Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g05 12/8 p. 2-3
  • Enweghị Ebe Obibi—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enweghị Ebe Obibi—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
  • Teta!—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Na-akpata Ya?
    Teta!—2005
  • Enweghị Ebe Obibi—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2005
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2005
  • Enyemaka Ndị Bara Uru Dị n’Ebe Nile
    Teta!—2001
Teta!—2005
g05 12/8 p. 2-3

Enweghị Ebe Obibi—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA POLAND

“HA BỤ ndị aṅụrụma ruru unyí ma na-esi ísì—ọ dịghị ihe ha nwere, ọ dịghị onye ma ha, o nweghịkwa ihe ha bụ abụ!” Ọ bụ ihe ijuanya na ndị mmadụ ga-enwewa echiche dị otú a banyere ndị na-enweghị ebe obibi, ma dị ka ndị ọrụ afọ ofufo na-enyere ndị na-enweghị ebe obibi aka n’obodo Czestochowa, nke dị na Poland, si kwuo, nke ahụ bụ kpọmkwem otú ndị mmadụ na-esikarị ele ndị na-enweghị ebe obibi anya.

Dị ka otu akụkọ gbara na magazin bụ́ The Economist n’afọ ole na ole gara aga si kwuo, n’obodo Ulaanbaatar nke dị na Mongolia, ọtụtụ n’ime ọtụtụ puku ụmụaka ndị bi na ya bi n’ebe ndị na-esi nnọọ ísì ná mpụga obodo ahụ. Ebe ndị a ha bi bụ ebe ndị e si aga n’ebe ndị a na-ekpofu nsị́ ma ọ bụ n’ebe ndị e nwere ígwè ọrụ ndị na-eme ka ime ụlọ na-ekpo ọkụ n’oge oyi. Magazin ahụ kwukwara na ọ bụ ezie na ọ na-awụ ọtụtụ ndị Mongolia akpata oyi n’ahụ́ ịmata banyere ụmụaka ndị a na-enweghị ebe obibi, ha kwuru na ihe kpatara ọnọdụ ahụ bụ “n’ihi na umengwụ adịghị ekwe ndị mmadụ lekọta ụmụ ha.”

N’ebe ọzọ n’ụwa, ndị kpọrọ onwe ha ndị nchekwa obodo na-egbu ụmụaka ndị bi n’okporo ámá. N’ihi gịnị? Otu akwụkwọ Òtù Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara kọwara, sị: “Na Latin America, ọtụtụ ndị ọkàikpe, ndị uwe ojii, ndị ọrụ mgbasa ozi, ndị o ji ego achụ nta ego, na ọhaneze n’ozuzu ha kweere na ụmụaka ndị bi n’okporo ámá na-emebi obodo.” Akwụkwọ ahụ kwukwara sị: “A kọrọ na, ọ dịkarịa ala, a na-egbu mmadụ atọ n’ime ụmụaka ndị bi n’okporo ámá ndị dị na steeti Rio de Janeiro, kwa ụbọchị.”

Ndị na-enweghị ebe obibi “na-eme ka anyị nọrọ n’ụjọ nakwa ka ahụ́ ghara iru anyị ala . . . , ma ha bụkwa mmadụ ndị agụụ na-agụ otú o sikwa agụ anyị. Ha dị ọtụtụ, ha nwekwara mkpa ndị chọrọ ka e lebara ha anya.” Ihe a ka e dere n’otu ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke ndị ọrụ afọ ofufo na-enyere ndị na-enweghị ebe obibi aka na Czestochowa mepere. E dekwara n’otu ebe ahụ, sị: “Ekpere anyị bụ ka . . . ndị mmadụ nye aka gboo nnukwu mkpa a.” Gịnị n’ezie bụ́ mkpa a, oleekwa otú ọ haruru?

[Foto dị na peeji nke 2, 3]

Ọtụtụ ụmụaka bi n’ọgba a dị n’okpuru ala

[Ebe E Si Nweta Foto]

Jacob Ehrbahn/Morgenavisen Jyllands-Posten

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya