Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 8/8 p. 3
  • Ịnọ n’Ụjọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnọ n’Ụjọ
  • Teta!—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ikekwe Ọ Ga-agbanwe na nke Ugbu A”
    Teta!—2001
  • N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Nọrọ N’ụjọ?
    Teta!—2005
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2005
g05 8/8 p. 3

Ịnọ n’Ụjọ

ỤJỌ na-atụ Roxanaa ịgwa di ya na ya chọrọ ịmalite ọrụ nwa oge. Mgbe ọ rịọrọ di ya ego ọ ga-eji baa bọs gaa leta nne ya, di ya kụtaara ya isi aba okpu nke mere ka a kpọga ya ụlọ ọgwụ. Roxana nọ n’ụjọ mgbe nile.

Rolando na-ekwebu ka nwunye ya na-eji ụgbọ njem ọhaneze alọta n’abalị, ma ugbu a, ọ na-eji ụgbọala ya aga ebulata ya. E nwewo nnọọ ọtụtụ ihe ike ndị a kọrọ na e mere n’ógbè ha bi nke na ọ na-atụzi ụjọ ka a ghara imerụ nwunye ya ahụ́.

Haidé na-arụ ọrụ n’ebe kasị ekwo ekwo n’otu isi obodo. Ka ọ na-alọta ọrụ otu ụbọchị, ọ dabara n’aka ndị na-eme ngagharị iwe bụ́ nke e mesịrị mewe ihe ike na ya. Ugbu a, ya nụhaala mkpọtụ ndị na-eme ngagharị iwe, obi amapụ ya. Ọ na-ekwu, sị: “Ahụ́ adịghị eru m ala. Achọghịzi m ịrụ ọrụ ebe a. Ma ọ dịghị ihe m pụrụ ime banyere ya.”

Roxana, Rolando, na Haidé nọ n’ụjọ—ọ bụghịkwa nanị mgbe e nwere ọnọdụ mberede. Kama ọ bụ ihe ha nọ na ya mgbe nile. Mgbe ndị mmadụ nọ n’ụjọ, ọ pụrụ ịdị ha ka a napụrụ ha ume. Ụjọ pụrụ ime ka ha ghara inwe ọṅụ site n’igbochi ha ime ihe ha chọrọ ime. Ọ pụrụ imetụta otú ndị mmadụ si eche echiche ma gbochie ha itinye uche n’ihe ndị ọzọ.

Ịnọ n’ụjọ na-akpata oké nchegbu. Ọ na-akpatakarị ịda mbà n’obi, ọ pụkwara ịkpatara mmadụ ọrịa dị oké njọ. Otu akwụkwọ na-ekwu banyere ahụ́ ike kwuru, sị: “Nchegbu na-ebelata ikike ahụ́ nwere ịlụso ọrịa ọgụ, sorokwa na-akpata ọtụtụ ọrịa. Ọ na-eji nwayọọ nwayọọ egbu ahụ́, karịsịa akụkụ ahụ́ ndị o metụtara. Nke a pụrụ ịkpata ọbara mgbali elu, ọrịa obi, ọrịa imeju, ọrịa afọ, ọnyá afọ, isi ọwụwa, ehighị ụra nke ọma, ịda mbà n’obi, na nchekasị. Mmadụ ịnọ n’ọnọdụ ahụ ruo ogologo oge na-eme ka ọ ghara inwe ume.”

N’ụwa taa, ndị mmadụ na-anọkarị n’ụjọ. Ọ̀ dị mgbe ọ bụla anyị ga-ahụ ụwa nke ndị mmadụ ga-ebi na ya n’atụghị ụjọ?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya