Mgbe Olileanya Na Ịhụnanya Na-adịkwaghị
OTU nwa agbọghọ dị afọ 17 bụ́ onye Canada deturu ihe ndị mere o ji chọọ ịnwụ. Tụkwasị n’ihe ndị ọzọ, o depụtara: ‘Ịbụ onye owu na-ama na ịtụ ọdịnihu m ụjọ; inwe mmetụta nke ịbụ onye dị ala n’ezie n’ebe ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ nọ; agha nuklia; ihe nchebe ozone; ajọrọ m njọ n’ezie, n’ihi ya ọ dịghị mgbe m ga-enweta di, m ga-emechakwa nọrọ nanị m; echeghị m na e nwere oké ihe mere a ga-eji nọrọ ndụ, n’ihi ya gịnị mere m ga-eji chere iji chọpụta ya; ọ ga-ewepụrụ mmadụ ọ bụla ọzọ ibu arọ; ọ dịghịkwa mgbe onye ọ bụla ga-akpasu m iwe ọzọ.’
Ihe ndị a hà pụrụ ibu ụfọdụ n’ime ihe ndị mere ndị na-eto eto ji na-egbu onwe ha? Na Canada, “e wezụga ihe mberede ụgbọala, igbu onwe onye bụ ihe kasị akpata ọnwụ n’etiti ha ugbu a.”—The Globe and Mail.
Prọfesọ Riaz Hassan, nke Mahadum Flinders nke Ndịda Australia, na-ekwu n’ihe odide ya bụ́ “Ndụ Ndị A Na-adịghị Adị: Ihe Na-emenụ ná Ndị Ntorobịa Igbu Onwe Ha,” sị: “E nwere ọtụtụ ihe metụtara mmekọrịta ọha na eze ndị metụtara okwu ahụ ma yie ka ha enwewo mmetụta dị ịrịba ama n’ịrị elu nke ndị nọ n’oge uto igbu onwe ha. Ihe ndị a bụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke enweghị ọrụ nke ndị ntorobịa; mgbanwe n’ezinụlọ ndị Australia; ịrị elu nke iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi; ịrị elu nke ime ihe ike ndị ntorobịa; ahụ ike uche; na enweghị nkwekọ na-arị elu dị n’etiti ‘nnwere onwe e kwuru nanị n’ọnụ’ na iduzi onwe onye site n’ahụmahụ.” Ihe odide ahụ gara n’ihu na-ekwu na ihe ndị si n’ọtụtụ nnyocha pụta ekpughewo echiche enweghị nchekwube banyere ọdịnihu ma na-egosi na “ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-eto eto na-eji egwu na ịma jijiji ele ọdịnihu ha na nke ụwa anya. Ha na-ahụ ụwa nke agha nuklia bibiri na nke mmetọ na imebi gburugburu ebe obibi bibiri, ọha mmadụ nwere obi ọjọọ bụ́ nke nkà na ụzụ ya na-enweghị nchịkwa nakwa nke enweghị ọrụ jupụtara na ya.”
Dị ka otu njụta echiche e mere ndị dị afọ 16 ruo 24 gosiri, ihe ndị ọzọ na-akpata igbu onwe onye bụ oghere na-ebuwanye ibu n’agbata ndị bara ọgaranya na ndị ogbenye, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ịrị elu nke iji égbè eme ihe, mmetọ ụmụntakịrị, na “enweghị okwukwe n’ọdịnihu” nke zuru ebe nile.”
Magazin bụ́ Newsweek na-akọ na na United States, “ịdị adị nke égbè pụrụ ịbụ ihe bụ́ isi kasị akpata [ndị nọ n’afọ iri na ụma igbu onwe ha]. Otu nnyocha nke ji ndị nọ n’oge uto gburu onwe ha bụ́ ndị na-enweghị ọrịa uche pụtara ìhè tụnyere ụmụaka ndị na-egbughị onwe ha chọpụtara nanị otu ọdịiche: inwe égbè mgbọ dị na ya n’ụlọ. Nanị n’ihi echiche bụ́ na égbè adịghị egbu ndị mmadụ.” Ọtụtụ nde ezinụlọ nwekwara égbè ndị mgbọ dị na ha!
Egwu na ọha mmadụ na-adịghị echebara ndị ọzọ echiche pụrụ inuga ndị ntorobịa dị mfe nnweta ngwa ngwa n’igbu onwe ha. Tụlee: Ọnụ ọgụgụ nke mpụ ime ihe ike ndị e mere megide ndị dị afọ 12 ruo 19 ji ihe karịrị okpukpu abụọ karịa mpụ ndị e mere megide ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’ozuzu ya. A chọpụtara site ná nnyocha ndị e mere na “ụmụ agbọghọ dị malite n’afọ 14 ruo 24 yikarịsịrị ndị a ga-awakpo,” ka magazin bụ́ Maclean’s kọrọ. “Ndị inyom kasị bụrụ ndị ndị na-asị na ha hụrụ ha n’anya na-awakpo ma na-egbu.” Gịnị si na ya pụta? Egwu ndị a na ndị ọzọ “na-erichapụ obi ike na echiche nke ịnọ ná nchebe nke ụmụ agbọghọ ndị a.” N’otu nnyocha, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị e dinara n’ike ka dị ndụ bụ́ ndị a gbara ajụjụ ọnụ echewo echiche igbu onwe ha.
Otu akụkọ sitere New Zealand na-akọ akụkụ ọzọ banyere ndị na-eto eto igbu onwe ha, na-ekwu, sị: “Ụkpụrụ ụwa nke ịhụ ihe onwunwe n’anya jupụtara ebe nile nke na-eji akụ̀ na ụba, mma, na ike atụ inwe ihe ịga nke ọma nke mmadụ, na-eme ka ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwe mmetụta nke abaghị nnọọ uru na ịbụ ndị ọha na eze jụrụ.” Ọzọkwa, magazin bụ́ The Futurist na-ekwu nke a: “[Ndị ntorobịa] nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa siri ike nke imeju agụụ ozugbo, ịchọ inwetacha ihe nile na ịchọ ha ngwa ngwa. Ihe omume TV ndị kasị amasị ha bụ usoro ihe nkiri. Ọ ga-amasị ha ka ndụ ha jupụta n’otu ụdị ndị ahụ mara mma, yi ụdị uwe ndị kasị ọhụrụ, nwere nnukwu ego na ùgwù, n’arụghịkwa ọrụ ike.” Oké atụmanya ndị dị otú ahụ na-enweghị isi, nke a na-apụghị imezu emezu yiri ka ọ na-akpata ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi nkoropụ, ọ pụkwara iduga n’igbu onwe onye.
Ọ̀ Bụ Àgwà Na-azọpụta Ndụ?
Shakespeare dere, sị: “Ịhụnanya na-enye nkasi obi dị ka anwụ na-acha mgbe mmiri zosịrị.” Bible na-ekwu, sị: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) N’àgwà ahụ ka e nwere ihe na-akọwa nsogbu ndị na-eto eto bụ́ ndị pụrụ igbu onwe ha—ọchịchọ ha na-achọsi ịhụnanya na nkwurịta okwu ike. Akwụkwọ bụ́ The American Medical Association Encyclopedia of Medicine na-ekwu, sị: “Ndị na-achọ igbu onwe ha na-enwekarị oké owu ọmụma, ohere nke ịgwa onye na-ege ntị, nke nwere ọmịiko ma nwee nghọta okwu na-ezu mgbe ụfọdụ igbochi omume obi nkoropụ ahụ.”
Ndị na-eto eto na-enwekarị oké mkpa maka ịhụnanya na ịbụ ndị e ji kpọrọ ihe. Igbo ya na-esiwanye ike kwa ụbọchị n’ụwa a na-enweghị ịhụnanya na nke na-ebibi ebibi—ụwa nke ha na-enweghị ọnụ okwu na ya. Ịbụ onye nne ma ọ bụ nna jụrụ n’ihi ntisa ezinụlọ na ịgba alụkwaghịm pụrụ ịbụ otu ihe na-eso akpata ndị nọ n’oge uto igbu onwe ha. Ọjụjụ a na-apụtakwa ìhè n’ọtụtụ ụzọ.
Tụlee ọnọdụ nke ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-adịghị esokarị ụmụ ha anọ n’ụlọ. Mama na papa ha pụrụ itinye oge ha nile n’ọrụ ha ma ọ bụ na-enwe otu ụdị ntụrụndụ nke ụmụ ha na-adịghị eso enwe. Ozi ha ji ụzọ ọzọ na-ezigara ụmụ ha bụ ọjụjụ pụtara ìhè. Onye odeakụkọ na onye nchọpụta a ma ama bụ́ Hugh Mackay na-ekwu na “ndị mụrụ ụmụ na-aghọwanye ndị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị. Ha na-etinye onwe ha n’ọnọdụ mbụ iji chekwaa ụzọ ndụ ha. . . . N’ikwu ya hoo haa, ụmụaka adịghị ewukwa ewu. . . . Ihe siri ike, ndị mmadụ na-emikpukwa onwe ha n’ọchịchọ onwe ha.”
N’ọdịbendị ụfọdụ kwa, ụmụ nwoke ndị na-eme nganga n’ihi ịbụ nwoke nwere ike ghara ịchọ ka a hụ ha n’ọrụ inye nlekọta. Onye odeakụkọ bụ́ Kate Legge kwuru ya n’ụzọ dị mma, sị: “Ndị nwoke nwere ọchịchọ ijere ọha ozi na-ahọrọkarị ọrụ ịzọpụta ndụ ma ọ bụ ịgbanyụ ọkụ kama ọrụ inye nlekọta. . . . Ha na-ahọrọ ọrụ obi ike tara akpụ, nke na-achọghị ikwu ọtụtụ okwu nke ịlụso ihe ndị a na-ahụ anya ọgụ kama ọrụ ndị gụnyere isoro ndị mmadụ na-emekọrịta ihe na inye nlekọta.” N’ezie, otu n’ime ọrụ ndị kasị gụnye isoro ndị mmadụ na-emekọrịta ihe na inye nlekọta taa bụ ịbụ nne ma ọ bụ nna. Azụghị nwa nke ọma pụtara ịjụ nwa ahụ. N’ihi ya, nwa gị nwoke ma ọ bụ nwanyị pụrụ ịzụlite echiche na-adịghị mma banyere onwe ya na enweghị ezi nkà maka mmekọrịta ọha mmadụ. Magazin bụ́ The Education Digest na-ekwu, sị: “N’enweghị echiche dị mma banyere onwe ha, ụmụaka adịghị enwe ihe ndabere maka ime mkpebi ndị kasị bụrụ maka ọdịmma ha.”
Enweghị Olileanya Pụrụ Isi na Ya Pụta
Ndị nnyocha kwere na enweghị olileanya bụ isi ihe na-atụnye ụtụ n’igbu onwe onye. Gail Mason, bụ́ onye edemede banyere ndị ntorobịa igbu onwe ha n’Australia, kwuru, sị: “A na-ewere enweghị olileanya dị ka nke ya na echiche igbu onwe onye ka nwee njikọ karịa ịda mbà n’obi. Mgbe ụfọdụ a na-akọwa enweghị olileanya dị ka otu mgbaàmà nke ịda mbà n’obi. . . . Ọ na-abịakarị n’ụdị echiche zuru ebe nile nke inwe obi nkoropụ na enweghị obi ike banyere ọdịnihu nke ndị na-eto eto, karịsịakwa n’ọdịnihu ha banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba: na n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karị mmetụta nke enweghị olileanya banyere ọnọdụ zuru ụwa ọnụ.”
Ihe nlereanya na-adịchaghị mma nke ndị ọchịchị na-egosi n’ebe ime ihe n’eziokwu dị adịghị akpali ndị ntorobịa iwelite ọnọdụ ụkpụrụ omume ha. Mgbe ahụ omume na-abụ, “N’ihi gịnị ka m ga-eji na-esogbu onwe m?” Harper’s Magazine na-ekwu banyere ikike ndị ntorobịa nwere ịchọpụta ihu abụọ, sị: “Ndị na-eto eto, site n’isi imi n’ala ha iji chọpụta ihu abụọ, bụ n’ezie ndị na-agụ ihe nke ọma—ma ọ bụghị ịgụ akwụkwọ. Ihe ndị ha na-agụ nke ọma bụ mgbaàmà ndị metụtara ọha na eze bụ́ ndị na-esite n’ụwa nke ha na-aghaghị isi na ya nweta ihe ha ji ebi ndụ.” Gịnịkwa ka mgbaàmà ndị ahụ na-egosipụta? Onye dere akwụkwọ bụ́ Stephanie Dowrick na-ekwu, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe anyị nwejupụtara ihe ọmụma banyere ụzọ e si ebi ndụ karị. Ọ dịtụbeghị mgbe anyị bara ọgaranya karị ma ọ bụ gụọ akwụkwọ karị, ma e nwere obi nkoropụ ebe nile.” Ọ bụkwa nnọọ ole na ole na-egosi ezi ihe nlereanya ná ndị nọ n’ọkwá ndị dị elu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke okpukpe. Dowrick na-ajụ ajụjụ ole na ole bara uru, sị: “Ànyị ga-esi aṅaa nweta amamihe, ngwọta na ọbụna nzube n’ime nhụjuanya na-enweghị isi? Ànyị ga-esi aṅaa zụlite ịhụnanya n’ebe e nwere ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, iwe na-enweghị isi na anyaukwu?”
Ị ga-achọta azịza nye ajụjụ ndị a n’isiokwu anyị na-esonụ, ha pụkwara ịtụ gị n’anya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-eto eto na-eji egwu na ịma jijiji ele ọdịnihu ha na nke ụwa anya”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“Ohere nke ịgwa onye na-ege ntị, nke nwere ọmịiko ma nwee nghọta okwu na-ezu mgbe ụfọdụ igbochi omume obi nkoropụ ahụ”
[Igbe dị na peeji nke 6]
Mgbaàmà Ụfọdụ nke Igbu Onwe Onye
• Nsogbu ihi ụra, enwekwaghị agụụ iri nri
• Nkewapụ na ịnọpụrụ onwe onye iche, ịbụ onye pụrụ inwe ihe ọghọm
• Ịgbapụ n’ụlọ
• Oké mgbanwe n’ọdịdị ile anya
• Iji ọgwụ na/ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi
• Nchekasị na isi ọnwụ
• Ikwu okwu banyere ọnwụ; ozi ndị e dere ede banyere ịla onwe onye n’iyi; ihe osise na-egosi ime ihe ike, karịsịa megide onwe onye
• Obi amamikpe
• Enweghị olileanya, nchegbu, ịda mbà n’obi, ibe ákwá
• Inyefu ihe onwunwe onwe onye
• Etinyechaghị uche n’ihe
• Enwekwaghị mmasị n’ihe omume ndị na-enye obi ụtọ
• Ịkatọ onwe onye
• Inwe mmekọahụ aghara aghara
• Ndalata mberede n’ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, nsogbu ịga akwụkwọ
• Ịnọ n’òtù nzuzo ma ọ bụ ajọ òtù
• Oké obi ụtọ na-enweghị isi mgbe e nwesịrị ịda mbà n’obi
Ọ dabeere n’akwụkwọ bụ́ Teens in Crisis (Òtù Ndị Isi Ụlọ Akwụkwọ America) na Depression and Suicide in Children and Adolescents, nke Philip G. Patros na Tonia K. Shamoo dere
[Igbe dị na peeji nke 8]
Enyemaka Ndị Ọkà Dị Mkpa
Akwụkwọ bụ́ The American Medical Association Encyclopedia of Medicine na-ekwu na “ihe karịrị pasent 90 nke igbu onwe onye na-eme n’ihi ọrịa uche.” Ọ na-edepụta nrịanrịa ndị dị ka oké ịda mbà n’obi (ihe dị ka pasent 15), ọrịa echiche (ihe dị ka pasent 10), aṅụrụma (ihe dị ka pasent 7), nsogbu nke àgwà achọghị iso ndị mmadụ kpakọrịta (ihe dị ka pasent 5), na ụdị nsogbu uche ụfọdụ (ihe na-erughị pasent 5). Ọ na-enye ndụmọdụ, sị: “E kwesịrị ịgwọ ndị nile nwara igbu onwe ha nke ọma. Pasent 20 ruo pasent 30 nke ndị nwara igbu onwe ha na-emeghachi ya n’ime otu afọ.” Dr. Jan Fawcett na-ede, sị: “Ihe karịrị pasent 50 nke igbu onwe onye [na United States] bụ n’etiti ndị na-ahụbeghị ọkachamara banyere ahụ ike uche.” Akwụkwọ ọzọ na-ekwukwa, sị: “Akụkụ kasị mkpa nke ọgwụgwọ bụ ka onye ahụ gaa hụ dibịa na-agwọ ọrịa uche ozugbo o kwere mee iji nye aka gwọta ịda mbà n’obi ahụ kpatara ya.”
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịhụnanya na-ekpo ọkụ na ọmịiko pụrụ inyere onye ntorobịa aka inwe ekele maka ndụ