Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 9/8 p. 12-13
  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Nwa Amaala?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Nwa Amaala?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Kraịst Ido Onwe Ha n’Okpuru Ndị Na-achị Isi
  • “Ndị E Doziworo Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla”
  • ‘Kwenyere Chineke Karịa Mmadụ’
  • Chineke na Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Iso Ụzọ Kraịst Oge Mbụ na Ọchịchị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ido Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Na-achị Isi n’Ụzọ A Kpaara Ókè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Inyeghachi Siza Ihe nke Siza
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 9/8 p. 12-13

Echiche nke Bible

Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Nwa Amaala?

MGBE Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, e kpere ọtụtụ ndị nọ na Europe na Japan bụ́ ndị weere onwe ha dị ka ezi ụmụ amaala, na-erube isi n’iwu ikpe ma maa ha ikpe n’ihi mpụ ha mere n’oge agha. N’ime ha e nwere ndị isi ndị agha bụ́ ndị ọkwá ha dị elu, ndị ọkà mmụta sayensị, na ndị ọkachamara ndị ọzọ. Ná mgbalị ime ka ihe ha mere zie ezie, ụfọdụ n’ime ndị omempụ a kọwara na ha nọ nanị na-erube isi n’iwu, dị ka a ga-atụ anya ya n’aka onye ọ bụla bụ́ ezi nwa amaala. Otú ọ dị, ezi ụmụ amaala ha kpọrọ onwe ha dugara ha n’ime ajọ mpụ megide ihe a kpọrọ mmadụ.

N’aka nke ọzọ, e nwere ndị na-eleghara ikike nke Ọchịchị nwere anya. Ụfọdụ na-ajụ ikike ọchịchị n’ezoghị ọnụ, ebe ndị ọzọ dị njikere imebi iwu ma ọ bụrụhaala na ọ ga-esi ike ijide ha. Otú ọ dị, ọ bụ mmadụ ole na ole ga-ajụ ikweta na e nwere mkpa nke irubere ọchịchị isi, n’ihi na ma e meghị ya a ga-enwe ọnọdụ nke enweghị ọchịchị na ọgba aghara. Otú ọ dị, ajụjụ bụ, Ruo ókè hà aṅaa ka e kwesịrị ịrụru ọrụ ọchịchị chọrọ ka nwa amaala rụọ na irube isi n’iwu? Tụlee ụfọdụ ụkpụrụ ndị bụ́ isi nyeere ndị Kraịst narị afọ mbụ aka inwe echiche ziri ezi banyere ibu ọrụ ha nwere n’ebe Ọchịchị dị.

Ndị Kraịst Ido Onwe Ha n’Okpuru Ndị Na-achị Isi

Ndị Kraịst narị afọ mbụ jiri obi ha debe iwu na ụkpụrụ nke “ndị na-achị isi”—ya bụ́, ndị na-achị achị n’oge ahụ. (Ndị Rom 13:1) Ndị Kraịst kweere na o ziri ezi “ka ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị isi, n’okpuru ndị nwere ike, ka ha na-ekwenye ekwenye.” (Taịtọs 3:1) Ọ bụ ezie na ha nakweere Kraịst dị ka Eze eluigwe ha, ha bụkwa ndị na-erubere ndị ọchịchị ha bụ́ mmadụ isi, ha adịghịkwa eyi nchebe nke Ọchịchị egwu. N’eziokwu, a gbara ha ume ka ha ‘na-asọpụrụ eze ha’ mgbe nile. (1 Pita 2:17) Ọbụna Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume, sị: “Ya mere ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike bụ, ka a na-arịọ arịrịọ, kpeekwa ekpere, rịọkwa arịrịọ a na-arịọrọ ndị ọzọ, keleekwa ekele, n’ihi mmadụ nile; n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ dị elu; ka anyị wee biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.”—1 Timoti 2:1, 2.

Ndị Kraịst narị afọ mbụ jiri akọ na uche ha tụọ ụtụ isi ọ bụla a sị ha tụọ, ọ bụ ezie na n’oge ụfọdụ nke a bụ ajọ ibu arọ. Ha gbasoro ntụzi sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl onyeozi nyere n’okwu a: “Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ.” (Ndị Rom 13:7) N’echiche ndị na-eso ụzọ Jisọs, ọ bụ Chineke kwere ka gọọmenti Rom na ndị isi ya na-achị, n’ụzọ ụfọdụ ha na-ejekwa ozi dị ka “ndị ozi ihu ọha Chineke,” n’ihi na ha mere ka udo na ịdị jụụ dịtụ n’obodo.—Ndị Rom 13:6, NW.

“Ndị E Doziworo Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla”

A gbara ndị Kraịst narị afọ mbụ ume ịnabata ọrụ Ọchịchị bokwasịrị ha. Jisọs Kraịst n’onwe ya dụrụ ndị na-eso ụzọ ya ọdụ ka ha dị njikere mgbe ụfọdụ imefere ọbụna ihe kasị dị ala ndị ọchịchị chọrọ ka ha mee. “Onye ọ bụla nke ga-ejide gị ije otu mile,” ka o kwuru, “so ya jee mile abụọ.” (Matiu 5:41) N’ịgbaso ndụmọdụ a, ndị Kraịst gosiri na ha achọghị inweta abamuru nke ibi n’ụwa mepere emepe n’enyeghị ihe ọ bụla ná nkwụghachi. Ha bụ ndị “e doziworo ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla” mgbe nile.—Taịtọs 3:1; 1 Pita 2:13-16.

Ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie ma chọọ ụzọ isi nyere ha aka. (Matiu 22:39) N’ihi ịhụnanya a na nrapara ha rapagidesiri ike n’ụkpụrụ omume ndị dị elu, ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere mmetụta dị mma n’ógbè ha. Ndị agbata obi ha nwere ọtụtụ ihe mere ha ji nwee obi ụtọ ibidebe onye Kraịst. (Ndị Rom 13:8-10) Ndị Kraịst gosipụtara ịhụnanya ha site n’ime ihe karịrị nanị izere ihe ọjọọ. A gbara ha ume inwe omume enyi na ime ihe maka ọdịmma nke ndị ọzọ, ka ha “na-arụ ezi ihe [ọ bụghị nanị n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ kama] n’ebe mmadụ nile nọ,” dị ka Jisọs Kraịst mere.—Ndị Galetia 6:10.

‘Kwenyere Chineke Karịa Mmadụ’

Otú ọ dị, e nwere ókè ha ga-eruberuru ndị ọchịchị isi. Ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi akọ na uche ha ma ọ bụ mebie mmekọrịta ha na Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ndú okpukpe nọ na Jerusalem nyere ndị ozi iwu ka ha kwụsị ikwusa banyere Jisọs, ha jụrụ ime otú ahụ. “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ,” ka ha kwupụtara. (Ọrụ 5:27-29) Ndị Kraịst jiri iguzosi ike n’ezi ihe jụ ofufe eze ukwu nke bụ́ ikpere arụsị. (1 Ndị Kọrint 10:14; 1 Jọn 5:21; Mkpughe 19:10) Gịnị si na ya pụta? “Ọ rụpụtara nkatọ,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-ekwu, “ọ bụghị n’ihi ịbụ ndị Kraịst, kama ọ bụ n’ihi ịjụ ime ihe iwu kwuru.”—Shorter History of the World.

N’ihi gịnị ka ha ji ‘jụ ime ihe iwu kwuru’ n’oge a? Ha matara na “ndị na-achị isi” jiri ikike ha mee ihe n’ihi na Chineke kwere, wee sikwa otú a jee ozi dị ka “onye na-ejere Chineke ozi” n’ịhụ na e debere iwu na usoro. (Ndị Rom 13:1, 4) Ma ndị Kraịst ka lere iwu Chineke anya dị ka nke ka elu. Ha chetara na Jisọs Kraịst guzobere ụkpụrụ a guzoziri eguzozi maka ndị ga-abụ ụmụazụ ya: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Ibu ọrụ ha n’ebe Chineke nọ aghaghị ibutere ihe Siza chọrọ ụzọ.

Ihe mere mgbe ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị Kraịst na-agbasoghị ụkpụrụ ọma ndị a gosiri na nke a bụ ụzọ ziri ezi. Dị ka ihe atụ, ndị ndú Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ ghọrọ “ndị dị mfe [e jiri mee ihe] dị ka ngwá ọrụ gọọmenti obodo, nke ka nke n’ịzụlite na ilekọta ndị agha,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere agha bụ́ John Keegan na-ekwu. Ndị na-eso ụzọ ha mesịrị dụnyere akụkụ dị iche iche úkwù n’agha ndị kwafuru ọbara nke ọtụtụ nde ndị aka ha dị ọcha. Keegan na-ekwu, sị: “Ọ dịghị onye ṅara ntị n’iwu Chineke mgbe a kpaliri ndị mmadụ.”

Otú ọ dị, ndị Kraịst narị afọ mbụ gosiri ihe nlereanya dị ịrịba ama n’inwe nguzo ziri ezi. Ha bụ ezi ụmụ amaala. Ha rụrụ ọrụ ọchịchị chọrọ ka ha rụọ ma mezuo ibu ọrụ ha nke ọma. Ma ha rapagidesiri ike n’ụkpụrụ Bible ndị doro anya ma gbasoo akọ n’uche ha e jiri Bible zụọ n’akụkụ nile nke ndụ.—Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52; Ndị Rom 13:5; 1 Pita 3:16.

[Foto dị na peeji nke 12]

“Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya