Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/15 p. 8-9
  • Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-erube Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-erube Isi
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Ihe I Nwere Ike Ime ma Nwa Gị Bido Ime Isi Ike Ụmụaka
    Teta!—2013
  • Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru
    Teta!—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 7/15 p. 8-9
Ebe obere nwa na-emere mama ya isi ike

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-erube Isi

IHE MERE O JI ESI IKE

Ka e were ya na nwa gị dị afọ anọ na-achọ ka ị na-eme ihe ọ bụla ọ chọrọ, ọ bụkwa ihe ọ chọrọ ka ị na-emekarị.

  • Ị gwa ya mee ihe ọ na-achọghị ime, ya eleghara gị anya.

  • Ị sịkwa ya emela ihe ọ chọrọ ime, ya esiwe ọnwụ.

Ụdị ihe a mee, ihe i nwere ike ịjụ onwe gị bụ, ‘Ọ̀ bụ àgwà ụmụaka na-enye nwa m a nsogbu? Ọ̀ ga-emecha tofee ya?’

Ị ka nwere ike ịkụziri nwa gị ka ọ na-erube isi. Ma tupu anyị amata otú i nwere ike isi eme ya, ka anyị leba anya n’otu n’ime ihe ndị na-eme ka ụmụaka na-eme isi ike.

IHE MERE ỤMỤAKA JI EME ISI IKE

Ọ bụrụ na a mụọ nwa ọhụrụ, ọrụ nne ya na nna ya bụ ilekọta ya, ha ga na-apakwa ya apa. O behaala ákwá, ha agbara bịa ka ha mara ihe na-eme ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ ihe ahụ́ ụmụaka chọrọ n’oge ahụ, anya ndị nne na nna kwesịkwara ịna-adị n’ebe nwa ọhụrụ ha nọ.

Ka nwa ahụ na-etolite, ọ ga-amalite ịna-eche na papa ya na mama ya kwesịrị ịna-emere ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Ma mgbe ọ na-erula afọ abụọ, ọ ga-edo ya anya na egwú adagharịala. Ọ ga-achọpụta na ọ ga na-emezi ihe papa ya na mama ya chọrọ, ọ bụghị ya ga na-atụrụ ha ụka. Ọ ga-abịa dị ya ka ọ̀ nọ ná nrọ. Egwú dagharịa otú a, ụfọdụ ụmụaka na-amalite isi ọnwụ. Ndị ọzọ na-ajụkwa ime ihe papa ha ma ọ bụ mama ha kwuru.

Ọ bụrụ na nwatakịrị amalite ịkpa ụdị àgwà a, ndị nne na nna kwesịrị ịgbadosi ụkwụ ike n’ala mee ka ihe ha chọrọ ka nwa ha na-eme doo ya anya. Ma, gịnị ka ha ga-eme ma ọ bụrụ na nwa ha anaghị ekwe eme ihe ha gwara ya otú ahụ nwa ahụ e ji mee ihe atụ ná mmalite isiokwu a si eme?

IHE I NWERE IKE IME

Ahapụla nwa gị ka ọ na-eme ihe masịrị ya. Nwa gị agaghị na-asọpụrụ gị ma ọ bụrụ na ị hapụ ya ka ọ na-eme ihe masịrị ya. N’ihi ya, na-agwa ya ihe ị chọrọ ka o mee. Ma, emela ka ị̀ na-akpa ya ahụ́. Ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị ọkachamara na-ekwu na nne na nna ọ bụla na-enye ụmụ ha iwu na-akpa ha ahụ́. Otu n’ime ndị ọkachamara ahụ kwudịrị na isi otú ahụ azụ ụmụaka adịghị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ ụmụ ya ka ha na-eme ihe ọ bụla masịrị ha, ha agaghị ama aka nri ha na aka ekpe ha, ha ga-alakwa n’iyi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 29:15.

Na-adọ nwa gị aka ná ntị. Otu akwụkwọ kwuru na ịdọ aka ná ntị pụtara inye mmadụ ọzụzụ ka onye ahụ mụta irube isi ma ọ bụ ijide onwe ya. O kwukwara na a na-enye onye a na-enye ọzụzụ iwu, na-atakwa ya ahụhụ ma ọ daa iwu ahụ. Ma, e kwesịghị iji obi ọjọọ na-adọ mmadụ aka ná ntị. Ị na-adọ nwa gị aka ná ntị, mee ka ọ ghọta na ị chọrọ inyere ya aka nakwa na àgwà ahụ ọ kpara nwere ike ịkpatara ya nsogbu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 23:13.

Gwa nwa gị ihe ị chọrọ ka o mee. Ụfọdụ ndị nne na nna na-eme ha chọọ ka nwa ha mee ihe, ha agwawa ya okwu ka hà na-arịọ ya arịrịọ. Ihe mere ha ji eme otú ahụ nwere ike ịbụ na ha chere na ọ bụ otú dị mma e si azụ ụmụaka. Ọ bụrụ na ndị nne na nna emee otú ahụ, ọ ga-eme ka nwa ha chewe na ọ bụ ya ka ọ dị n’aka ikpebi ma ọ̀ ga-eme ihe ha kwuru ma ọ bụ na ọ gaghị eme ya. Kama inyewe nwa gị ụdị ohere a, gwa ya hoo haa ihe ị chọrọ ka o mee.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 14:9.

Alala azụ n’ihe i kpebiri. I kpebie ihe ị chọrọ ka nwa gị mee, ya emela gị obi abụọ, gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịkwara inwe otu olu. Ọ bụrụkwa na ị gwa nwa gị ihe ị ga-eme ya ma o nupụ isi, mee ya ihe ahụ ma o nupụ isi. Gị na ya anọkwala na-akpa isiokwu n’ihe mere i ji gwa ya ihe ị chọrọ ka o mee. Ihe niile ga na-aga n’anya ha ma ọ bụrụ na i mee ‘ka Ee gị bụrụ Ee, ka Ee e gị bụrụkwa Ee e.’—Jems 5:12.

Hụ nwa gị n’anya. Ezinụlọ ekwesịghị ịbụ ebe mmadụ na-eme otú masịrị ya, o kwesịghịkwa ịbụ ebe a na-akpa mmadụ ahụ́. Kama, ọ bụ ebe Chineke chọrọ ka e jiri ịhụnanya zụlite ụmụaka otú ha ga-aba uru. Ịdọ nwa gị aka ná ntị ga-eme ka ọ na-erube isi, meekwa ka ọ ghọta na ị hụrụ ya n’anya n’eziokwu.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.”​—Ilu 29:15.

  • “Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.”​—Ilu 23:13.

  • “Ọ bụrụ na unu ejighị ire unu kwuo okwu dị mfe nghọta, olee otú a ga-esi mata ihe unu na-ekwu?”​—1 Ndị Kọrịnt 14:9.

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ I NWERE IKE ỊGỤ

Ị gaa na jw.org/ig, ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere ndị nne na nna aka. Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ DI NA NWUNYE NA NDỊ NNE NA NNA ka ị hụ isiokwu ndị a:

  • “Ịdọ Ụmụaka Aka ná Ntị”

  • “Ihe I Nwere Ike Ime ma Nwa Gị Bido Ime Isi Ike Ụmụaka”

  • “Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru”

  • “Kụziere Ụmụ Gị Omume Ọma”

  • “Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha”

  • “Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi”

Gụọkwa isiokwu bụ́ “Otú A Ga-esi Zụọ Ụmụaka Ha Abaa Uru.” Ọ dị na Teta! Ọktoba–Disemba 2011.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya