Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Dịgide Ndụ n’Enweghị Nne na Nna?
“Ndị mụrụ m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ atọ, nwanne m nwanyị dịkwa afọ anọ. Ha sọrọ mpi n’ụlọikpe maka onye ga-akpọrọ anyị, anyị mesịkwara laara mama anyị. Otú ọ dị, mgbe m dị afọ asaa, mụ na nwanne m nwanyị kpebiri ịga soro papa anyị biri.”—Horacio.
KA AFỌ ole na ole gasịrị, papa Horacio na enyi ya nwanyị ya na ya bi pụrụ—gbahapụ Horacio na nwanne ya nwanyị. Horacio na-echeta, sị: “Otú ahụ ka m si ghọọ onyeisi ezinụlọ nke gụnyere nwanne m nwanyị dị afọ 19, nwanne m nwanyị nke otu nna ji mụ na ya dị afọ 12—bụ́ onye kpebiri isoro anyị nọrọ—na mụ onwe m, mgbe m dị afọ 18.”
Dị ka isiokwu bu nke a ụzọ gosiri, ọtụtụ nde ndị na-eto eto gburugburu ụwa na-achọta onwe ha ịnọ n’enweghị nne na nna.a Dị ka Horacio, a gbahapụwo ụfọdụ ndị ntorobịa. Ma ndị ọzọ abụrụwo ndị nne na nna ha nwụnahụrụ ma ọ bụ agha ma ọ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha ekewapụwo ha n’ebe ha nọ. N’agbanyeghị ihe ọnọdụ bụ, ịnọ n’enweghị nne na nna pụrụ isi ike ma kpata mkpasasị uche. Ọ pụkwara ime ka i nwee ibu ọrụ ndị karịrị gị.
‘Ònye Ga-elekọta M?’
Ókè ị ga-anagideru ya na-adabere nke ukwuu n’afọ ole ị dị na n’ọnọdụ gị. O doro anya na ọnọdụ ahụ na-esi ike nke ukwuu karị ma ọ bụrụ na ị ka bụ nwata ma ọ bụ nọrọ ná mmalite afọ iri na ụma. Ọbụna mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbụ na a gbahapụbeghị gị kpam kpam. Ikekwe nwanne ndị mụrụ gị nke nwoke, nwanne ndị mụrụ gị nke nwanyị, ma ọ bụ deede ma ọ bụ daada gị dị njikere ịkpọrọ gị.
N’etiti Ndịàmà Jehova, a na-ele ilekọta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ anya dị ka akụkụ ofufe ha. (Jemes 1:27; 2:15-17) Ọtụtụ mgbe kwa, ndị mmadụ n’otu n’otu nọ n’ọgbakọ ga-enye aka. Dị ka ihe atụ, Horacio na ụmụnne ya ndị nwanyị esorowo Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma na-aga nzukọ ha. N’ebe ahụ ha zutere otu ezinụlọ bụ́ ndị Kraịst malitere inyere ha aka. “Lee obi ekele m nwere n’ebe Jehova nọ maka nduzi ya na nlekọta ịhụnanya ya kwa ụbọchị!” ka Horacio na-ekwu. “Anyị nwetara ngọzi nke ịbụ ndị otu ezinụlọ na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ nnọọ ihe bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ nwere ụmụ na-eto eto anyị na ha bụ ọgbọ nyeere aka. Ha kpọọrọ anyị nnọọ dị ka ụmụ ha, n’ihi ya kwa, dị ka ọ na-adịtụbeghị mbụ, ọ dị anyị ka anyị bụ akụkụ nke ezinụlọ, bụ́ nke anyị pụrụ ịdabere na ya maka enyemaka.”
Otú ọ dị, ọ bụghị ndị ntorobịa nile ka ihe na-adabara nke ọma otú a. Otu akụkọ nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Mgbe ụfọdụ a na-akpọbata ụmụaka ndị a hapụrụ nanị ha n’ezinụlọ ndị a na-eti ha ihe na ha, na-amanye ha ịrụ ọrụ n’akwụghị ha ụgwọ ma ọ bụ n’enyeghị ha ohere maka ọganihu, jiri ha na-agba akwụna ma ọ bụ ọbụna jiri ha mere ohu.” Ya mere, ọ bụrụ na i nwere onye na-elekọta gị anya nke ọma, nwee obi ekele.
N’eziokwu, esoghị ndị mụrụ gị nọrọ bụ mfu dị oké njọ. Dị ka ọ na-adịkarị, i nwekwara ike na-ewe iwe n’ihi enweghị ha ilekọta gị. Ịbụ onye onye ikwu ma ọ bụ nwanne gị nke okenye na-agwa ihe ọ ga-eme pụrụ ime ka iwe gị ka njọ. Ma ewesala ndị na-agbalị ilekọta gị iwe. Bible na-ekwu, sị: “Lezie anya ka ọnụma ghara ịrafu gị [ime omume mkpasu iwe, NW] . . . Lezie anya, echela ajọ ihe ihu.” (Job 36:18, 21) Cheta nwa agbọghọ ahụ dị na Bible aha ya bụ Esta. Dị ka nwa mgbei, nwa nwanne ndị mụrụ ya nke okenye bụ́ Mọdekaị zụlitere ya. Ọ bụ ezie na ọ bụghị papa ya, Mọdekaị “nyere ya iwu,” bụ́ ndị o rubere isi na ha, ọbụna mgbe o toruru ogo mmadụ! (Esta 2:7, 15, 20) Gbalịa ịdị na-erube isi ma na-enye nkwado n’onwe gị. Ọ ga-enye nnọọ aka ibelata esemokwu ma mee ka ndụ dị mfe karị nye ndị nile o metụtara.
Ibu Ọrụ Ezinụlọ
Ọ bụrụ na i nwere deede ma ọ bụ daada—ma ọ bụ ọ bụrụ na i toruola—ikekwe ọ pụrụ ikwe gị na ụmụnne gị mee ibiri nke unu. Ọ pụrụ ọbụna ịbụ na ị ghaghị ịrụ ọrụ onyeisi ezinụlọ—nke yiri ibu ọrụ karịrị gị! Otú ọ dị, n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto arụwo ọrụ na-atụ n’anya nke ịzụlite ụmụnne ha.
N’ụzọ kwere nghọta, ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị ime ihe banyere iwe iwe. Ịtụgharị uche n’eziokwu ahụ nke bụ́ na ị hụrụ ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwanyị n’anya ma na-echebara ha echiche pụrụ inyere gị aka inwekwu echiche ziri ezi. Ọ pụkwara inye aka ma ọ bụrụ na i lee ilekọta ha anya dị ka ọrụ Chineke nyere gị. E kwuwerị, e nyere ndị Kraịst iwu ilekọta ndị nke aka ha. (1 Timoti 5:8) Ma ihe ọ masịkwara gị mee ịbụrụ ụmụnne gị nne ma ọ bụ nna, ị pụghị n’ezie ịbụ nne ma ọ bụ nna ha.
Ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya ka ụmụnne gị mee ihe i kwuru otú ha si mee nke ndị mụrụ unu kwuru. N’eziokwu, ọ pụrụ iwe oge dị ukwuu tupu ha atụsara ahụ ma nye gị nkwado. Ya mere ka ọ dị ugbu a, gbalịa ịghara inwe nkụda mmụọ. Zere “ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile.” Site n’ihe nlereanya gị, kụziere ụmụnne gị ‘inwerịta obiọma n’ahụ ibe ha, inwe obi ọmịiko, iwerekwa amara gbaghara onwe ha.’—Ndị Efesọs 4:31, 32.
Horacio na-ekweta na ya mehiere ihe: “Mgbe ụfọdụ adị m nnọọ aka ike n’ebe ụmụnne m nọ. Ma ruo n’ókè ụfọdụ, nke ahụ bụ nchebe, anyị nọgidekwara na-akpa àgwà ziri ezi n’anya Jehova.”
Ịkpatara Onwe Gị Ihe
Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị anọghị ya ilekọta gị, obi abụọ adịghị ya na ịkpatara onwe gị ihe n’ụzọ ihe onwunwe na-abụ nchegbu bụ́ isi. Ikekwe ụfọdụ ndị toworo eto nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ inyere gị na ụmụnne gị aka, ma ọ bụrụ na i nwere, ịmụta otú e si esi nri, ihicha ihe, na ịrụ ọrụ ụlọ ndị ọzọ ị na-aghaghị ịdị na-arụ ugbu a. Ma gịnị ka i ga-eme iji nweta ego? Ikekwe ọ dịkarịghị ihe ọzọ ị pụrụ ime karịa ịgbalị ịchọta ọrụ.
Otú ọ dị, ọrụ dị ụkọ nye ndị ntorobịa na-agụghị akwụkwọ hie nne, na-enwechaghị ahụmahụ, ma ọ bụ na-enwechaghị nkà ọrụ. Ya mere ọ bụrụ nnọọ na ọ ga-ekwe gị mee inwetacha agụmakwụkwọ bụ́ isi—ma ọ bụ ọbụna ịnarakwu ọzụzụ ọrụ—hụ na i mere otú ahụ. Horacio na-echeta, sị: “Mụ na daada m rụrụ ọrụ ma kwadoo agụmakwụkwọ m na nke nwanne m nwanyị otu nna ji mụ na ya.” Ọ bụrụ na i bi n’ala na-emepe emepe, ọ pụrụ ịbụ na ị ghaghị iji ọgụgụ isi gị mee ihe iji chọta ọrụ.—Lee “Imepụta Ọrụ ná Mba Ndị Na-emepe Emepe,” dị ná mbipụta Teta! nke October 22 (Bekee), 1994.
N’ala ndị mepere emepe n’ụzọ akụ̀ na ụba karị, ọ pụrụ ọbụna ikwe omume inweta enyemaka ego site n’aka gọọmenti. Ọtụtụ mgbe, a na-enwe ụlọ ọrụ ndị gọọmenti ma ọ bụ ndị mmadụ nwe bụ́ ndị e guzobere maka inyere ụmụaka ndị na-enweghị nne na nna ma ọ bụ ndị a gbahapụrụ agbahapụ aka. Dị ka ihe atụ, ụlọ ọrụ ụfọdụ pụrụ inyere gị aka inweta nri ma ọ bụ ịchọta ebe ị ga-ebi. N’ezie, i kwesịrị iji enyemaka ego ọ bụla i na-enweta eme ihe n’ụzọ amamihe. ‘Ego bụ ndo,’ ka Bible na-ekwu. (Eklisiastis 7:12) Ọ gwụlakwa ma i na-eji nlezianya na-eme ihe n’ime atụmatụ mmefu ya na n’iji ya na-azụ ihe, ego pụrụ ‘imere onwe ya nku ma fepụsịa.’—Ilu 23:4, 5.
Ịkpatara onwe gị ihe n’ụzọ ihe onwunwe nwere ike ọ gaghị abụcha nsogbu ma ọ bụrụ na onye toworo eto na-elekọta gị. Otú ọ dị, n’ọdịnihu oge ga-abịa mgbe ọ ga-adị gị mkpa ịkpatara onwe gị ihe. Ebe i na-enwekwaghị nne na nna ịgba gị ume n’agụmakwụkwọ gị, ọ pụrụ ịchọ nnọọ mgbalị itinye uche n’ọmụmụ ihe gị. Ndụmọdụ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi nyere Timoti banyere ọganihu ime mmụọ pụkwara imetụta ọmụmụ ihe ụlọ akwụkwọ gị: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè.” (1 Timoti 4:15) N’ime otú a, ị ga-esetịpụrụ ndị gị na ha nọ ezi ihe nlereanya ma ritekwa uru n’onwe gị.
Nke kasị mkpa n’ime ha nile bụ igbo mkpa ime mmụọ gị. Gbalịa iguzobe usoro ihe omume ime mmụọ a haziri ahazi. (Ndị Filipaị 3:16) Dị ka ihe atụ, n’etiti Ndịàmà Jehova, ọ bụ omume ezinụlọ nile ịtụle otu akụkụ Bible kwa ụbọchị. Gịnị ma i mee nke a akụkụ nke ihe i na-eme mgbe dum? Inwe usoro ọmụmụ Bible na ịga nzukọ ndị Kraịst mgbe dum ga-enyekwara gị aka isi ike n’ụzọ ime mmụọ.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ịnagide Ihe Ịma Aka Ahụ
Mmadụ ịnọ n’enweghị nne na nna na-esi ike, ma ọ pụtaghị na ọ na-akpatacha ndakpọ olileanya na enweghị obi ụtọ. Paola dị afọ 20 bụ onye nne ya nwụrụ mgbe ọ dị nanị afọ isii. Nna ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri. Otu nwanyị nwere obiọma kpọọrọ ya na ụmụnne ya ndị nwanyị anọ. Ndụ ya ọ̀ bụrụwo kpam kpam nke nhụsianya? Ee e. Paola na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya anyị abụghị kpọmkwem ezinụlọ dị otú ọ na-adị, ma anyị na-ebi ndụ otú o kwesịrị. N’eziokwu, ịhụnanya anyị nwere n’etiti onwe anyị siri ike karịa nke e nwere n’ihe ka ọtụtụ n’ezinụlọ dị iche iche.”
Nwanne nwanyị Paola bụ́ Irene na-ekwukwasị: “Ọ bụ ezie na anyị nọ n’enweghị nne na nna, anyị dị nnọọ ka ndị ọzọ na-eto eto.” Gịnị bụ ndụmọdụ ọ na-enye ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ a? “Echela na ihe agazighịrị gị.” Horacio na-ekwukwa, sị: “Ọnọdụ a mere ka m tozuo okè ngwa ngwa.”
Nne na nna mmadụ ịnwụ bụ otu n’ime ihe ndị a pụrụ ichetụ n’echiche kasị egbu mgbu. Otú ọ dị, jide n’aka na site n’enyemaka Jehova, ị pụrụ ịdịgide ndụ ma nweta ngozi ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu ahụ bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . N’ihi Gịnị Ka M Ga-eji Nọrọ n’Enweghị Nne na Nna?,” dị ná mbipụta Teta! nke December 8, 1998.
[Foto dị na peeji nke 27]
Ị pụrụ inweta nkwado site n’aka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst