Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/14 p. 9
  • 3 Olileanya Dị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 3 Olileanya Dị
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?
    Olee Otú I Chere Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Baịbụl Na-eme Ka Anyị Nwee Olileanya
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Malite Ịmụ Baịbụl
  • Olee Ebe Ị Pụrụ Inweta Olileanya Bụ́ Ezigbo Ya?
    Teta!—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 5/14 p. 9
Nwoke obi siri ike na nkwa Chineke ga-emezu

ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

3 Olileanya Dị

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”​—ABỤ ỌMA 37:11.

Baịbụl kwuru na ndụ ụmụ mmadụ ‘jupụtara ná nsogbu.’ (Job 14:1) Taa, e nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ihe niile dịịrị ya mma. Ma, e nwere ndị ike ụwa gwụrụla, ya adị ha ka ha enweghịzi olileanya nakwa na ihe agaghị adịkwara ha mma ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru na olileanya dị. O kwuru na ihe ga-adịrị ma gịnwa ma ụmụ mmadụ niile mma. Dị ka ihe atụ:

  • Baịbụl kwuru na Jehova Chineke buuru anyị niile ihe ọma n’obi.—Jenesis 1:28.

  • Jehova kwekwara nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 65:21-25.

  • Obi sikwara anyị ike na ọ ga-eme ihe ahụ o kwere ná nkwa. Mkpughe 21:3, 4 kwuru, sị:

    “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

Ihe a Baịbụl kwuru abụghị nrọ. Jehova Chineke ga-emezurịrị ihe ahụ o kwuru, ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ya, o nwekwara ike ọ ga-eji eme ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-eme ihe niile o kwere anyị ná nkwa. Nkwa ahụ mere ka anyị mara na e nwere ihe anyị nọ ndụ eme.

IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọ bụrụgodị na nsogbu ụwa a mere ka ike ụwa gwụ gị, nkwa Baịbụl kwere anyị nwere ike inyere gị aka ịna-edi nsogbu ndị ahụ.

IHE I NWERE IKE IME: Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ahụ. I nwere ike ịjụ ndị nke nọ n’obodo unu ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig.a

a Ihe i nwere ike ime: Gaa n’adres Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa Ọ́BÁ AKWỤKWỌ. N’ebe ahụ e dere chọwa, denye “ịda mbà n’obi” ma ọ bụ “mmadụ igbu onwe ya,” ị ga-ahụ ihe ga-enyekwuru gị aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya