Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/15 p. 14-15
  • Mesaya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mesaya
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee otú ndị mmadụ ga-esi mata onye bụ́ Mesaya?
  • Olee otú Mesaya ga-esi rụchaa ọrụ ya?
  • Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Amụma Ndị E Buru Banyere Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Mesaya Ahụ Bụ Onye Chineke Ga-esi n’Aka Ya Zọpụta Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ha Nọ Na-atụ Anya Mesaya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 3/15 p. 14-15
Ebe Jizọs na-agwọ onye ọrịa

IHE BAỊBỤL KWURU

Mesaya

Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-abịa n’ụwa. Ya bịa, ọ ga-anapụta ụmụ mmadụ n’ọrịa, ahụhụ, na ọnwụ. Ọ̀ bụ Jizọs Kraịst bụ Mesaya ahụ?

Olee otú ndị mmadụ ga-esi mata onye bụ́ Mesaya?

Baịbụl buru amụma na Mesaya ma ọ bụ Kraịst ga-arụ ụzọ ọrụ abụọ, ma ọ gaghị abụ otu mgbe. Ya rụchaa nke mbụ, ogologo oge ga-aga tupu ya arụọ nke abụọ.a Ka o nwee ike ịrụ ọrụ nke mbụ ahụ, ọ ga-abụ mmadụ. Ndị dere Baịbụl buru amụma gbasara ụdị ndụ ọ ga-ebi ma ọ bịa n’ụwa nakwa otú ọ ga-esi jee ozi ya ka ndị mmadụ nwee ike ịmata onye ọ bụ. Ọ bụ “ịgba àmà banyere Jizọs” bụ isi ihe mere e ji buo amụma ndị dị na Baịbụl.—Mkpughe 19:10.

Ihe niile Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa gosiri ihe ọ ga-eme ma ọ malite ịchị ụwa. N’oge ahụ, ọ ga-eme ya n’ụwa niile

IHE BAỊBỤL KWURU

Mesaya ga-esi . . .

  • n’agbụrụ Eze Devid.—Aịzaya 9:7; Luk 3:23-31.b

  • A ga-amụ ya na Betlehem.—Maịka 5:2; Luk 2:4-7.

  • Ọ ga-eji obi umeala na-ekwusa “ozi ọma.”—Aịzaya 61:1; Luk 4:43.

  • Ndị mmadụ ga-eleda ya anya, o nweghịkwa ihe ha ga-eji ya kpọrọ.—Aịzaya 53:3; Matiu 26:67, 68.

  • A ga-eji maka mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ nyefee ya n’aka ndị iro ya.—Zekaraya 11:12, 13; Matiu 26:14, 15.

  • A ga-ebo ya ebubo ụgha, maakwa ya ikpe ọnwụ, ma ọ gaghị atụpụ ọnụ.—Aịzaya 53:6, 7; Matiu 27:12-14.

  • A ga-egbu ya otú e si egbu “nwa atụrụ” e ji achụ àjà. Ọ ga-ebupụkwa mmehie ụmụ mmadụ ma mee ka ha na Chineke dị ná mma.—Aịzaya 53:7; Jọn 1:29, 34, 36.

  • A ga-egbu ya, ma a gaghị agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla.—Abụ Ọma 34:20; Jọn 19:33, 36.

  • A ga-eli ya n’ili ndị ọgaranya.—Aịzaya 53:9; Matiu 27:57-60.

  • Ọ ga-ebili n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ.—Matiu 16:21; 28:5-7.

Amụma a niile nakwa ọtụtụ amụma ndị ọzọ mezuru n’isi Jizọs. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. O si otú a mee ka anyị ghọtakwuo na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, meekwa ka obi sie anyị ike na nkwa Baịbụl kwere na ọ ga-eme ihe ndị a n’ụwa niile ga-emezu. (Luk 7:21-23; Mkpughe 21:3, 4) Mgbe Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ gara nọdụ ala “n’aka nri” Chineke, na-eche ka oge ruo ka ọ rụchaa ọrụ ya.—Abụ Ọma 110:1-6.

“Mgbe Kraịst bịara, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke nwoke a na-eme?”—Jọn 7:31.

Olee otú Mesaya ga-esi rụchaa ọrụ ya?

Oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị Juu chere na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom ma chịwa ha. (Ọrụ Ndịozi 1:6) Ọ bụ ka oge na-aga ka ndị Juu na-eso ụzọ Jizọs ghọtara na ọ ga-anọ n’eluigwe rụchaa ọrụ ya mgbe ọ ghọrọla mmụọ ozi dị ike nke e nyerela ikike ịchị eluigwe na ụwa.—Matiu 28:18.

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Mesaya ga-arụ ọrụ nke abụọ ahụ, . . .

  • Ọ ga-abụ Eze Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-achị ụwa niile.—Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15.

  • Ọ ga-emere ndị niile nwere okwukwe n’ebe ọ nọ ihe ọma.—Jenesis 22:17, 18; Abụ Ọma 72:7, 8.

  • Ọ ga-eme ka ‘ọtụtụ mba na ndị eze ha kụja’ mgbe ọ ga-ebibi ha maka na ha na-emegide ya.—Aịzaya 52:15; Mkpughe 19:19, 20.

  • Ọ ga-eme ka “oké ìgwè mmadụ” na-erubere Chineke isi baa n’ụwa ọhụrụ.—Mkpughe 7:9, 10, 13-17.

  • Ọ ga-eso Chineke kpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha ebiri n’ụwa e mere ka ọ bụrụ Paradaịs.—Luk 23:43; Jọn 5:21, 28, 29.

  • Ọ ga-akụziri ndị ọ ga-achị otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo.—Aịzaya 11:1, 2, 9, 10.

  • Ọ ga-ewepụ mmehie, bụ́ ihe kpatara ọrịa na ọnwụ.—Jọn 1:29; Ndị Rom 5:12.

  • Ọ ga-ebibi ọrụ Setan kpamkpam ma mee ka mmadụ niile na Jehova Chineke dịghachi ná mma.—1 Ndị Kọrịnt 15:25-28; 1 Jọn 3:8.

Ọ bụ Jizọs rụrụ ọrụ nke mbụ ahụ e kwuru na Mesaya ga-arụ. Ọ ga-arụkwa nke abụọ a. Onye ọ bụla ma ihe kwesịrị ileru anya ala mụọ gbasara Jizọs n’ihi na o kwuru, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ.”—Jọn 14:6.

““N’oge ọchịchị ya, onye ezi omume ga na-ama pokopoko, udo ga-adịkwa ebe niile ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị. Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị . . . ruo ná nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 72:7, 8.

a “Mesaya” bụ okwu Hibru. Ihe ọ pụtara n’asụsụ Grik bụ “Kraịst.”—Jọn 1:41.

b Amaokwu Baịbụl ndị nke mbụ kwuru banyere amụma ndị e buru gbasara Mesaya, ndị nke abụọ ekwuo otú ha si mezuo.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya