Ndị Agadi Na-abawanye Ụba n’Ụwa
NA 1513, onye Spain na-eme njem nchọpụta bụ́ Juan Ponce de León si na mmiri gbagoo n’ụsọ oké osimiri a na-amaghị ama dị n’Ebe Ugwu America. Otu akụkọ na-ekwu na ebe ọ bụ na ókèala ọ chọpụtara jupụtara n’okooko osisi, ọ kpọrọ ya Florida, nke pụtara “Jupụtara n’Okooko Osisi” n’asụsụ Spanish. Ichepụta aha dị mfe. Ịchọta isi njem ya—isi iyi mmiri nke nwere ikike ime ka ndị mere okenye ghọọ ndị ntorobịa—ekweghị omume. Mgbe o jisịrị ọtụtụ ọnwa chọchaa n’ala ahụ, onye ahụ na-eme njem nchọpụta kwụsịrị ọchịchọ ọ na-achọ isi iyi ntorobịa dị n’akụkọ ifo ma banye n’ụgbọ mmiri ya gawa n’ihu.
Ọ bụ ezie na isi iyi ntorobịa ka bụ ihe a na-apụghị ịchọta achọta taa dị ka ọ dị n’ụbọchị Ponce de León, o yiri ka mmadụ ọ chọpụtawo ihe Betty Friedan na-ede akwụkwọ kpọrọ “isi iyi nke nká.” O kwuru nke a n’ihi mmụba dị ukwuu nke ndị agadi n’ụwa nile. Ugbu a ọtụtụ ndị na-eme agadi nke na ìgwè mejupụtara ndị bi ụwa na-agbanwe. N’ihi ya, ndị agadi na-aba ụba n’ụwa.
“Otu n’Ime Ọganihu Kasị Ukwuu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Nwere”
Ndekọ ụba mmadụ na-eme ka ọ pụta ìhè. Ná mmalite narị afọ a, ọbụna ná mba ndị kasị baa ọgaranya, afọ ndụ mmadụ nwere ike iru malite mgbe a mụrụ ya erughị afọ 50. Taa, ọ rịruwo ihe karịrị afọ 75. N’otu aka ahụ, ná mba ndị ka na-emepe emepe dị ka China, Honduras, Indonesia, na Vietnam, nkezi afọ ndụ mmadụ nwere ike iru malite mgbe a mụrụ ya ejiriwo afọ 25 karịa ihe ọ bụ na nanị iri afọ anọ gara aga. Kwa ọnwa, n’ụwa nile otu nde mmadụ na-eru afọ 60. N’ụzọ na-eju anya, kama ịbụ ndị na-eto eto, ọ bụ ndị dị afọ 80 ma ọ bụ karịa, bụ́ ‘ndị agadi,’ bụzi ìgwè ọnụ ọgụgụ ya kasị arị elu ngwa ngwa n’ụwa.
“Ịgbatịkwu afọ ndụ mmadụ nwere ike iru,” ka ọkà n’ihe banyere ụba mmadụ bụ́ Eileen Crimmins na-ekwu na magazin bụ́ Science, “abụwo otu n’ime ọganihu kasị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere.” Òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwetara, iji dọrọkwa uche gaa n’ihe a a rụzuru, ọ kpọwo afọ 1999 Afọ Ndị Mere Okenye nke Mba Nile.—Lee igbe dị na peji nke 11.
Ihe Dị Mkpa —Mgbanwe nke Echiche
Otú ọ dị, ọganihu a gụnyere ihe karịrị mgbanwe nke afọ ndụ mmadụ nwere ike iru. Ọ gụnyekwara mgbanwe nke ụzọ mmadụ si ele ime agadi anya. N’ezie, echiche nke ime agadi ka na-echegbu ọtụtụ ndị mmadụ, ọbụna na-atụ ha ụjọ, n’ihi na anụ ahụ ịdọlị na enwekwaghị ike icheta ihe nke ọma na ime agadi na-agakarị ụkwụ na ụkwụ. Otú ọ dị, ndị nnyocha na-amụ ihe banyere ime agadi na-ekwusi ike na ime agadi na ịrịa ọrịa bụ ihe abụọ dị iche. Ndị mmadụ dị nnọọ iche n’ụzọ ha si eme agadi. E nwere ọdịiche, ka ndị nnyocha na-ekwu, dị n’etiti ime agadi n’afọ ndụ na ime agadi n’elu ahụ. (Lee igbe bụ́ “Gịnị Bụ Ime Agadi?”) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mmadụ ịkata ahụ na ịgbada agbada adịghị agakọtakarị.
N’eziokwu, ka ị na-eme agadi, ị pụrụ ime ihe ndị ga-emeziwanye ọdịdị nke ndụ gị. N’eziokwu, ihe ndị a agaghị eme ka ị bụrụ nwata, ma ha pụrụ ime ka i nwee ahụ ike ka ị na-eme okenye. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụfọdụ n’ime ihe ndị a. Ọ bụrụgodị na ihe banyere ime agadi abụghị ihe bụ́ isi na-echegbu gị ugbu a, ọ dị gị mkpa ịgụrụ gawa, n’ihi na n’oge na-adịghị anya ọ ga-abụ.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]
AFỌ NDỊ MERE OKENYE NKE MBA NILE
“N’ịbụ onye gbaworo afọ 60 . . . , a na-agụnyekọtazi m ugbu a ná ndekọ ọnụ ọgụgụ m zoro aka na ya ná mmalite,” ka Odeakwụkwọ Ukwu nke Òtù UN bụ́ Kofi Annan kwuru na nso nso a n’oge ememe mbido Afọ Ndị Mere Okenye nke Mba Nile. E nwere ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ Maazị Annan. Ndị nnyocha na-ekwu na mgbe ọ na-erule ngwụsị narị afọ a, n’ọtụtụ mba 1 onye n’ime mmadụ 5 ọ bụla ga-agba afọ 60 ma ọ bụ karịa. Ụfọdụ n’ime ha ga-enwe mkpa nke nlekọta, ma ha nile ga-enwe mkpa nke ụzọ ha pụrụ isi nọgide n’adabereghị n’onye ọzọ, na-enwe ùgwù, ma na-arụpụta ihe. Iji nyere ndị na-atụpụta ụkpụrụ aka imeri ihe ịma aka nke ‘mgbanwe a nke ìgwè mejupụtara ụba mmadụ’ na ịghọta “uru ime agadi bara n’ọha mmadụ” nke ọma karị, na 1992, Nzukọ Ezumezu nke UN kpebiri ịkpọ 1999 Afọ Ndị Mere Okenye nke Mba Nile. “Ịghọ Ọha na Eze nke Ndị Nọ n’Afọ Ndụ Nile Mejupụtara” bụ isiokwu dịịrị afọ a pụrụ iche.
[Foto]
Kofi Annan
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto UN
Foto UN/DPI nke Milton Grant sere
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
GỊNỊ BỤ IME AGADI?
“Ihe e ji enyocha ndụ na-egosi nnọọ ihe dị inyoghị inyoghị ma e jiri ya nyochaa ime agadi,” ka otu onye nnyocha na-ekwu. “Ọ dịghị onye na-aghọtazu ya,” ka onye nnyocha ọzọ na-ekwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ ihe banyere ime agadi anwawo ịkọwa ya. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe nghọta, ka ha na-ekwu, ime agadi bụ afọ ole mmadụ gbaworo. Ma ịka nká abụghị nanị ngafe nke afọ. A dịghị ekwukarị na nwatakịrị na-eme agadi n’ihi na ime agadi nwere echiche nke enwechaghị ume. Ime agadi bụ aka ọjọọ afọ ndụ mmadụ na-akpa ahụ onye ahụ. Ụfọdụ ndị yiri nwata ma e jiri ọdịdị ha tụnyere afọ ndụ ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ya ka a na-ekwu mgbe a gwara mmadụ na o “nwere ahụ nwata.” Iji gosi ihe dị iche n’etiti ime agadi n’ihi afọ ndụ na ime agadi n’elu ahụ, ndị nnyocha na-akọwakarị ime agadi n’elu ahụ (ime agadi nke e ji mgbanwe ọjọọ mara) dị ka ịka nká.
Prọfesọ n’ihe ọmụmụ anụmanụ bụ́ Steven N. Austad na-akọwa ịka nká dị ka “ndakpọ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ikike nile dị n’ahụ mmadụ bụ́ nke na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka oge na-aga.” Dr. Richard L. Sprott, nke Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ime Agadi, na-ekwukwa na ime agadi “bụ ndakpọ na-eme nwayọọ nwayọọ n’akụkụ ụfọdụ nke usoro ihe ndị dị n’ahụ anyị nke na-eme ka anyị chịkwaa nchekasị.” Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkachamara kwere na inye nkọwa doro anya banyere ime agadi ka bụ ihe ịma aka. Ọkachamara n’ihe banyere ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ bụ́ Dr. John Medina na-akọwa ihe kpatara ya: “Site n’isi ruo na mkpịsị ụkwụ, site na protein ruo na DNA, site mgbe a mụrụ mmadụ ruo n’ọnwụ ya, imerime ndakpọ na-ewere ọnọdụ iji mee ka mmadụ nke nwere puku ijeri mkpụrụ ndụ 60 mee agadi.” Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị nnyocha na-ekwubi na ime agadi bụ “nke kasị dị mgbagwoju anya n’ime nsogbu nile nke ihe ndị dị ndụ”!