Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 4/11 p. 30
  • Olee Uru Ụra Bara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Uru Ụra Bara?
  • Teta!—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Ọma Na-adịchaghị Mkpa Ka Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Mkpa?
    Teta!—2003
  • Ihi Ụra nke Dị Gị Mkpa
    Teta!—2004
  • Ndị Nọ N’afọ Iri Na Ụma Na-ero Ụra—Ọ̀ Bụ Ihe Na-akpata Nchegbu?
    Teta!—2002
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ụra Gị Ka Mma
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2011
g 4/11 p. 30

Olee Uru Ụra Bara?

● Nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na ugbu a, ọtụtụ ndị torurula ogo mmadụ na Kọntinent Ebe Ugwu Amerịka na-ehi ụra naanị awa asaa ma ọ bụ awa asaa na ọkara n’abalị ọ bụla.a Olee uru ụra bara? Ụra na-enwe agba nke mbụ, agba nke abụọ na agba ndị ọzọ. Mgbe mmadụ nọ n’ụra, ọ na-esi n’agba nke mbụ abanye n’agba ọzọ. Agba nke ọ bụla na-ewekwa ihe dị ka nkeji iri isii ruo nkeji iri itoolu. N’oge a ka ụbụrụ mmadụ na-akacha arụ ọrụ. Ndị na-eme nchọpụta kwetakwara na ọ bụ n’oge a ka ụbụrụ na-eji aka ya arụzi ihe ndị mebiri na ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na ọ bụrụ na a na-enwe ihe na-eme ka mmadụ teta ụra mgbe ọ na-ehirubeghị otú o kwesịrị, ka oge na-aga, o nwere ike ịkpatara onye ahụ nsogbu n’ahụ́. Ụbụrụ onye ahụ ga-akwụsị ịrụ ọrụ nke ọma, nke ga-eme na ọ gaghị na-emezi ihe ndị ọ maara eme nke ọma, ọ ga-akpatakwara ya ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ.

Ihe ndị dị ka kọfị nwere ike igbochi mmadụ ihi ụra ruo oge ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ụbụrụ anyị nwere ihe na-eme ka ụra buru anyị ma ọ bụrụ na anyị ehirubeghị ụra otú ahụ́ anyị chọrọ. Ọ bụ nke a na-eme ụra ji eburu mmadụ ruo tịnkọm tịnkọm ole na ole mgbe ọ na-eme ihe dị ya mkpa. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star kwuru na “ihe ọ sọkwara gị na-eme, ọ bụrụ na i hirughị ụra otú ahụ́ gị chọrọ, a ga-enwe oge ụra ga-eburu gị ruo ihe dị ka tịnkọm tịnkọm iri ma ọ bụ ruo ihe gafetụrụ otu nkeji.” Weregodị ya na mgbe i ji ụgbọala gị na-agba ihe ruru kilomita iri anọ na asatọ n’otu awa, ụra buuru gị ruo tịnkọm tịnkọm iri. Ihe ọ pụtara bụ na n’oge a ụra buuru gị, ebe ị gbaruru karịrị ọgbọ egwuregwu bọl n’ogologo. Ihe ọzọkwa bụ na ehighị ụra nke ọma nwere ike ime ka ahụ́ anyị gharazie inwecha ike ịlụso ọrịa ọgụ, n’ihi na ọ bụ mgbe anyị nọ n’ụra ka ahụ́ anyị na-emepụta ụdị mkpụrụ ndụ ndị na-alụso nje ọgụ. Ọ bụkwa n’oge anyị na-ehi ụra ka ahụ́ anyị na-emepụta ihe ndị na-enye aka eme ka agụụ na-agụ anyị otú kwesịrịnụ. N’eziokwu, otú ahụ o si dị mkpa ka anyị na-emega ahụ́ ma na-eri ezigbo nri, otú ahụkwa ka ọ dị mkpa ka anyị na-ehi ụra nke ọma.

Ọtụtụ ihe ndị ị na-arụ hà na-egbochi gị ihi ụra otú kwesịrịnụ? Ihe ndị na-echu gị ụra ọ̀ bụ nchegbu nke ndụ ka ọ̀ bụ ihe ndị ị kpakọbara maka ọdịnihu? Eze Sọlọmọn, onye maara ihe, kwuru, sị: “Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.”—Ekliziastis 5:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ isiokwu bụ́ “Iji Ụra Ụgwọ—Ọ̀ Na-emetụta Gị?” nke dị na Teta! February 8, 2004.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya