Ndị Nọọsụ—n’Ihi Gịnị Ka Ha Ji Dị Anyị Mkpa?
“Ọrụ nọọsụ bụ otu n’ime ọrụ nkà ndị kasị sie ike. Ọmịiko pụrụ ịbụ ihe na-akpali ya, ma ihe ọmụma bụ nanị ihe na-enye anyị ike ọrụ.”—Mary Adelaide Nutting, 1925, onye mbụ ghọrọ prọfesọ n’ọrụ nọọsụ n’ụwa.
N’ỤDỊ ya kasị dị mfe, ọrụ nọọsụ dịwara eri ọtụtụ puku afọ gara aga—ọbụna n’oge Bible. (1 Ndị Eze 1:2-4) N’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị inyom a ma ama elekọtawo ndị ọrịa. Dị ka ihe atụ, tụlee Elizabeth onye Hungary (1207-1231), nwa nwanyị Eze Andrew nke Abụọ. Ọ haziri nkesa nri n’oge e nwere ụnwụ nri na 1226. Mgbe nke ahụ gasịrị o mere ndokwa ka e wuo ụlọ ọgwụ dị iche iche, o lekọtakwara ndị ekpenta n’ebe ndị ahụ. Elizabeth nwụrụ mgbe ọ dị nanị afọ 24, ka o jisịrị ihe ka ukwuu n’afọ ole na ole ọ dịrị ndụ lekọta ndị ọrịa.
Ọ pụghị ikwe omume ịkọ akụkọ banyere ọrụ nọọsụ wee ghara ịkpọtụ Florence Nightingale aha. Nwanyị a na-adịghị atụ ụjọ bụ́ onye England na ndị nọọsụ 38 hazigharịrị ụlọ ọgwụ ndị agha dị na Scutari, bụ́ ógbè dịpụrụ adịpụ na Constantinople, n’oge a na-alụ Agha Crimea na 1853-1856. Mgbe o rutere n’ebe ahụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụnụ fọrọ nke nta ka o ruo pasent 60; mgbe ọ pụrụ n’ebe ahụ na 1856, ọ bụ ihe na-erughị pasent 2 na-anwụ.—Lee igbe dị na peeji nke 6.
Ihe ọzọ nwere mmetụta dị ukwuu n’ọrụ nọọsụ bụ Ụlọ Akwụkwọ Protestant Na-azụpụta Ndị Dikin Ụmụ Nwanyị dị na Kaiserswerth, Germany, bụ́ ebe Nightingale gara akwụkwọ tupu ya agaa Crimea. Ka oge na-aga, ìgwè ndị nọọsụ ọzọ a ma ama malitere. Dị ka ihe atụ, na 1903, Agnes Karll guzobere Òtù Ndị Ọrụ Nọọsụ nke Germany.
Taa, ndị nọọsụ mejupụtara ihe a na-ewere dị ka ìgwè ndị ọrụ kasịnụ n’usoro nlekọta ahụ ike. Òtù Ahụ Ike Ụwa na-akọ na ugbu a e nwere ihe karịrị nnọọ ndị nọọsụ na ndị na-eji ime 9,000,000 na-arụ ọrụ ná mba 141. Lee ọrụ dị mkpa ha na-arụ! Magazin bụ́ The Atlantic Monthly na-akọ na ndị nọọsụ “na-ejikọ nlekọta, ihe ọmụma, na ntụkwasị obi dị mkpa maka mgbake nke ndị ọrịa.” Ya mere, anyị pụrụ ịjụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere ndị nọọsụ, sị, Gịnị ka anyị ga-eme ma e wezụga ha?
Ọrụ Nọọsụ Na-arụ ná Mgbake
Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-akọwa ọrụ nọọsụ dị ka “usoro nọọsụ ji enyere onye ọrịa aka ịgbake n’ọrịa ma ọ bụ ná mmerụ ahụ ya, ma ọ bụ inwetaghachi onwe ya ruo ókè o kwere mee.”
N’ezie, usoro ahụ gụnyere ọtụtụ ihe. Ọ bụ ihe karịrị nanị ile ahụ mgbe mgbe, dị ka ile obi ọkụkụ na ọ̀tụ̀tụ̀ nrugharị ọbara. Nọọsụ na-arụ ọrụ dị mkpa ná mgbake nke onye ọrịa. Dị ka The American Medical Association Encyclopedia of Medicine si kwuo, “nọọsụ na-ahụ banyere otú onye ọrịa si emeghachi omume n’ozuzu ya n’ebe ọrịa dị karịa ịhụ banyere ọrịa ahụ n’onwe ya, ọ na-etinyekwa mgbalị dị ukwuu n’ibelata ahụ mgbu, ịkwụsị mkpaghasị uche, na, mgbe o kwere mee, izere nsogbu ndị ọzọ ọrịa na-akpata.” Tụkwasị na nke a, nọọsụ na-eji “nlezianya enye nlekọta, bụ́ nke na-agụnye iji ndidi na-ege ntị ná nchegbu onye ọrịa na-enwe na ihe ndị ọ na-atụ egwu, ya na inye nkwado n’ụzọ mmetụta uche na ịkasi ya obi.” Mgbe onye ọrịa na-anwụ anwụ, ka magazin a na-ekwu, ọrụ nọọsụ na-arụ bụ “inyere onye ọrịa aka izute ọnwụ n’enweghị ihe mgbu nakwa n’ụzọ dị ùgwù ruo ókè o kwere mee.”
Ọtụtụ ndị nọọsụ na-arụ karịa ihe ndị a chọrọ ha n’aka. Dị ka ihe atụ, Ellen D. Baer dere banyere ahụmahụ o nwere n’Ụlọ Ọrụ Ahụ Ike Montefiore dị na New York City. Ọ chọghị isoro ìgwè ndị na-awa ahụ rụọ ọrụ ụtụtụ ya ọkụ ọkụ. “Achọrọ m isoro ndị ọrịa nọrọ,” ka o dere. “Achọrọ m inyere ha aka n’iku ume ha, inyere ha aka ime ngagharị, ịsa ọnyá ha nke ọma, ịza ajụjụ ha, ịkọwara ha ihe dị iche iche, na ime ka ha tụsara ahụ. Isoro ndị ọrịa na-akpachi anya ma na-emekọrịta ihe na-amasị m.”
Obi abụọ adịghị ya na onye ọ bụla nọtụworo n’ụlọ ọgwụ dị ka onye ọrịa pụrụ icheta nọọsụ nwere ọmịiko nke nwere otu mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà dị otú ahụ. Ma gịnị ka ọ chọrọ mmadụ n’aka iji ghọọ nọọsụ maara nke a na-akọ?
[Foto dị na peeji nke 3]
Florence Nightingale
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’ikike nke National Library of Medicine