Ị Ga-amụtali Otú Gị na Ndị Mmadụ Ga-esi Na-adị n’Udo
Ọ BỤ eziokwu na àgwà ọjọọ ụfọdụ nwere ike isi mmadụ n’ọbara, a na-amụta ime ihe ike amụta. Otú ahụ ka anyị nwekwara ike ịmụta otú anyị na ndị mmadụ ga-esi na-adị n’udo. Ma, ònye ga-akụziri anyị otú anyị na ndị mmadụ ga-esi na-adị n’udo? N’eziokwu, o nweghị onye ọzọ ma ọ́ bụghị Onye kere anyị. Ị manụ na amamihe ya enweghị atụ. Ka anyị tụlee ụzọ ihe ise nwere ike inyere gị aka ka gị na ndị mmadụ na-adị n’udo. Ị ga-ahụkwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ha.
1 “Enwerela onye na-eme ihe ike anyaụfụ.” (Ilu 3:31) Ihe e ji ama onye dị ike bụ na ọ dị nwayọọ ma na-ejide onwe ya ma a kpasuo ya iwe. Ilu 16:32 kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.” A kpasuo ya iwe, ọ na-edi ya. Kama iwe iwe, ọ na-eji olu ọma zaa onye ahụ kpasuru ya iwe okwu. Nke a na-emekwa ka ‘ọnụma onye ahụ kpasuru ya iwe laa.’ (Ilu 15:1) Ma, obere ihe na-ewe onye na-ewe iwe ọkụ iwe.—Ilu 25:28.
2 Emetela onye ọ bụla ị hụrụ enyi. Ilu 16:29 kwuru na “onye na-eme ihe ike ga-arata mmadụ ibe ya.” Ma, “onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.” (Ilu 13:20) Ọ bụrụ na anyị na ndị na-eme udo, bụ́ ndị dị nwayọọ na ndị na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, na-akpa, anyị ga-amụta àgwà ọma ha.
3 Gbaa mbọ hụ ndị mmadụ n’anya. O nwetụbeghị ebe a kọwara ihe ịhụnanya bụ otú e si kọwaa ya ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-7. Ebe ahụ kwuru na ‘ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ na-edi ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.’ Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị nwere ụdị ịhụnanya Chineke nwere, anyị ga-ahụ mmadụ niile n’anya, ya bụrụgodị na ha bụ ndị iro anyị.—Matiu 5:44, 45.
4 Hapụ Chineke ka o jiri aka ya kwụọ ndị ọjọọ ụgwọ. Ndị Rom 12:17-19 kwuru, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Chineke obi, kwetakwa na ihe ndị o kwuru ga-eme, anyị ga na-enwe obi ụtọ. Ndị na-amaghị Chineke agaghị ama ihe mere anyị ji na-enwe obi ụtọ.—Abụ Ọma 7:14-16; Ndị Filipaị 4:6, 7.
5 Alaeze Chineke ga-eme ka e nwee ezigbo udo n’ụwa a. Alaeze Chineke bụ ọchịchị nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ala ndị ọjọọ niile n’iyi ma chịwa ụwa. (Abụ Ọma 37:8-11; Daniel 2:44) N’Alaeze Chineke, “onye ezi omume ga na-ama pokopoko, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị.”—Abụ Ọma 72:7.
Ihe a niile Baịbụl kwuru enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo.