Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/13 p. 3
  • IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Alaka Oké Osimiri Dị na Meksiko
  • Rọshịa
  • Peruu
  • Ịtali
  • Saụt Afrịka
  • Mmanụ Ala—Olee Otú Anyị Si Enweta Ya?
    Teta!—2003
  • Akụkọ Gbasara Afrịka
    Teta!—2015
  • Mmanụ Ala—Otú O Si Emetụta Gị
    Teta!—2003
  • Isiokwu Ndị dị n’Akwụkwọ a
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 1/13 p. 3

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Alaka Oké Osimiri Dị na Meksiko

Alaka Oké Osimiri Dị na Meksiko
N’ọnwa Eprel afọ 2010, o nwere ihe mere n’ebe a na-amị mmanụ. Ihe e ji awụnye mmanụ a mịpụtara n’ala gbawara, mmanụ ana-asọju n’oké osimiri. Ọ fọrọ obere ka ihe a meruo ọnwa atọ. Mgbe ọnwa abụọ na ọkara gara, ụfọdụ ndị e dunyere ka ha gaa chọpụta ihe kpatara ya kwuru na mmanụ ahụ ataala. Ma, ụfọdụ ekweghị ihe a ha kwuru. Ha sịrị na ọ ga-abụ na mmanụ ahụ agbadaala n’ala ala osimiri.
Rọshịa
Otu akwụkwọ akụkọ kwuru gbasara otu nnyocha e mere na Rọshịa. Nnyocha ahụ e mere gosiri na e kee ndị Rọshịa dị n’agbata afọ iri na asatọ na iri atọ na ise ụzọ abụọ, ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na “e nwere mgbe ụfọdụ onye chọrọ inwe ego na-eme ihe ọ ma na ọ dịghị mma.”
Peruu
I lee anya n’elu, ị ga-ahụ isisi ọka mere ochie. A hụrụ isisi ọka a n’ebe ugwu Peruu. Ọ ga-abụ na ndị bi n’ebe ahụ na-eme pọpkọn kemgbe puku afọ atọ gara aga. Ọ ga-abụkwa na ha na-egwe ọka egwe, ya aghọọ ntụ ọka.
Ịtali
E nwere otu bishọp ndị Katọlik aha ya bụ Lucio Soravito De Franceschi. Ọ bụ bishọp ndị obodo Adria na Rọvigọ. O kwuru na e kwesịrị ịna-agakwuru ndị mmadụ n’ebe ha bi zie ha ozi ọma. O kwukwara na kama iji mgbịrịgba na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịawa chọọchị, e kwesịrị ịna-aga n’ụlọ ha agwa ha okwu Chineke.
Saụt Afrịka
A na-akpọ anụ a e sere ebe a raịno. Ndị mmadụ na-ere mpi ya na nzuzo. Ha na-ere ya oké ọnụ, ọ bụkwa ndị ji ya agwọ ọrịa ka ha na-eresị ya. Dị ka ihe atụ, ha na-ere otu kilogram ihe dị ka ₦10,075,000. N’afọ 2011, ndị na-achụ nta gburu narị raịno anọ na iri anọ na asatọ na Saụt Afrịka naanị. Na Yurop, ndị ohi na-aga akụka ebe a na-edewe ihe ndị mgbe ochie na ụlọ ahịa ebe a na-ere mpi raịno zuru mpi ya ndị dị ebe ahụ. Raịno ndị dị n’ebe a na-edewe anụ ọhịa na Yurop nọ n’ezigbo nsogbu.

[Ebe E Si Nweta Foto]

© © llukee/Alamy

[Foto dị na peeji nke 3]
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photo by John Kepsimelis, U.S Coast Guard

A na-akpọ anụ a e sere ebe a raịno. Ndị mmadụ na-ere mpi ya na nzuzo. Ha na-ere ya oké ọnụ, ọ bụkwa ndị ji ya agwọ ọrịa ka ha na-eresị ya. Dị ka ihe atụ, ha na-ere otu kilogram ihe dị ka ₦10,075,000. N’afọ 2011, ndị na-achụ nta gburu narị raịno anọ na iri anọ na asatọ na Saụt Afrịka naanị. Na Yurop, ndị ohi na-aga akụka ebe a na-edewe ihe ndị mgbe ochie na ụlọ ahịa ebe a na-ere mpi raịno zuru mpi ya ndị dị ebe ahụ. Raịno ndị dị n’ebe a na-edewe anụ ọhịa na Yurop nọ n’ezigbo nsogbu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya