Echiche nke Bible
Ịdị n’Otu n’Ụzọ Okpukpe n’Alụmdi na Nwunye—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
OTU ezinụlọ anọdụ ala iri nri anyasị. Ka nna ha na-ekpe ekpere, nne ha ekpegara chi ọzọ ekpere n’ime obi ya. N’ezinụlọ ọzọ nwunye na-aga otu chọọchị, ma di ya na-aga ụlọ nzukọ ndị Juu. E nwere ezinụlọ ndị nne ma ọ bụ nna na-akụziri ụmụ ha ihe banyere Santa Claus, ebe onye nke ọzọ na-akọrọ ha banyere Hanukkah.
Dị ka nnyocha ndị e mere na nso nso a gosiri, ọnọdụ ndị dị otú ahụ aghọwo ihe a na-ahụkarị ka ọtụtụ ndị mmadụ na-alụ ndị na-anọghị n’okpukpe ha. Otu nnyocha na-egosi na na United States, ugbu a pasent 21 nke ndị Katọlik na-alụ ndị na-anọghị n’okpukpe ha; n’etiti ndị Mormon ọnụ ọgụgụ ahụ bụ pasent 30; nke ndị Alakụba, pasent 40; nke ndị Juu, ọ gafekwara pasent 50. N’ihi ọtụtụ narị afọ nke ibu iro okpukpe, ụfọdụ na-ele alụmdi na nwunye nke ndị na-anọghị n’otu okpukpe anya dị ka mmeri megide ekweghị ibe nọrọ. Otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere, sị: “A ga-emere alụmdi na nwunye ndị gwara ọgwa bụ́ ndị ọ fọrọ nke nta ka ha bụrụ ụdị ọ bụla ememe.” Nke a ọ̀ bụ echiche Bible?
E kwesịrị ịrịba àmà na Bible akwadoghị ajọ mbunobi nke agbụrụ. Okwu Chineke na-akwado eleghị agbụrụ anya n’ihu. Pita onyeozi kwuru okwu n’ụzọ doro anya banyere nke a, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) N’otu mgbe ahụ, Bible na-ezi na ezi ndị na-efe Jehova ofufe kwesịrị ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) N’ihi gịnị?
Nzube nke Alụmdi na Nwunye
Chineke zubere ka alụmdi na nwunye bụrụ nkekọ kasị chie anya. (Jenesis 2:24) N’ime ndokwa alụmdi na nwunye, Chineke ebughị nanị mkpakọrịta n’uche. Mgbe Jehova kenyere di na nwunye mbụ ahụ ọrụ ịzụ ụmụ na ilekọta ebe obibi ha bụ́ ụwa, o gosiri na ha ga-arụkọ ọrụ n’ụzọ chiri anya n’imezu uche ya. (Jenesis 1:28) Site n’ịgbakọ aka na-efe Chineke ofufe n’akụkụ a, di na nwunye ga-enwe, ọ bụghị nanị mkpakọrịta, kama njikọ chiri anya, na-adịgidekwa adịgide.—Tụlee Malakaị 2:14.
Jisọs zoro aka ná njikọ a mgbe o kwuru okwu ahụ a maara nke ọma: “Ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ, kama ọ bụ otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.” (Matiu 19:6) Jisọs kwuru okwu n’ụzọ ihe atụ iji jiri njikọ alụmdi na nwunye tụnyere yoke na-ejikọta anụmanụ abụọ ka ha dọkpụrụ ibu. Cheedị ndọlị ọ ga-abụrụ anụmanụ abụọ e ji yoke jikọta bụ́ ndị dọkpụ ihe chee ihu n’ụzọ abụọ dị iche! N’otu aka ahụ, ndị na-alụ n’okpukpe na-abụghị ezi okpukpe pụrụ ịhụ ka ha na-adọlị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible ma ndị òtù ọlụlụ ha ana-eguzogide ya. Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.”—2 Ndị Kọrint 6:14.
Alụmdi na Nwunye Ka Mma
Ịdị n’otu n’ezi ofufe pụrụ iwusi alụmdi na nwunye ike nke ukwuu. Otu onye edemede kwuru, sị: “Ifekọ ofufe bụ otu n’ime ihe ndị bụ́ isi e ji amata ezinụlọ dị mma, na nke obi ụtọ.” Eklisiastis 4:9, 10 na-ekwu, sị: “Abụọ dị mma karịa otu; n’ihi na ha nwere ezi ụgwọ ọrụ n’ime ndọgbu ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ. N’ihi na ọ bụrụ na ha adaa, otu n’ime ha ga-eme ka ibe ya bilie.”
Mgbe ha mere ka ndụ ha dabere n’ofufe ha, di na nwunye bụ́ ndị Kraịst na-adị n’otu ọ bụghị nanị n’ụzọ anụ ahụ kamakwa n’ụzọ ime mmụọ. Ka ha na-ekpekọ ekpere, na-amụkọ Okwu Chineke, na-esoro ndị Kraịst ibe ha na-ezukọ, ma na-agwa ndị ọzọ banyere okpukpe ha, ha na-enwe nkekọ ime mmụọ nke na-eme ka alụmdi na nwunye ha chie anya karị. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst kwuru, sị: “Ezi ofufe bụ ụzọ ndụ. Apụghị m iche n’echiche ịhọrọ ịlụ onye na-ekweghị n’ihe mere ka m bụrụ onye m bụ.”—Tụlee Mak 3:35.
Ndị na-alụ “n’ime Onyenwe anyị” pụrụ ịtụ anya ka ndị òtù ọlụlụ ha ṅomie omume Jisọs. Ndị Kraịst bụ́ di ga-emeso nwunye ha ihe dị ka Jisọs ji ịhụnanya mesoo nzukọ ya. Ndị Kraịst bụ́ nwunye ga-eji nkwanye ùgwù na-emeso di ha ihe. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:25, 29, 33) Ndị Kraịst na-eme nke a n’ihi ọchịchọ ha nwere ọ bụghị nanị iji mee ihe na-atọ onye òtù ọlụlụ ha ụtọ kama iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ, bụ́ onye ga-ajụ ndị di na nwunye ajụjụ banyere otú ha si mesoo ibe ha.—Malakaị 2:13, 14; 1 Pita 3:1-7.
Ijigide ihe ndị ha kweere na ha na-enyekwara ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst aka idozi esemokwu n’udo. Bible na-adụ ndị Kraịst ọdụ ilekwasị anya, ‘ọ bụghị n’ihe nke aka ha, kama ka ha nile n’otu n’otu na-elekwa ihe nke mmadụ ibe ha.’ (Ndị Filipaị 2:4) N’agbanyeghị nhọrọ onwe onye, ndị òtù ọlụlụ kweere n’otu ihe na-eji Okwu Chineke eme ihe dị ka o kwusịa o bie nke ha ji edozi nghọtahie ọ bụla. (2 Timoti 3:16, 17) N’ụzọ dị otú a ha na-agbaso ndụmọdụ Bible nyere ndị Kraịst ka ha nwee ‘otu uche ahụ.’—1 Ndị Kọrint 1:10; 2 Ndị Kọrint 13:11; Ndị Filipaị 4:2.
Mmasị na Ihe Ndị Ha Abụọ Ji Akpọrọ Ihe
N’eziokwu, inwe mmekọrịta abụghị nanị ịnọ n’otu okpukpe. Inwerịta mmasị bụkwa ihe ọzọ. (Abụ nke Abụ 3:5; 4:7, 9; 5:10) Ma ka alụmdi na nwunye wee dịgide, ihe ndị ha abụọ ji akpọrọ ihe dị oké mkpa. Dị ka akwụkwọ bụ́ Are You the One for Me? si kwuo, “ndị di na nwunye ji otu ụdị ihe akpọrọ ihe nwere ohere buru nnọọ ibu inwe mmekọrịta obi ụtọ, nke esemokwu na-adịghị na ya, na nke na-adịgide adịgide.”
Ọ dị mwute ikwu na ndị nwere mmasị n’ebe ibe ha nọ nwere ike ha agaghị edozi nnukwu ndịrịta iche ha ruo mgbe ha lụsịrị di na nwunye. N’iji ya tụnyere ihe ọzọ, cheedị banyere ịzụ ụlọ nanị n’ihi na ọ dị gị mma n’anya. Otú ọ dị, nanị mgbe ị kwabara na ya ka ị ga-amata na ntọala ya esighị ike. N’ịbụ nke nwere ntọala na-esighị ike, ihe nile mara mma n’ụlọ ahụ na-aghọ ihe na-abaghị uru. N’otu aka ahụ, mmadụ pụrụ inwe mmasị n’ebe onye nọ n’okpukpe ọzọ nọ bụ́ onye yiri ka ha ga-ekwekọ—ma mgbe ha lụsịrị di na nwunye mmekọrịta ahụ pụrụ ịghọ nke nwere nnukwu nsogbu.
Tụlee ụfọdụ n’ime okwu ndị siri ike pụrụ imesị bilite n’alụmdi na nwunye nke ndị na-anọghị n’otu okpukpe: Olee ebe ezinụlọ ahụ ga-efe ofufe? Ọzụzụ okpukpe dị aṅaa ka a ga-enye ụmụaka? Olee okpukpe nke ezinụlọ ahụ ga-akwado n’ụzọ ego? Di ma ọ bụ nwunye ọ̀ ga-anọgide na-ekere ókè n’omenala okpukpe na nke ụbọchị ememe ụfọdụ bụ́ ndị onye nke ọzọ ga-ele anya dị ka ikpere arụsị? (Aịsaịa 52:11) Alụmdi na nwunye ọ bụla na-achọ ka onye òtù ọlụlụ nke ọ bụla mee mgbanwe ndị ezi uche dị na ha; otú ọ dị, Chineke adịghị anabata imebi ụkpụrụ Bible—ọbụna iji chekwaa alụmdi na nwunye.—Tụlee Deuterọnọmi 7:3, 4; Nehemaịa 13:26, 27.
Iji nọgide na-enwe udo n’alụmdi na nwunye, ụfọdụ ndị di na nwunye nọ n’alụmdi na nwunye ndị e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe na-aga okpukpe iche iche. Otú ọ dị, ọ dị mwute ikwu na ife ofufe iche iche na-eme ka alụmdi na nwunye tọgbọrọ chakoo n’ụzọ ime mmụọ. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst lụrụ otu nwoke na-anọghị n’okpukpe ya kọrọ, sị: “Ọ bụ ezie na anyị lụrụ di na nwunye ruo afọ 40, di m amataghị onye m bụ n’ezie.” N’ụzọ dị iche, Chineke na-anọ n’etiti alụmdi na nwunye nke ndị òtù ọlụlụ abụọ na-efe ofufe “n’ime mmụọ na eziokwu.” Dị ka Bible na-ekwu n’ụzọ abụ, “ụdọ atọ nke a tụkọtara n’otu, a dịghị adọbi ya ngwa ngwa.”—Jọn 4:23, 24; Eklisiastis 4:12.
Gịnị Banyere Ụmụ?
Ụfọdụ ndị na-eche echiche ịbanye n’alụmdi na nwunye nke ndị na-anọghị n’otu okpukpe na-eche na ha pụrụ ime ka ụmụ ha mata okpukpe abụọ ahụ ma hapụ ụmụ ahụ ka ha mee nhọrọ. N’eziokwu, ọ bụ ihe ruuru nne na nna n’ụzọ iwu na n’ụzọ omume inye ọzụzụ okpukpe, ma mee elu mee ala, ụmụaka na-eme mkpebi nke ha.a
Bible nyere ụmụaka ntụzi irubere nne na nna ha isi “n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:1) Ilu 6:20 na-ekwu ya otú a: “Nwa m, chebe ihe nna gị nyere n’iwu, ahapụkwala iwu nne gị.” Kama ịbụ ndị a na-ezi ozizi dị iche iche, ụmụaka ndị nne na nna ha kwere n’otu ihe na-adị n’otu n’ihe Bible kpọrọ ‘otu Onyenwe anyị, otu okwukwe, otu baptism.’—Ndị Efesọs 4:5; Deuterọnọmi 11:19.
“N’ime Onyenwe Anyị” n’Ezie
Ọ bụrụ na iji otu ụdị ihe akpọrọ ihe bụ isi ihe na-akpata alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịlụ onye ọ bụla nnọọ sị na ya bụ onye Kraịst? Bible na-aza, sị: “Onye na-asị na ọ na-anọgide n’ime [Jisọs], o ji ụgwọ ka ya onwe ya na-ejegharịkwa dị ka Ya onwe ya jegharịrị.” (1 Jọn 2:6) N’ihi ya, onye Kraịst na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-achọ onye Kraịst ibe ya na-agbalị n’ezie iso ụzọ Jisọs. Onye dị otú ahụ ọ ga-alụ aghaghị ịbụ na ọ rarawo onwe ya nye Chineke ma bụrụ onye e mere baptism. Ọ ga-eṅomi àgwà ịhụnanya nke Jisọs na nkwusa Alaeze Chineke o ji ịnụ ọkụ n’obi mee. Dị ka Jisọs mere, ọ ga-eme ka ndụ ya dabere n’ime uche Chineke.—Matiu 6:33; 16:24; Luk 8:1; Jọn 18:37.
Site n’iji ndidi chere ruo mgbe ị ga-enweta onye kwesịrị ekwesị ị ga-alụ n’ime ezinụlọ Chineke nke ndị na-efe ya ofufe, ndị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ nwunye na-eguzobe ụkpụrụ nke ibu ụzọ na-eme uche Chineke ná ndụ ha. Ụkpụrụ dị otú ahụ ga-emesị soro kpata alụmdi na nwunye obi ụtọ ka ukwuu, na nke na-eju afọ karị.—Eklisiastis 7:8; Aịsaịa 48:17, 18.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ò Kwesịrị Ka Ụmụaka Họrọ Okpukpe nke Ha?” dị na Teta! nke March 8, 1997, peji nke 24-25. Leekwa peji nke 24-25 nke Ndịàmà Jehova na Agụmakwụkwọ, bụ́ nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., 1996, bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Enyemaka Maka Ezinụlọ Ndị Kewara Ekewa n’Ụzọ Okpukpe
N’ihi ihe dị iche iche, ọtụtụ di na nwunye taa kewara ekewa n’ụzọ okpukpe. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị ahọrọwo onye òtù ọlụlụ na-aga okpukpe ọzọ. Ma ọtụtụ ndị malitere alụmdi na nwunye ha n’otu okpukpe ma mesịa ghọọ ndị kewara ekewa n’ụzọ okpukpe mgbe otu onye nakweere ụdị ofufe ọzọ. A pụrụ inwe ọnọdụ ndị ọzọ na-akpata nkewa n’ụzọ okpukpe n’ezinụlọ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị na-akpata ya, a gaghị emebi nkwa alụmdi na nwunye ma ọ bụ were ya n’ihe dị nta nanị n’ihi na di na nwunye ekwekọrịtaghị n’ihe banyere nhọrọ okpukpe. Bible na-asọpụrụ ịdị nsọ na ịdịgide adịgide nke alụmdi na nwunye, ọbụna mgbe di na nwunye na-adịghị n’otu n’ofufe. (1 Pita 3:1, 2) Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na nwanna ọ bụla nwere nwunye na-ekweghị ekwe, ọ bụrụkwa na ọ dị nwanyị ahụ ezi mma ka ya na ya biri, ka di ya ghara ịhapụ ya.” (1 Ndị Kọrint 7:12) Ọ bụrụ na e tinye ha n’ọrụ, ụkpụrụ ndị dị na Bible pụrụ inyere di na nwunye ọ bụla aka inwe udo ná mmekọrịta ịhụnanya na nke na-egosi nkwanye ùgwù.—Ndị Efesọs 5:28-33; Ndị Kọlọsi 3:12-14; Taịtọs 2:4, 5; 1 Pita 3:7-9.