Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/14 p. 4-6
  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị nke Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị nke Ọma
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị ga-esi Mee Ka Ihe Gaara Gị Nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Ka Ihe Ịgara Mmadụ nke Ọma Pụtara?
    Teta!—2014
  • Otú Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ihe Isii Ga-enyere Mmadụ Aka Inwe Ezigbo Ihe Ịga nke Ọma
    Teta!—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 11/14 p. 4-6
Charlotte na Timothy

ISIOKWU TETA! A | GỊNỊ KA IHE ỊGARA MMADỤ NKE ỌMA PỤTARA?

Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Na-agara Gị nke Ọma

Ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ịgaziri mmadụ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eche na ihe ịgaziri mmadụ pụtara. O kwughị na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ihe dabaara ka ihe ga-agara nke ọma. Ma, ọ naghị akwado ihe ndị mmadụ na-ekwu na onye mee ihe obi ya gwara ya, ihe agaziere ya. Ọtụtụ ndị na-amalite mgbe ụmụ ha ka bụ nwata gwawa ha ihe ahụ. N’eziokwu, mmadụ nwere ike mee ihe obi ya gwara ya, ihe aghara ịgara ya nke ọma.

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị onye ihe na-agaghị agaliri nke ọma ma onye ahụ gbaa mbọ. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru banyere ihe ịgara mmadụ nke ọma.

  • Ego kịrịkịrị

    IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekliziastis 5:10.

    IHE Ọ PỤTARA. Ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ anaghị eme ka mmadụ nwee afọ ojuju. Kama, ọ na-eme ka ihe ghara ịna-atụ onye ahụ n’anya. Otu ọkachamara aha ya bụ Jean M. Twenge kwuru na obi anaghị eru ndị mkpa ha bụ ịba ọgaranya ala, obi na-adị na-ajọkwa ha njọ. Ma, ndị mkpa ha bụ ka ha na mmadụ ibe ha dị ná mma anaghị echegbu onwe ha, obi na-erukwa ha ala. O kwukwara na nchọpụta niile a na-eme na-egosi na ego anaghị eme ka mmadụ nwee obi ụtọ nakwa na onye kpatahaala ihe ọ ga-eri, ego ndị ọzọ na-abatazi ya n’aka adịchazighị mkpa iji nwee afọ ojuju.

    IHE I NWERE IKE IME. Gbawa mbọ ka ị na-eme ihe ndị ọzọ ga-abara gị uru ná ndụ, ọ bụghị ịchụ ego na akụnụba. Jizọs kwuru, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”—Luk 12:15.

  • Nwoke dị mpako

    IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.” —Ilu 16:18.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọ bụrụ na mmadụ adị mpako ma ọ bụ nwee oké ọchịchọ, ihe agaghị agara ya nke ọma. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe ịga nke ọma kwuru na a bịa n’ụlọ ọrụ ndị na-eme nke ọma, ndị isi ha na-adị umeala n’obi, ha adịghị ebuli onwe ha elu. Ma, e kee ụlọ ọrụ ndị na-anaghị eme nke ọma ụzọ atọ, ndị bụ́ ndị isi n’ụzọ abụọ n’ime ha dị mpako. Ihe anyị mụtara n’ihe akwụkwọ a kwuru bụ na mmadụ ibuli onwe ya elu nwere ike ime ka ihe ghara ịgara ya nke ọma.

    IHE I NWERE IKE IME. Kama ịgbawa mbọ ka ị bụrụ onye a ma ama, gbalịa ka ị dị umeala n’obi. Baịbụl sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.” Ụdị onye a abụghị onye ihe na-agara nke ọma.—Ndị Galeshia 6:3.

  • Onye ji hama n’aka

    IHE BAỊBỤL KWURU:

    ‘Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa ime ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya.’—Ekliziastis 2:24.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọ bụrụ na ị na-arụsi ọrụ ike, ọrụ gị ga na-enye gị obi ụtọ. N’akwụkwọ Dr. Madeline Levine dere, ọ sịrị na tupu ihe agaara mmadụ nke ọma n’ihe ọ na-eme, onye ahụ ga-amarịrị ime ihe ahụ nke ọma. Onye ahụ agaghịkwanụ ama ihe ahụ nke ọma ma ọ bụrụ na ọ naghị agbasi mbọ ike. Ụdị onye ahụ ga-amakwa ihe ọ ga-eme ma nsogbu ọ bụla bịara ya.

    IHE I NWERE IKE IME. Gbaa mbọ ka ọrụ gị doo gị anya, adakwala mbà ma nsogbu bịara gị. Ọ bụrụ na ị mụrụ ụmụ, nyere ha aka ka ha mụta ihe ha kwesịrị ime ma nsogbu bịara ha. Ya abụla ha nwehaala nsogbu, ị gbara doziere ha ya. Obi na-adịkwa ụmụaka ụtọ ma ha mụta otú ha ga-esi na-edozi nsogbu ha. Ọ ga-enyekwara ha aka ịna-edozi nsogbu ndị ga-abịara ha ma ha too.

  • Nkịta

    IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Nkịta dị ndụ ka ọdụm nwụrụ anwụ mma.”—Ekliziastis 9:4.

    IHE Ọ PỤTARA. Ọrụ i ji akpata ego ekwesịghị ịna-ewekọrọ oge gị niile. Ọ bụrụ na mmadụ na-eme nke ọma n’ọrụ ya, ma ọ naghị enwe efe elekọta onwe ya ma ọ bụ ezinụlọ ya, ị̀ ga-asị na ihe na-agara onye ahụ nke ọma? Ndị ihe na-agara nke ọma n’eziokwu anaghị ekwe ka ọrụ ha mee ka ha ghara ịna-elekọta onwe ha na ndị ezinụlọ ha.

    IHE I NWERE IKE IME. Na-elekọta onwe gị anya. Na-ezu ike. A gaghị asị na ihe na-agara gị nke ọma ma ị na-arụsi ọrụ ike ma leghara ma onwe gị ma ndị ezinụlọ gị ma ndị enyi gị anya.

  • Baịbụl a sapere asape

    IHE BAỊBỤL KWURU:

    “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

    IHE Ọ PỤTARA. Mmadụ ịmụ Baịbụl na ime ihe ọ mụtara so n’ihe ndị dị mkpa na-eme ka ihe na-agara onye ahụ nke ọma. Nde kwuru nde Ndịàmà Jehova amụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-enyere ha aka ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha banyere akụnụba.—Matiu 6:31-33.

    IHE I NWERE IKE IME. Mụta otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka ka ihe na-agara gị nke ọma. Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru, gwa Ndịàmà Jehova bi gị nso ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị agaa n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.pr418.com/ig.

“Echeburu M na Ihe Na-agaziri M”

Charlotte na Timothy

Timothy na nwunye ya, bụ́ Charlotte, bi ná nnukwu ụlọ ha rụrụ. Ha nwere ụgbọala atọ bụ́ kpọcha kpọcha, ha na-agakwa ekpori ndụ n’obodo dị iche iche kwa afọ. Ma, mgbe o yiri ka ihe niile ọ̀ na-agara ha nke ọma, ha gbanwere otú ha si ebi ndụ. Ndị dere akwụkwọ a jụrụ Timothy ihe mere ha ji gbanwee ndụ ha. Ka anyị hụ ihe ha kwuru.

Olee ụdị ọrụ unu na-arụbu?

Ana m arụbu n’ebe a na-akụ egwú nakwa n’ụlọ akụ̀. Nwunye m na-arụbu n’ebe a na-agba ọkpụkpụ, mechaa rụwa n’ụlọ akụ̀. Anyị mechara meghee ebe anọ a na-anọ akpụ ndị mmadụ isi. Ndị mmadụ na-ele m anya ka onye ihe na-agara nke ọma. Anaghịdị m aga ọrụ ọtụtụ mgbe n’ihi na m nwere ndị na-arụrụ m ọrụ. Ka oge na-aga, anyị kpebiri na anyị ga-agbanwe otú anyị si ebi ndụ. Anyị rere ọtụtụ ngwongwo anyị.

Gịnị mere unu ji gbanwee ndụ unu?

Anyị chọpụtara na otú ihe si agara anyị abụghị ihe ịga nke ọma nke ezigbo ya. Obi na-adị anyị ụtọ ma e nwee ihe ọhụrụ anyị zụrụ, ma ka oge na-aga ike ihe ahụ na-agwụ anyị.

Gịnị ka unu mere ka ihe wee gawara unu nke ọma?

Abụ m Onyeàmà Jehova, na-agachikwa ozi ọma anya. N’agbanyeghị na e nwere mgbe mụ na nwunye m na-eji iri awa asaa iri awa asaa akụziri ndị mmadụ Baịbụl kwa ọnwa, ikwusa ozi ọma abụghị ihe kacha mkpa ná ndụ anyị mgbe ahụ. N’ihi ya, anyị kwụsịrị ọrụ ahụ anyị na-arụ, gaa kwusawa ozi ọma n’ebe a na-enweghị ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma. Anyị na-arụ ọrụ ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Amerịka. A naghị akwụ anyị ụgwọ, e nyeghịkwa m ọkwá pụrụ iche n’ebe ahụ n’ihi na ọrụ anyị na-arụ bụ otu n’ime ụzọ anyị si efe Chineke. E nweghị ihe kọrọ anyị n’ihi na mkpa anyị abụghị inwe elu na ala.

Ì chere na ihe na-agaziri gị ugbu a karịa ná mbụ?

Ee. Echeburu m na ihe na-agaziri m. Ma, ugbu a ka ihe gaziweere m nke ezigbo ya. Ọrụ m na-arụ ugbu a na-eme ka m nwee ezigbo obi ụtọ n’ihi na ọ na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mata eziokwu Baịbụl, meekwa ka ha na Chineke dịrị ná mma.a

a A naghị akwụ Ndịàmà Jehova ụgwọ ọnwa maka ọrụ ha na-arụ iji kwado ozi ọma a na-ezi ndị mmadụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya