú anyị pụrụ isi chebe ụmụ anyị anyị hụrụ n’anya pụọ na ya? Olee otú ajọ òtù dị iche iche sidị amalite, gịnịkwa ka ọtụtụ ndị ntorobịa ji abanye na ha? A tụlere ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Scott Olson/Sipa Press