Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/07 p. 26
  • Gosinụ na Unu Ghọtara Otú Obi Dị Nwa Unu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gosinụ na Unu Ghọtara Otú Obi Dị Nwa Unu
  • Teta!—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Nyere Ụmụ Gị Aka Ime nke Ọma
    Teta!—1997
  • Ndị Nne na Nna na Ndị Bụ́ Ụmụ, Jirinụ Ịhụnanya Na-ekwurịta Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2007
g 10/07 p. 26

Nke 6

Gosinụ na Unu Ghọtara Otú Obi Dị Nwa Unu

Gịnị mere nke a ji dị mkpa? Ụmụaka chọrọ ka ndị kacha mkpa ná ndụ ha, ya bụ, ndị mụrụ ha, ghọta otú obi dị ha. Nke a dịkwa ha mkpa. Ọ bụrụ na mgbe ọ bụla ụmụaka kwuru ihe dị ha n’obi na ndị mụrụ ha adịghị eji ihe ha kwuru akpọrọ ihe, ọ ga na-esiri ụmụaka ahụ ike ịgwa ha ihe dị ha n’obi. Ha nwedịrị ike ibido chewe ma hà nwekwara ike ichere onwe ha echiche.

Ihe mere o ji esi ike: Mgbe ụmụaka na-ekwu ihe dị ha n’obi, ha na-ekwubiga ya ókè. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime ihe ụmụaka na-ekwu na-agba ndị mụrụ ha agba ná ntị. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị iwe ji nwere ike ịsị, “Ike ndụ agwụla m.”a Ihe mbụ ga-apụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’ọnụ bụ “Mechie ọnụ! O nweghị ike ndụ gwụrụ gị.” Ndị mụrụ ụmụ nwere ike ichegbuwe onwe ha na ọ bụrụ na ha agbachi nwa ha nkịtị mgbe o kwuru ihe na-adịghị mma nke dị ya n’obi na ọ ga-adị ka hà nabatara ihe o kwuru.

Ihe ga-enyere unu aka: Tinyenụ ndụmọdụ dị na Bible n’ọrụ nke na-asị na anyị “aghaghị ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu.” (Jems 1:19) Buru n’obi na Jehova bụ́ Chineke elefurughị echiche na-ezighị ezi nke ọtụtụ n’ime ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi kwupụtara anya. Ọ bụ ya mere o ji hụ na e dere ha na Bible. (Jenesis 27:46; Abụ Ọma 73:12, 13) Dị ka ihe atụ, mgbe ọnwụnwa dị oké njọ bịaara Job, ọ sịrị na ọ dị ya ka ya nwụọ.—Job 14:13.

O doro anya na e kwesịrị ịgbazi ihe ụfọdụ dị Job n’obi. Ma, kama ikwu na ihe Job kwuru abụghị eziokwu ma ọ bụkwanụ gwa ya ka o mechie ọnụ, Jehova kwanyeere Job ùgwù site n’iji ndidi chere ka o kwuchaa otú ọ dị ya n’obi. Ọ bụ mgbe o kwuchara ihe dị ya n’obi ka Jehova ji obiọma gbazie ya. Otu nna bụ́ Onye Kraịst si otú a kwuo ya: “Ebe ọ bụ na Jehova na-ahapụ m ka m gwa ya ihe dị m n’obi n’ekpere, echere m na o ziri ezi ka m hapụ ụmụ m ka ha kwuo ihe dị ha n’obi, ma nke ọma ma nke ọjọọ.”

Ọ bụrụ na e nwee mgbe ọzọ ị chọrọ ịsị nwa gị, “Ihe ahụ i kwuru abụghị otú ọ dị gị n’obi” ma ọ bụ “O nweghị otú ị ga-esi chewe ụdị ihe ahụ n’obi gị,” cheta ụkpụrụ a a ma ama nke Jizọs tụrụ: “Dị nnọọ ka unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emeso ha n’otu ụzọ ahụ.” (Luk 6:31) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ ji obi ọjọọ meso gị omume n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ na e nwere ihe menahụrụ gị, ikekwe, ọ bụ gị ka o si n’aka. Gị akọọrọ ezigbo enyi gị na ị maghịzi ihe ị ga-eme eme, gwakwa ya na ike ịrụ ọrụ gị agwụla gị. Gịnị ka ị ga-achọ ka enyi gị mee? Ị̀ ga-achọ ka ọ gwa gị na ihe ahụ i kwuru abụghị otú ọ dị gị n’obi, gwakwa gị ozugbo na ọ bụ gị ka nsogbu ahụ si n’aka? Ka ọ̀ ga-akara gị mma ka enyi gị sị gị: “Ahụrụ m na ihe a nyere gị nsogbu. Ị hụsiri anya taa”?

Ma ụmụaka ma ndị toruru ogo mmadụ ga-aka anabata ndụmọdụ ma ọ bụrụ na ha chere na onye na-enye ha ndụmọdụ ahụ ghọtara ihe dị ha n’obi, ghọtakwa nsogbu bịaara ha. Okwu Chineke sịrị: “Obi onye maara ihe na-eme ka ọnụ ya nwee uche, ọ na-atụkwasịkwara egbugbere ọnụ ya abụọ mmụta.”—Ilu 16:23.

Olee otú unu ga-esi hụ na a na-eji ndụmọdụ ọ bụla unu nyere akpọrọ ihe?

[Ihe odide ala ala peeji]

a Unu ejila ihe ọ bụla ụmụ unu kwuru banyere igbu onwe ha gwurie egwu.

[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 26]

“Onye na-azaghachi okwu tupu ọ nụ, uche gbagọrọ agbagọ na ọnọdụ ihere ka ọ bụụrụ ya.”—Ilu 18:13

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya