Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g00 6/8 p. 31
  • Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn
  • Teta!—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Mmadụ Ga-esi Na-achịkwa Otú O Si Ekiri TV
    Teta!—2006
  • Tv Ọ̀ Na-ezu Ohi Oge?
    Teta!—2006
  • Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’
    Teta!—2006
Teta!—2000
g00 6/8 p. 31

Iji Nlezianya Na-ekiri Telivishọn

TELIVISHỌN bụ “ọkọ akụkọ bụ́ isi, ihe na-eku nwa na ihe na-akpụzi echiche ọha na eze,” ka otu akụkọ bụ́ Not in the Public Interest—Local TV News in America na-ekwu, nke otu ìgwè na-enyocha ụlọ ọrụ mgbasa ozi na United States chịkọtara. “TV gbara anyị gburugburu . . . Dị ka anwụrụ ọkụ, ọ dị n’ikuku.” Dịkwa nnọọ ka ikuru anwụrụ ọkụ siga onye ọzọ si emerụ ahụ, otú ahụ ka iji ọtụtụ awa na-ekiri ihe omume TV a na-ahọrọghị nke ọma na-enwe mmetụta na-emerụ ahụ—karịsịa n’ahụ ụmụaka.

N’ikwu banyere mpụ na ime ihe ike nke TV, otu akụkọ ahụ na-ekwu na “ọtụtụ narị nnyocha ndị e mere egosiwo na ikiri ime ihe ike na-enwe mmetụta dị njọ n’ikike ịmụta ihe, ịchọ okwu na ọmịiko nke ụmụaka.” Òtù Ọgwụ na Ahụ Ike nke America kwuru na 1992 na “ihe ike telivishọn so n’ihe na-eyi ahụ ike nke ndị na-eto eto egwu.”

Olee otú ị pụrụ isi chịkwaa mmetụta nke ihe omume TV dị njọ na-enwe n’ahụ ụmụaka gị? Akụkọ ahụ depụtara ihe ọmụma ụfọdụ, bụ́ ndị e nwetara n’aro ndị òtù ahụ ike dị iche iche tụrụ, banyere otú a ga-esi ejikwu nlezianya na-ekiri telivishọn. Ụfọdụ n’ime ihe ọmụma ndị ahụ gụnyere ihe ndị na-esonụ.

◼ Mee atụmatụ ma belata ikiri TV. Kwuo mgbe ụmụaka pụrụ ikiri TV. Etinyela TV n’ọnụ ụlọ ụmụaka.

◼ Debe map ụwa n’akụkụ TV ahụ ka ụmụaka wee nwee ike ịhụ ebe ndị ha na-ekiri n’ihe omume TV.

◼ Soro ụmụaka gị na-ekiri telivishọn ka i wee nwee ike ịkọwa ihe ndị dị ka ọdịiche dị n’agbata ihe bụ echiche efu na ihe mere eme. Ọtụtụ ụmụaka na-erubeghị afọ iri apụghị ịmata ọdịiche ahụ mgbe nile.

◼ Bupụ telivishọn n’ebe a na-ahụkarị ya n’ụlọ gị. Debe TV n’ime kọbọd nwere ọnụ ụzọ. Ọ ga-eme ka o sitụ ike ịgbanye ya na ịgbanwegharị chanel ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya