Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/13 p. 6-15
  • Setan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Setan
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye bụ Setan?
  • Olee ebe Setan bi?
  • Setan ò nwere ike imesi ndị mmadụ ike ma ọ bụkwanụ jiri ha na-arụ ọrụ?
  • Na-eche Nche, Setan Chọrọ Iripịa Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ònye Bụ Setan? Ọ̀ Dị Adị n’Ezie?
    Teta!—2007
  • Ndị Ọchịchị n’Ógbè Ndị Bụ Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Setan Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Dị Ndị Mmadụ n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 7/13 p. 6-15

IHE BAỊBỤL KWURU

Setan

Ònye bụ Setan?

“Agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, . . . na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na Setan bụ ihe ọjọọ dị n’ime onye ọ bụla. Ndị ọzọ ana-ekwu na ọ bụ mmadụ bụ Ekwensu. Ha na-asịkwa na onye kwe, ya esu.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na Setan abụghị ihe ọjọọ dị n’ime mmadụ. Mmadụ abụghịkwa Ekwensu. Ekwensu bụ mmụọ. Ọ bụbu mmụọ ozi Chineke. Ma, o mechara nupụrụ Chineke isi, na-agbakwa ya mgba okpuru. Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan “na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31) Ọ na-eji “ihe ịrịba ama ụgha” eduhie ndị mmadụ.—2 Ndị Tesalonaịka 2:9, 10.

Baịbụl kwuru na o nwere ụbọchị Chineke na Setan kwurịtara okwu n’eluigwe. Ọ bụrụ na Setan bụ ihe ọjọọ dị n’ime onye ọ bụla, ọ pụtaranụ na ihe ya na Chineke kwuru okwu bụ ihe ọjọọ dị n’ime ya. Ma, ị manụ na nke a agaghị eme eme n’ihi na Baịbụl kwuru na Chineke zuru okè, bụrụkwa onye ezi omume. (Diuterọnọmi 32:4; Job 2:1-6) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere onye bụ́ Setan, ọ bụghị ihe ọjọọ dị n’ime onye ọ bụla. Mmadụ abụghịkwa Ekwensu.

GỊNỊ MERE I KWESỊRỊ IJI AMATA ONYE Ọ BỤ?

Setan chọrọ ka i chee na ya adịghị. Ọ na-eme ka onye omekome. Ị manụ na onye omekome anaghị achọ ka a mata onye ọ bụ. Ihe mere o ji eme otú ahụ bụ ka o nwee ike ịna-eme ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ị chọghị ka Setan nweta gị, ihe mbụ ị ga-eme bụ ịghọta na ọ dị adị.

Olee ebe Setan bi?

‘Ahụhụ ga-adịrị ụwa, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ.’—Mkpughe 12:12.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọkụ ala mmụọ dị n’ime ime ala. Ha na-asị na ọ bụ n’ebe ahụ ka Setan bi. Ndị ọzọ na-ekwu na o bi n’ime ndị ajọ mmadụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na Setan bụ mmụọ. Nke a pụtara na anyị agaghị ahụli ya anya. Mgbe Setan nupụchaara Chineke isi, ọ hapụrụ ya ka ọ ka na-abịa n’ebe ya na ndị mmụọ ozi ya bi. Ọ na-abụ ya gaa, ya alọta. (Job 1:6) Ma ugbu a, ọ gaghị agali ebe Chineke bi n’ihi na a chụdatala ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa ebe a.—Mkpughe 12:12.

Nke a ọ̀ pụtara na o nwere otu ebe Setan bi, nọrọ n’ebe ahụ na-akpa ike n’ụwa? O nwere ike ị gụtala na Baịbụl na ocheeze Setan dị n’otu obodo a kpọrọ Pagamọm. (Mkpughe 2:13) Ihe mere Baịbụl ji kwuo otú ahụ bụ na ndị ebe ahụ na-efesi Setan ike. O nweghị obodo a ga-asị na ọ bụ ebe Setan bi. Kama, ihe Baịbụl kwuru bụ na ọ bụ ya nwe “alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi.”—Luk 4:5, 6.

Setan ò nwere ike imesi ndị mmadụ ike ma ọ bụkwanụ jiri ha na-arụ ọrụ?

“Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọtụtụ ndị ekwerela ka Setan duhie ha. Ọ bụ ya na-achị ha. (2 Ndị Kọrịnt 11:14) Ọ bụ ya mere na ụmụ mmadụ enwebeghị ike ime ka ụwa a dị mma.

Baịbụl kwukwara gbasara ndị ụfọdụ Setan ji kwara ngwá ọrụ nakwa ndị nke o mekpara ahụ́.—Matiu 12:22; 17:15-18; Mak 5:2-5.

IHE I NWERE IKE IME

Atụla Setan ụjọ. Ọ bụrụ na ị chọghị ka Setan nweta gị ma ọ bụ jiri gị kwara ngwá ọrụ, i kwesịrị ịma otú o si na-eji ndị mmadụ arụ ọrụ. Nke a ga-eme ka ị mara atụmatụ ya. (2 Ndị Kọrịnt 2:11) Ị na-agụ Baịbụl, ị ga-ama otú Setan si eji aghụghọ na-eduhie ndị mmadụ. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ikwe ka o duhie gị.

Mebie ihe ọ bụla jikọrọ gị na ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ Ndịozi 19:19) Tụfuo ọtụmọkpọ ọ bụla i nwere. Tụfuokwa akwụkwọ, vidio, egwú, na ihe ọ bụla ọzọ na-akwado ime mgbaasị na ịgba afa.

Baịbụl kwuru, sị: “Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Ọ bụrụ na i mee ihe a Baịbụl kwuru, ọ ga-esi ike Setan eduhie gị.—Ndị Efesọs 6:11-18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya