Echiche nke Bible
Na Nwoke na Nwanyị Hụrụ Onwe Ha n’Anya Ọ̀ Na-eme Ka Ha Inwe Mmekọahụ Tupu Ha Alụwa Zie Ezie?
N’OTU nnyocha e mere, a chọpụtara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ itoolu n’ime mmadụ iri ọ bụla a jụrụ ajụjụ a chere na nwoke na nwanyị inwe mmekọahụ tupu ha alụwa adịghị njọ ma ọ bụrụhaala na ha abụọ hụrụ onwe ha n’anya. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-agbasa echiche a, ọtụtụ mgbe, ha na-anabatakwa ya. A na-egosikarị mmekọahụ na televishọn nakwa na fim dị ka otu ụzọ dị mma e si ama na nwoke na nwanyị hụrụ onwe ha n’anya.
N’ezie, ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ anaghị ekwe ka ụwa na-eduzi ha n’ihi na ha maara na ụwa na-eme ihe kwekọrọ n’echiche nke onye na-achị ya, bụ́ Ekwensu. (1 Jọn 5:19) Ha na-akpacharakwa anya ka ọ ghara ịbụ nanị echiche nke ha na-eduzi ha n’ihi na ha maara na “obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Kama nke ahụ, ndị maara ihe n’ezie na-achọ ka Onye Okike na Okwu ya e ji ike mmụọ nsọ dee na-eduzi ha.—Ilu 3:5, 6; 2 Timoti 3:16.
Mmekọahụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke
Jems 1:17 na-ekwu, sị: “Ezi onyinye ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè sitere n’elu, n’ihi na o si n’ebe Nna nke ìhè eluigwe nọ na-abịa.” Mmekọahụ di na nwunye na-enwe bụ otu n’ime onyinye ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa. (Rut 1:9; 1 Ndị Kọrint 7:2, 7) Ọ bụ ụzọ ndị mmadụ si amụta ụmụ, bụrụkwa ụzọ dị ụtọ di na nwunye si amatakwu onwe ha n’ụzọ anụ ahụ́, nakwa ụzọ ha si amata ụdị mmetụta onye nke ọ bụla n’ime ha na-enwe. Eze Solomọn nke oge gboo dere, sị, ‘Ṅụrịa ọṅụ na nwunye ị lụrụ n’okorobịa. Ka ara ya abụọ na-eju gị afọ na mgbe nile.’—Ilu 5:18, 19.
Dị ka o kwesịrị ịdị, Jehova na-achọ ka anyị na-erite uru n’onyinye ya, ọ chọkwara ka ọ na-eme anyị obi ụtọ. N’ihi ya, o nyela anyị iwu na ụkpụrụ ndị kasị mma, bụ́ ndị anyị ga na-agbaso. (Abụ Ọma 19:7, 8) Jehova bụ “Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Nna anyị nke eluigwe—onye bụ́ ịhụnanya n’onwe ya—ọ̀ ga-anapụ anyị ihe dị nnọọ mma?—Abụ Ọma 34:10; 37:4; 84:11; 1 Jọn 4:8.
Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ọ Lụwa Di Ma Ọ Bụ Nwunye Na-egosi na O Nweghị Ịhụnanya
Mgbe nwoke na nwanyị bikọtara ọnụ dị ka di na nwunye, a pụrụ ịsị na ha aghọọla “otu anụ ahụ́.” Mgbe mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye nwere mmekọahụ, nke a na-akpọkwa ịkwa iko, ha abụọ na-aghọkwa “otu anụ ahụ́”—kama ọ bụ nke na-adịghị ọcha n’anya Chineke.a Ọzọkwa, nke ahụ adịghị egosi ịhụnanya. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ?—Mak 10:7-9; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10, 16.
Otu ihe kpatara ya bụ na ịkwa iko bụ mmadụ inwe mmekọahụ n’emeghị ezigbo nkwekọrịta. E wezụgakwa na ọ na-eme ka mmadụ gharazie inwe ùgwù, ọ pụrụ ime ka mmadụ bute ọrịa, tụrụ ime ọkwà, nweekwa obi mgbawa. Nke kasị njọ bụ na o megidere ụkpụrụ ezi omume Chineke. N’ihi ya, onye kwara iko na-egosi na ya achọchaghị ịma ma ọ bụkwanụ na ya achọghịdị ịma banyere ọdịmma na obi ụtọ nke onye ahụ ya na ya kwara iko, ma ugbu a ma n’ọdịnihu.
Nye Onye Kraịst, ịkwa iko bụkwa mmadụ ịnapụ nwanna ya nwoke ma ọ bụ nwanna ya nwanyị ihe ndị ruuru ya. (1 Ndị Tesalonaịka 4:3-6) Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla sịrị na ya bụ ohu Chineke nke sooro onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ na-emetọ ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ndị Hibru 12:15, 16) Ọzọkwa, onye ahụ emeela ka onye ya na ya kwara iko gharazie ịdị ọcha, ya bụrụkwa na onye ahụ alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, o meela ka onye ahụ ghara ịbanye n’alụmdi na nwunye dị ka onye na-amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị. Onye ahụ emebiekwala aha ọma nke ezinụlọ ya, mejọọkwa ezinụlọ nke onye ahụ ya na ya kwara iko. Nke ikpeazụ bụ na onye ahụ gosiri na ya adịghị akwanyere Chineke ùgwù, bụ́ onye o mejọrọ site n’imebi iwu na ụkpụrụ ezi omume ya. (Abụ Ọma 78:40, 41) Jehova n’onwe ya ‘ga-enyekwa ntaramahụhụ’ maka ihe ọjọọ nile dị otú ahụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị mere. (1 Ndị Tesalonaịka 4:6) Ya bụrụ otú ahụ, ò kwesịrị iju anyị anya na Bible na-agwa anyị ka anyị ‘gbanahụ ịkwa iko’?—1 Ndị Kọrint 6:18.
Ò nwere onye ị hụrụ n’anya, nke ị na-achọkwa ịlụ? Ya bụrụ na o nwere, gịnị ma unu jiri oge ahụ unu ka na-achọ ịlụ mee ihe n’ụzọ ga-eme ka unu nwee obi ike na nkwanye ùgwù n’ebe ibe unu nọ? Chegodị echiche: Olee otú nwanyị ga-esi tụkwasị nwoke gosirila na ya anaghị ejideli onwe ya obi? Oleekwa otú ọ ga-esi dịrị nwoke mfe ịsọpụrụ na inwe ịhụnanya n’ahụ́ nwanyị na-eleghara iwu Chineke anya iji mejụọ agụụ mmekọahụ ya ma ọ bụ iji mee ka obi dị nwoke ahụ ụtọ?
Chetakwa na ndị na-eleghara ụkpụrụ Chineke ji ịhụnanya setịpụ anya ga-aghọta mkpụrụ ha kụrụ. (Ndị Galeshia 6:7) Bible na-ekwu, sị: “Onye nọgidere na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.” (1 Ndị Kọrint 6:18; Ilu 7:5-27) N’eziokwu, ọ bụrụ na nwoke na nwanyị nwere mmekọahụ tupu ha alụọ ejiri obi ha nile chegharịa, gbalịsie ike iji mee ka ha na Chineke dịghachi ná mma, ma tụkwasịkwuo onwe ha obi karịa, ha nwere ike imesị kwụsị inwe mwute ha na-enwe. Otú ọ dị, omume ahụ ha mere n’oge gara aga nwere ike ịka nọkwa na-enye ha nsogbu n’obi. Otu di na nwunye na-akatachabeghị ahụ́ na-akwa ụta na ha kwara iko tupu ha alụọ. Nke nwoke na-ajụ onwe ya mgbe ụfọdụ, sị, ‘Ihe mere mụ na nwunye m na-ejikarị ese okwu ọ̀ ga-abụ n’ihi na anyị ji omume na-adịghị ọcha malite adịm ná mma anyị?
Ezi Ịhụnanya Adịghị Achọ Ọdịmma Onwe Ya Nanị
Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ịdị na-enwe ọchịchọ nke iso onye ọ hụrụ n’anya nwee mmekọahụ, onye nwere ezi ịhụnanya ‘adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị’ ma ọ bụ ‘na-achọ ọdịmma nke ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:4, 5) Kama nke ahụ, ọ na-achọ ọdịmma onye nke ọzọ, na-achọkwa ka onye ahụ nwee obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Ịhụnanya dị otú ahụ na-akpali nwoke na nwanyị ịsọpụrụ ibe ha na ile mmekọahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị otú Chineke si ele ya anya—ya bụ, dị ka ihe dịịrị nanị di na nwunye.—Ndị Hibru 13:4.
Mmetụta nke ịbụ ndị tụkwasịrị onwe ha obi na ndị ahụ́ ruru ala, bụ́ nke na-eme ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ, dị mkpa karịsịa mgbe ha mụtara ụmụ, n’ihi na ọ bụ nzube Chineke ka ụmụaka tolite n’ebe e nwere ịhụnanya, udo, na ahụ́ iru ala. (Ndị Efesọs 6:1-4) Ọ bụ nanị n’ime alụmdi na nwunye ka mmadụ abụọ na-eme ezigbo nkwekọrịta. Ha na-eji ma obi ha ma ọnụ ha ekwe nkwa ilekọta na ịkwado ibe ha ná ndụ ha nile, ma n’oge ihe dịịrị ha mma, ma n’oge ihe na-esiri ha ike.—Ndị Rom 7:2, 3.
Mmekọahụ n’etiti di na nwunye na-eme ka alụmdi na nwunye ha sikwuo ike. Di na nwunye nke na-enwe obi ụtọ na-ahụ mmekọahụ dị ka ihe na-enyekwu ha obi ụtọ na ihe na-abara ha uru, n’emeghị ka ha ree ùgwù ha, nwee obi amamikpe, ma ọ bụ mebie iwu Onye Okike.
[Ihe odide ala ala peeji]
a Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịkwa iko” na-ezo aka n’ụdị mmekọahụ nile mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye na-enwe site n’iji akụkụ ahụ́ e ji enwe mmekọahụ eme ihe, dị ka iji ọnụ amị akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.—Lee Teta! nke August 8, 2004, peeji nke 14, na Ụlọ Nche nke February 15, 2004, peeji nke 13, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Ì CHETỤWO ECHICHE BANYERE NKE A?
◼ Olee otú Chineke si ele inwe mmekọahụ tupu a lụọ di na nwunye anya?—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
◼ Gịnị mere ịkwa iko ji dị ize ndụ?—1 Ndị Kọrint 6:18.
◼ Olee otú nwoke na nwanyị hụrụ onwe ha n’anya pụrụ isi gosi na ịhụnanya ha ahụ bụ́ nke ezigbo ya?—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.