Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 8/8 p. 18-19
  • Ụmụ Anụ Rhino Na-enweghị Nne na Nna nke Kenya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Anụ Rhino Na-enweghị Nne na Nna nke Kenya
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịzụ Anụ Rhino
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ndị ahụ Na-enweghị Nne na Nna?
  • Akụkọ Gbasara Afrịka
    Teta!—2015
Teta!—1998
g98 8/8 p. 18-19

Ụmụ Anụ Rhino Na-enweghị Nne na Nna nke Kenya

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA KENYA

GỊNỊ na-eme n’ọhịa mgbe e kewapụrụ nwa anụ site n’ebe ndị mụrụ ya nọ? Eleghị anya anụ ndị na-eri ibe ha ga-egbu ya. Iji gbochie nke ahụ, ndị na-elekọta anụ ọhịa na Kenya na-anapụta ụmụ anụ dị otú ahụ ma wega ha n’ogige ụmụ anụ na-enweghị nne na nna. Otu n’ime ndị a kasị mara bụ nke Daphne Sheldrick na-elekọta n’Ogige Nchekwa Anụ Ọhịa Mba na Nairobi. Ruo ọtụtụ iri afọ, Sheldrick azụwo ma weghachi ọtụtụ anụmanụ n’ime ọhịa, gụnyere atụ, ele, edi, ezì ọhịa, ufu, enyí, na anụ Rhino.

N’afọ gara aga o nwere anụ Rhino ojii abụọ a mụrụ ọhụrụ ọ na-elekọta, bụ́ Magnette na Magnum. Magnette bụ nwa anụ Rhino bụ́ Edith, nke ka dị ndụ n’Ogige Nchekwa Anụ Ọhịa Nairobi. E wetara nwa anụ Rhino ahụ n’ogige ụmụ anụ na-enweghị nne na nna n’etiti ọnwa February nke afọ 1997, n’ịbụ nke e kewapụrụ n’ụzọ ụfọdụ site n’ebe nne ya nọ. Mgbe ndị ahụ na-elekọta anụ ọhịa mesịrị chọta ebe nne Magnette nọ, ọ gaala ụbọchị ise. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ohere e nwere dị nta na nne ya ga-akpọrọ nwa anụ ahụ n’ihi ogologo oge nke nkewa ahụ were na ísìsì mmadụ dị n’ahụ anụ ahụ.

A mụrụ Magnum na January 30, 1997, ọ bụkwa nwa anụ Rhino aha ya bụ Scud, nke na-ejikwaghị ụkwụ ihu ya nke aka nri eme ihe, ikekwe n’ihi ịzọbanye ụkwụ n’ime òkòkòrò ka ọ na-awụ ọsọ. Ọ bụ ezie na e mere mgbalị dị ukwuu iji gwọọ ọnyá ahụ, ọ malitere ịrịa ọrịa ọkpụkpụ, a ghaghịkwa igbu Scud izu atọ mgbe ọ mụsịrị Magnum.

Ịzụ Anụ Rhino

Ọ na-agụsi nwa anụ Rhino agụụ ike ime mmadụ obi ụtọ, ọ dịkwa mfe ịchịkwa ya, ma ịzụ ha abụghị ọrụ a na-arụ n’ụlọ. Hour anọ ọ bụla n’ụbọchị, ha na-amị nnukwu karama e ji enye nwa ọhụrụ nri, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ e tinyere mmiri ara ehi nwere abụba. Ha na-atakwa osisi nta. Ọ bụ ezie na anụ Rhino a mụrụ ọhụrụ na-adị nanị ihe dị ka sentimita 40 n’ogo ma na-ada malite n’agbata kilogram 30 na 40 n’arọ mgbe a mụrụ ya, ha na-ebu ibu n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ịtụnanya—na-atụkwasị otu kilogram kwa ụbọchị! Mgbe o tojuru, otu anụ Rhino na-ada ihe karịrị otu tọn n’arọ.

Ndị na-elekọta ha na-eso Magnette na Magnum gaa ije dị ogologo gabiga ogige ahụ kwa ụbọchị. Ịga ije ndị a abụghị nanị maka mmega ahụ; ha na-emezu otu nzube dị mkpa—ịkpọba anụ Rhino n’ime ọhịa. Ka anyị tụlee otú e si eme nke a.

Anụ Rhino adịghị ahụcha ụzọ nke ọma, ma ha na-anụ ísìsì nke ọma ma nwee ikike ncheta dị egwu. N’ihi ya, anụ Rhino na-ebu ụzọ ama onwe ha site n’ísìsì ahụ. Anụ Rhino na-akpa ókèala ha site n’ịnyụsa ikpo nsị na site n’ịnyụsasị mamịrị n’elu ahịhịa.

N’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, ọ bụ nne ya na-echebe nwa ọ mụrụ ọhụrụ, ísìsì ahụ ya pụrụ iche na-agwakọta na nke ya ruo mgbe ọ mụrụ nwa ọzọ. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, nwa ọhụrụ ahụ ga-esonyeworo ma bụrụ nke ìgwè anụ Rhino ahụ ma onwe ha nabatara n’ụzọ zuru ezu. Maka ndị ọhụrụ dị ka Magnette na Magnum, ọnọdụ ahụ dị iche. Ha aghaghị ịnyụnyekọta nsị nke ha n’ikpo nsị dịbu adị nke anụ Rhino ndị bi n’ógbè ahụ tupu ha emetụ ha ahụ. Ya mere, n’oge ha na-aga ogologo ije ha kwa ụbọchị, ụmụ anụ Rhino ndị ahụ na-enweghị nne na nna na-anyụnye nsị nke ha n’elu ikpo nsị ndị dịbu adị n’ime ọhịa ahụ. Ìgwè anụ Rhino ndị nọ n’ógbè ahụ na-esi n’ụzọ dị otú a nụ, nyochaa, mesịakwa nabata ísìsì ha. Ya mere, iweghachi anụ Rhino mmadụ zụrụ n’ime ọhịa bụ usoro dị mgbagwoju anya nke pụrụ iwe ọtụtụ afọ.

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ndị ahụ Na-enweghị Nne na Nna?

Dị ka Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa Ụwa si kwuo, na 1970 e nwere ihe dị ka anụ Rhino ojii 65,000 n’Africa. Taa e nwere ihe na-erughị 2,500. Oké ndalata a abụwo nke ndị na-achụ nta n’ụzọ iwu na-akwadoghị kpatara bụ́ ndị gbuworo anụ Rhino maka akpụkpọ ahụ na mpi ha. N’azụmahịa nzuzo, ọnụ ahịa mpi anụ Rhino karịrị nke ọlaedo ya na ya hà n’ịdị arọ. N’ihi gịnị ka e ji ewere ya n’ihe dị oké ọnụ ahịa?

Otu ihe bụ na ná mba ụfọdụ dị n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ọtụtụ kwere na mpi e gwere egwe pụrụ ibelata ahụ ọkụ. Nnyocha ọgwụ egosiwo na a pụrụ inwe eziokwu ụfọdụ na nke a ma ọ́ bụ nanị ma e jiri ya mee ihe n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ elu karịa ndị ahụ a na-achọta n’ọgwụ ndị e nwere ugbu a. N’ezie, e nwere ọtụtụ ọgwụ ndị ọzọ na-ebelata ahụ ọkụ.

A na-achọkwa mpi anụ Rhino maka ihe ndị metụtara ọdịbendị. N’otu mba nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, mma nwa ntì gọrọ agọ bụ ihe a na-achọsi ike nke e ji ama dimkpa. Mma nwa ntì e ji mpi anụ Rhino mee isi ya dị oké ọnụ ahịa nke na ndị na-azụ ya dị njikere ịkwụ $580 maka otu isi e ji mpi ọhụrụ mee na $1,200 maka otu isi e ji mpi ochie mee.

N’ihi ịchụ ntá n’ụzọ iwu na-akwadoghị, n’ihe na-erughị afọ 20 ihe karịrị pasent 95 nke anụ Rhino Kenya nwụrụ. Ka ọ na-erule mmalite nke afọ ndị 1990, ọnụ ọgụgụ ahụ adawo site na 20,000 ruo nanị 400. Kemgbe ahụ, n’ihi usoro nchebe siri ike, ọnụ ọgụgụ anụ Rhino amụbawo ruo ihe dị ka 450. Kenya bụ ugbu a otu n’ime nanị mba atọ dị n’Africa ebe ọnụ ọgụgụ anụ Rhino ojii hà otú ọ dị ma ọ bụ na-amụba amụba. Ya mere, ọdịnihu Magnette na Magnum yiri ihe dị mma, ndị na-elekọta ha nwekwara olileanya na ha ga-emesịa sonyere ìgwè anụ Rhino dị n’ógbè ahụ ma bie ogologo ndụ na nke obi ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 8]

Magnum (n’aka ekpe) na Magnette mgbe ha dị ọnwa anọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya