Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 4/8 p. 31
  • Gosi na Ị Na-eche Banyere Ha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosi na Ị Na-eche Banyere Ha
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbu Onwe Onye—Ihe Otiti nke Ndị Na-eto Eto
    Teta!—1998
  • Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2001
  • Ihe Mere Ike Ndụ Ji Agwụ Ndị Mmadụ
    Teta!—2001
  • Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè
    Teta!—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 4/8 p. 31

Gosi na Ị Na-eche Banyere Ha

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Canada

Nhụjuanya ndị ọzọ na-amaghị maka ya nke ọtụtụ ndị agadi nọ na Canada na-enwe na-eme ka ha na-egbu onwe ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị egwu. Otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ Vancouver Sun na-ekwu na ọ bụ ezie na otu onye n’ime 200 ndị na-eto eto na-anwa igbu onwe ha na-emesi nwụọ, nkezi ya bụ otu onye n’ime mmadụ 4 maka ndị gafeworo afọ 65. E kwenyekwara ọbụna na “a dịghị akọcha banyere ndị agadi nile gburu onwe ha, n’ihi na ọ pụrụ isi ike ịmata mgbe ndị agadi nwere nsogbu ahụ ike siri ike gburu onwe ha na mgbe ha nwụrụ n’onwe ha.”

N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na ọtụtụ n’ime ndị agadi na-akwụsị inwe ọchịchọ ịdị ndụ? Dibịa na-agwọ ọrịa uche na Mahadum British Columbia, bụ́ Oluwafemi Agbayewa, bụ́ ọkachamara n’okwu banyere ndị agadi igbu onwe ha, na-ezo aka n’ịda mbà n’obi, esoghị ndị ọzọ kpakọrịta, na owu ọmụma dị ka ihe ndị so na-akpata ya. Gerry Harrington, bụ́ onye nduzi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Inye Ihe Ọmụma Banyere Igbu Onwe Onye nke dị na Calgary, Alberta, na-ekwu na ka ndị mmadụ na-eme agadi, ha “na-akwụsị inwe ùgwù ha, ike ha, ikike nchịkwa ha. . . . Na mberede, ọ dịghị onye ọ bụla na-ajụkwa ha echiche ha. Ọtụtụ ndị mmadụ na-emesị bụrụ ndị a kpọgara n’ogige a na-elekọta ndị agadi, n’enweghị ihe ha na-eme ma e wezụga ịnọ na-azụ kaadị na ikiri TV.” Ihe na-eme ka mmetụta a ka njọ bụ eziokwu ahụ bụ́ na ọha na eze na-ewere ịbụ ntorobịa dị ka ihe dị mkpa, tinyere ịnọrọ onwe onye, ịrụpụta ihe, na ịdị gara gara—àgwà ndị na-ebelata mgbe mmadụ na-eme agadi.

Otú ọ dị, n’anya Jehova Chineke, a na-ewere ndị agadi dị ka ndị dị oké mkpa. A pụrụ ịhụ ihe àmà na-egosi na ọ na-aghọta mkpa ha n’ụzọ mmetụta uche ha nke ọma n’iwu ahụ o nyere ndị Israel oge ochie: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ́, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị.”—Levitikọs 19:32.

Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi ‘sọpụrụ’ ndị agadi? Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na okwu amamihe agaghị na-esi n’ọnụ ha na-apụta mgbe nile, ime agadi pụkwara ime ka ezughị okè ha pụtakwuo ìhè, anyị kwesịrị ịkwanyere ha ùgwù. Gosi na ị na-eche banyere ha. Gosi ha nkwanye ùgwù, nsọpụrụ na ekele site n’iji nghọta na amamihe ha na-eme ihe, karịsịa mgbe e jiworo mmụọ Chineke na ezi ihe ọmụma nke Okwu ya duzie ndụ ha.

E nwere ọtụtụ ihe Okwu Chineke na-akụziri anyị n’ihe banyere ilekọta ndị agadi na ịsọpụrụ ha. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko degara ndị na-ebipụta magazin a akwụkwọ ma rịọ maka akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya