Ihe Anọ I Kwesịrị Ịma Banyere Ịgba Alụkwaghịm
Mgbe ndị nwe ụlọ ahụ tụlechara ihe ndị mebirinụ, ha ga-ekpebi ma ihe ha ga-eme ọ̀ bụ ịkụtu ya ka ọ̀ bụ ịrụzi ya.
Ọ̀ BỤ ụdị ihe a ka ị na-eche banyere alụmdi na nwunye gị? O nwere ike di gị ma ọ bụ nwunye gị aghọọla nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu ma ọ bụ ya abụrụ na okwu unu na-esekarị emeela ka ị ghara inwezi obi ụtọ n’alụmdi na nwunye unu. Ya bụrụ otú ahụ, ihe i nwere ike ịna-eche bụ, ‘Anyị ahụghịzi onwe anyị n’anya’ ma ọ bụ ‘Anyị ekwesịghịdị ịlụ’ ma ọ bụkwanụ ‘Anyị amaghị ebe anyị lewere anya gaa lụọ.’ Ihe i nwedịrị ike ichewe bụ, ‘Ịgba alụkwaghịm dị ka ọ̀ ga-akara anyị mma.’
Kama iji ọsọ gbaa di gị ma ọ bụ nwunye gị alụkwaghịm, ọ ka mma ichebara ya echiche nke ọma. Ịgba alụkwaghịm abụghị ihe na-ebi nsogbu mmadụ na-enwe ná ndụ ya. Kama, ihe ọ na-emekarị bụ iwepụ nsogbu ụfọdụ ma butere gị ndị ọhụrụ. Ọka mmụta bụ́ Brad Saks kwuru n’otu akwụkwọ o dere, sị: “Di na nwunye ndị na-achọ ịgba alụkwaghịm na-eche na ọ ga-eme ka nsogbu ha bie. Ha na-ewere na ịgba alụkwaghịm ga-adị ha ka mmadụ isi n’ebe e nwere oké ifufe na oké mmiri ozuzo gafee n’ebe dị jụụ ahụ́ ga-eru ya ala. Ma otú ahụ a na-enweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu, otú ahụkwa ka ịgba alụkwaghịm na-agaghị eme ka nsogbu ha niile bie.” N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa na mmadụ ga-aghọta ihe niile ya na ịgba alụkwaghịm so tupu o kpebiwe ma ọ̀ ga-agba alụkwaghịm.
Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm
Baịbụl ejighị okwu ịgba alụkwaghịm egwu egwu. O kwuru na Jehova Chineke kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị, nakwa na o weere onye gbara nwunye ya ma ọ bụ di ya alụkwaghịm n’ihi ihe na-enweghị isi ka onye aghụghọ, nke ka nke ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ bu n’obi gbaa alụkwaghịm bụ ịlụ onye ọzọ. (Malakaị 2:13-16) Di na nwunye ekwesịghị itisa etisa. (Matiu 19:6) Ọtụtụ ndị di na nwunye tisaranụ n’ihi ihe ndị na-enweghị isi agaaraghị etisa ma a sị na ha mụtara ịgbagharakwu ibe ha.—Matiu 18:21, 22.
Ma, Baịbụl kwuru na otu ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye gbaa ibe ya alụkwaghịm ma lụrụ onye ọzọ bụ ịkwa iko. (Matiu 19:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọpụta na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, i nwere ike ịgba ya alụkwaghịm. Ndị ọzọ ekwesịghị ịtụrụ gị ihe ị ga-eme, ihe anyị bu n’obi dee isiokwu a abụghịkwa ịgwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụ gịnwa ga-ebu ihe ọ bụla ga-esi ná mkpebi i mere pụta; n’ihi ya, ọ bụ naanị gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme.—Ndị Galeshia 6:5.
Ka o sina dị, Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, nke bụ́ ihe Baịbụl kwuru mere i nwere ike iji gbaa ya alụkwaghịm, ọ ga-adị mma ma i chebara ya echiche ma mara nsogbu ịgba alụkwaghịm nwere ike ịkpatara gị. (1 Ndị Kọrịnt 6:12) Otu nwoke bi na Briten aha ya bụ Devid sịrị: “Ụfọdụ nwere ike iche na ha kwesịrị ikpebi ịgba alụkwaghịm n’egbughị oge. Ma kemgbe m gbachara alụkwaghịm, achọpụtala m na mmadụ kwesịrị iwepụta oge chebara ya echiche tupu ya ekpebie ma ò kwesịrị ịgba alụkwaghịm.”a
Ka anyị tụlee ihe anọ dị mkpa i kwesịrị ichebara echiche. Ka anyị na-atụle ha, biko buru n’uche na o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị gbara alụkwaghịm e kwuru okwu ha ebe a nke kwuru na mkpebi ya mere adịghị mma. Ma, ihe ndị ha kwuru gosiri ụfọdụ nsogbu ndị gbara alụkwaghịm na-enwekarị ma ọtụtụ ọnwa ma ọ bụdị ọtụtụ afọ gafee.
1 Ụkọ Ego
Daniela, onye bi n’Ịtali, na di ya ebiela afọ iri na abụọ tupu ya achọpụta na di ya na otu nwaanyị ya na di ya na-arụkọ ọrụ na-eme enyi. Daniela kwuru, sị, “Tupu m mara ihe na-eme, nwaanyị ahụ dịzi ime ọnwa isii.”
Daniela na di ya kewara ruo oge ụfọdụ tupu ya ekpebizie ịgba di ya alụkwaghịm. Ọ sịrị, “Agbalịrị m ka anyị ghara ịgba alụkwaghịm, ma di m ka nọkwa na-achụ nwaanyị.” Daniela weere na ya mere mkpebi dị mma. Ma, ọ sịrị: “Ozugbo m gbara di m alụkwaghịm, ihe bịara siere m ezigbo ike, nke na mgbe ụfọdụ, anaghị m ahụ ego m ga-eji azụta nri abalị. Naanị ihe m na-eme bụ ịṅụ otu iko mmiri ara ehi.”
Ụdị ihe ahụ mekwara Marịa, onye bi na Spen. Ọ sịrị, “Mgbe mụ na di m gbara alụkwaghịm, ọ kwụsịrị inye anyị ego, n’ihi ya, abịara m rụwa ọrụ karịa otú m kwesịrị ịrụ iji nwee ike ịkwụ ụgwọ ndị o ji. Esikwa m n’ọmarịcha ụlọ anyị bi kwapụ, kwagazie n’otu obere ụlọ nke dị n’ógbè na-adịchaghị mma obibi.”
Ihe a ndị a kọrọ gosiri na ịgba alụkwaghịm na-emekarị ka ụmụ nwaanyị nọrọ n’ụkọ ego. Nnyocha e mere ruo afọ asaa na Yurop gosidịrị na di na nwunye gbaa alụkwaghịm, nwoke anaghị emefuchazi ego otú o si emefubu, ebe nwaanyị na-amalitezi imefu ego karịa ka ọ na-emefubu. Mike Yensịn, onyeisi ndị mere nnyocha a, kwuru na “Ihe mere o ji esiri ụfọdụ ụmụ nwaanyị ike bụ n’ihi na ọ bụ ha ga-achọta ọrụ, na-elekọta ụmụ ha, ma na-edi obi mgbawa ịgba alụkwaghịm ahụ kpataara ha.” Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Lọndọn sịrị na ụfọdụ ndị ọkàiwu kwuru na nsogbu ndị a ụfọdụ ndị gbara alụkwaghịm na-enwe “na-emezi ka ndị mmadụ ghara iji ọsọ na-agba alụkwaghịm.”
Ihe nwere ike ime: Ọ bụrụ na ị gbaa alụkwaghịm, i nwere ike na-emefuzi ego karịa otú i si emefubu. O nwekwara ike ime ka i si ebe i bi kwapụ. Ọ bụrụ gịnwa kpọọrọ ụmụ unu, o nwere ike isiri gị ike ịkpata ihe ga na-ezuru ma gị ma ụmụ unu.—1 Timoti 5:8.
2 Okwu Ilekọta Ụmụ
Otu nwaanyị bi na Briten aha ya bụ Jen kwuru sị, “O riri m ọnụ mgbe m chọpụtara na di m nwere nwaanyị ya na ya na-eme enyi. Ike ụwa bịara gwụ m mgbe m hụrụ na o kpebiela ịhapụ anyị.” Jen gbara di ya alụkwaghịm. Obi ka siri ya ike na ihe ya mere dị mma, ma ọ sịrị: “Otu nsogbu m nwere bụ ịrụ ọrụ mama nakwa nke papa. Ọ bụ m na-ekpebi ihe niile a ga-eme.”
Ụdị ihe ahụ mekwara Grisila, bụ́ otu nwaanyị bi na Spen, ya na di ya gbara alụkwaghịm. Ọ sịrị, “Ọ bụ m kpọọrọ nwa anyị nwoke dị afọ iri na isii. Ma ịzụ nwa dị afọ iri na isii abụghị obere ọrụ, ọ dịghịkwa mgbe m bu n’obi ịzụ ya naanị m. Ebere m ákwá ọtụtụ ụbọchị. Ọ bịara dị m ka erughị m eru ịbụ nne.”
Ndị nke ụlọ ikpe gwara na ha abụọ ga-azụ nwa ha na-enwekwa nsogbu ọzọ. O nwere ike isiri ha abụọ ike ịbịakọta ọnụ kwurịta oge nwa ahụ ga-anọ na nke onye ọ bụla n’ime ha, ego ole a ga-eji na-elekọta ya, na otú a ga-esi na-adọ ya aka ná ntị. Otu nne bi na Amerịka aha ya bụ Kristen, onye ya na di ya gbara alụkwaghịm, sịrị: “Ọ naghị adị mfe nwaanyị na onye bụ́bu di ya ikwurịta ihe ndị ha chọrọ ikwu n’eseghị okwu. Ọtụtụ ihe ga na-abata gị n’uche, ọ bụrụkwa na ị kpachaghị anya, i nwere ike jiri nwa unu na-enweta ihe ọ bụla ị chọrọ n’aka ya.”
Ihe nwere ike ime: O nwere ike otú ụlọ ikpe kpebiri ka unu si na-azụ nwa unu agaghị abụ otú ị chọrọ. Ọ bụrụ na unu abụọ na-azụ nwa unu, o nwere ike ihe onye nke ọzọ ga-ekwu gbasara oge nwa ahụ ga-anọ na nke onye ọ bụla n’ime unu, ego ole a ga-eji na-elekọta nwa ahụ, na ihe ndị ọzọ, agaghị adị gị mma.
3 Otú Ịgba Alụkwaghịm Si Emetụta Gị
Nwunye otu nwoke bi na Briten, aha ya bụ Mak, mewara ya obi ihe karịrị otu ugboro. Mak sịrị: “Mgbe nke abụọ mere, ọ dị m ka m gaghị edili ya ma o mee ya ọzọ.” Mak gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ chọpụtara na ya ka hụkwara ya n’anya. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla ndị mmadụ kwuru okwu ọjọọ gbasara ya, ha na-eche na ha na-eme ka obi dị m mma; ma ha amaghị na ọ na-ewe m iwe. Ịhụnanya anaghị eji ike ala.”
Otu ihe ahụ mekwara Devid, onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Mgbe ọ chọpụtara na nwunye ya na nwoke ọzọ na-eme enyi, ike ụwa gwụrụ ya. Ọ sịrị: “O nyeghị m ọnụ okwu. N’eziokwu o nweghị mgbe m chọrọ ka ihe ọ bụla kewaa mụ na ya na ụmụ anyị.” Devid gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ maghị otú ụwa ya ga-adị adị. Ọ sịrị: “Ụjọ m bụ ma m̀ ga-ahụkwa onye ga-eji obi ya niile hụ m n’anya ma ọ bụ ma ụdị ihe a ọ̀ ga-eme ọzọ ma m lụọ onye ọzọ. Obi anaghịzi aka m n’ihe ọ bụla m na-eme.”
Ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị gbara alụkwaghịm, o doro anya na ọtụtụ ihe ga na-aga gị n’uche. Ma, o nwekwara ike ị ka hụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị ahụ n’anya, bụ́ onye gị na ya bụbu otu anụ ahụ́. (Jenesis 2:24) Ma ọ bụkwanụ, ya abụrụ na iwe ihe ahụ merenụ ka na-ewe gị. Grisila, onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Ọtụtụ afọ gachaadị, ọ ka ga na-agbagwoju gị anya otú unu si gbasaa, ọ ga na-adị gị ka à kparịrị gị, ike ụwa ana-agwụkwa gị. Ị ga na-echeta oge ndị gị na ya bụ nnu na mmanụ, gị ana-eche sị: ‘Ọ naara agwa m na ụwa gaara agbụ ya ma a sị na ọ lụghị m. Ọ̀ pụtaziri na ọ na-aghara m ụgha n’oge ahụ? Gịnị mere ihe a ji mee?’”
Ihe nwere ike ime: O nwere ike iwe ihe ahụ di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị agaghị apụ gị apụ n’obi. Mgbe ụfọdụ, ụdị owu ga-ama gị agaghị enye gị ọnụ okwu.—Ilu 14:29; 18:1.
4 Otú Ịgba Alụkwaghịm Si Emetụta Ụmụaka
Otu nwoke onye Spen ya na nwunye ya gbara alụkwaghịm, aha ya bụ Hozeyi, sịrị: “Ihe nwunye m mere riri m ọnụ. Nke ka njọ bụ mgbe m chọpụtara na ọ bụ di nwanne m nwaanyị ka ya na ya na-eme enyi. Ọ dị m ka ọnwụ bịa gburu m.” Hozeyi chọpụtara na o nwere otú ihe ahụ nwunye ya mere si kpaa ụmụ ya nwoke dị afọ abụọ na afọ anọ aka ọjọọ. Ọ sịrị: “Ha enweghị ike ịghọta ihe na-emenụ. Ha aghọtaghị ihe mere mama ha na di nwanne papa ha ji biri, nakwa ihe mere m ji kpọrọ ha gaa bikwuru nwanne m nwaanyị na mama m. O nwee ebe m chọrọ ịga, ha ajụwa m, ‘Olee mgbe ị ga-alọta?’ ma ọ bụkwanụ ha asị, ‘Papa, ahapụkwala anyị!’”
Ọ na-abụkarị ụmụaka na-ata ahụhụ ma di na nwunye gbaa alụkwaghịm. Ma ọ́ bụrụkwanụ na di na nwunye na-esekarị okwu? Ọ̀ ga-akara ụmụ ha mma ma ha gbaa alụkwaghịm? Na nso nso a, ọtụtụ ndị na-ekwuzi na ọ naghị akara ha mma, karịchaa ma ọ bụrụ na nsogbu di na nwunye ahụ abụghị nke ha na-amaghị otú a ga-esi eme ya. Otu akwụkwọ kwuru gbasara ịgba alụkwaghịm, sịrị: “Ọ ga-eju ọtụtụ di na nwunye ndị na-esekarị okwu anya ma a gwa ha na enwechaghị ihe ụmụ ha ji esemokwu ha kpọrọ. Ọ bụrụhaala na ezinụlọ ha bikọtara ọnụ, ha achọghịdị ịma ma mama ha na papa ha hà na-esekarị okwu.”
N’eziokwu, ụmụaka na-ama mgbe ndị mụrụ ha na-ese okwu, esemokwu nne na nna ha nwekwara ike ime ka ahụ́ ghara iru ha ala. Ma, ọ dịghị mma ichewe na nne na nna ha ịgba alụkwaghịm kaara ha mma. Linda J. Waịt na Magị Galaga kwuru n’akwụkwọ ha dere banyere alụmdi na nwunye, sị: “Ezinụlọ bụ ebe nne na nna ga-enwe ike inye ụmụ ha ọzụzụ otú dị mma, na otú ọ ga-abara ụmụaka ahụ uru, a sịgodị na nne ha na nna ha na-esekarị okwu.”
Ihe nwere ike ime: Ịgba alụkwaghịm nwere ike ịkpa ụmụaka gị aka ọjọọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ị naghị ekwe ka ha na papa ha ma ọ bụ mama ha ahụ gị na ya gbara alụkwaghịm dịrị ná mma.—Gụọ igbe bụ́ “Ọ Dị M Ka M̀ Tọrọ Atọ.”
N’isiokwu a, a tụlere ụzọ ihe anọ i kwesịrị ichebara echiche ma ọ bụrụ na ị na-eche echiche ịgba di gị ma ọ bụ nwunye gị alụkwaghịm. Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-agba ya alụkwaghịm. Chetakwa na ọ bụ gị ga-eji isi gị ebu ihe si na mkpebi ọ bụla i mere pụta. Buru nsogbu ndị ị ga-enwe n’obi, jikerekwa ịma ihe ị ga-eme banyere ha.
I chebachaara ya echiche, i nwere ike ịchọpụta na ọ ga-aka mma idozi nsogbu unu na-enwe. Ma ọ̀ ga-ekwe omume idozi ya?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“IHE NWATAKỊRỊ Ọ BỤLA KWESỊRỊ INWE”
“Mgbe m dị afọ ise, papa m na odeakwụkwọ ya kwara iko, nke mere ka papa m na mama m gbaa alụkwaghịm. Ha abụọ mere ike ha niile ilekọta m otú kwesịrịnụ dị ka ha nwere ike ime n’oge ahụ. Ha na-agwakwa m na ha ka hụrụ m nnọọ n’anya n’agbanyeghị na ha ahụghịzi ibe ha n’anya. Mgbe papa m mechara kwafee n’ụlọ naanị ya bi, ha abụọ nọgidere na-enye m ihe ndị dị m mkpa.
“Ka afọ abụọ gachara, mama m lụrụ di ọzọ, anyị akwagakwa mba ọzọ. N’ihi ya, ọ na-ete aka tupu mụ ahụ papa m. Naanị otu ugbo ka m hụrụla ya n’ime afọ itoolu gara aga. Mụ na ya ahụkebeghị anya mgbe m na-etolite, ọ hụbeghịkwa ụmụ m atọ bụ́ ụmụ ụmụ ya. Naanị ihe ọ maara banyere ha bụ ihe ndị m kọọrọ ya n’akwụkwọ ozi nakwa foto ha ndị m zigaara ya. Ọ na-ewute ụmụ m na ha amaghị nna mama ha.
“N’ihi alụkwaghịm papa m na mama m gbara, o nweghị mgbe obi na-adị m mma. Iwe na-ejukarị m obi mgbe niile, ike ụwa na-agwụkwa m, ahụ́ anaghị eru m ala, amaghịkwa m ihe kpatara ya. Anatụdịghị m atụkwasị ụmụ nwoke obi. Ọ bụ mgbe m gaferela afọ iri atọ ka otu enyi m katarala ahụ́ nyeere m aka ịghọta ihe mere anaghị m atụkwasịli ụmụ nwoke obi, ọ bụkwa mgbe ahụ ka m bidoro gbalịwa ịtụkwasị ha obi.
“Alụkwaghịm papa m na mama m gbara mere ka m ghara inwe ihe nwatakịrị ọ bụla kwesịrị inwe, nke bụ́, inwe obi iru ala na ịma na ndị mụrụ ya ga-echebe ya. Ịhụnanya adịghị n’ụwa a, ihe ndị na-eme na ya na-atụkwa ụjọ, ma m ga-asị na ezinụlọ bụ ebe a na-echebe nwatakịrị, ebe ọ ga-abụ ya lọta ya enwee onye ga-elekọta ya ma kasie ya obi. Ma di na nwunye gbasahaala, a gaghịzi enwe ebe ga-echebe nwatakịrị ahụ.”—Diyan.
[Igbe dị na peeji nke 7]
“Ọ DỊ M KA M̀ TỌRỌ ATỌ”
“Ndị mụrụ m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ iri na abụọ. Enwere m ike ịsị na obi bịara rutụ m ala, n’ihi na ụlọ anyị abụghịzi ọgbọ agha; ọgụ nne na nna m na-alụkarị kwụsịrị. N’agbanyeghị nke ahụ, obi anaghị adịcha m mma.
“Mgbe ha gbachara alụkwaghịm, agbalịrị m ike m niile ịhụ na mụ na ha abụọ dịcha ná mma nakwa ka a ghara inwe onye nke ọ bụla chere na m ka hụ ya n’anya. N’agbanyeghị mgbalị niile m mere, ọ na-adịkarị m ka m̀ tọrọ atọ. Papa m gwara m na ọ na-adị ya ka mama m ọ̀ ga-eme ka m kpọọ ya asị. N’ihi ya, m na-eme ka obi sie ya ike mgbe niile na mama m anaghị agwa m ụdị ihe ahụ. Ọ dịkwa mama m otú ahụ. Ọ gwara m na ụjọ ya bụ na m ga-ekwere ihe ọjọọ papa m na-akọrọ m banyere ya. O ruziri n’ókè nke na anaghịzi m achọ ịkọrọ onye nke ọ bụla n’ime ha ihe mụ na ya na-alụ, n’ihi na achọghị m ịkpasu onye ọ bụla iwe. N’ihi ya, malite mgbe m dị afọ iri na abụọ, anaghịzi m akọrọ onye ọ bụla otú alụkwaghịm papa m na mama m gbara dị m n’obi.”—Sandra.