Akụkọ Ihe Mere Eme—Ànyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ya Obi?
“Ịmata ihe ndị mere n’oge gara aga na-eme . . . ka anyị nwee mmetụta nke iso n’ọha mmadụ nke na-anọru ogologo oge site n’oge dị anya tupu a mụọ anyị ruo n’oge dị anya mgbe anyị nwụsịrị.”—A COMPANION TO THE STUDY OF HISTORY, NKE MICHAEL STANFORD DERE.
I BI ndụ n’amaghị ihe ndị mere n’oge gara aga bụ ibi ndụ n’enweghị ihe ọmụma zuru ezu. Ọ bụrụ na a maghị ihe ndị mere n’oge gara aga, gị onwe gị, ezinụlọ gị, ebo gị, ma ọ bụ ọbụna mba gị ga-eyi ihe na-enweghị mmalite, ihe na-adịghị n’oge gara aga. Ihe ndị na-eme ugbu a ga-eyi ka hà enweghị ntọala, gharakwa inwe nzube.
Akụkọ ihe mere eme pụrụ inwe ọtụtụ ihe mmụta maka ndụ. Ọ pụrụ inyere anyị aka izere ịdaba n’otu mmehie ihe ugboro ugboro. Dị ka otu onye ọkà ihe ọmụma kwusiri ike, ndị na-echezọ ihe ndị ha mehiere n’oge gara aga aghaghị ime ha ọzọ. Ịmata ihe ndị mere n’oge gara aga nke ọma pụrụ ime ka anyị ghọta ọdịnala ndị e nwere n’oge gara aga, ihe ndị dị ịtụnanya a chọpụtara, ụmụ mmadụ na-adọrọ mmasị, na ụzọ dị iche iche e si ele ihe anya.
Ma ebe ọ bụ na akụkọ ihe mere eme na-akọ banyere ndị mmadụ na ihe ndị mere n’oge dị anya gara aga, olee otú anyị ga-esi mara ma a pụru ịtụkwasị ya obi? Ọ bụrụ na anyị ga-amụta ihe ndị bara uru n’akụkọ ihe mere eme, mgbe ahụ, o doro anya na ha aghaghị ịdabere n’eziokwu. Mgbe anyị chọpụtakwara eziokwu, anyị kwesịrị ịnakwere ya, ọ bụ ezie na nke ahụ nwere ike ghara ịdị ụtọ mgbe nile. A pụrụ iji oge gara aga tụnyere ubi okooko osisi—ọ na-ama mma ma na-adụ ogwu; ọ pụrụ ịkpali akpali, ọ pụkwara ime ka a kwaa ụta.
N’isiokwu ndị na-esonụ, anyị ga-atụle akụkụ ụfọdụ nke akụkọ ihe mere eme bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ikpebi izi ezi nke ihe anyị na-agụ. Anyị ga-atụlekwa otú akụkọ ihe mere eme n’ezie pụrụ isi baara onye na-agụ ihe nke nwere nghọta, uru.
[Foto dị na peeji nke 3]
Eze Nwanyị Nefertiti
[Foto dị na peeji nke 3]
Ihe ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịmụta site n’akụkọ ihe mere eme?
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Nefertiti: Ägyptisches Museum der Staatlichen Museen Preußischer Kulturbesitz, Berlin
N’akụkụ peeji: Foto e sere site n’ikike a natara British Museum