Otú I Nwere Ike Isi Nwee Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
E NWERE ike iji alụmdi na nwunye tụnyere njem—ogologo njem nke ị ga-ahụ ọtụtụ ihe dị ịtụnanya na ya—ụfọdụ n’ime ha ga-atọ gị ụtọ, ndị ọzọ ewee gị iwe. “Okporo ụzọ” ị na-amabughị nwere ike ịkpatara gị nsogbu ndị ị na-atụghị anya ha, ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ nwekwara ike iyi ndị ị na-agaghị emerili. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị na-eji obi ụtọ mee njem a, ya agaara ha nke ọma, ha enweekwa naanị nsogbu ole na ole. N’ezie, ihe ga-ekpebi ma alụmdi na nwunye ọ̀ ga-aga nke ọma abụghị ugwu na ndịda ole dị na njem ahụ kama ọ bụ otú di na nwunye ahụ si lee njem ahụ anya.
Olee ihe i chere nwere ike ime ka njem alụmdi na nwunye gakwuo nke ọma ma tọkwuo ụtọ? Ọtụtụ di na nwunye kweere na ọ dị ha mkpa inwe ‘map’ ga-eduzi ha ụzọ. Onye malitere alụmdi na nwunye—bụ́ Jehova Chineke—enyela anyị map kasị zie ezie maka alụmdi na nwunye. Ma, Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Baịbụl Nsọ, abụghị ọtụmọkpọ ga-eme ka ihe niile gaa nke ọma. Kama nke ahụ, o nwere ntụziaka ndị bara uru ndị ọ dị mkpa ka di na nwunye na-eso iji mee ka alụmdi na nwunye ha gaa nke ọma.—Abụ Ọma 119:105; Ndị Efesọs 5:21-33; 2 Timoti 3:16.
Ka anyị tụlee ụfọdụ ntụziaka na akara nduzi ụzọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ—ya bụ ụkpụrụ Baịbụl ndị gbara ọkpụrụkpụ—nwere ike inye aka duzie gị na njem nke na-eduga n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma na nke na-enye obi ụtọ.
▸ Lee alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị nsọ. “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Onye Okike anyị malitere ndokwa alụmdi na nwunye mgbe ọ kpọtaara nwoke mbụ, bụ́ Adam, nwunye ya, bụ́ Iv. (Jenesis 2:21-24) Kraịst Jizọs, bụ́ onye nọ n’eluigwe jiri anya ya hụ ihe a mgbe ọ na-aghọbeghị mmadụ, kwughachiri na Chineke bu n’obi ka alụmdi na nwunye Adam na Iv dịgide adịgide. O kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:4-6.
Mgbe Jizọs sịrị, “ihe Chineke kekọtara,” ihe ọ na-ekwu abụghị na a na-ejikọta di na nwunye n’eluigwe. Kama nke ahụ, ihe ọ na-ekwu bụ na ọ bụ Chineke malitere ndokwa nke alụmdi na nwunye, nakwa na e kwesịrị ile ya anya dị ka ihe dị nsọ.a
N’ezie, di na nwunye agaghị achọ ịbụ ndị ‘e kekọtara’ n’alụmdi na nwunye ịhụnanya na-adịghị na ya. Kama nke ahụ, ha chọrọ inwe alụmdi na nwunye na-eju afọ nke ga-eme ha abụọ obi ụtọ. Ha nwere ike ịbụ ndị ‘e kekọtara’ n’alụmdi na nwunye na-enye obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha esoro ndụmọdụ ndị bara uru Onye Okike nyere na Baịbụl.
Ebe ọ bụ na anyị niile bụ ndị na-ezughị okè, a ga-enwerịrị nghọtahie na esemokwu n’alụmdi na nwunye. Ma, ihe na-akasị eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma abụghị otú ihe si adabara mmadụ abụọ ahụ kama ọ bụ ihe ha na-eme mgbe ha na-ekwekọrịtaghị n’otu ihe. N’ihi ya, otu n’ime nkà ndị kasị mkpa n’alụmdi na nwunye bụ di na nwunye inwe ike iji ịhụnanya dozie esemokwu ha, n’ihi na ịhụnanya “na-eme ka ihe niile dị nnọọ n’otu.”—Ndị Kọlọsi 3:14, English Standard Version.
▸ Jiri nkwanye ùgwù na-ekwu okwu. “E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ, ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 12:18) Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na ihe ka ọtụtụ ná nkwurịta okwu na-ebi otú ha si malite. N’ihi ya, ọ bụrụ na nkwurịta okwu malitere n’ụzọ nkwanye ùgwù, o yikarịrị ka ọ̀ ga-ebi n’ụzọ nkwanye ùgwù. N’aka nke ọzọ, ị maara otú o si egbu mmụọ mgbe onye ị hụrụ n’anya gwara gị okwu n’echeghị echiche. N’ihi ya, kpesie ekpere ike ma gbalịa ịdị na-eji nkwanye ùgwù, nsọpụrụ, na ịhụnanya ekwu okwu. (Ndị Efesọs 4:31) Otu nwaanyị onye Japan nọrọla na di ruo afọ iri anọ na anọ, nke aha ya bụ Harukob kọwara, sị: “Ọ bụ ezie na anyị na-ahụ ebe ibe anyị na-adịghị emete nke ọma, anyị na-agbalị ịkwanyere onwe anyị ùgwù n’okwu na n’omume anyị. Nke ahụ enyerela anyị aka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.”
▸ Mụta inwe obiọma na obi ọmịiko. “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko.” (Ndị Efesọs 4:32) Mgbe e nwere nnukwu esemokwu, ọ na-adị mfe iji iwe kwuo okwu ndị na-akpasu iwe. Na Germany, Annette, bụ́ onye nọrọla na di ruo afọ iri atọ na anọ, kwetara, sị: “Ọ naghị adị mfe iwetu obi mgbe iwe na-ewe gị—ihe ga na-agụ gị bụ ikwu ihe ndị ga-akpasu di ma ọ bụ nwunye gị iwe, naanị ihe nke ahụ na-emekwa bụ ime ka ihe ka njọ.” Ma, ọ bụrụ na ị na-agbalị inwe obiọma na obi ọmịiko, ị ga-enwe nnọọ ike ime ka ụzọ nke na-eduga n’alụmdi na nwunye dị n’udo dị larịị.
▸ Dịrị umeala n’obi. “Ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Ndị Filipaị 2:3) Ihe na-akpata ọtụtụ esemokwu bụ na di na nwunye na-ata ibe ha ụta maka nsogbu ndị dapụtaranụ n’ihi mpako kama iji ịdị umeala n’obi chọọ otú ha ga-esi mee ka ihe kara ibe ha mma. Ịdị nwayọọ n’obi, ma ọ bụ ịdị umeala n’obi, nwere ike ime ka i zere ịkpọ ekwe nkụ na ikpe laara gị mgbe e nwere esemokwu.
▸ Adịla ngwa ịbụ onye a kpasuru iwe. “Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Ekliziastis 7:9) Gbalịa izere ịgbagha ihe di ma ọ bụ nwunye gị kwuru ma ọ bụ ịzọwa onwe gị ozugbo mgbe di ma ọ bụ nwunye gị kwuru na ihe i kwuru ma ọ bụ ihe i mere adịghị ya mma. Kama nke ahụ, gee di ma ọ bụ nwunye gị ntị ma gwa ya na ị ghọtara ihe ọ na-ekwu. Chee echiche nke ọma tupu ị na-azaghachi. Ọ bụ naanị mgbe ọtụtụ ndị di na nwunye mewerela okenye ka ha na-aghọta na ime ka obi dị di ma ọ bụ nwunye ha mma dị mkpa karịa imeri n’arụmụka.
▸ Mara mgbe ị ga-agbachi nkịtị. “[Bụrụ] onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) O doro anya na inwe ezi nkwurịta okwu bụ otu n’ime akara nduzi ụzọ ndị kasị mkpa dị n’okporo ụzọ nke na-eduga n’alụmdi na nwunye obi ụtọ. Oleezi ihe mere Baịbụl ji kwuo na e nwere “oge ịgbachi nkịtị”? (Ekliziastis 3:7) Nke a nwere ike ịbụ oge ige ntị nke ọma iji ghọta ihe onye nke ọzọ na-ekwu—nke bụ́ akụkụ dị mkpa nke nkwurịta okwu, bụ́ mgbe mmadụ na-achọ ịghọta nnọọ otú obi dị di ya ma ọ bụ nwunye ya na ihe mere obi ji dị ya otú ahụ.
▸ Jiri ọmịiko gee ntị. “Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (Ndị Rom 12:15) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-enwe nkwurịta okwu ga-arụpụta ihe, ị ghaghị inwe ọmịiko n’ahụ́ ya n’ihi na ọ ga-enyere gị aka ịma otú obi dị ya na ihe mere obi ji dị ya otú ahụ. Ọ ga-eme ka a kwanyere echiche onye nke ọ bụla na otú obi dị ya ùgwù mgbe a na-enwe nkwurịta okwu. Nella, bụ́ onye bi na Brazil nke nọrọla na di ruo afọ iri atọ na abụọ kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị na-ekwurịta nsogbu anyị, ana m ege ntị nke ọma iji ghọta ihe Manuel chere na otú obi dị ya.” Mgbe di ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu okwu, ọ bụ “oge [nke gị] ịgbachi nkịtị” na iji ọmịiko gee ntị.
▸ Mee ka ọ mara gị ahụ́ ikele di ma ọ bụ nwunye gị maka ezi ihe ndị o mere. “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Ihe e ji ama alụmdi na nwunye ndị siri ike bụ di na nwunye ndị na-ahụ na ha mere ka ibe ha mara na ha ji ha kpọrọ ihe. Ma, ka di na nwunye na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị, ụfọdụ ndị di na nwunye na-eleghara ikele ibe ha anya ma chee na di ha ma ọ bụ nwunye ha maara na ha ji ha kpọrọ ihe. Dr. Ellen Wachtel kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị di na nwunye nwere ike ime ka ibe ha mara na ha ji ha kpọrọ ihe ma ọ bụrụ na ha echebatụrụ ya nnọọ echiche.”
Ọ na-adị ụmụ nwaanyị mkpa karịsịa ịnụ ka di ha ji ịhụnanya na-agwa ha na ọ ka hụrụ ha n’anya nakwa na o ji ha kpọrọ ihe. Unu ndị bụ́ di nwere ike ime ka alụmdi na nwunye unu ka nnọọ mma, meekwa ka obi ruo nwunye unu, na unu onwe unu ala, ma ọ bụrụ na unu ana-agbalị ikele ndị nwunye unu n’ihi ihe ọma ndị ha na-eme ma ọ bụ àgwà ọma ndị ha nwere.
Ọ dị mkpa iji ma ọnụ ma ụzọ ndị ọzọ agwa ha na unu ka hụrụ ha n’anya. Mgbe i ji nwayọọ sutụ nwunye gị ọnụ, metụ ya aka, mụmụọrọ ya ọnụ ọchị, ọ na-agwa ya ihe karịrị “Ahụrụ m gị n’anya.” Ọ na-eme ka obi sie ya ike na ọ bụ onye pụrụ iche nye gị nakwa na ọ dị gị mkpa. Na-akpọtụ ya na fon ma ọ bụ na-eji fon ezigara ya ozi iji sị ya, “Agụụ gị na-agụ m” ma ọ bụ “Olee otú ị na-eme?” Ọ bụrụ na kemgbe unu lụchara, ị nakwaghị agwakarị ya ụdị ihe ndị ahụ, ọ dị mma ka ị maliteghachi ya. Nọgide na-achọpụta ihe ndị na-eru nwunye gị n’obi.
Okwu ndị nne Eze Lemuel nke Izrel oge ochie gwara ya dabara nnọọ adaba: “Di ya na-eto ya, ‘Ọtụtụ ụmụ nwaanyị emeela nke ọma, ma i ka ha niile mma.’” (Ilu 31:1, 28, 29, Tanakh—The Holy Scriptures) Olee mgbe ikpeazụ ị jara nwunye gị mma? Ma ọ bụ gịnwa bụ́ nwaanyị, Olee mgbe ikpeazụ ị jara di gị mma?
▸ Na-adị ngwa ịgbaghara. “Anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) Ị ga-emejọrịrị di ma ọ bụ nwunye gị, ọ ga-enwerịrịkwa mgbe yanwa ga-emejọ gị. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ị na-adị njikere ịgbaghara. Clive na Monica, bụ́ ndị bi na South Africa, bụ́ ndị lụrụ afọ iri anọ na atọ gara aga, achọpụtala na ndụmọdụ Baịbụl a na-enye nnọọ aka. Clive kwuru, sị: “Anyị na-agbalị ime ihe Ndị Efesọs 4:26 kwuru, anyị na-agbalịkwa ịgbaghara ibe anyị ngwa ngwa, ebe anyị maara na nke ahụ na-eme Chineke obi ụtọ. Ọ na-emekwa ka obi ruo anyị ala, anyị ejiri akọnuche dị ọcha laba ụra ma hie ụra nke ọma.”
Otu ilu oge ochie kwuru ihe a amamihe dị na ya: “Ileghara mmejọ anya [bụ] ịma mma.” (Ilu 19:11) Annette, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, kwetara, kwuokwa, sị: “Ọ dịghị otú a ga-esi nwee alụmdi na nwunye dị mma ma e nweghị mgbaghara.” Ọ kọwara ihe mere o ji kwuo otú ahụ, sị: “Ma ọ́ bụghị ya, iwe ga-eju mmadụ abụọ ahụ obi, ha akwụsịkwa ịtụkwasị onwe ha obi, ihe ndị dị otú ahụ na-egbukwa alụmdi na nwunye. Mgbaghara na-eme ka alụmdi na nwunye sikwuo ike, meekwa ka unu nọrọkwuo ibe unu nso.”
Ọ bụrụ na i mejọrọ di ma ọ bụ nwunye gị, asịla nnọọ na ọ ga-echefu ya. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na di ma ọ bụ nwunye gị kpezie, ọ na-adịkarị mkpa ka i mee otu n’ime ihe ndị ka sie ike di na nwunye kwesịrị ịdị na-eme, nke bụ́: Ikweta na i mejọrọ. N’agbanyeghị nke ahụ, chọta otú ị ga-esi wetuo onwe gị ala ma sị: “Nke m, gbaghara m. Emejọrọ m.” Ọ bụrụ na i wetuo onwe gị ala ma rịọ mgbaghara, ọ ga-eme ka di ma ọ bụ nwunye gị na-akwanyere gị ùgwù, mee ka ọ na-atụkwasị gị obi, meekwa ka obi rukwuo unu abụọ ala.
▸ Nọgide jiri di ma ọ bụ nwunye gị na alụmdi na nwunye unu kpọrọ ihe. “Ha [di na nwunye] abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:6) Unu nọ n’ihu Chineke na mmadụ kwe onwe unu nkwa na unu ga-anọgide bụrụ di na nwunye, n’agbanyeghị nsogbu ndị nwere ike ibilite.c Ma, ihe mere unu ji anọgide n’alụmdi na nwunye unu abụghị naanị na iwu kwuru otú ahụ. Kama nke ahụ, ihe na-akpali unu ime ya bụ ezi ịhụnanya si n’obi unu nwere, ọ bụkwa ihe na-egosi na unu na-akwanyere ibe unu na Chineke ùgwù, nakwa na unu na-asọpụrụ ibe unu na Chineke. N’ihi ya, ya adịla mgbe ị ga-eji mmekọrịta dị nsọ unu nwere gwurie egwu site n’ịchụ nwaanyị ma ọ bụ nwoke; ka anya gị dị n’ebe naanị di ma ọ bụ nwunye gị nọ.—Matiu 5:28.
▸ Ibute ọdịmma di ma ọ bụ nwunye gị ụzọ na-eme ka alụmdi na nwunye sikwuo ike. “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Ibute ọdịmma di ma ọ bụ nwunye gị ụzọ bụ otu ụzọ isi mee ka alụmdi na nwunye unu sikwuo ike. Premji na nwunye ya ebiela afọ iri abụọ, ma ọ na-agbalịsi ike inyere nwunye ya aka, bụ́ onye na-arụ ọrụ ego na-ewe oge, site n’ịrụtụrụ ya ọrụ ndị dị n’ụlọ. “M na-enyere Rita aka isi nri na ihicha ụlọ na ịrụ ọrụ ndị ọzọ ka o wee nwee oge na ume ime ihe ndị na-atọ ya ụtọ.”
Mgbalị Na-arụpụta Ezigbo Ihe
Mgbe ụfọdụ, oké ọrụ dị n’ime ka a na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye nwere ike ime ka ụfọdụ chọwa ịkwụsị ime mgbalị. Ma, ekwela ka nsogbu mee ka ị kwụsị mgbalị ị na-eme ma ọ bụ kwe ka ihe niile i tinyerela n’alụmdi na nwunye gị funahụ gị, nke ga-apụta unu isi ebe unu rurula na njem unu laghachiwe azụ.
Sid, bụ́ onye alụmdi na nwunye ya garala nke ọma ruo afọ iri atọ na atọ, tụrụ aro, sị: “Ọ bụrụ na unu agbalịsie nnọọ ike ma gosi na unu chọrọ ka alụmdi na nwunye unu gaa nke ọma, Jehova ga-agọzi unu.” Otú unu abụọ si enyere onwe unu aka mgbe ihe siri ike na otú unu abụọ si aṅụrị ọṅụ mgbe ihe dị mma ga-eme ka unu nwee afọ ojuju ka unu na-eme njem nke alụmdi na nwunye na-aga nke ọma.
[Ihe odide ala ala peeji]
a Jizọs kwuru na naanị ihe ga-eme ka di na nwunye gbasaa ma nwee ike ịlụ ndị ọzọ bụ ịkwa iko—ya bụ, otu n’ime ha na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya inwe mmekọahụ.—Matiu 19:9.
b A gbanwere aha ụfọdụ dị n’isiokwu a agbanwe.
c Baịbụl nyere onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko ikike ikpebi ma ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm. (Matiu 19:9) Lee isiokwu bụ́ “Echiche nke Bible: Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye—Ịgbaghara Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịgbaghara?” nke dị na Teta! August 8, 1995.
[Ihe Odide Gbatụrụ Okpotokpo nke dị na peeji nke 6]
Baịbụl dị ka map ga-eduzi gị ụzọ na njem alụmdi na nwunye gị
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
Mgbe Ọ Dị Mkpa Ka Unu Kwurịta Nsogbu Unu
◼ Wepụtanụ oge mgbe ọ na-adịghị onye nke ọ bụla n’ime unu ike gwụrụ.
◼ Zerenụ ịkatọ onwe unu; na-elenụ onwe unu anya ọma.
◼ Zerenụ ịnapụ ibe unu okwu n’ọnụ; mgbe otu onye na-ekwu okwu onye nke ọzọ gewe ntị.
◼ Gosi na ị ghọtara otú obi dị di ma ọ bụ nwunye gị.
◼ Nweenụ ọmịiko n’ahụ́ ibe unu, ọbụna mgbe unu na-ekwenyeghịrị ibe unu.
◼ Dịnụ njikere ịgbanwe echiche unu, unu esikwala ọnwụ.
◼ Weda onwe gị ala ma rịọ mgbaghara mgbe i mejọrọ.
◼ Kelee di ma ọ bụ nwunye gị maka ebe ndị ọ na-emezi ma gwa ya na ị hụrụ ya n’anya.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]
Ọ Bụrụ na Unu Chọrọ Ka Alụmdi na Nwunye Unu Gaa nke Ọma
◼ Unu ejila eziokwu Baịbụl ndị na-eme ka alụmdi na nwunye sie ike egwuri egwu.
◼ Na-ewepụta oge maka alụmdi na nwunye gị na maka di ma ọ bụ nwunye gị.
◼ Na-eme ihe ndị ga na-akwalite ịhụnanya n’alụmdi na nwunye gị.
◼ Bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ma jiri alụmdi na nwunye gị kpọrọ ihe.
◼ Nwee obiọma, na-akwanyekwara di ma ọ bụ nwunye gị ùgwù.
◼ Na-agbakọtanụ aka arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ.
◼ Mgbe unu na-ekwurịta okwu, onye nke ọ bụla na-ekwu ihe ndị ga-eme ka nkwurịta okwu ahụ tọọ ụtọ.
◼ Na-emenụ ibe unu ihe ọchị, na-ewepụtakwanụ ohere iji kporie ndụ.
◼ Nọgidenụ na-arụ ọrụ iji mee ka alụmdi na nwunye unu na-esiwanye ike.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 9]
Ihe Ị Ga-echebara Echiche
◼ Olee ebe m kwesịrị ịrụ ọrụ karịsịa n’alụmdi na nwunye m?
◼ Olee ihe ndị m ga-eme iji mee otú ahụ?