Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/06 p. 19
  • À Pụrụ Ịnụ Ụtọ Oge Agadi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Pụrụ Ịnụ Ụtọ Oge Agadi?
  • Teta!—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Enyerela M Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Otú Mgbakọ Atọ Si Mee Ka Ndụ M Gbanwee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • ‘Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe Ndị Dị Mkpa Merenụ n’Ozi M Na-ejere Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2006
g 4/06 p. 19

À Pụrụ Ịnụ Ụtọ Oge Agadi?

O JIRILA ọkara gafee elekere isii nke ụtụtụ n’otu ụtụtụ oké oyi na-atụ na Soweto, nke dị na South Africa. Oge eruola ka Evelyn bilie n’ihe ndina ya.a Ahụhụ ọ na-ata n’ụlọ ya n’ihi enweghị ihe na-eme ka ime ụlọ kporo ọkụ, abụghị ihe e ji ọnụ ekwu.

O jisiri nnọọ ike si n’ihe ndina ya ahụ chịtuo ụkwụ ya nke ogbu na nkwonkwo na-akpa aka ọjọọ. Ya anọdụzie ọdụ ma chere. Ụkwụ na-egbu ya mgbu ejiri nnọọ nwayọọ nwayọọ belata. Evelyn ejisizie ike bilie ọtọ. Ya asụọ ude n’ihi ihe mgbu. Dị nnọọ ka ‘ụkpala nke ghọọrọ onwe ya ibu,’ ma ọ bụ nke dọkpụụrụ onwe ya na-aga, Evelyn ejide aka n’úkwù ya ma jiri nwayọọ nwayọọ mara jijiji gawa ebe ọ na-anọ asa ahụ́.—Eklisiastis 12:5.b

Evelyn agwa onwe ya, sị, ‘Agbalịala m!’ Ọ bụghị nanị na ọ bọọla chi, kama o jisiekwala ike mee ka ahụ́ ya na-egbu ya mgbu malite ọrụ.

Ma, o nwere ihe ọzọ na-enye ya nsogbu n’obi. “Ọ bụ na m ga-amalite inwe ‘uche mkpasasị,’” ka Evelyn kwuru. Ọ naghị ama ebe o debere mkpịsị ugodi ya mgbe ụfọdụ, ma ụbụrụ ya ka na-arụ ọrụ nke ọma. Evelyn kwuru, sị: “Ekpere m bụ ka m ghara inwe uche mkpasasị dị ka ụfọdụ ndị agadi na-enwe.”

Mgbe Evelyn ka bụ agbọghọ, ọ dịtụghị eche banyere ihe na-eme mmadụ ma o mee agadi. Na mberede, ya adị ka afọ ọ̀ gbara ọsọ, ahụ́ ya ana-echetazikwara ya mgbe nile na ọ gbaala afọ 74.

Ụfọdụ ndị ọnọdụ ha ka nke Evelyn mma na ndị na-anaghị arịakarị ọrịa ma ọ bụ na-enwe nchegbu nwere ike ile oge a ha bụ agadi anya dị ka oge ha na-anụ ụtọ ndụ. Dị ka ọ dị nna ochie ahụ bụ́ Ebreham, ha nwere ike ịdịgide ndụ ruo ‘ezi isi awọ, bụrụ agadi, ndụ ha ejukwa ha afọ.’ (Jenesis 25:8) Ndị ọzọ na “ụbọchị ihe ọjọọ” na-alụ, nanị ihe ha nwekwara ike ikwu bụ: ‘Ndụ atọghị m ụtọ.’—Eklisiastis 12:1.

Olee otú i si ele oge agadi anya? Olee ụfọdụ ihe ịma aka ndị agadi na-enwe? Ọ̀ bụ iwu na mmadụ ga-enwerịrị uche mkpasasị ma o mee agadi? Gịnị ka a pụrụ ime iji mee ka obi na-eru ndị mmadụ ala n’oge agadi ha?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanweela aha ụfọdụ dị n’usoro isiokwu a.

b Ọ dịla anya a ghọtara akụkụ Akwụkwọ Nsọ a dị n’Eklisiastis, bụ́ akwụkwọ ochie dị na Bible, dị ka nkọwa e ji nlezianya jiri uri kọwaa ihe isi ike ndị a na-ahụ n’oge agadi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya