Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 9/8 p. 29
  • Aha Chineke Achọọ Ihe Owuwu nke Czech Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Aha Chineke Achọọ Ihe Owuwu nke Czech Mma
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọ Mgbe Ochie Egosipụta Aha Chineke
    Teta!—2004
  • A4 Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Teta!—1998
g98 9/8 p. 29

Aha Chineke Achọọ Ihe Owuwu nke Czech Mma

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Czech Republic

N’ỌTỤTỤ akụkụ nke ụwa, a na-ejikọtakarị nanị Ndịàmà Jehova na aha ahụ bụ́ Jehova. Ọ pụrụ ịtụ gị n’anya ịmara na na Czech Republic, ihe ịchọ mma ndị dị n’ọtụtụ ihe owuwu mgbe ochie na-agụnye Tetragrammaton ahụ, bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ (יהוה) mejupụtara aha Chineke, bụ́ Jehova.

Ikekwe ihe atụ a kasị mara nke Tetragrammaton dị n’Àkwà Mmiri Charles, bụ́ nke e wuru na 1357 gafere Osimiri Vltava ahụ mara mma, na nso Obodo Ochie nke Prague. E debere ihe a kpụrụ akpụ n’ahịrị n’akụkụ abụọ nke àkwà mmiri a, nke otu n’ime ha na-adọrọ uche ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-agafe. Ọ bụ ihe oyiyi Jisọs Kraịst nọ n’elu obe, nke mkpụrụ akwụkwọ Hibru na-egbuke egbuke gbara gburugburu—gụnyere Tetragrammaton ahụ—nke na-agụ, sị “Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị.”

Olee otú okwu a, dị na Bible n’Aịsaịa 6:3, si bịa dịrị n’ihe oyiyi a? Otu ihe e dere n’ala ala ya na-akọ banyere otu onye Juu nke gafere otu ụbọchị na 1696 ma kwuo okwu e weere na ọ bụ okwu enweghị nsọpụrụ banyere obe ahụ. N’ihi nke a, a kpụtara ya n’ihu Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe Eze ma maa ya ikpe ịkwụ nhá. N’iji kwụọ ya o wetara ihe dị okirikiri na-acha ọlaedo ọlaedo maka obe ahụ, bụ́ nke nwere okwu ahụ e hotara n’elu.

Ụlọ Nzụkọ Ochie ahụ E Mere Ka Ọ Dị Ọhụrụ na ebe ili ozu kasị ochie nke ndị Juu dị na Europe dị nso n’ebe ahụ. N’ụlọ nzukọ a ikpo okwu nke onye ndú ndị ukwe nwere Tetragrammaton dị n’ọbọ́ e ji ọlaọcha mee. Ma ọ bụghị nanị n’ihe owuwu ndị Juu ka a ga-ahụ Tetragrammaton ahụ. N’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Prague ka ụlọ ukwu mgbe ochie nke Český Šternberk dị, n’elu ugwu jupụtara na nkume nke a pụrụ ịnọ na ya hụ Osimiri Sázava. E nwere mkpụrụ akwụkwọ anọ na-acha ọlaedo ọlaedo—Tetragrammaton ahụ—n’elu ọlta nke ụlọ ekpere nke ụlọ ukwu ahụ. Mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ yiri ka ha na-efegharị n’ikuku, ebe e ji waya jide ha. Ìhè na-egbukepụ n’azụ ha—ma ọ bụghị site n’oriọna! Ìhè anyanwụ, bụ́ nke a na-apụghị ịhụ site n’ime, na-eme ka ìhè na-acha pinki pinki na-achakwasị ọlta ahụ na-acha ọcha, bụ́ nke Tetragrammaton ahụ na-akwụfegharị n’elu ya.

Tetragrammaton dịkwa n’ihe osise ndị dị n’ụlọ ndị ọzọ dị na Czech. Ha na-agbakwu akaebe na n’oge gara aga ọtụtụ ndị nọ n’ebe a maara aha Chineke. Taa, na Czech Republic na n’ihe karịrị ala 200 ndị ọzọ, Ndịàmà Jehova na-enwe aṅụrị n’ihi ịma aha Chineke na ịkụziri ndị ọzọ banyere ya. (Aịsaịa 43:10-12) Ọzọkwa, akwụkwọ Bible bụ́ Aịsaịa na-ekwu banyere oge mgbe aha Chineke—nakwa àgwà, nzube, na ọrụ ya nile—ga-abụ nke a ‘ga-amara n’ụwa nile.’—Aịsaịa 12:4, 5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya