Site n’Ịbụ Ọdụm Na-agbọ Ụja Gaa n’Ịbụ Nwa Atụrụ Dị Nwayọọ
DỊ KA ENRIQUE TORRES, JR. SI KỌỌ
A MỤRỤ m na 1941 n’àgwàetiti Caribbean bụ́ Puerto Rico, ebe mmadụ nile na-asụ Spanish. Nne na nna m na-abaghị ọgaranya na-ekpe Roman Katọlik, e nyetụghị ha ma ọ bụ ụmụnne m ndị nwanyị na nwanne m nwoke (bụ́ onye nwụrụ mgbe ọ bụ nwata) ma ọ bụ mụ onwe m ntụziaka okpukpe ọ bụla, o sikakwa ike anyị ejee chọọchị.
Ezinụlọ anyị kwapụrụ na Puerto Rico kwaga United States na 1949. Anyị biri na New York City n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Harlem, nke a maara dị ka EL Barrio. Anyị bigidere ebe ahụ ruo 1953. O siiri m ike ịgbanwe asụsụ m sụwa Bekee. Ihe mgbochi a mere ka m nwee mmetụta nke erughị eru.
Mmetụta Ọjọọ
Mgbe ahụ ezinụlọ anyị kwagara n’ógbè Prospect Heights nke Brooklyn. Ọ bụ n’oge a ka ndị ọgbọ m mere ka m sonye n’ajọ òtù okporo ámá. E mesịrị họpụta m ịbụ onye ndú ya. Mgbe nke ahụ gasịrị aghọrọ m onye ndú nke òtù ndị omempụ ọzọ, nke na-ezu obere ụgbọala. Aghọkwara m onye ozi (onye nnakọta ụgwọ e ji n’ịgba chaa chaa iwu na-akwadoghị) nke ndị na-ejide ihe e ji tie ebe. Site na nke ahụ, abanyere m n’itika ụlọ iji zuo ohi, a nwụchikwara m ọtụtụ ugboro tupu m ruo afọ 15. Mgbe ahụ agbapụtala m n’ụlọ akwụkwọ.
Mgbe m dị afọ 16, ndị ọchịchị chụgara m Puerto Rico ruo afọ ise dị ka akụkụ nke arịrịọ m rịọrọ n’ụlọ ikpe. A kpọọrọ m gakwuru nna m ochie na ezinụlọ ya. Ọ bụ onye uwe ojii laworo ezumike nká a maara nke ọma ma na-akwanyere ùgwù. Otú ọ dị, mgbe otu afọ gasịrị nna m ochie kpọghachiri m na Brooklyn n’ihi na m na-aṅụbiga mmanya ókè, na-eso ndị ọjọọ na-akpakọrịta, ma na-etika ụlọ iji zuo ohi.
Òkè Nna M Keere ná Ndụ M
Mgbe m si Puerto Rico laghachi New York City, achọpụtara m na nna m amalitela iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Otú ọ dị, ndụ m chere ihu n’ebe dị nnọọ iche. Anọgidere m na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke ma na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụbigakwa mmanya ókè. Aghọrọ m onye òtù nke otu òtù ndị omempụ na-etika ụlọ ma na-eji égbè ezu ohi, nke dugara ná nnwụchi a nwụchiri m na 1960. A mara m ikpe ma tụọ m mkpọrọ afọ atọ.
Na 1963, a tọhapụrụ m dabere ná nkwa m kwere ịkpa ezi àgwà. Ma n’oge na-adịghị anya a nwụchiri m ọzọ n’ihi itika ụlọ iji zuo ohi, anọkwara m afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’Àgwàetiti Rikers, dị na New York City. A tọhapụrụ m na 1965. Ma, n’otu afọ ahụ, a nwụchiri m n’ihi igbu mmadụ. Lee ndụ ọjọọ, dị ka nke ọdụm m zụliteworo!
Ụlọikpe tụrụ m mkpọrọ afọ 20 na Dannemora, n’ebe mgbago New York. N’ebe ahụ esonyere m n’ìgwè a na-ezi ụkpụrụ omume ọma n’ụlọ mkpọrọ.
Otú ọ dị, dị ka e kwuru ná mmalite, nna m so Ndịàmà Jehova na-amụ Akwụkwọ Nsọ. E mesịrị mee ya baptism, o jekwara ozi dị ka okenye n’otu ọgbakọ dị na Harlem. Ọ bịara leta m ọtụtụ mgbe n’oge m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ na-agwakwa m okwu mgbe nile banyere Chineke, aha Ya, na nzube Ya.
Otú ọ dị, mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ na Dannemora, aghọrọ m onye òtù nke otu ìgwè ndị omempụ na-ebinye ego n’ọmụrụ nwa dị ukwuu. N’oge a, na 1971, e nwere ọgba aghara n’ụlọ mkpọrọ ọzọ dị na New York State, bụ́ Ogige Mgbazi Omume nke Attica. Ọgba aghara a pụtara n’isi akụkọ nke ọtụtụ akwụkwọ akụkọ, ụlọ ọrụ redio na telivishọn dị gburugburu ụwa kwukwara banyere ya. Mgbe ọgba aghara a gasịrị, iji gbochie ihe dị otú ahụ ime na Dannemora, onyeisi ụlọ mkpọrọ ahụ chere na ya aghaghị ịhọpụta ndị mkpọrọ pụrụ imebi ndị mkpọrọ ndị ọzọ. O kewapụrụ ndị a iche ma debe ha n’ụlọ ndị pụrụ iche.
N’ime ndị mkpọrọ 2,200, e kewapụrụ ihe dị ka anyị mmadụ 200 iche. Nnyocha ọzọ dugara n’ịhọpụta ụfọdụ maka iti ha ihe n’ụzọ dị egwu. Tụkwasị na nke a, dị ka akụkụ nke ihe a kpọrọ “ọzụzụ iji gbanwee akparamàgwà,” a malitere itinye ọgwụ n’ihe oriri anyị.
Nke a abụghị nke mbụ a na-etinye m n’ụlọ e kewapụrụ iche n’ihi akparamàgwà na-adịghị mma. Otú ọ dị, nke a bụ nke mbụ e mesoro m mmeso dị oké njọ otú a, o metụtakwara m nke ukwuu. A tụrụ m ịgà n’aka, kee m agbụ n’ụkwụ, ndị nche tikwara m ihe nke ukwuu ọtụtụ ugboro. Aghaghịkwa m idi mkparị a na-akparị m n’esepụghị aka n’ihi mba m si. N’ihi mweda n’ala na iti ihe ahụ, ajụrụ m iriju nri afọ n’oge ahụ e kewapụrụ m iche, bụ́ nke dịruru ihe dị ka ọnwa atọ. Nke a mere ka m jiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kilogram 20 felata.
Ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ azaghị ajụjụ ndị nna m jụrụ banyere ahụ ike m na-adalata adalata. Nke a mere ka m nwee mmetụta nke enweghị olileanya, amalitekwara m idegara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị akwụkwọ maka enyemaka banyere mmeso na-ezighị ezi dị otú ahụ.
Nna m gara n’ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ ọtụtụ ugboro n’ihi iti ihe, mweda n’ala, na mmalite a malitere itinye ọgwụ n’ihe oriri ndị mkpọrọ ahụ e debere n’ụlọ pụrụ iche. Ọ bụ nanị otu ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ, bụ́ Amsterdam News, ṅara ya ntị site n’ibipụta otu isiokwu kwuru banyere ọnọdụ ọjọọ ndị ahụ. Nna m jekwukwaara Kọmishọna Na-ahụ Maka Mgbazi Omume, n’Albany, New York, ọtụtụ ugboro, a gwakwara ya mgbe nile na m nọ n’ụlọ ndị ọzọ nọ na ya. E leghaara akụkọ m degaara ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị banyere ọnọdụ ụlọ mkpọrọ ahụ anya. Enwere m nkụda mmụọ karịa ka m nwetụrụla, ebe o yiri ka o nweghị ebe ọzọ m ga-echigharịkwuru maka enyemaka.
Ọ bụ mgbe ahụ ka m chetara ụfọdụ n’ime ihe ndị nna m gwaworo m okwu banyere ha. Ekpebiri m ikpegara Chineke ekpere maka enyemaka.
Ichigharịkwuru Chineke
Tupu m kpee ekpere, echetaghachiri m okwu agbamume nna m na-agwa m mgbe nile ka m na-ekpegara, ọ bụghị Jisọs, kama Nna Jisọs ekpere, onye aha ya bụ́ Jehova. Akpọrọ m isiala n’ala ụlọ mkpọrọ ahụ ma kwuo na echegharịwo m nnọọ n’ụzọ ndụ m họrọwooro, nke meworo ka m nọọ ihe karịrị ọkara nke afọ ndụ m n’ụlọ mkpọrọ. Arịọsiri m Jehova ike ka o nyere m aka isi n’ọnọdụ a pụta n’ihi na aghọtala m ugbu a na ọ bụ nanị ya nwere ike ịnapụta m n’ọnọdụ ọjọọ a.
Amaghị m ogologo oge m kpere ekpere, ma echeghachiri m echiche azụ ná ndụ m biri n’oge gara aga ma jiri nchegharị rịọ Jehova mgbaghara. Ekwere m ya nkwa na aga m agbalị ịmụkwu ihe banyere ya. N’oge na-adịghị anya mgbe nke a gasịrị, a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ ahụ yiri ka ọ dị n’okpuru ala ebe nanị m nọ na ya wee kpọje m n’ụlọ mkpọrọ ebe ndị ọzọ nọ. Nke a mere ka m kwụsị ịjụ nri.
N’imezu nkwa m kwere ịmụkwu ihe banyere Jehova, amalitere m ịgụ New World Translation of the Holy Scriptures. Otu n’ime ihe ndị masịrị m ná nsụgharị Bible a bụ azụ ya na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Nke a masịrị m n’ihi na uwe, ụlọ, mgbidi, na paseji ụlọ mkpọrọ ahụ na-achacha ntụ ntụ, ụdị ụcha na-eweta ịda mba n’obi. Mgbe e mesịrị, n’ụzọ juru m anya, a gbanwere ụcha ihe ndị a nile ka ọ bụrụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ngalaba Mgbazi Omume gbanwere ha mgbe ọgba aghara ahụ e nwere n’ụlọ mkpọrọ dị n’Attica gasịrị.
Amalitekwara m ịgụ isiokwu ndị dị na magazin Ụlọ Nche na Teta!, bụ́ ndị nna m dokwara ka a na-ewetara m. Ịgụ ahụmahụ nke ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ihi ijigidesi okwukwe ha ike na ndị taworo ahụhụ karịa m metụrụ m n’obi nke ukwuu. Ndị a bụ ndị na-enweghị mpụ ha mere ma bụrụ ndị tara ahụhụ n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. N’aka nke ọzọ, atara m ahụhụ kwesịịrị m. Mgbe m gụrụ ahụmahụ ndị a, o metụrụ m n’obi, ọ gbakwara m ume ịmụkwu ihe banyere Jehova na ndị ya.
N’ikpeazụ, mgbe otu afọ gasịrị, agara m n’ihu òtù bọọdụ na-ahụ maka ịtọhapụ ndị mkpọrọ dabere ná nkwa ha kwere ịkpa ezi àgwà. A tụleghachiri okwu ikpe m, tinyere ajọ ahụmahụ m nwere n’ụlọ mkpọchi ahụ pụrụ iche. Obi tọrọ m ụtọ ịnụ na a ga-atọhapụ m dabere ná nkwa m kwere ịkpa ezi àgwà na 1972.
Izu abụọ mgbe a tọhapụsịrị m, ejere m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè anyị, na Harlem na-asụ asụsụ Spanish. Ma m ka nwere mmetụta nke erughị eru isoro ndị Jehova na-akpakọrịta. Aka m nwekwara ọtụtụ ihe ịmụ banyere Jehova, nzukọ ya, na ndị ya. Achọkwara m oge iji dozigharịa ndụ m ikwekọ na nke ọha na eze ka m nọsịrị ọtụtụ oge n’ụlọ mkpọrọ.
N’ụzọ dị mwute, enweghị m ike ịhapụ ụzọ ndụ ochie m. Amaliteghachiri m ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ime mpụ, na ibi ndụ nke asọpụrụghị Chineke. Nke a mere ka a tụọ m mkpọrọ afọ 15 ọzọ. Ma, echere m na Jehova aghaghị ịhụworị ihe dịtụ mma n’obi m, ebe ọ na-esepụbeghị aka n’ahụ m. Nanị ihe m pụrụ ịgwa gị bụ na ma ị nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ na ị nọghị, Jehova adịghị agbahapụ ma ọ bụ esepụ aka ma ọlị n’ahụ ndị nwere ọchịchọ ịmụ ihe banyere ya.
Ịmụ Bible n’Ụlọ Mkpọrọ
Ugbu a, mgbe m laghachiri n’ụlọ mkpọrọ dị na Dannemora, ejiri m ohere nke ịmụ Bible nke otu onye ozi nke Ndịàmà Jehova na-akụzi kwa izu mere ihe. Mgbe e mesịrị, a kpọfere m n’Ogige Mgbazi Omume dị na Mid-Orange, bụ́ ụlọ mkpọrọ a na-adịghị echecha nche nke ukwuu na ya nke dị ná mgbago New York. Nke a bụ mgbanwe site n’ụlọ mkpọrọ a na-echechakarịsị nche na ya nke dị na Dannemora.
Mgbe m nọsịrị afọ abụọ n’Ogige Mgbazi Omume ahụ dị na Mid-Orange, amalitere m ikeresi ókè ike n’ọmụmụ Bible a na-eduziri otu onye mkpọrọ ibe m, bụ́ nke ndị nlekọta ụlọ mkpọrọ ahụ kwadoro. Nne ya, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, dokwara ka ọ na-enwe ọmụmụ ihe a. N’ikpeazụ, site n’ịnọgide na-enweta ihe ọmụma, amalitere m itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, bụ́ nke mesịrị mee ka m nwee ọganihu ime mmụọ.
Mgbe a jụchara ịtọhapụ m dabere n’ikwe nkwa ugboro asaa, a tọhapụrụ m na nke ugbo asatọ iji mezuo iwu. Ihe e kwuru mere e jiri jụ ịtọhapụ m ná ndị mbụ bụ n’ihi “àgwà ịbanyeghachi n’ime mpụ” m nwere. A tọhapụrụ m mgbe m nọsịrị afọ 8 n’ime afọ 15 ahụ a mara m ikpe ịnọ.
Ntọhapụ Ikpeazụ Pụọ n’Ọchịchịrị
Mgbe a tọhapụsịrị m, a dọpụkwara uche m ọzọ, alaghachikwara m n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ ruo nwa oge. Mụ na otu nwanyị bikwa n’alụmdi na nwunye na-adịghị ka iwu si kwuo ka bi. Nke a malitere na 1972. Otú ọ dị, na 1983, amaliteghachiri m iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Na nke ugbu a, amalitere m ijechi nzukọ ndị Kraịst anya. Otú ọ dị, tupu m malite ịmụ ihe na ije nzukọ, akwụsịrị m ịṅụ ọgwụ ọjọọ ma kwụsị ise siga.
Ka o sina dị, n’ụzọ megidere iwu Chineke banyere alụmdi na nwunye, mụ na nwunye m m na-alụghị dị ka iwu si kwuo ka bi. Nke a nyere akọ na uche m nsogbu, ya mere agbalịrị m ime ka ọ nakwere ọmụmụ Bible ma mee ka mmekọrịta anyị nwee nkwado iwu site n’anyị ịlụ di na nwunye. Ma o kwuru na Bible bụ akwụkwọ mmadụ dere nke ndị mmadụ dere iji chịgbuo ndị inyom nakwa na alụmdi na nwunye adịghị mkpa.
Aghọtara m na mụ na nwanyị na-adịghị asọpụrụ iwu Chineke banyere alụmdi na nwunye agaghị anọgide na-enwe mmekọrịta rụrụ arụ. N’ihi ya, akwụsịrị m mmekọrịta anyị ma kwaga Brooklyn. Amaara m na apụghị m ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Chineke na nzube ya ma ọ bụrụ na ihe ndị m na-eme ekwekọghị n’iwu ya.
N’inwere onwe m pụọ n’ihe nile Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị na ịmụ Bible ruo afọ atọ, ejiri m akọ na uche dị ọcha rara ndụ m nye ime uche Chineke ma gosipụta ya site n’ịbụ onye e mere baptism n’otu mgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Nkwa m kwere ịmata Chineke onye nna m na-akpọ aha ya mgbe nile bụ ihe m na-akwatụbereghị ụta. Nkwa m kwekwara Jehova n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị n’okpuru ala na Dannemora bụ nke m ga-arụsi ọrụ ike imezu ruo mgbe ọ ga-eweta ọtụtụ ngọzi o kwere nkwa ha n’Okwu ya.
Ịtụ Anya Paradaịs
Ana m atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-agbanwe ụwa a nile ka ọ bụrụ paradaịs mara mma. (Abụ Ọma 37:11, 29; Luk 23:43) Ana m atụkwa anya nkwa ọzọ nke Chineke—mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ inwe ohere nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Lee oge magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ mgbe m ga-enwe ike ịnabata ndị m hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site n’ili, gụnyere nna m, nwanne m nwoke nke nta, na ndị ọzọ m maara nwụchuru ọnwụ! Ana m atụgharịkarị uche n’olileanya a, ọ na-enyekwa m ọṅụ dị ukwuu. Ọṅụ ọzọ m na-enwe ugbu a bụ na ụmụnne m ndị nwanyị abụọ na ụfọdụ n’ime ụmụ ha ararawo ndụ ha nye Jehova, e mewokwa ha baptism.
Ugbu a, ka m na-ekwupụta okwukwe m gwa ndị ọzọ ma na-akọrọ ha ahụmahụ m, m na-enwe nnọọ obi ụtọ ime ka ha mara okwu nkasi obi nke onye ọbụ abụ ahụ, nke e dekọrọ n’Abụ Ọma 72:12-14: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; Ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”
Ndidi Jehova nwere n’ebe m nọ emewo ka m nwee obi ụtọ, o mewokwa ka m nwee ike ịmụta na igosipụta àgwà ndị ọ chọrọ ka ndị ya nwee—ọ bụghị ndị nke ọjọọ yiri nke ọdụm, kama àgwà ịdị n’udo, obi ọma, na àgwà ịdị nwayọọ nke nwa atụrụ. Nke a dị mkpa, n’ihi na dị ka Okwu Chineke si kwuo, “ọ bụ ndị dị umeala n’obi ka Ọ na-enye amara.”—Ilu 3:34.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 26]
“A nwụchiri m ọzọ n’ihi itika ụlọ iji zuo ohi, anọkwara m afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’Àgwàetiti Rikers, dị na New York City. A tọhapụrụ m na 1965. Ma, n’otu afọ ahụ, a nwụchiri m n’ihi igbu mmadụ. Lee ndụ ọjọọ, dị ka nke ọdụm m zụliteworo!”
[Foto dị na peeji nke 27]
Ụbọchị e mere m baptism