Idei Mmiri E Nwere na Mozambique—Otú Ndị Kraịst Si Lekọta Ndị O Metụtara
SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MOZAMBIQUE
NÁ MMALITE afọ gara aga, foto ndị si Mozambique, ndị e sere ndị jidesiri aka ike n’alaka osisi dị iche iche ka idei mmiri na-eyi ndụ ha egwu dọọrọ uche ndị kiriri ha na telivishọn. Otu nwanyị nọ n’elu osisi mụọ nwa, a hụkwara ka e buuru ya na nwa ya gaa n’ebe na-adịghị ize ndụ. Otú ọ dị, ọtụtụ puku mmadụ tọrọ atọ ruo ọtụtụ ụbọchị—ụfọdụ na agwọ nọrọ—ruo mgbe idei mmiri ahụ talatara ma ọ bụ ruo mgbe e ji helikọpta bịa napụta ha.
Ọdachi ahụ malitere mgbe e nwere oké mmiri ozuzo n’isi obodo Mozambique, bụ́ Maputo. N’ime awa ole na ole, idei mmiri jupụtara n’ógbè dum dịpụrụ adịpụ. N’ebe ụfọdụ, mmiri toruru n’elu ụlọ. Okporo ụzọ ghọrọ osimiri na-ebigbọ ebigbọ. A bịara nwee nnukwu okokoro dị iche iche, mmiri bufuru ụlọ na ụgbọala, nakwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile. Ma nke kasị njọ ka na-abịa.
Mmiri ahụ nọgidere na-ezo, na-erikpu akụkụ ebe ndịda dum nke mba ahụ. Mmiri zokwara ná mba ndị ya na ha gbara agbata obi bụ́ South Africa, Zimbabwe, na Botswana. N’ihi na osimiri Incomati, Limpopo, na Zambezi na-esi ná mba ndị a asọfe Mozambique ịsọnye n’oké osimiri, e bibiri ebe buru ibu na Mozambique mgbe mmiri tojuru na ha. Otú ndị Kraịst si lekọta ibe ha mgbe e nwere ọdachi a bụ akụkọ na-ewusi okwukwe ike.
Ịchọpụta Ihe Ndị Mebiri ná Mmalite
Na February 9 n’afọ gara aga, ndị nnọchiteanya abụọ nke alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova na Maputo gara ileta ebe ugwu. N’ihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, ha gafere obodo bụ́ Xinavane, bụ́ ebe Osimiri Incoluane tojuru nnọọ etoju. Ha kpebiri ịga n’ihu ruo Xai-Xai, isi obodo ógbè Gaza. Otú ọ dị, ha chọpụtara na ọ dịghị ihe na-egosi na e nwere nsogbu n’ebe dị nso n’obodo bụ́ Chókwè, bụ́ ebe a na-enwekarị idei mmiri kasị njọ ma e nwee oké mmiri ozuzo. Ya mere ha kpebiri ịlaghachi Maputo.
Otú ọ dị, ka ọ fọrọ nke nta ka ha rute Xinavane ná nlọta ha, ha kwụsịrị n’ebe ndị uwe ojii gebichiri ihe n’ụzọ. “Idei mmiri si South Africa asọrutewo ma mee ka ụzọ awara awara ghara ikwe ọgịga,” ka ndị uwe ojii dọrọ ha aka ná ntị. “Ma bọs ma gwongworo apụghị ịgafe.” Ugbu a idei mmiri erikpuwo otu ụzọ ahụ ha si gafee n’ụtụtụ! Ebe ọ bụ na osimiri ndị dị n’ime ime ebe ugwu na-etokwa eto, e kewapụrụ ógbè ahụ n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ.
Ụmụnna abụọ ahụ kpebiri ịrahụ na Macia, bụ́ nke dị nso. Ọnọdụ bịara ka njọ n’abalị ahụ. Idei mmiri rikpuru obodo Xinavane ahụ dum, ihe nile ndị bi ebe ahụ nwere funahụkwara ha. E mere ndokwa inyere Ndịàmà nọ n’ebe ahụ aka iru n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Macia, bụ́ ebe e wuru ogige ndị gbara ọsọ ndụ a ga-ebi na ya ruo nwa oge. Ndịàmà gara n’ụlọ nkwakọba ihe ozugbo ma zụrụ ihe ndị dị ha mkpa dị ka osikapa, àgwà, ntụ ọka, na mmanụ.
E nwere nchegbu ugbu a banyere ndị Kraịst nọ na Chókwè na n’obodo ndị dị ya nso. Ndị nlekọta nọ n’ọgbakọ ndị dị na Chókwè nọkọrọ ma hazie otú a ga-esi kpọpụ mmadụ nile. A gbasara ozi, sị: “Sinụ n’ebe a pụọ ozugbo, gawakwanụ Macia!” Otú ọ dị, a chọpụtara n’oge na-adịghị anya na ọtụtụ ndị si Xinavane erutebeghị. N’ihi ya e zipụrụ Ndịàmà ka ha gaa chọpụta ọnọdụ ha. A chọpụtakwara na mmiri riri otu onye Kraịst bụ́ okenye n’ime ụlọ ya. E mere ndokwa maka olili ya, a chọtakwara Ndịàmà ndị ọzọ, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha nọ n’elu ụlọ, ma nyere ha aka iru Macia.
Mgbe e mesịrị ndokwa ndị a, ndị nnọchiteanya ahụ si alaka ụlọ ọrụ gara Bilene, bụ́ otu obere obodo dị n’ókè obodo ahụ, bụ́ ebe ha kwụrụ ụgwọ otu ụgbọelu ga-ebuga ha Maputo. Idei mmiri rikpuru ógbè ahụ ruo ebe anya ndị njem ahụ pụrụ iru. A kọrọ na nanị n’ógbè Gaza, o metụtara mmadụ 600,000.
Ọnọdụ ahụ Aka Njọ
N’ụbọchị ole na ole sochirinụ, mmiri ahụ zosikwuru ike, e bibikwara ógbè ndị dị n’etiti Mozambique. Mgbe nke ahụ gasịrị, oké ifufe nke ebe okpomọkụ a na-akpọ Eline malitere. Na February 20, o butere mmiri ozuzo na-ebibi ihe n’ógbè ndị dị n’Inhambane, Sofala, na Manica. N’ihi ya, e nwere idei mmiri, mbibi ọzọ, na ndị ọzọ nwụrụnụ.
Mgbe nke ahụ gasịrị, ka ọ na-erule ná ngwụsị February, idei mmiri rikpuru obodo bụ́ Chókwè na ógbè dum gbara ya gburugburu n’ụzọ a na-ahụtụbeghị mbụ. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ etiti abalị na Saturday, February 26, nnukwu idei mmiri sọbatara, na-eburu ihe nile o zutere. “Mkpu onye agbata obi anyị nọ na windo na-eti kpọtere anyị n’ụra,” ka Luis Chitlango kọrọ, bụ́ Onyeàmà dị afọ 32.
Chitlango kọwara, sị: “Ka anyị sị n’àkwà na-amatu, anyị nụrụ oké mbigbọ nke idei mmiri ahụ. Ka anyị na-agbapụ, anyị hụrụ ọtụtụ agwọ. N’elekere isii nke ụtụtụ anyị rutere n’ebe ala ka elu, ma ka e mesịrị n’ụtụtụ ahụ, mgbe idei mmiri tojuworo ebe nile, anyị rịgooro n’elu osisi. Mmadụ 20 mejupụtara ìgwè nke anyị.
“Ndị ikom bu ụzọ rịgoro n’elu osisi ndị ahụ. Ndị inyom ekunyezie ha ụmụaka, e wee kegide ha n’alaka osisi. Ndị inyom kuuru ụmụ ọhụrụ ha sochie. Site n’oge ruo n’oge, anyị na-esi n’osisi ndị ahụ arịdata ma metụ aka n’ala mmiri ahụ iji chọọ ahụekere, bụ́ nke anyị maara na a na-akọ n’ebe ahụ.
“Ka ụbọchị atọ gasịrị, e kpebiri na anyị nile ga-eji ụkwụ gaa Chókwè. Idei mmiri ahụ ruru anyị n’obi, anyị nagidekwara ebe ndị na-asọsi ike. Ka anyị na-aga anyị hụrụ ọtụtụ mmadụ n’elu osisi nakwa n’elu ụlọ. N’echi ya, idei mmiri ahụ talataruru n’ókè nke ikwe ka gwongworo ruo n’obodo ahụ ma buru ndị mmadụ gaa Macia.”
Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ nke Ndịàmà
Na March 4, alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova kwụrụ ụgwọ otu ụgbọelu ma jiri ya buga ndị nnọchiteanya ya n’ebe ahụ e nwere ọdachi. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị bi ebe ahụ agbagawo Macia, bụ́ ebe e meworo ka ọ ghọọ ogige buru ibu maka ndị gbara ọsọ ndụ. Ọtụtụ ndị idei mmiri ahụ metụtara bịara bụrụ ndị na-adịkwaghị eri ihe na-edozi ahụ, nwee ahụ ọkụ, ịba, na nsogbu ndị ọzọ.
Ebe ahụ dị ka ebe a na-alụ agha. Helikọpta mba dị iche iche zitere jupụtara na mbara igwe n’obodo ahụ, ha dakwara n’ebe ndị e mere ngwa ngwa ka ụgbọelu daa iji butuo ihe dị iche iche. Mgbe Ndịàmà bụ́ ndị ọrụ enyemaka rutere Macia, ha mere ndokwa, ọ bụghị nanị maka inye ndị idei mmiri metụtara nri, kama ha guzobekwara ebe nlekọta maka ndị ahụ na-adịghị ike. Otú ọ dị, ha bu ụzọ nweta nkwado nke ndị ọchịchị nke ógbè ahụ, bụ́ ndị jara ha mma maka ime ihe n’onwe ha.
Kwa ụtụtụ n’ogige Ndịàmà ahụ, bụ́ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Ndịàmà 700 na ndị ọzọ nọ na ya, a na-atụle otu akụkụ Bible n’elekere 6:30 nke ụtụtụ. Mgbe nri ụmụnna nwanyị bụ́ ndị kraịst na-esi ghere, a na-akpọ aha ndị isi ezinụlọ dị iche iche. Nke ọ bụla n’ime ha na-eji mkpịsị aka ya egosi efere ole ọ chọrọ, a na-ebunyekwa ya nri ahụ.
A haziri ihe nile a na-eme ná ndụ nke ọma n’ogige ahụ. E kenyere ndị ụfọdụ ịzụta nri; e kenyekwara ndị ọzọ ịhụ na e debere mmiri ọṅụṅụ ọcha, idebe ụlọ mposi ọcha, na ihe ndị ọzọ. Ndị ọrụ ọchịchị hụrụ ezi nhazi ahụ e mere, ha kwuru, sị: ‘Ebe a dị mma ọnụnọ. Ọ dịghị onye nri na-adịghị erute, e nweghịkwa esemokwu.’ Otu onye ọchịchị si ebe ahụ kwuru, sị: ‘Onye ọ bụla kwesịrị ịga leta ogige Ndịàmà iji hụ otú ihe kwesịrị isi na-aga.’
Otu ụbọchị kọmitii enyemaka ahụ kpọkọtara ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ma gwa ha na alaka ụlọ ọrụ emewo ndokwa ịrụgharị ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche nakwa inye ndị idei mmiri metụtara ihe ndị ọzọ bụ́ isi. N’ụtụtụ na-esochi ya mgbe a na-atụle ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị, a mara ọkwa banyere atụmatụ ndị ahụ. A kụrụ aka ruo ogologo oge.
Ọ bụ ezie na ndị ọchịchị nyere ha nnukwu ụlọikwuu abụọ, ọtụtụ ndị nọ n’ogige ahụ ka na-ehi ụra n’èzí. Ya mere e si n’etiti ndị ahụ idei mmiri metụtara hazie otu ìgwè iwu otu nnukwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu ibé ala ọgbakọ dị n’ebe ahụ. E ji ahịhịa na gbam gbam wuo ya—ụdị a na-ewu na Mozambique—ịba mmadụ 200. E wuchara ya n’ime nanị ụbọchị abụọ!
Ịchọta Ndị E Kewapụrụ Ekewapụ
Ka ọ dịgodị, na March 5, mgbe idei mmiri ahụ talatatụsịrị, e guzobere otu ìgwè ndị ọrụ enyemaka ka ha gaa Aldeia da Barragem, bụ́ nke dị n’otu n’ime ógbè ndị mbụ e nwere idei mmiri. O nwere otu ọgbakọ nke ihe dị ka Ndịàmà 90 mejupụtara, ọ dịbeghịkwa ihe ọ bụla a nụrụ banyere ha.
Ka ha na-aga, ìgwè ahụ gafere Chihaquelane, otu nnukwu ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke ihe dị ka 100,000 mmadụ nọ na ya. N’aka abụọ nke ụzọ ahụ, bụ́ nke mmiri bibiri ebe dị iche iche na ya, idei mmiri jupụtara ógbè ahụ ruo ebe anya pụrụ iru. Otu onye so n’ìgwè ahụ kwuru, sị: “Mgbe anyị rutere na Chókwè, anyị hụrụ na ọ bụzi mkpọmkpọ ebe. Idei mmiri ka toruru n’elu ọtụtụ ụlọ dị ná mbata nke obodo ahụ. Idei mmiri rikpuru ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị dị n’ebe ahụ. Chi ejiwela, anyị ka ga-aga kilomita 25 tupu anyị erute Aldeia da Barragem.”
N’ikpeazụ, ìgwè ahụ rutere ebe ha na-aga n’abalị. Otu onye so n’ìgwè ahụ na-echeta, sị: “Anyị kwụsịrị ma na-eche ihe ọzọ anyị ga-eme.” Mgbe ahụ, ndị mmadụ pụtara, na-eti, sị: “Ụmụnna!” a chịkwara ọchị obi ụtọ, nke dara oké ụda. Mgbe ha hụrụ ọkụ ụgbọala abụọ ahụ, Ndịàmà nọ ebe ahụ chere ozugbo na ọ pụrụ ịbụ ụmụnna ha, ha gwakwara ndị ọzọ nke a. Nke a masịrị nnọọ ndị na-ekiri ihe na-emenụ, ha kwuru, sị: ‘Ndị a nwere ịhụnanya n’ezie. Ha butere nri, ọbụnakwa bịa ime nleta!’
Ịga n’Ihu n’Inye Nlekọta
E nyeere ụmụnna ahụ si Aldeia da Barragem aka iru n’ogige ahụ dị na Macia, bụ́ ebe e nyere ha nri, ụlọ, na ọgwụgwọ. Ka ọ dịgodị, ọnọdụ e nwere na Macia nọ na-adịwanye njọ. Nri, ọgwụ, na mmanụ ụgbọala dị ụkọ, ebe ọ bụ na ọ bụ ụgbọelu ka e ji na-ebubata ha. E nwere mkpa dị ngwa maka ịmaliteghachi iji ụgbọala na-aga Maputo. E mere nke a ka ọ na-erule March 8.
Idei mmiri rikpuru obodo ukwu bụ́ Xai-Xai kpam kpam. Idei mmiri tojupụtara ebe kasị mepee emepe na ya, na-eru mita atọ n’ebe ụfọdụ! Ndịàmà ahụ guzobere kọmitii enyemaka iji lekọta ụmụnna ha nọ n’ebe ahụ. Ọzọkwa, a haziri kọmitii ndị ga-elekọta ndị nwere mkpa nọ n’ógbè Sofala na Manica.
Ndịàmà nọ ná mba ndị ọzọ wetara ihe enyemaka dị iche iche. Dị ka ihe atụ, alaka ụlọ ọrụ South Africa mere ndokwa maka ibubata ọtụtụ tọn ákwà, blanket, na ihe ndị ọzọ. Isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, wetakwara ego iji lekọta ndị ọdachi ahụ metụtara.
Mgbe idei mmiri ahụ talataruru n’ókè dị mma, a gụkọọkwa ndị ụlọ ha bibiri, a malitere ọrụ iwughachi ụlọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. E guzobere kọmitii ga na-ahụ maka iwughachi ụlọ, ọtụtụ ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ ndị malitere ọrụ ozugbo kwadokwara ya. Kemgbe ahụ, e wughachiwo ihe karịrị ụlọ 270 nakwa ma ọ dịkarịa ala Ụlọ Nzukọ Alaeze ise.
Mgbe e wuchara ụlọ ndị mbụ ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà wuru, ndị mmadụ matara. Otu onye agbata obi kwuru, sị: ‘Unu na-efe Chineke dị ndụ. Ndị pastọ anyị adịghị echeta ụmụ atụrụ ha na-ata ahụhụ. Ma, a na-ewuru unu ụlọ ndị a mara mma.’ N’ebe ndị dị otú ahụ, ọtụtụ ndị anọwo na-aṅa ntị n’ozi Alaeze Ndịàmà Jehova na-ezisa, a malitewokwa ọtụtụ ọmụmụ Bible.—Matiu 24:14; Mkpughe 21:3, 4.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ Ndịàmà tụfuru ihe onwunwe ha nile, ọ dịghị nke kwụsịrị inwe okwukwe. Kama nke ahụ, e wusiri okwukwe ha nwere n’ebe Jehova Chineke nakwa n’ebe òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ nọ, ike. Ha na-ekele òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ nke na-ahụ n’anya, bụ́ nke mere nnọọ ihe ozugbo maka oké ọdachi a. Ha enwetawo nlekọta ọmịiko na nchebe nke Jehova n’onwe ha, ha ga na-echetakwa mgbe nile okwu Bible bụ́: “Onye ukwu ka Jehova bụ.”—Abụ Ọma 48:1.
[Foto dị na peeji nke 24, 25]
Idei mmiri rikpuru obodo Xai-Xai
[Foto dị na peeji nke 25]
E bubatara ihe enyemaka
[Foto dị na peeji nke 26]
ìgwè ndị ọrụ enyemaka bụ́ Ndịàmà guzobere ebe nlekọta nke ndị ahụ na-adịghị ike
[Foto dị na peeji nke 26]
A na-aga n’ihu n’iwu ụlọ ndị ọhụrụ
[Foto dị na peeji nke 26]
Ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke kasịnụ nwere 100,000 mmadụ nọ na ya