Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 9/15 p. 8-9
  • Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE ODIDI
  • Gịnị Ga-enyere M Aka ma Mụ na Onye Mụ na Ya Na-akpa Kwụsị Ịkpa?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Mụ na Onye M Chọrọ Ịlụ Gbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ọ Bụrụ na Anyị Agbasaa, Olee Otú M Ga-esi Die Ya?
    Teta!—2009
  • Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye A Ma Anyị Lụọ?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 9/15 p. 8-9
Nwa okorobịa a na-eche gbasara nwa agbọghọ ọ chọburu ịlụ

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara

IHE MERE O JI ESI IKE ODIDI

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Amakaa kwuru, sị: “Echere m na ahụla m onye ga-alụ m. Agwara m onwe m na ọ bụ nwoke a ka mụ na ya ga-ebi. Ma mgbe anyị kpara ọnwa abụọ, agwara m ya na achọghịzi m ka e nwee ihe jikọrọ mụ na ya. Onye gwa m na ọ bụ otú a ka anyị ga-esi tisaa, agaghị m ekweta.”

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Ebere kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe na-amasị m na-amasịkwa onye mụ na ya na-akpa. M chere na o nweghị ihe ga-eme ka anyị ghara ịlụ. Ma ka oge na-aga, achọpụtara m na ihe anaghị adabara anyị abụọ. Ahụkwara m nsogbu m na-aga ịbanye na ya, mụ agwa ya ka anyị kwụsị ịkpa.”

Ọ bụrụ na ụdị ihe ụmụ agbọghọ abụọ a kwuru emetụla gị, isiokwu a ga-enyere gị aka ka i die ya.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Mmadụ abụọ chọrọ ịlụ gbasaa, ọ na-ewute ha abụọ. E nwere otu nwa agbọghọ ya na onye chọrọ ịlụ ya kpara naanị ọnwa isii tupu ha agbasaa. Aha ya bụ Chinyere. O kwuru, sị: “Ahụ́ gwụrụ m n’ihi na ahụrụ m ya n’anya, achọkwara m ka mụ na ya biri. Ma tupu anyị amara ihe na-emenụ, anyị agbasaala. Ọ na-abụ m nụ egwú na-atọ anyị abụọ ụtọ, mụ echeta otú anyị si enwe aṅụrị mgbe ahụ anyị ka na-akpa. M gaa ebe ụfọdụ anyị abụọ na-adị aga mgbe ahụ, ya ana-ewute m na mụ na ya anọghịzi. Ọ bụ otú a ka ọ dị m mgbe ahụ n’agbanyeghị na ọ bụ m gwara ya ka ọ gawara onwe ya.”

Mgbe ụfọdụ, ọ na-aka mma ka a gbasaa n’agbanyeghị na ọ na-agbawa obi. Ebere kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike ịgba nkịtị ka ọ ghara itiwa onye nke ọzọ obi. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ha abụọ anọgide na-akpa n’agbanyeghị na ihe anaghị adabara ha, obi ga-emecha gbawaa ha abụọ.” Chinyere kwukwara otu ihe ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na obi anaghị adị gị mma mgbe gị na mmadụ na-akpa, obi agaghịkwa na-adị gị mma ma ọ bụrụ na unu emechaa lụọ. Ọ bụrụ na unu achọpụta ya n’oge ma gawara onwe unu, ọ ga-akara unu mma.”

Ọ bụrụ na gị na onye ị chọrọ ịlụ agbasaa, ọ pụtaghị na ị bụ ajọ mmadụ. Ọ bụghị mgbe niile ka mmadụ abụọ chọrọ ịlụ ibe ha na-emecha lụọ. Ọ bụrụ na obi esighị gị ma ọ bụ onye gị na ya na-akpa ike na ije unu ga-enwe isi, ịgbasa nwere ike ịkara unu mma. Ọ bụrụkwa na unu emechaa gbasaa, echela na ị bụ ajọ mmadụ. I nwere ike idi ya. Gịnị ga-enyere gị aka?

IHE I NWERE IKE IME

Kweta na ọ gaghị adịrị gị mfe. Ebere kwuru, sị: “Onye mụ na ya kwụsịrị ịkpa abụghị naanị enyi m, ọ bụ ezigbo enyi m.” Ọ bụrụ na mmadụ na onye ọ hụrụ n’anya agbasaa, ọ ga-ewute ya. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Okoro kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịlụ agbasaa, ọ ga-ewuterịrị ha n’agbanyeghị na ihe mere ha ji gbasaa bụ ka ihe dị mma.” N’oge Eze Devid nọ ná nsogbu, o dere, sị: ‘N’ogologo abalị dum, m na-eme ka ihe ndina m jupụta n’anya mmiri m.’ (Abụ Ọma 6:6) O nwere ike ịdị anyị otú a ọ dị Eze Devid. Mgbe ụfọdụ, ihe ga-enyere mmadụ aka idi ụdị mgbawa obi ahụ bụ iji nwayọọ na-edi ya. Ihe ga-enyekwaranụ ya aka bụ ịghọta otú obi dị ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Abụ Ọma 4:4.

Mete ndị ga-enyere gị aka enyi. Ịkpa ndị ọzọ nso n’ụdị oge a adịghị mfe. Nwa agbọghọ ahụ aha ya bụ Amaka kwuru, sị: “Mgbe mụ na nwoke ahụ chọburu ịlụ m gbasara, ihe m mere bụ ịnọrọ onwe m. M malitere ịnọ naanị m ka m nwee ike inweta onwe m ma chebara ihe niile merenụ echiche, marakwanụ otú mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ.” Ma, Amaka mechara kpawa ndị enyi ya nso. O kwuru, sị: “Otú m si na-akpa ha nso emeela ka obi na-adị m mma. O meekwala ka mgbasa ahụ anyị gbasara ghara ịna-ewute m otú o sibu ewute m.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 17:17.

Mụta ihe na ya. I nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Ihe a merenụ ọ̀ kụziiri m ebe ụfọdụ m nwere ike ịrụ ọrụ? Ọ bụrụ na o nwere ihe m mụtara, ọ̀ ga-enyere m aka ma mụ na onye ọzọ kpawa?’ Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nnenna kwuru, sị: “Ka oge na-aga, m bịara nwetatụwa onwe m. Ma, o were m oge tupu mụ enwee ike idi ihe niile merenụ.” Okoro kwetakwara ihe a o kwuru. Ọ sịrị: “O were m otu afọ tupu mụ enweta onwe m mgbe mụ na onye m chọrọ ịlụ gbasara. O wekwara m ogologo oge tupu mụ amụta ihe na ya. Ihe mụ na ije jere n’oge ahụ mere ka m ghọtakwuo ụdị mmadụ m bụ, mụ amụtakwuo ọtụtụ ihe gbasara ụmụ nwaanyị nakwa ihe mmadụ kwesịrị ime ma ya na onye ọ chọrọ ịlụ na-akpa. Obi anaghịzi agbawa m otú o si agbawabu m.”

Kọọrọ Jehova otú obi dị gị. Baịbụl kwuru na Chineke ‘na-agwọ ndị e tiwara obi, na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.’ (Abụ Ọma 147:3) Jehova anaghị agwa mmadụ onye ọ ga-alụ, e kwesịghịkwa ịta ya ụta ma mmadụ abụọ chọrọ ịlụ mechaa gbasaa. Ma, anyị kwesịrị iburu n’obi na ihe ọ bụla gbasara anyị na-emetụ ya n’obi. Kọọrọ ya ihe ọ bụla na-enye gị nsogbu n’obi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 5:7.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Weenụ iwe . . . Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, n’elu ihe ndina unu.”—Abụ Ọma 4:4.

  • ‘Ezi enyi bụ nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.’—Ilu 17:17.

  • ‘Na-atụkwasịnụ Chineke nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

MMADỤ NWERE IKE IDI YA

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nneoma kwuru, sị: “Mgbe mụ na onye chọburu ịlụ m gbasara, ọ dị m ka ọ̀ bụ m kpatara ihe niile, ọ gbagwojukwara m anya. Ịnọ naanị m kpara m aka ọjọọ, ya ana-adịkwa m ka mụ enweghịzi isi ná ndụ. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ agbasaa, ọ naghị adị mfe idi obi mgbawa ya na ya so. Chineke kere nwoke na nwaanyị ka ha hụ ibe ha n’anya nke ga-eme ka ha nwee mmasị ịlụ. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịlụ emechaa gbasaa, otú Chineke si kee anyị ga-eme ka ha nwee ike idi ya. Ọ naghị adị mfe nwoke na nwaanyị ịhụ ibe ha n’anya ruo na nke ha chọrọ ịlụ. Ha mechaa gbasaa, ọ na-ewe oge tupu ha enweta onwe ha. Ma, ha ga-edili ya.”

Ị chọọ ịmatakwu gbasara isiokwu a, gụọ isi nke iri atọ na otu nke akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè,Nke 1. Ị gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya