Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/13 p. 3
  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Amerịka
  • Chaịna
  • Gris
  • India
  • Ịtali
  • Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2001
  • Igbu Onwe Onye—Ihe Otiti nke Ndị Na-eto Eto
    Teta!—1998
  • Ihe Mere Ike Ndụ Ji Agwụ Ndị Mmadụ
    Teta!—2001
  • Igbu Onwe Onye—Nsogbu Zuru Ebe Nile nke Na-apụtachaghị Ìhè
    Teta!—2000
Teta!—2013
g 9/13 p. 3

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Amerịka

N’Amerịka, e nwere ọtụtụ ndị larala ezumike nká n’ọrụ amị. Kwa ụbọchị, ihe karịrị iri mmadụ abụọ n’ime ha na-egbu onwe ha, ebe ihe dị ka narị mmadụ itoolu na iri ise na-anwa igbu onwe ha kwa ọnwa.

Chaịna

Otu akwụkwọ akụkọ ndị Chaịna kwuru na ọtụtụ ụmụ nwaanyị na-erubeghị iri afọ atọ na-esi obodo ha gaa rụwa ọrụ na mpaghara ọzọ na Chaịna. Ihe dị ka ọkara n’ime ha na-atụrụ ime tupu ha alụọ di. Ndị nke na-atụrụ ime ugbu a tupu ha alụọ di karịrị akarị ma e jiri ha tụnyere ndị tụụrụ ime n’afọ ole na ole gara aga. Akwụkwọ ahụ kwukwara na ndị Chaịna anaghịzi ele nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye anya ọjọọ ma ha biri.

Gris

N’afọ 1974, ndị Gris chụrụ ịba ọsọ ụkwụ eru ala. Ma ugbu a, ịba amalitela ịkpa ha aka ọjọọ. A sị na ihe kpatara ya bụ ihe isi ike nakwa na ndị ọchịchị anaghịzi ewepụtacha ego a ga-eji na-azụta ihe ndị e ji egbochi ọrịa n’obodo ahụ.

India

Nnyocha e mere gosiri na n’agbanyeghị otú India si na-emepe, ọtụtụ ndị ka chọrọ ka nne na nna ha jiri aka ha na-achọtara ha onye ha ga-alụ kama hanwa iji aka ha achọta onye dị ha mma. Ọtụtụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ kwukwara na ha chọrọ ka ha na ndị ikwu ha biri kama naanị ha na nne na nna ha na ụmụnne ha ibi.

Ịtali

Mgbe a gbara otu ụkọchukwu ndị Katọlik ajụjụ ọnụ, o kwuru na ike agwụla ndị chọọchị ha ma na Yurop ma na mba ndị dị n’Amerịka. O kwukwara na ha kwesịrị ịgbanwe ihe ndị ha na-eme n’ụlọ ụka ha. Ihe ọzọ o metụrụ ọnụ bụ na ụlọ ụka na-ebu oké ibu nakwa na ọtụtụ ndị anaghịzi echi ụkọchukwu na sista. Ha anaghịzi ahazi ihe nke ọma, ndị ụkọchukwu ha na-eyikwa uwe ukwu. Ihe ọzọ o kwuru bụ na ndị ụka ha ka na-eme ihe ndị mgbe ochie.—Aha ụkọchukwu kwuru ihe a bụ Carlo Maria Martini. E bipụtara ihe a o kwuru mgbe ọ nwụrụla.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya