Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 4/8 p. 16
  • Ha Lanahụrụ Iju Mmiri!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Lanahụrụ Iju Mmiri!
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi n’Agbanyeghị Ebe Ọ Bụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • ‘Obi Malitere Iru Ọgbakọ Niile Ala n’Oge Ahụ’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Gịnị Mere Anyị Nile Kwesịrị Iji Too Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 4/8 p. 16

Ha Lanahụrụ Iju Mmiri!

Site n’aka onye edemede Teta! na Switzerland

N’October 2000, e nwetara ọtụtụ akụkọ si n’akụkụ dị iche iche nke ụwa banyere idei mmiri. Oké mmiri ozuzo kpara akụkụ ugwu dị iche iche aka ọjọọ, na-akpata ala mbuze ndị buuru ihe dị iche iche na ọbụna osisi ndị guzo eguzo!

Ọdachi dị otú ahụ mere n’ógbè Valais nke dị n’ebe ndịda Switzerland. Osimiri Rhône kewara ógbè a ụzọ abụọ, bụ́ osimiri nke si n’ala snow nke Rhône bụ́ nke dị n’ebe Etiti Ugwu Alps asọga n’ebe ọdịda anyanwụ ruo n’Ọdọ Mmiri Geneva—ihe dị ka kilomita 170. Ugwu ndị dị n’akụkụ abụọ nke osimiri ahụ na-enubanye mmiri ndị na-esi na ha asọdata n’ime osimiri ahụ site n’ọwa mmiri ndị hà otú dịgasị iche iche. Mgbe ihe dị mma, mmiri ndị na-asọ n’ọwa mmiri ndị a adịghị akpata nsogbu. Ma mgbe oké mmiri zoro wee tojuo n’ógbè ahụ nile, ihe na-eso ya na-abụkarị ọdachi.

Ọ dị otú a karịsịa na Gondo, nke dị n’ókè Ịtali. Nnukwu apịtị ndị okwute jupụtara na ha sọkwutere obodo nta a nke bụ́ ugwu ugwu bụ́ nke mmadụ 150 bi na ya, wee bibie akụkụ ya dị ukwuu. N’oge na-adịghị anya, oké mmiri ozuzo a rikpukwara ebe ndị ọzọ na Valais. Ọ sụchiri okporo ụzọ na ụzọ okporo ígwè dị iche iche, ụlọ dị iche iche malitekwara ijupụta n’apịtị na okwute. Ikpo apịtị e nwere n’ebe ụfọdụ ruru ihe dị ka mita 4 n’ịdị elu. Otu nwanyị nọ na-ekiri ka nnukwu apịtị karịrị mita 30 n’ịdị elu bu ọtụtụ nnukwu okwute na osisi ndị guzo eguzo na-abịa nnọọ n’obodo ya!

Markus na Tabitha, bụ́ di na nwunye, bi na Mörel n’oge ọdachi ahụ mere. “Otu ụda na mkpọtụ o mere metere anyị n’ụra mgbe o ji nnọọ obere ihe gafee elekere 6:00 nke ụtụtụ,” ka Markus na-echeta. “Eji m tọọchị pụọ n’èzí iji mara ihe merenụ, ihe m hụrụ wụkwara m akpata oyi n’ahụ́. Imerime okwute ebibiwo ụlọ na àkwà mmiri dị iche iche, mmiri bukwaara otu ụgbọala kụọ n’ụlọ onye agbata obi anyị. N’ebe mgbada nke ebe anyị bi, otu onye agbata obi anyị na nwunye ya tọrọ n’ime ụlọ ha. Agara m si na windo kpọpụta ha. Mgbe m lọtara n’ụlọ, mụ na Tabitha nwere nanị oge zuru iji chịkọta ngwongwo ole na ole.”

Markus na Tabitha bụ Ndịàmà Jehova, ha gbagakwara na nke ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị nọ n’ebe ọdachi ahụ na-erughị. “Ọ bụ ezie na anyị lanahụrụ ọdachi ahụ,” ka Markus na-ekwu, “ọdachi ahụ merenụ kpasasịrị nnọọ uche Tabitha ruo ọtụtụ ụbọchị.” Gịnị nyeere ya aka ịnagide ahụmahụ ọjọọ ahụ? “Nnọnyere na nkwado nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị, bụ́ ndị anyị na ha nọ n’otu okwukwe,” ka Tabitha na-aza, na-agbakwụnye, sị: “Tinyekwara mmasị nke ọtụtụ ndị nọ n’ógbè anyị gosiri anyị.”

E chetaara Markus na Tabitha ihe dị n’Ilu 18:24, bụ́ nke na-ekwu na “[enyi] na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” N’oge ọdachi, lee nnọọ ka ndị enyi dị otú a si abụ ndị dị oké ọnụ ahịa!

[Map dị na peeji 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ógbè ebe ọdachi ahụ metụtara

Gondo

[Foto dị na peeji nke 16]

Markus na Tabitha

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]

Mise à disposition par www.crealp.ch

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya