Chebe Nwa Gị Pụọ n’Ihe Ọghọm
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SWEDEN
HANNA, bụ́ onye fọrọ nke nta ka ọ gbaa afọ atọ, so nne na nna ya, bụ́ Karl-Erik na Birgitta nọrọ, ka ha na-edebe ụlọ onye agbata obi ha nwụrụ anwụ ọcha. Mgbe nwa oge gasịrị, Hanna si n’otu ọnụ ụlọ pụta na-eji otu karama mkpụrụ ọgwụ dị n’ime ya n’aka. O lowo ụfọdụ n’ime ha. Ụjọ tụrụ Birgitta mgbe o leruru karama ahụ anya. Ọ bụ karama e tinyere mkpụrụ ọgwụ ọrịa obi onye agbata obi ha.
N’egbughị oge, a kpọgara Hanna ụlọ ọgwụ, bụ́ ebe e lekọtara ya n’ụzọ pụrụ iche ruo ụtụtụ echi ya. N’agbanyeghị na o loro ọgwụ ndị gaara akpatara ya ọrịa na-agaghị ala ala, ọ dịghị ihe o mere ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ka risịrị nri ọka tupu o loo mkpụrụ ọgwụ ndị ahụ. Nri ọka ahụ, bụ́ nke e mere ka ọ pụta mgbe ọ gbọrọ ihe, mịkọọrọ ụfọdụ n’ime nsí ahụ.
Ọ bụghị nanị Hanna nweworo ahụmahụ ahụ. Kwa ụbọchị, ọtụtụ puku ụmụaka gburugburu ụwa na-enwe ihe ọghọm na-eme ka ijekwuru dọkịta ma ọ bụ ije ụlọ ọgwụ dị mkpa. Kwa afọ, na Sweden a na-enye 1 onye n’ime ụmụaka 8 ọ bụla ọgwụ mgbe o nwesịrị ihe ọghọm. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o nwere nnọọ ike ịbụ na ihe yiri nke ahụ pụrụ ịdakwasị nwa gị.
Ọ bụghị ihe ijuanya na ụmụaka na-emerụkarị ahụ n’ebe ha maara, dị ka ụlọ ha na gburugburu ya. Ụdị ahụ ndị ha na-emerụ na-agbanwe ka ha na-etowanye. Nwa ọhụrụ pụrụ ịdapụ n’ebe a na-enyiwe ya n’ụzọ dị mfe ma ọ bụ bụrụ onye iberibe nri ma ọ bụ ntakịrị ihe gbakooro n’akpịrị. Ụmụaka na-adakarị ada mgbe ha na-arigogharị n’ihe ma ọ bụ bụrụ ndị ọkụ hụrụ ma ọ bụ ndị riri nsí mgbe ha weere ihe ndị e debere ebe aka ha na-eru ma ọ bụ rie ha erie. Ụmụaka toruworo ije akwụkwọ na-emerụkarị ahụ n’ihe ọghọm okporo ụzọ ma ọ bụ mgbe ha na-egwuri egwu n’èzí.
A pụrụ igbochi ọtụtụ n’ime ihe ọghọm ndị a. Site n’ilepụ anya n’ihu na ịma ókè nwa gị toruworo, ị pụrụ inye aka gbochie mmerụ ahụ ma ọ bụ ọbụna ihe ọghọm ndị dị oké njọ. Usoro ihe omume a haziri maka ichebe ụmụaka bụ́ nke e nweworo na Sweden eri 1954 egosipụtawo na nke a bụ eziokwu. Tupu mgbe ahụ, ihe karịrị ụmụaka 450 na-anwụ kwa afọ n’ihe ọghọm. Taa, ọnụ ọgụgụ na-anwụ kwa afọ ebelatawo ruo ihe dị ka ụmụaka 70.
N’ebe Obibi
“Ị pụghị ịkụziri nwatakịrị dị otu afọ, afọ abụọ, ma ọ bụ afọ atọ izere ihe ize ndụ ma na-atụ anya ka ọ na-echeta ya,” ka ọkà akparamàgwà ụmụaka bụ́ Kerstin Bäckström na-ekwu. Ya mere ibu ọrụ nke inyere nwa gị aka izere ihe ọghọm bụ nke gị dị ka nne ma ọ bụ nna ya—ma ọ bụ ndị ọzọ toworo eto ha na nwa ahụ na-anọkarị.
Iji malite, leruo gburugburu ebe obibi gị anya. Jiri ihe ndepụta dị n’igbe dị n’isiokwu a mee ihe. Ikekwe ngwá nchebe ụfọdụ adịghị ná mba nile ma ọ bụ ha adịghị ọnụ ala. Ma site n’ịdịtụ nkọ na ichepụta ihe, eleghị anya ị pụrụ icheta ihe ngwọta ga-adị irè n’ọnọdụ gị kpọmkwem.
Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na drọwa ndị dị na kichin gị nwere aka a na-ekochi ekochi, ị pụrụ ịkpọchi ha site n’ịfanye osisi n’ime ha. Usoro yiri nke ahụ pụkwara ịrụ ọrụ dị ka ihe e ji akpọchi ụzọ ovun. Akpa wọtapruf adịghị nnọọ adịcha ize ndụ ma ị machie ha amachie mgbe ị na-edebe ha.
Ikekwe ị pụrụ icheta ụzọ ndị ọzọ dị mfe isi gbochie ihe ọghọm n’ebe obibi na gburugburu ya, ị pụkwara ịgwa ndị enyi gị na ndị ị maara banyere ha bụ́ ndị nwere obere ụmụaka.
N’èzí
Leruo ebe nwa gị na-egwuri egwu anya. Ihe ka ọtụtụ n’ahụ ụmụaka gafeworo afọ anọ na-emerụ na-abụ mgbe ha na-egwuri egwu n’èzí. Ha na-ada ada wee merụọ ahụ ma ọ bụ ikekwe si n’ịnyịnya ígwè ha daa. Ihe ọghọm ndị dị oké njọ kasị bụrụ ndị ụmụaka dị n’agbata afọ atọ na afọ asaa na-enwekarị n’èzí bụ ihe ọghọm okporo ụzọ na mmiri iri ha.
Mgbe ị na-eleta ebe ụmụaka na-egwuri egwu, leruo anya iji hụ ma ngwá dị ebe ahụ ọ̀ ka dị mma ka ọ ghara imerụ nwatakịrị ahụ mgbe o ji ya na-egwuri egwu. À wụsara ihe ndị dị nro, dị ka, uzuzu n’okpuru eriri e ji akwụ èfè, na ngwá yiri ya, ka nwatakịrị ghara imerụ ahụ ma ọ daa ada?
È nwere ọdọ mmiri ma ọ bụ iyi ndị dị nso n’ụlọ unu? Mmiri dị nanị sentimita ole na ole n’omimi ezuwo iri nwatakịrị dị otu afọ ma ọ bụ afọ abụọ. “Mgbe obere nwatakịrị dabara n’ime ọdọ mmiri wee kpudo ihu n’ala, ọ dịghịzi ama ihe bụ́ elu na ihe bụ́ ala,” ka ọkà akparamàgwà ụmụaka bụ́ Bäckström na-ekwu. “Nwatakịrị ahụ apụghị nnọọ ibili ọtọ ọzọ.”
Ya mere, ụkpụrụ nduzi kasị bụrụ isi bụ nke a: Ekwela ka nwatakịrị dị n’agbata otu afọ na afọ atọ gwurie egwu n’èzí nanị ya n’enweghị onye toworo eto na-elekọta ya. Ọ bụrụ na e nwere nnukwu mmiri dị nso n’ụlọ unu, chere ruo mgbe nwatakịrị ahụ tolitetụrụ nnọọ tupu ị hapụ ya ka ọ na-egwuri egwu n’èzí n’enweghị onye na-elekọta ya.
N’ebe E Nwere Okporo Ụzọ
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na okporo ụzọ dị nso n’ebe obibi unu. “Nwatakịrị na-etorubeghị ije akwụkwọ na-aghọta nanị ihe ndị e kwuru n’ụzọ doro anya, ọ na-etinyekwa uche n’ihe otu otu,” ka Bäckström na-ekwu. “Ma echiche na-esi ike nghọta na mgbàmà ndị na-edoghị anya bụ ihe na-ejupụta n’okporo ụzọ.” Ekwela ka nwa gị gafee okporo ámá nanị ya tupu o toruo ogo ije akwụkwọ. A dịghị ele ụmụaka anya dị ka ndị toruworo ịgba ịnyịnya ígwè nanị ha n’ụzọ na-ekwo ekwo ruo mgbe ha dị ma ọ dịkarịa ala afọ 12, dị ka ndị ọkachamara si kwuo.
Kụziere nwa gị ka ọ na-eyi okpu nchebe mgbe ọ na-agba ịnyịnya ígwè ma ọ bụ ọgba tum tum mgbe o yi akpụkpọ ụkwụ ndị nwere ihe mkpọre n’okpuru ha, ma ọ bụ na-agba obere ihe na-agba n’elu snow. Ahụ e merụrụ n’isi na-esi ike ọgwụgwọ, ọ pụkwara imebi ihe kpam kpam—ma ọ bụ ọbụna kpata ọnwụ! N’otu ụlọ ahụ ike ụmụaka, pasent 60 nke ndị a gwọrọ mgbe ha ji ịnyịnya ígwè nwesịa ihe ọghọm merụrụ ahụ n’isi na n’ihu, ma ndị ji okpu ígwè emerụghị ahụ n’isi nke ukwuu.
Ọzọkwa, jide n’aka na e chebere nwa gị mgbe o ji ụgbọala na-eme njem. Ọtụtụ mba nwere iwu ndị na-ekwu ka e jiri belt na-ekedo ụmụaka n’oche ndị e mere n’ụzọ pụrụ iche iji chebe ha. Nke a ebelatawo n’ụzọ dị ukwuu mmerụ ahụ na ọnwụ ụmụaka nwere ihe ọghọm okporo ụzọ. Ọ bụrụ na e nwere oche ndị e mere maka nchebe n’ebe i bi, iji ya eme ihe pụrụ ichebe ndụ n’ezie. Ma jide n’aka na ọ bụ ụdị nke iwu kwadoro. Rịba ama na oche ndị e mere maka ụmụ ọhụrụ dị iche ná ndị nke ụmụaka dị site n’ihe dị ka afọ atọ.
Ụmụ anyị bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Jehova, anyị kwesịrị ilekọta ha n’ụzọ ọ bụla. (Abụ Ọma 127:4) Dị ka ezigbo nne na nna, Karl-Erik na Birgitta anọwo na-enwe nchegbu mgbe nile banyere ichebe ụmụ ha—tupu nakwa mgbe ihe ahụ mere Hanna gasịrị. “Ma n’ezie anyị kpachapụrụ anya karị mgbe ihe ahụ mesịrị,” ka Karl-Erik na-ekweta. “Ugbu a anyị nwere ụmụ ụmụ, anyị na-ejidekwa n’aka na anyị kpọchibidoro ọgwụ anyị n’ime ihe,” ka Birgitta na-ekwubi.
[Igbe dị na peeji nke 24]
Nchebe n’Ụlọ Gị
• Ọgwụ: Debe ha na kọbọd a kpọchiri akpọchi bụ́ ebe aka nwatakịrị na-agaghị eru. A ga-emekwa otu ihe ahụ banyere ọgwụ ndị ọ na-abụghị dọkịta depụtara nakwa ọgwụ mkpọrọgwụ. Ọzọkwa, gwa ndị ọbịa ga-anọbọ chi ka ha debe ọgwụ ha ebe aka nwatakịrị na-agaghị eru.
• Mmiri ọgwụ ndị e ji eme ihe n’ụlọ: Debe ha n’ime kọbọd a na-akpọchi akpọchi bụ́ ebe aka nwatakịrị na-agaghị eru. Hapụ ha ná mkpọ ha bu bịa ka e wee mara ha nke ọma. Legide ihe ndị ahụ anya nke ọma mgbe i ji ha eme ihe, wepụkwa ha mgbe nile, ọbụna ma ọ bụrụ na ị gaghị anọ n’ọnụ ụlọ ahụ ruo nanị nwa oge. Ahapụkwala ụfọ ncha n’ihe i ji asa efere.
• Stovu: Na-eweba aka ite e sikwasịrị n’elu stovu n’ime. Were ihe e ji ejide ite jide ya, ma ọ bụrụ na ọ dị. Rụnye ihe ga-eme ka stovu ghara ịdị na-adalaga otu akụkụ maka nchebe a dịghị ama ama nwatakịrị arịgoro n’elu ụzọ ovun ghere oghe. E kwesịrị ịrụnye ihe mkpọchi n’ụzọ ovun ahụ. Ọkụ ọ̀ pụrụ ịhụ nwatakịrị mgbe o metụrụ ụzọ ovun aka? Ọ bụrụ otú ahụ, rụnye ya ihe nchebe ma ọ bụ ihe ga-ekpuchi ya o wee ghara ịdị na-emetụ ụzọ dị ọkụ aka.
• Arịa ndị e ji eme ihe n’ụlọ bụ́ ndị dị ize ndụ: E kwesịrị itinye mma, mkpà, na ngwá ndị dị ize ndụ na kọbọd ma ọ bụ na drọwa ndị a na-akpọchi akpọchi ma ọ bụ n’ihe ha na-amagide n’elu ya ma ọ bụ debe ha n’ebe aka nwatakịrị na-agaghị eru. Mgbe i ji arịa ndị dị otú ahụ eme ihe ma kwụsịtụ ruo nwa oge, ahapụla ha n’ọnụ ọnụ tebụl ma ọ bụ na kọbọd, debe ha ebe aka nwatakịrị na-agaghị eru. Mkpaọkụ na akpa wọtapruf bụkwa ihe ndị dị ize ndụ nye obere ụmụaka.
• Stepụ: Rụnye ihe mgbochi bụ́ ndị ga-adị sentimita 70 ruo 75 n’ịdị elu ma ọ dịkarịa ala n’akụkụ abụọ nke stepụ ahụ.
• Windo na ọnụ ụzọ varanda: Rụnye ihe mgbochi ndị ụmụaka na-agaghị emepeli ma ọ bụ chen ọnụ ụzọ ndị e konyere n’ebe dị elu ma ọ bụ ngwá ọzọ na-enye nchebe nke ga-egbochi nwatakịrị imepe ha ma ọ bụ isi na ha piofee mgbe e mepere ha ka ikuku wee bata n’ime ụlọ.
• Ebe ndebe akwụkwọ: Ọ bụrụ na ọ na-amasị nwatakịrị ịdị na-arị elu ma na-eguzo n’ihe, kpọgide ebe ndebe akwụkwọ na ngwongwo ndị ọzọ dị elu n’ahụ ájá, iji mee ka ha ghara ịda.
• Ebe a na-akwụnye ngwá eletrik na waya eletrik: A ghaghị ịrụnye ihe mkpọchi n’ebe ndị unu na-akwụnye ngwá eletrik a na-ejighị eme ihe. E kwesịrị ịkụdo waya ọkụ na-adị na tebụl na ihe ndị yiri ya n’ahụ ájá ma ọ bụ ná ngwá ụlọ ka nwatakịrị wee ghara inwe ike ịdọtu ọkụ ahụ o wee kụta ya. Ma ọ bụghị ya, wepụ ọkụ ndị dị otú ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-ahapụ ígwè e ji ede ákwà n’elu tebụl ya, ekwekwala ka waya ya gbaghaa agbagha ma kpụdata n’ala.
• Mmiri ọkụ: Ọ bụrụ na ị pụrụ ịgbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke mmiri ọkụ gị, i kwesịrị iwetulata ya ka ọ bụrụ ihe dị ka 50 degree Celsius ka mmiri ọkụ wee ghara ịwụ nwatakịrị ma ọ bụrụ na ọ kpọghee pọmpụ.
• Ihe ndị ụmụaka ji egwuri egwu: Tụfuo ihe ndị ụmụaka ji egwuri egwu bụ́ ndị akụkụ ha dị nkọ. Tụfuo ụmụ obere ihe ụmụaka ji egwuri egwu ma ọ bụ ihe ndị ụmụaka ji egwuri egwu bụ́ ndị a pụrụ ịtụkasị atụkasị, n’ihi na ha pụrụ ịgbakoro nwatakịrị ma o tinye ha n’ọnụ. E kwesịrị ịkwụnye anya na imi dị na nwa bebi nke nwatakịrị ahụ nke ọma. Kụziere ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tolitetụworonụ ka ha na-ewepụ ụmụ obere ihe ndị ha ji egwuri egwu mgbe nwa ọhụrụ nọ n’ala.
• Ihe nracha na ihe ọtịta: Ahapụla ihe nracha na ihe ọtịta, dị ka ahụekere ma ọ bụ ihe nracha ndị siri ike n’ebe aka nwatakịrị ga-eru. Ha pụrụ igbakoro nwatakịrị n’akpịrị.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe E Si Nweta Ya: Ọfịs Onye Na-ahụ Maka Mkpesa Metụtara Ụmụaka
[Igbe dị na peeji nke 24]
Ọ Bụrụ na E Nwee Ihe Ọghọm
• Nsí: Ọ bụrụ na nwatakịrị aṅụwo ihe na-egbu egbu, sachaa ọnụ ya nke ọma ma nye ya otu iko mmiri ma ọ bụ abụọ ma ọ bụ mmiri ara ehi ka ọ ṅụọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, kpọtụrụ dọkịta ma ọ bụ ụlọ ọrụ na-enye ihe ọmụma banyere nsí, maka ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ihe na-erichapụ ihe abanye nwatakịrị n’anya, jiri nnukwu mmiri sachaa ya ozugbo ruo minit iri ma ọ dịkarịa ala.
• Ọkụ ọhụhụ: Maka ọkụ ọhụhụ na-ebughị ibu, wụọ mmiri jụrụ oyi (ọ bụghị nke jụbigara oyi ókè) n’ebe ahụ ọkụ hụrụ ya ruo minit 20 ma ọ dịkarịa ala. Ọ bụrụ na ebe ahụ ọkụ hụrụ ya bukarịrị ọbọ aka nwatakịrị n’ibu ma ọ bụ na ọ bụ n’ihu, na nkwonkwo, ma ọ bụ n’okpuru afọ ma ọ bụ n’akụkụ o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, i kwesịrị ịkpọga nwatakịrị ahụ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede. Dọkịta aghaghị ịgwọ ọkụ ọhụhụ buru ibu mgbe nile.
• Ihe mgbakoro: Ọ bụrụ na e nwere ihe gbakooro nwatakịrị n’akpịrị, ọ kasị dị oké mkpa ka i wepụ ihe ahụ ngwa ngwa. Otu ụzọ dị irè ị pụrụ ịgbaso bụ ịbịado ya aka n’afọ. Ọ bụrụ na ị maghị eme ya, kpọtụrụ dọkịta gị iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere usoro a, ma ọ bụ gaa ebe a na-amụ ihe banyere inyere ụmụaka nwere ihe ọghọm aka ma ọ bụ inye ọgwụgwọ mberede bụ́ ebe a na-akụzi usoro a.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe E Si Nweta Ya: Red Cross nke Sweden
[Foto dị na peeji nke 25]
Ikpu okpu nchebe mgbe a na-agba ịnyịnya ígwè
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịnọ ná nchebe mgbe a nọ n’oche ụgbọala