Mgbe Olileanya Na Ịhụnanya Lọghachiri
NDỊ mụrụ ụmụ, ndị nkụzi, na ndị ọzọ ọrụ ha metụtara ndị nọ n’oge uto na-aghọta na ma ha ma ndị ntorobịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ adịghị nke pụrụ ịgbanwe ụwa. E nwere mmetụta ndị na-akpa ike bụ́ ndị yiri oké ebili mmiri, nke na-adịghị onye pụrụ ịkwụsị ya. Ma, e nwere ọtụtụ ihe anyị nile pụrụ ime iji tụnye ụtụ n’ime ka ndị ntorobịa nwee obi ụtọ karị, nwee ahụ ike karị, ma bụrụ ndị dozigharịrị mmekọrịta ha.
Ebe mgbochi ọrịa ka ọgwụgwọ ya mma, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ichezi echiche banyere otú ụzọ ndụ ha na ihe ndị ha na-ebute ụzọ pụrụ isi metụta omume na akparamàgwà nke ụmụ ha. Ime ka e nwee ọnọdụ ịhụnanya na nke nchebara echiche n’ebe obibi na-enye nchebe bụ́ nke pụrụ ịkasị gbochie akparamàgwà nke ịla onwe onye n’iyi. Otu n’ime mkpa ndị ntorobịa kasị nwee bụ inwe onye ga-ege ha ntị. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ụmụ egeghị ntị, ikekwe ndị na-ekwesịghị ekwesị ga-eme otú ahụ.
Gịnị ka nke ahụ pụtara nye ndị mụrụ ụmụ taa? Wepụtara ụmụ gị oge mgbe ọ dị ha mkpa—mgbe ha dị na nwata. Nye ọtụtụ ezinụlọ nke a adịghị mfe. Ha na-adọlị iji nweta ihe e ji ebi ndụ, nke na-eme na ma nne ma nna aghaghị ịrụ ọrụ. Mgbe mgbe ndị nọworo na-adị njikere ma na-enwe ike ịchụ ọtụtụ ihe n’àjà iji wepụtakwuoro ụmụ ha oge enwetawo ụgwọ ọrụ nke ịhụ ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha na-enwe ihe ịga nke ọma karị ná ndụ. Otú ọ dị, dị ka e kwuru na mbụ, mgbe ụfọdụ n’agbanyeghị mgbalị kasị mma nke ndị mụrụ ụmụ tinyere, nsogbu ndị siri ike n’ebe ụmụ ha nọ pụrụ ibilite.
Ndị Enyi na Ndị Ọzọ Toworo Eto Pụrụ Inye Aka
Agha, ndina n’ike, na imetọ ndị ntorobịa chọrọ oké mgbalị n’aka ndị toworo eto na-echebara ha echiche n’ezie n’ịchịkwa mbibi e nwere. Ndị ntorobịa ahụmahụ ọjọọ ndị dị otú ahụ kpasasịrị uche nwere ike ghara imeghachi omume n’ụzọ dị mma ọbụna ná mgbalị ndị a na-eme iji nyere ha aka. Ọ pụrụ ịpụta itinye oge na mgbalị gị n’ebe ọ dị ukwuu. N’ezie ọ bụghị ihe na-egosi ịhụnanya ma ọ bụ amamihe iwetu ha ala ma ọ bụ ịjụ ha ajụ. Ànyị pụrụ imeghetụkwu obi anyị ma gosi obiọma na ịhụnanya dị mkpa iji ruo ndị ahụ nọ n’ihe ize ndụ nso?
Ọ dị ọ bụghị nanị ndị mụrụ ụmụ kamakwa ndị enyi na ọbụna ụmụnne mmadụ mkpa ịnọrọ na nche iji hụta omume ndị pụrụ igosi ọnọdụ mmetụta uche na-esighị ike na nke na-adịchaghị mma n’ebe ndị na-eto eto nọ. (Lee igbe bụ́ “Enyemaka Ndị Ọkà Dị Mkpa,” peji nke 8.) Ọ bụrụ na e nwere mgbaàmà, dị ngwa ige ntị. O kwe mee, gbalịa iji ajụjụ obiọma dọpụta okwu n’ọnụ ndị ntorobịa nwere nchegbu iji mesie ha obi ike banyere ezi ọbụbụenyi gị na ha. Ndị ikwu na ibe a tụkwasịrị obi nwere ike ịkwado ndị mụrụ ụmụ n’ime ihe maka ọnọdụ ndị siri ike; ma, n’ezie, ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iweghara ọrụ ndị mụrụ ụmụ. Ọtụtụ mgbe ọchịchọ igbu onwe onye nke ndị ntorobịa bụ arịrịọ siri ike maka nlebara anya—nlebara anya nke ndị mụrụ ụmụ.
Otu n’ime onyinye kasị mma nke mmadụ pụrụ inye ndị ntorobịa bụ olileanya siri ike maka ọdịnihu obi ụtọ, ihe mkpali maka ịdị ndụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa aghọtawo ịbụ eziokwu nke nkwa Bible kwere maka ọnọdụ ụwa ka mma ga-abịa n’oge na-adịghị anya.
Ndị A Napụtara Site n’Ihe Gaara Abụ Igbu Onwe Onye
Site na Japan, otu nwa agbọghọ bụ́ onye chere echiche ọtụtụ ugboro igbu onwe ya nwere nke a ikwu: “Lee ọtụtụ ugbo m nweworo ọchịchọ isoro ime otú ahụ. Mgbe m na-amụ ije, otu onye m tụkwasịrị obi metọrọ m n’ụzọ mmekọahụ. . . . N’oge gara aga, edewo m ihe ọtụtụ ugboro ná mpempe akwụkwọ na-asị ‘Achọrọ m ịnwụ’ nke na amakwaghị m ugboro ole. Aghọwo m otu n’ime Ndịàmà Jehova kemgbe, m na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye na-ezisa ozi ọma oge nile, ma ọchịchọ a ka na-enubata m n’obi site n’oge ruo n’oge. . . . Ma Jehova ekwewo ka m dịrị ndụ, o yikwara ka ọ na-agwa m n’ụzọ dị nro, ‘Nọgide na-adị ndụ.’”
Otu nwa agbọghọ dị afọ 15 si Russia kọwara, sị: “Mgbe m dị afọ asatọ, amalitere m iche na ọ dịghị onye ọ bụla chọrọ m. Ndị mụrụ m enweghị oge isoro m kwurịta okwu, agbalịkwara m idozi nsogbu m n’onwe m. Anọpụụrụ m onwe m. Mụ na ndị ikwu m sere okwu mgbe nile. Mgbe ahụ echiche nke igbu onwe m batara m n’obi. Lee obi ụtọ m nwere izute Ndịàmà Jehova!”
E sikwa Australia nweta okwu ndị a na-agba ume nke Cathy, bụ́ onye nọ ná mmalite afọ 30 na ụma ya kwuru, bụ́ nke na-egosi na obi nkoropụ pụrụ n’ezie ịghọ olileanya: “Arọrọ m nrọ mgbe nile banyere ụzọ dị iche iche nke isi gbuo onwe m ma n’ikpeazụ nwaa igbu onwe m. Achọrọ m ịgbapụ n’ụwa a, bụ́ nke jupụtara ná mmegbu, iwe, na nke na-abaghị uru. Ịda mbà n’obi mere ka o siere m ike isi ‘n’ọnyà udide’ ahụ nke m chere na o jichiri m pụta. N’ihi ya, igbu onwe m yiri ka ọ bụ ihe ngwọta dịnụ n’oge ahụ.
“Mgbe mbụ m nụrụ banyere ikwe omume nke ụwa ịghọ paradaịs, na-enwe ndụ nke udo, na nke obi ụtọ maka mmadụ nile, ọ gụrụ m agụụ n’ezie. Ma o yiri nnọọ nrọ na-apụghị ime eme. Otú ọ dị, nke nta nke nta amalitere m ịghọta ụzọ Jehova si ele ndụ anya na otú onye ọ bụla n’ime anyị dịruru oké ọnụ ahịa n’anya ya. Amalitere m inwe obi ike na e nwere olileanya maka ọdịnihu. N’ikpeazụ, achọtara m ụzọ isi gbapụ ‘n’ọnyà udide’ ahụ. Otú ọ dị, isi na ya pụta ghọrọ ihe siri ike. Mgbe ụfọdụ ịda mbà n’obi na-erikpu m, ihe nile na-agbagwojukwa m anya nke ọjọọ ya. Ma, ime Jehova Chineke ebe m na-elekwasị anya dọtara m nnọọ nso n’ebe ọ nọ ma mee ka m nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Ana m ekele Jehova maka ihe nile o meere m.”
Ọnwụ Ndị Ntorobịa Agaghị Adịkwa Ọzọ
Site n’ịmụ Bible, onye na-eto eto pụrụ ịghọta na e nwere ihe ka mma a ga-atụ anya ya—ihe onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi kpọrọ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” O nyere nwa okoro bụ́ Timoti ndụmọdụ, sị: “Na-enye ndị bụ́ ọgaranya . . . iwu, ka ha ghara . . . ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ; ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, . . . ka ha kpadooro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa, ka ha wee jide ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:17-19.
N’eziokwu, ndụmọdụ Pọl pụtara na anyị kwesịrị iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe, na-enyere ha aka inwe olileanya siri ike maka ọdịnihu. “Ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie” bụ ihe Jehova kweworo nkwa ya n’ụwa ọhụrụ ya nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.”—2 Pita 3:13.
Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị nọbu n’ihe ize ndụ aghọtawo na ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ụdị ndụ rụrụ arụ bụ nanị ogologo ụzọ nke gbara ngọ na-eduga n’ọnwụ, nke igbu onwe onye bụụrụ ụzọ ka nso. Ha amarawo na ụwa a, na agha, ịkpọasị, na akparamàgwà rụrụ arụ ya, na ụzọ ya nke enweghị ịhụnanya, ga-agabiga n’oge na-adịghị anya. Ha amụtawo na ọnọdụ ụwa a enwekwaghị mmekwata. Ha ekwenyesiwo ike na Alaeze Chineke bụ nanị ezi olileanya dịnụ, n’ihi na ọ ga-eweta ụwa ọhụrụ bụ́ ebe ma ndị ntorobịa ma ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi na-adịghị mgbe ha ga-anwụ—ee e, ọbụna ha agaghịkwa achọ ịnwụ ọzọ.—Mkpughe 21:1-4.
[Igbe dị na peeji nke 8]
Enyemaka Ndị Ọkà Dị Mkpa
Akwụkwọ bụ́ The American Medical Association Encyclopedia of Medicine na-ekwu na “ihe karịrị pasent 90 nke igbu onwe onye na-eme n’ihi ọrịa uche.” Ọ na-edepụta nrịanrịa ndị dị ka oké ịda mbà n’obi (ihe dị ka pasent 15), ọrịa echiche (ihe dị ka pasent 10), aṅụrụma (ihe dị ka pasent 7), nsogbu nke àgwà achọghị iso ndị mmadụ kpakọrịta (ihe dị ka pasent 5), na ụdị nsogbu uche ụfọdụ (ihe na-erughị pasent 5). Ọ na-enye ndụmọdụ, sị: “E kwesịrị ịgwọ ndị nile nwara igbu onwe ha nke ọma. Pasent 20 ruo pasent 30 nke ndị nwara igbu onwe ha na-emeghachi ya n’ime otu afọ.” Dr. Jan Fawcett na-ede, sị: “Ihe karịrị pasent 50 nke igbu onwe onye [na United States] bụ n’etiti ndị na-ahụbeghị ọkachamara banyere ahụ ike uche.” Akwụkwọ ọzọ na-ekwukwa, sị: “Akụkụ kasị mkpa nke ọgwụgwọ bụ ka onye ahụ gaa hụ dibịa na-agwọ ọrịa uche ozugbo o kwere mee iji nye aka gwọta ịda mbà n’obi ahụ kpatara ya.”